Leviticus 19 (BOICB)

1 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị ya, 2 “Gwa ọgbakọ ụmụ Izrel niile okwu sị ha: ‘Dịnụ nsọ, nʼihi na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu, dị nsọ. 3 “ ‘Onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịsọpụrụ nne na nna ya, debekwa iwu m nyere maka ụbọchị izuike, nʼihi na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ Chineke unu. 4 “ ‘Unu akpọla isiala nye arụsị, unu emekwarala onwe unu chi ndị e ji ọla kpụọ. Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ Chineke unu. 5 “ ‘Mgbe unu ga-achụrụ ONYENWE ANYỊ aja udo, soronụ ụkpụrụ m nyere unu chụọ ya, ka m nabata ya. 6 Unu ga-eri ya nʼụbọchị ahụ unu chụrụ ya, maọbụ nʼụbọchị nke na-eso ụbọchị ahụ. Nke ọbụla fọdụrụ ruo ụbọchị nke atọ ka unu ga-esure ọkụ. 7 Ọ bụrụ na unu erie ya nʼụbọchị nke atọ ihe arụ ka ọ bụ. A gaghị anabata aja ọbụla unu ga-eri nʼụbọchị nke atọ. 8 Ikpe ga-ama onye ga-eri ya nʼụbọchị nke atọ nʼihi na o meela ka ihe nsọ ONYENWE ANYỊ bụrụ ihe arụ. A ga-ekewapụ onye ahụ site nʼetiti ndị ya. 9 “ ‘Mgbe unu na-ewe ihe ubi, unu ewechala ihe niile dị nʼakụkụ ubi niile, maọbụ chịkọtachaa irighiri ihe ubi niile fọdụrụ nʼala. 10 A ghọrọchakwala mkpụrụ vaịnị niile mịrị nʼelu vaịnị gị, maọbụ chịkọrọ mkpụrụ ndị dara nʼala. Hapụrụ ha ụmụ ogbenye na ndị ọbịa, nʼihi na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ Chineke unu. 11 “ ‘Unu ezula ohi.“ ‘Unu aghala ụgha.“ ‘Unu aghọgbula ibe unu. 12 “ ‘Unu aṅụla iyi ụgha, si otu a weta nkọcha nye aha ONYENWE ANYỊ Chineke unu. Abụ m ONYENWE ANYỊ. 13 “ ‘Unu ejila ike pụnara onye agbataobi unu ihe ya, maọbụ zuru ihe o nwere nʼohi.“ ‘Kwụọnụ onye ọbụla unu goro ọrụ ụgwọ ọrụ ya ọsịịsọ. Unu echela ka chi bọọ tupu unu akwụọ ya ụgwọ ya. 14 “ ‘Akọchala onye ntị chiri, edochikwarala onye ìsì ihe nʼụzọ. Tụọ egwu Chineke. Abụ m ONYENWE ANYỊ. 15 “ ‘Unu ekpela ikpe na-ezighị ezi, unu elela mmadụ anya nʼihu mgbe unu na-ekpe ikpe, ma onye unu na-ekpe ikpe ọ bụ ọgaranya maọbụ ogbenye. Kama kpeenụ ikpe kwụ ọtọ. 16 “ ‘Unu ejegharịla na-agbasa okwu nkwujọ nʼetiti ndị mmadụ.“ ‘Emela ihe ọbụla ga-ebutere onye agbataobi gị ọnwụ. Abụ m ONYENWE ANYỊ. 17 “ ‘Akpọla nwanne gị asị nʼime obi gị. Tụọ onye agbataobi gị mmehie ya nʼihu ya, ka ị ghara iketa oke nʼikpe ọmụma dịrị ya. 18 “ ‘Abọla ọbọ, ebukwala iro nʼobi megide onye ọbụla nʼetiti ndị gị. Kama hụ onye agbataobi gị nʼanya dịka i si hụ onwe gị nʼanya. Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ unu. 19 “ ‘Unu ga-edebe iwu m niile.“ ‘Unu ejila otu ụdị anụ ụlọ unu na-agba ụdị anụ ụlọ ọzọ dị iche.