Leviticus 22 (BOICB)

1 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị, 2 “Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom ka ha jiri nsọpụrụ nabata onyinye dị nsọ nke ụmụ Izrel na-edo nsọ nye m, ka ha ghara imerụ aha nsọ m. Abụ m ONYENWE ANYỊ. 3 “Gwa ha sị, ‘Nʼọgbọ unu niile na-abịa, ọ bụrụ na enwee onye ọbụla nʼagbụrụ unu nke bịara nso nʼihe ndị ahụ dị nsọ ụmụ Izrel na-edo nsọ nye ONYENWE ANYỊ, mgbe onye ahụ nọ ọnọdụ dịka onye rụrụ arụ, a ga-esi nʼihu m wezuga onye ahụ. Abụ m ONYENWE ANYỊ. 4 “ ‘Onye ọbụla bụ nwa nwa Erọn nke ọrịa ekpenta na-arịa, maọbụ nke ihe si nʼahụ ya na-asọpụta agaghị eri aja dị nsọ tutu ruo mgbe e mere ka ọ dịrị ọcha. Ọ ga-abụkwa onye rụrụ arụ ma ọ bụrụ na o metụ ozu aka, maọbụ onye mkpụrụ nwa na-esite nʼahụ awụsị, 5 maọbụ na o metụrụ anụ na-akpụgharị akpụgharị nʼala aka, nke na-emerụ ya, maọbụ na ọ metụrụ mmadụ aka nke mere ka ọ bụrụ onye rụrụ arụ nʼagbanyeghị ihe ọ bụ na-emerụ ya. 6 Onye ahụ metụrụ ihe ndị a aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ gaghị eri ihe nsọ ọbụla tutu ruo mgbe ọ sachara ahụ. 7 Mgbe anyanwụ dara ka ọ ga-adị ọcha, nweekwa ike iri ihe dị nsọ, nʼihi na ọ bụ nri ya. 8 Ọ gaghị eri anụ nwụrụ anwụ, maọbụ nke anụ ọzọ dọgburu, nʼihi na ihe ndị a ga-emerụ ya. Abụ m ONYENWE ANYỊ. 9 “ ‘Ndị nchụaja kwesiri idebe ụkpụrụ m, ka ha ghara ịbụ ndị ikpe mara si otu a nwụọ nʼihi na ha lelịrị ha anya. Abụ m ONYENWE ANYỊ onye na-edo ha nsọ. 10 “ ‘O nweghị onye ọbụla na-esiteghị nʼezinaụlọ ndị nchụaja ga-eri aja nsọ ahụ. Onye bụ ọbịa na onye e goro ọrụ nọ nʼụlọ onye nchụaja agaghị eri ya. 11 Otu ọ dị, ọ bụrụ na onye nchụaja weere ego nke aka ya gbata ohu, maọbụ na a mụrụ ohu ahụ nʼụlọ ya, ohu ahụ nwere ike iri aja nsọ ahụ. 12 Ọ bụrụ na nwa nwanyị onye nchụaja alụọ onye na-abụghị onye nchụaja, ọ gaghị eri ihe ọbụla site nʼime aja nsọ a. 13 Ma nwa nwanyị onye nchụaja nke di ya nwụrụ, maọbụ na ya na di ya ebikwaghị, ọ bụrụkwa na ọ mụtaghị nwa ọbụla, ọ lọghachi bịa biri nʼụlọ nna ya dịka o mere mgbe ọ bụ agbọghọ, o nwere ike iri nri dị nʼụlọ nna ya. Ọ dịkwaghị onye na-ekwesighị iri ya, nke ga-eri ya. 14 “ ‘Ọ bụrụ na onye ọbụla erie onyinye nsọ ahụ na-amaghị ama, ọ ga-eweghachiri onye nchụaja ihe niile o riri tụkwasịkwa ya otu ụzọ nʼụzọ ise ọzọ. 15 Ndị nchụaja ekwesighị imerụ onyinye nsọ ụmụ Izrel na-eche nʼihu ONYENWE ANYỊ, 16 site nʼikwenye ka ndị mmadụ efu rie onyinye nsọ ahụ, si otu a wetara ndị riri ya ikpe ọmụma nke ya na nkwụghachi so. Abụ m ONYENWE ANYỊ onye na-edo ha nsọ.’ ” 17 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị, 18 “Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom na ụmụ Izrel niile okwu sị ha, ‘Ọ bụrụ na onye ọbụla, onye Izrel maọbụ onye ọbịa nʼIzrel, eweta aja nsure ọkụ nye ONYENWE ANYỊ imezu nkwa o kwere, maọbụ dịka onyinye afọ ofufu, 19 ọ ga-eweta otu oke nke na-enweghị nkwarụ nke si nʼigwe ehi, maọbụ atụrụ, maọbụ ewu, ka a nabata ya nʼaha. 20 Ewebatala ihe ọbụla nke nwere nkwarụ, nʼihi na agaghị m anabata ya nʼaha gị. 21 Mgbe onye ọbụla wetara ehi maọbụ atụrụ maọbụ ewu site nʼigwe anụ, dịka onyinye aja udo ọ na-enye ONYENWE ANYỊ maka imezu nkwa, maọbụ onyinye afọ ofufu, ọ ga-abụ nke na-enweghị ọrụsị maọbụ ntụpọ ọbụla tupu a nabata ya. 22 Anụmanụ ọbụla kpuru ìsì, maọbụ nke merụrụ ahụ, maọbụ nke ụkwụ maọbụ aka gbajiri, maọbụ nke akpụkpa dị nʼahụ ya, maọbụ ihe nwere ure, maọbụ nke ọnya dị nʼahụ, agaghị abụ ihe onyinye nye ONYENWE ANYỊ. Unu atụkwasịkwala ha nʼebe ịchụ aja dịka onyinye nye ONYENWE ANYỊ. 23 Unu nwere ike jiri ehi maọbụ atụrụ nke akụkụ ahụ ya tara ata, maọbụ nke otu akụkụ ya buru ibu karịa ibe ya chụọ aja onyinye si nʼobi, ma a gaghị e ji ya chụọ aja imezu nkwa. 24 Unu agaghị enye anụmanụ ọbụla nke mkpụrụ amụ ya chipịara echipịa, maọbụ nke pịara apịa, maọbụ nke a dọwapụrụ adọwapụ maọbụ nke a chakapụrụ achakapụ, dịka onyinye nʼihu ONYENWE ANYỊ. Unu enyekwala ụdị onyinye a nʼala unu. 25 Unu esitekwala nʼaka onye ọbịa nata ụdị onyinye a, ma webata ya dịka nri a na-enye Chineke unu. A gaghị anabata ha nʼọnọdụ unu, nʼihi na ha nwere nkwarụ, nwekwa ntụpọ.’ ” 26 ONYENWE ANYỊ sịrị Mosis, 27 “Mgbe a mụrụ nwa ehi, maọbụ nwa atụrụ, maọbụ ewu ọhụrụ, a ga-ahapụ ya na nne ya ụbọchị asaa. Site nʼụbọchị nke asatọ gaa nʼihu a ga-anabata ya dịka onyinye ihe oriri i ji chụọ aja nsure ọkụ nye ONYENWE ANYỊ. 28 Egbula nne anụ na nwa ya nʼotu ụbọchị, maọbụ ehi maọbụ atụrụ. 29 “Mgbe unu na-achụrụ ONYENWE ANYỊ aja ekele, chụọnụ ya nʼụzọ ahụ a ga-anabata ya. 30 Riekwanụ anụ aja ahụ nʼotu ụbọchị ahụ, ka ọ hapụ ịfọdụ ruo echi ya. Abụ m ONYENWE ANYỊ. 31 “Unu ga-edebe iwu m ndị a niile, mee ha nʼihi na abụ m ONYENWE ANYỊ. 32 Unu emekwala ka aha m ghara ịdị nsọ. A ga-edo aha m nsọ nʼetiti ụmụ Izrel, nʼihi na abụ m ONYENWE ANYỊ onye na-edo unu nsọ. 33 Ọ bụ m kpọpụtara unu site nʼala Ijipt ka m bụrụ Chineke unu. Abụ m ONYENWE ANYỊ.”

