Joshua 4 (BOICB)

1 Mgbe mba ahụ niile gafesịrị osimiri Jọdan, ONYENWE ANYỊ gwara Joshua okwu sị ya, 2 “Site nʼetiti ndị ụmụ Izrel họpụta ndị ikom iri na abụọ, otu onye site nʼebo ọbụla, 3 ka onye ọbụla nʼime ha site nʼebe ahụ ndị nchụaja guzoro nʼetiti osimiri Jọdan buputa otu nkume, otu nkume, gwa ha ka ha debe nkume ndị a ha buputara nʼebe unu ga-anọ ọnọdụ abalị taa.” 4 Ya mere, Joshua kpọrọ ndị ikom iri na abụọ ndị ahụ, ndị ọ họpụtara, site nʼetiti ndị Izrel, otu onye site nʼebo ọbụla, 5 Ọ gwara ha sị, “Sitenụ nʼetiti osimiri Jọdan, ebe ndị bu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ Chineke unu guzoro, buputa nkume. Onye ọbụla nʼime unu ga-ebuputa otu nkume, tụkwasị nʼubu ya, dịka ọnụọgụgụ ebo Izrel niile si dị, 6 ka ha bụrụ ihe ịrịbama nʼetiti unu. Nʼoge dị nʼihu, mgbe ụmụ unu ga-ajụ unu ajụjụ sị, ‘Gịnị bụ isi ogidi nkume a dị nʼebe a?’ 7 Unu ga-asịkwa ha, ‘Ọ bụ ihe na-echetara anyị otu osimiri Jọdan si kwụsị ịsọ, mgbe ndị bụ igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ zọnyere ụkwụ ha nʼosimiri ahụ.’ Nkume a ga-abụkwara ụmụ Izrel niile ihe ncheta ruo mgbe ebighị ebi.” 8 Ụmụ Izrel mere dịka Joshua gwara ha. Ha buputara nkume iri na abụọ site nʼetiti osimiri Jọdan, dịka ONYENWE ANYỊ si nye Joshua nʼiwu sị na otu onye, nʼebo Izrel ọbụla, ga-ebuputa otu nkume. Ha buuru nkume iri na abụọ ndị ahụ gaa nʼebe ha nọrọ ọnọdụ abalị, debe ha nʼebe ahụ. 9 Joshua nʼonwe ya kwa ji nkume iri na abụọ ahụ nke si nʼetiti osimiri Jọdan wuo ogidi ịrịbama, nʼebe ahụ ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ ahụ guzoro. Ha dịkwa nʼebe ahụ ruo taa. 10 Ndị nchụaja, ndị bụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ, guzoro nʼetiti osimiri Jọdan, tutu ruo mgbe e mezuru iwu ahụ niile ONYENWE ANYỊ nyere Joshua site nʼọnụ Mosis. Mgbe ahụ kwa, ndị Izrel mere ngwangwa gafee osimiri Jọdan. 