“ ‘Akụla ụdị mkpụrụ abụọ nʼubi.“ ‘Eyila uwe e ji ụzọ ihe abụọ, dịka ajị anụ na ogho dụọ. 20 “ ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla akpọrọ nwaagbọghọ bụ ohu nwanyị nke a na-agbapụtabeghị, maọbụ nke na-enwerebeghị onwe ya, nke nwoke ọzọ chọrọ ịlụ, mee ka ha abụọ dinakọọ, a ga-ekpe ha abụọ ikpe nʼụlọikpe, ma a gaghị egbu ha, nʼihi na nwanyị ahụ abụghị onye nwe onwe ya. 21 Ma nwoke ahụ ga-eweta aja ikpe ọmụma nye ONYENWE ANYỊ nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Ọ ga-abụkwa ebule ka ọ ga-eji chụọ aja ahụ. 22 Onye nchụaja ga-eji ebule aja ikpe ọmụma ahụ chụọrọ nwoke ahụ aja mkpuchi mmehie ya nʼihu ONYENWE ANYỊ, nʼihi mmehie o mere. A ga-agbaghakwara ya mmehie ya. 23 “ ‘Mgbe unu batara nʼala ahụ kụọ mkpụrụ osisi dị iche iche, unu erila mkpụrụ osisi ahụ mịrị nʼafọ nke mbụ, ọ bụ ihe rụrụ arụ. Ruo nʼafọ nke atọ, ha bụ ihe rụrụ arụ. Unu agaghị eri ha. 24 Nʼafọ nke anọ, mkpụrụ nke osisi ndị ahụ niile ga-amị dị nsọ. Unu ga-eji ya nye ONYENWE ANYỊ onyinye otuto. 25 Site nʼafọ nke ise, mkpụrụ ọbụla ga-abụ nke unu. Nʼụzọ dị otu a ihe ha ga-amịpụta ga-adị ukwuu. Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ Chineke unu. 26 “ ‘Unu erila anụ ọbụla ọbara dị nʼime ya.“ ‘Unu agbala afa maọbụ jụta mmụọ ase. 27 “ ‘Unu akpụchala agịrị isi dị gburugburu akụkụ isi unu, maọbụ chabie ọnụ ọnụ afụọnụ unu. 28 “ ‘Unu akala ihe ọbụla nʼahụ unu, nʼihi onye nwụrụ anwụ maọbụ jiri mma ọkụ dee ihe nʼahụ unu. Abụ m ONYENWE ANYỊ. 29 “ ‘Emerụla nwa gị nwanyị site nʼịkwagide ya ka ọ bụrụ akwụna, ka ala unu ghara ijupụta nʼịgba akwụna na ihe ọjọọ dị iche iche. 30 “ ‘Debenụ iwu niile m nyere maka ụbọchị izuike m. Sọpụkwaranụ ebe nsọ m. Abụ m ONYENWE ANYỊ. 31 “ ‘Unu ejekwurula ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase maọbụ chọgaa ndị dibịa afa, nʼihi na unu ga-emerụ onwe site na ha. Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ Chineke unu. 32 “ ‘Bilienụ ọtọ nʼihu okenye, sọpụrụnụ ndị okenye, ma tụọnụ egwu Chineke unu. Abụ m ONYENWE ANYỊ. 33 “ ‘Mgbe onye ọbịa soro unu biri nʼala unu, unu emejọla ya. 34 Mesonụ onye ọbịa bi nʼetiti unu mmeso dịka ọ bụ otu nʼime ndị amụrụ nʼala. Hụnụ ha nʼanya dịka unu si hụ onwe unu, nʼihi na o nwere oge unu bụ ọbịa nʼala Ijipt. Abụ m ONYENWE ANYỊ Chineke unu. 35 “ ‘Unu ejila ihe ọtụtụ aghụghọ mgbe unu na-atụ ihe dị ogologo, maọbụ ihe dị arọ, maọbụ ihe dị ukwuu, 36 Jirinụ ezi ihe ọtụtụ tụọ ogologo, maọbụ ihe dị arọ, maọbụ ihe dị ukwuu. Abụ m ONYENWE ANYỊ Chineke unu, onye si nʼala Ijipt kpọpụta unu. 37 “ ‘Debenụ ụkpụrụ m niile, na iwu m niile, gbasoonụ ha. Abụ m ONYENWE ANYỊ.’ ”