In Other Versions

Leviticus 22 in the ANGEFD

Leviticus 22 in the ANTPNG2D

Leviticus 22 in the AS21

Leviticus 22 in the BAGH

Leviticus 22 in the BBPNG

Leviticus 22 in the BBT1E

Leviticus 22 in the BDS

Leviticus 22 in the BEV

Leviticus 22 in the BHAD

Leviticus 22 in the BIB

Leviticus 22 in the BLPT

Leviticus 22 in the BNT

Leviticus 22 in the BNTABOOT

Leviticus 22 in the BNTLV

Leviticus 22 in the BOATCB

Leviticus 22 in the BOATCB2

Leviticus 22 in the BOBCV

Leviticus 22 in the BOCNT

Leviticus 22 in the BOECS

Leviticus 22 in the BOGWICC

Leviticus 22 in the BOHCB

Leviticus 22 in the BOHCV

Leviticus 22 in the BOHLNT

Leviticus 22 in the BOHNTLTAL

Leviticus 22 in the BOILNTAP

Leviticus 22 in the BOITCV

Leviticus 22 in the BOKCV

Leviticus 22 in the BOKCV2

Leviticus 22 in the BOKHWOG

Leviticus 22 in the BOKSSV

Leviticus 22 in the BOLCB

Leviticus 22 in the BOLCB2

Leviticus 22 in the BOMCV

Leviticus 22 in the BONAV

Leviticus 22 in the BONCB

Leviticus 22 in the BONLT

Leviticus 22 in the BONUT2

Leviticus 22 in the BOPLNT

Leviticus 22 in the BOSCB

Leviticus 22 in the BOSNC

Leviticus 22 in the BOTLNT

Leviticus 22 in the BOVCB

Leviticus 22 in the BOYCB

Leviticus 22 in the BPBB

Leviticus 22 in the BPH

Leviticus 22 in the BSB

Leviticus 22 in the CCB

Leviticus 22 in the CUV

Leviticus 22 in the CUVS

Leviticus 22 in the DBT

Leviticus 22 in the DGDNT

Leviticus 22 in the DHNT

Leviticus 22 in the DNT

Leviticus 22 in the ELBE

Leviticus 22 in the EMTV

Leviticus 22 in the ESV

Leviticus 22 in the FBV

Leviticus 22 in the FEB

Leviticus 22 in the GGMNT

Leviticus 22 in the GNT

Leviticus 22 in the HARY

Leviticus 22 in the HNT

Leviticus 22 in the IRVA

Leviticus 22 in the IRVB

Leviticus 22 in the IRVG

Leviticus 22 in the IRVH

Leviticus 22 in the IRVK

Leviticus 22 in the IRVM

Leviticus 22 in the IRVM2

Leviticus 22 in the IRVO

Leviticus 22 in the IRVP

Leviticus 22 in the IRVT

Leviticus 22 in the IRVT2

Leviticus 22 in the IRVU

Leviticus 22 in the ISVN

Leviticus 22 in the JSNT

Leviticus 22 in the KAPI

Leviticus 22 in the KBT1ETNIK

Leviticus 22 in the KBV

Leviticus 22 in the KJV

Leviticus 22 in the KNFD

Leviticus 22 in the LBA

Leviticus 22 in the LBLA

Leviticus 22 in the LNT

Leviticus 22 in the LSV

Leviticus 22 in the MAAL

Leviticus 22 in the MBV

Leviticus 22 in the MBV2

Leviticus 22 in the MHNT

Leviticus 22 in the MKNFD

Leviticus 22 in the MNG

Leviticus 22 in the MNT

Leviticus 22 in the MNT2

Leviticus 22 in the MRS1T

Leviticus 22 in the NAA

Leviticus 22 in the NASB

Leviticus 22 in the NBLA

Leviticus 22 in the NBS

Leviticus 22 in the NBVTP

Leviticus 22 in the NET2

Leviticus 22 in the NIV11

Leviticus 22 in the NNT

Leviticus 22 in the NNT2

Leviticus 22 in the NNT3

Leviticus 22 in the PDDPT

Leviticus 22 in the PFNT

Leviticus 22 in the RMNT

Leviticus 22 in the SBIAS

Leviticus 22 in the SBIBS

Leviticus 22 in the SBIBS2

Leviticus 22 in the SBICS

Leviticus 22 in the SBIDS

Leviticus 22 in the SBIGS

Leviticus 22 in the SBIHS

Leviticus 22 in the SBIIS

Leviticus 22 in the SBIIS2

Leviticus 22 in the SBIIS3

Leviticus 22 in the SBIKS

Leviticus 22 in the SBIKS2

Leviticus 22 in the SBIMS

Leviticus 22 in the SBIOS

Leviticus 22 in the SBIPS

Leviticus 22 in the SBISS

Leviticus 22 in the SBITS

Leviticus 22 in the SBITS2

Leviticus 22 in the SBITS3

Leviticus 22 in the SBITS4

Leviticus 22 in the SBIUS

Leviticus 22 in the SBIVS

Leviticus 22 in the SBT

Leviticus 22 in the SBT1E

Leviticus 22 in the SCHL

Leviticus 22 in the SNT

Leviticus 22 in the SUSU

Leviticus 22 in the SUSU2

Leviticus 22 in the SYNO

Leviticus 22 in the TBIAOTANT

Leviticus 22 in the TBT1E

Leviticus 22 in the TBT1E2

Leviticus 22 in the TFTIP

Leviticus 22 in the TFTU

Leviticus 22 in the TGNTATF3T

Leviticus 22 in the THAI

Leviticus 22 in the TNFD

Leviticus 22 in the TNT

Leviticus 22 in the TNTIK

Leviticus 22 in the TNTIL

Leviticus 22 in the TNTIN

Leviticus 22 in the TNTIP

Leviticus 22 in the TNTIZ

Leviticus 22 in the TOMA

Leviticus 22 in the TTENT

Leviticus 22 in the UBG

Leviticus 22 in the UGV

Leviticus 22 in the UGV2

Leviticus 22 in the UGV3

Leviticus 22 in the VBL

Leviticus 22 in the VDCC

Leviticus 22 in the YALU

Leviticus 22 in the YAPE

Leviticus 22 in the YBVTP

Leviticus 22 in the ZBP