11 Ngwangwa ha niile gafetasịrị, igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ na ndị nchụaja gafetakwara nʼakụkụ nke ọzọ, ka ndị mmadụ na-ele ha anya. 12 Ndị agha ụmụ Ruben, na ụmụ Gad, na ọkara ebo Manase, buuru ụmụ Izrel niile ụzọ gafee, idu ha nʼagha, dịka Mosis nyere ha nʼiwu. 13 Ndị agha ọnụọgụgụ ha ruru iri puku anọ (40,000), ndị jikeere nke ọma ibu agha, duuru ebo ndị ọzọ, gafere nʼihu ONYENWE ANYỊ bata nʼobosara ala Jeriko maka ibu agha. 14 Ụbọchị ahụ bụ ụbọchị ONYENWE ANYỊ buliri Joshua elu nke ukwuu nʼihi na o mere Joshua ka ọ dị ukwuu nʼanya ndị Izrel niile, si otu a mee ka ha tụọ ya egwu nke ukwuu dịka ha si tụọ Mosis egwu, ma sọpụkwara ya ụbọchị niile nke ndụ ya. 15 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Joshua okwu sị, 16 “Nye ndị nchụaja, ndị bu igbe ọgbụgba ndụ ahụ iwu ka ha si nʼosimiri Jọdan pụta.” 17 Ya mere Joshua nyere ndị nchụaja iwu sị ha, “Sitenụ nʼosimiri Jọdan pụta.” 18 Mgbe ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ ahụ si nʼosimiri Jọdan rịpụta, dịka ọbụ ụkwụ ha na-emetụ nʼala akọrọ, mmiri osimiri ahụ sọghachiri nʼọnọdụ ya ruchie akụkụ ya niile, ka ọ dị na mbụ. 19 Ihe ịrịbama a mere nʼụbọchị nke iri, nʼọnwa nke mbụ. Nʼụbọchị ahụ ka ndị Izrel niile gafere osimiri Jọdan, gaa maa ụlọ ikwu ha na Gilgal, ebe dị nʼọwụwa anyanwụ obodo Jeriko. 20 Nkume iri na abụọ ahụ ha si nʼosimiri Jọdan buputa, ka Joshua guzobere na Gilgal. 21 Ọ sịrị ndị Izrel, “Nʼoge dị nʼihu, mgbe ụmụ unu ga-ajụ ndị bụ nna ha ajụjụ sị, ‘Gịnị ka nkume ndị a pụtara, Gịnịkwa ka ha na-egosi?’ 22 Gwa ha, ‘Izrel gafere osimiri Jọdan nʼala akọrọ.’ 23 Nʼihi na ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu mere ka osimiri Jọdan takpọọ nʼihu unu tutu ruo mgbe unu gafesịrị nʼofe nke ọzọ. ONYENWE ANYỊ Chineke unu mere osimiri Jọdan ihe o mere osimiri Uhie mgbe o mere ka osimiri Uhie takpọọ nʼihu anyị, tutu ruo mgbe anyị gafesịrị nʼofe ya nke ọzọ. 24 O mere ihe ndị a niile ka ndị niile bi nʼelu ụwa mata na aka ONYENWE ANYỊ dị ike. O mekwara ya ka unu onwe unu tụọ egwu ONYENWE ANYỊ Chineke unu, mgbe niile.”