In Other Versions

Leviticus 19 in the ANGEFD

Leviticus 19 in the ANTPNG2D

Leviticus 19 in the AS21

Leviticus 19 in the BAGH

Leviticus 19 in the BBPNG

Leviticus 19 in the BBT1E

Leviticus 19 in the BDS

Leviticus 19 in the BEV

Leviticus 19 in the BHAD

Leviticus 19 in the BIB

Leviticus 19 in the BLPT

Leviticus 19 in the BNT

Leviticus 19 in the BNTABOOT

Leviticus 19 in the BNTLV

Leviticus 19 in the BOATCB

Leviticus 19 in the BOATCB2

Leviticus 19 in the BOBCV

Leviticus 19 in the BOCNT

Leviticus 19 in the BOECS

Leviticus 19 in the BOGWICC

Leviticus 19 in the BOHCB

Leviticus 19 in the BOHCV

Leviticus 19 in the BOHLNT

Leviticus 19 in the BOHNTLTAL

Leviticus 19 in the BOILNTAP

Leviticus 19 in the BOITCV

Leviticus 19 in the BOKCV

Leviticus 19 in the BOKCV2

Leviticus 19 in the BOKHWOG

Leviticus 19 in the BOKSSV

Leviticus 19 in the BOLCB

Leviticus 19 in the BOLCB2

Leviticus 19 in the BOMCV

Leviticus 19 in the BONAV

Leviticus 19 in the BONCB

Leviticus 19 in the BONLT

Leviticus 19 in the BONUT2

Leviticus 19 in the BOPLNT

Leviticus 19 in the BOSCB

Leviticus 19 in the BOSNC

Leviticus 19 in the BOTLNT

Leviticus 19 in the BOVCB

Leviticus 19 in the BOYCB

Leviticus 19 in the BPBB

Leviticus 19 in the BPH

Leviticus 19 in the BSB

Leviticus 19 in the CCB

Leviticus 19 in the CUV

Leviticus 19 in the CUVS

Leviticus 19 in the DBT

Leviticus 19 in the DGDNT

Leviticus 19 in the DHNT

Leviticus 19 in the DNT

Leviticus 19 in the ELBE

Leviticus 19 in the EMTV

Leviticus 19 in the ESV

Leviticus 19 in the FBV

Leviticus 19 in the FEB

Leviticus 19 in the GGMNT

Leviticus 19 in the GNT

Leviticus 19 in the HARY

Leviticus 19 in the HNT

Leviticus 19 in the IRVA

Leviticus 19 in the IRVB

Leviticus 19 in the IRVG

Leviticus 19 in the IRVH

Leviticus 19 in the IRVK

Leviticus 19 in the IRVM

Leviticus 19 in the IRVM2

Leviticus 19 in the IRVO

Leviticus 19 in the IRVP

Leviticus 19 in the IRVT

Leviticus 19 in the IRVT2

Leviticus 19 in the IRVU

Leviticus 19 in the ISVN

Leviticus 19 in the JSNT

Leviticus 19 in the KAPI

Leviticus 19 in the KBT1ETNIK

Leviticus 19 in the KBV

Leviticus 19 in the KJV

Leviticus 19 in the KNFD

Leviticus 19 in the LBA

Leviticus 19 in the LBLA

Leviticus 19 in the LNT

Leviticus 19 in the LSV

Leviticus 19 in the MAAL

Leviticus 19 in the MBV

Leviticus 19 in the MBV2

Leviticus 19 in the MHNT

Leviticus 19 in the MKNFD

Leviticus 19 in the MNG

Leviticus 19 in the MNT

Leviticus 19 in the MNT2

Leviticus 19 in the MRS1T

Leviticus 19 in the NAA

Leviticus 19 in the NASB

Leviticus 19 in the NBLA

Leviticus 19 in the NBS

Leviticus 19 in the NBVTP

Leviticus 19 in the NET2

Leviticus 19 in the NIV11

Leviticus 19 in the NNT

Leviticus 19 in the NNT2

Leviticus 19 in the NNT3

Leviticus 19 in the PDDPT

Leviticus 19 in the PFNT

Leviticus 19 in the RMNT

Leviticus 19 in the SBIAS

Leviticus 19 in the SBIBS

Leviticus 19 in the SBIBS2

Leviticus 19 in the SBICS

Leviticus 19 in the SBIDS

Leviticus 19 in the SBIGS

Leviticus 19 in the SBIHS

Leviticus 19 in the SBIIS

Leviticus 19 in the SBIIS2

Leviticus 19 in the SBIIS3

Leviticus 19 in the SBIKS

Leviticus 19 in the SBIKS2

Leviticus 19 in the SBIMS

Leviticus 19 in the SBIOS

Leviticus 19 in the SBIPS

Leviticus 19 in the SBISS

Leviticus 19 in the SBITS

Leviticus 19 in the SBITS2

Leviticus 19 in the SBITS3

Leviticus 19 in the SBITS4

Leviticus 19 in the SBIUS

Leviticus 19 in the SBIVS

Leviticus 19 in the SBT

Leviticus 19 in the SBT1E

Leviticus 19 in the SCHL

Leviticus 19 in the SNT

Leviticus 19 in the SUSU

Leviticus 19 in the SUSU2

Leviticus 19 in the SYNO

Leviticus 19 in the TBIAOTANT

Leviticus 19 in the TBT1E

Leviticus 19 in the TBT1E2

Leviticus 19 in the TFTIP

Leviticus 19 in the TFTU

Leviticus 19 in the TGNTATF3T

Leviticus 19 in the THAI

Leviticus 19 in the TNFD

Leviticus 19 in the TNT

Leviticus 19 in the TNTIK

Leviticus 19 in the TNTIL

Leviticus 19 in the TNTIN

Leviticus 19 in the TNTIP

Leviticus 19 in the TNTIZ

Leviticus 19 in the TOMA

Leviticus 19 in the TTENT

Leviticus 19 in the UBG

Leviticus 19 in the UGV

Leviticus 19 in the UGV2

Leviticus 19 in the UGV3

Leviticus 19 in the VBL

Leviticus 19 in the VDCC

Leviticus 19 in the YALU

Leviticus 19 in the YAPE

Leviticus 19 in the YBVTP

Leviticus 19 in the ZBP