In Other Versions

Joshua 4 in the ANGEFD

Joshua 4 in the ANTPNG2D

Joshua 4 in the AS21

Joshua 4 in the BAGH

Joshua 4 in the BBPNG

Joshua 4 in the BBT1E

Joshua 4 in the BDS

Joshua 4 in the BEV

Joshua 4 in the BHAD

Joshua 4 in the BIB

Joshua 4 in the BLPT

Joshua 4 in the BNT

Joshua 4 in the BNTABOOT

Joshua 4 in the BNTLV

Joshua 4 in the BOATCB

Joshua 4 in the BOATCB2

Joshua 4 in the BOBCV

Joshua 4 in the BOCNT

Joshua 4 in the BOECS

Joshua 4 in the BOGWICC

Joshua 4 in the BOHCB

Joshua 4 in the BOHCV

Joshua 4 in the BOHLNT

Joshua 4 in the BOHNTLTAL

Joshua 4 in the BOILNTAP

Joshua 4 in the BOITCV

Joshua 4 in the BOKCV

Joshua 4 in the BOKCV2

Joshua 4 in the BOKHWOG

Joshua 4 in the BOKSSV

Joshua 4 in the BOLCB

Joshua 4 in the BOLCB2

Joshua 4 in the BOMCV

Joshua 4 in the BONAV

Joshua 4 in the BONCB

Joshua 4 in the BONLT

Joshua 4 in the BONUT2

Joshua 4 in the BOPLNT

Joshua 4 in the BOSCB

Joshua 4 in the BOSNC

Joshua 4 in the BOTLNT

Joshua 4 in the BOVCB

Joshua 4 in the BOYCB

Joshua 4 in the BPBB

Joshua 4 in the BPH

Joshua 4 in the BSB

Joshua 4 in the CCB

Joshua 4 in the CUV

Joshua 4 in the CUVS

Joshua 4 in the DBT

Joshua 4 in the DGDNT

Joshua 4 in the DHNT

Joshua 4 in the DNT

Joshua 4 in the ELBE

Joshua 4 in the EMTV

Joshua 4 in the ESV

Joshua 4 in the FBV

Joshua 4 in the FEB

Joshua 4 in the GGMNT

Joshua 4 in the GNT

Joshua 4 in the HARY

Joshua 4 in the HNT

Joshua 4 in the IRVA

Joshua 4 in the IRVB

Joshua 4 in the IRVG

Joshua 4 in the IRVH

Joshua 4 in the IRVK

Joshua 4 in the IRVM

Joshua 4 in the IRVM2

Joshua 4 in the IRVO

Joshua 4 in the IRVP

Joshua 4 in the IRVT

Joshua 4 in the IRVT2

Joshua 4 in the IRVU

Joshua 4 in the ISVN

Joshua 4 in the JSNT

Joshua 4 in the KAPI

Joshua 4 in the KBT1ETNIK

Joshua 4 in the KBV

Joshua 4 in the KJV

Joshua 4 in the KNFD

Joshua 4 in the LBA

Joshua 4 in the LBLA

Joshua 4 in the LNT

Joshua 4 in the LSV

Joshua 4 in the MAAL

Joshua 4 in the MBV

Joshua 4 in the MBV2

Joshua 4 in the MHNT

Joshua 4 in the MKNFD

Joshua 4 in the MNG

Joshua 4 in the MNT

Joshua 4 in the MNT2

Joshua 4 in the MRS1T

Joshua 4 in the NAA

Joshua 4 in the NASB

Joshua 4 in the NBLA

Joshua 4 in the NBS

Joshua 4 in the NBVTP

Joshua 4 in the NET2

Joshua 4 in the NIV11

Joshua 4 in the NNT

Joshua 4 in the NNT2

Joshua 4 in the NNT3

Joshua 4 in the PDDPT

Joshua 4 in the PFNT

Joshua 4 in the RMNT

Joshua 4 in the SBIAS

Joshua 4 in the SBIBS

Joshua 4 in the SBIBS2

Joshua 4 in the SBICS

Joshua 4 in the SBIDS

Joshua 4 in the SBIGS

Joshua 4 in the SBIHS

Joshua 4 in the SBIIS

Joshua 4 in the SBIIS2

Joshua 4 in the SBIIS3

Joshua 4 in the SBIKS

Joshua 4 in the SBIKS2

Joshua 4 in the SBIMS

Joshua 4 in the SBIOS

Joshua 4 in the SBIPS

Joshua 4 in the SBISS

Joshua 4 in the SBITS

Joshua 4 in the SBITS2

Joshua 4 in the SBITS3

Joshua 4 in the SBITS4

Joshua 4 in the SBIUS

Joshua 4 in the SBIVS

Joshua 4 in the SBT

Joshua 4 in the SBT1E

Joshua 4 in the SCHL

Joshua 4 in the SNT

Joshua 4 in the SUSU

Joshua 4 in the SUSU2

Joshua 4 in the SYNO

Joshua 4 in the TBIAOTANT

Joshua 4 in the TBT1E

Joshua 4 in the TBT1E2

Joshua 4 in the TFTIP

Joshua 4 in the TFTU

Joshua 4 in the TGNTATF3T

Joshua 4 in the THAI

Joshua 4 in the TNFD

Joshua 4 in the TNT

Joshua 4 in the TNTIK

Joshua 4 in the TNTIL

Joshua 4 in the TNTIN

Joshua 4 in the TNTIP

Joshua 4 in the TNTIZ

Joshua 4 in the TOMA

Joshua 4 in the TTENT

Joshua 4 in the UBG

Joshua 4 in the UGV

Joshua 4 in the UGV2

Joshua 4 in the UGV3

Joshua 4 in the VBL

Joshua 4 in the VDCC

Joshua 4 in the YALU

Joshua 4 in the YAPE

Joshua 4 in the YBVTP

Joshua 4 in the ZBP