Leviticus 27 (BOICB)

1 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị ya, 2 “Gwa ụmụ Izrel sị ha, ‘Ọ bụrụ na mmadụ e kwee nkwa pụrụ iche iji mmadụ nye ONYENWE ANYỊ onyinye, ihe ndị a ka ọ ga-eji gbara onye ahụ: 3 nʼisi nwoke ọbụla gbara iri afọ abụọ ruo iri afọ isii, ọ ga-akwụ iri ọlaọcha shekel ise, dịka ihe ọtụtụ ebe nsọ si dị. 4 Nʼisi nwanyị ọbụla gbara iri afọ abụọ ruo iri afọ isii ọ ga-enye iri ọlaọcha shekel atọ. 5 Nʼisi nwoke gbara afọ ise ruo iri afọ abụọ, ọ ga-enye iri ọlaọcha shekel abụọ. Nʼisi nwanyị gbara afọ ise ruo iri afọ abụọ, ọ ga-enye ọlaọcha shekel iri. 6 A ga-akwụrụ nwantakịrị nwoke gbara site otu ọnwa ruo afọ ise, ọlaọcha shekel ise, kwụọra nwantakịrị nwanyị gbara otu ọnwa ruo afọ ise ọlaọcha shekel atọ. 7 Nʼisi nwoke gafere iri afọ isi, a ga-enye ọlaọcha shekel iri na ise. Nʼisi nwanyị gafere iri afọ isi a ga-enye ọlaọcha shekel iri. 8 Ọ bụrụ na e nwee onye ogbenye na-enweghị ego ọ ga-eji kwụọ ụgwọ ndị a, a ga-akpọtara ya onye nchụaja, onye ga-ekwubi ihe onye ahụ kwere nkwa ga-akwụ dịka ego o nwere ruru. 9 “ ‘Ọ bụrụ anụ ụlọ dị mma inye ONYENWE ANYỊ dịka onyinye ka e kwere nkwa inye, anụ ụlọ e nyere ONYENWE ANYỊ ga-aghọ ihe dị nsọ. 10 Onye kwere nkwa inye ya enweghị ike iji anụ ụlọ nke ahụ ya na-ezughị oke gbanwere anụ ụlọ ahụ na-enweghị ntụpọ. O nwekwaghị ike iji anụ ụlọ ahụ na-enweghị ntụpọ gbanwere nke anụ ahụ ya na-ezughị oke. Ọ bụrụ na o mee otu a, anụ ụlọ nke mbụ, na nke abụọ, ga-abụ ihe dị nsọ. 11 Ọ bụrụ na anụ ụlọ o ji kwee nkwa bụ anụ ụlọ rụrụ arụ, ụdị anụ ụlọ ahụ a jụrụ ịnabata dịka onyinye maka iji ya chụọ aja nye ONYENWE ANYỊ, a ga-akpụtara onye nchụaja anụ ụlọ ahụ. 12 Ọ bụ ya ka ọ dịrị ikpebi ma anụ ụlọ ahụ ọ dị mma, ma ọ jọrọ njọ. Ọnụ ego ọbụla onye nchụaja kpebiri, ka onye wetara anụ ụlọ ahụ ga-akwụ. 13 Ọ bụrụ na onye nwe anụ ụlọ ahụ achọọ ịgbara ya, ọ ga-akwụ ụgwọ anụ ụlọ ahụ, tụkwasịkwa nʼelu ya otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa anụ ụlọ ahụ. 14 “ ‘Ọ bụrụ na mmadụ enye ụlọ ya, dịka ihe ga-adị nsọ nye ONYENWE ANYỊ, onye nchụaja ga-ekpebi maọbụ ụlọ dị mma, ma ọ bụkwanụ ụlọ jọrọ njọ. Ọ ga-ekwukwa ihe bụ ọnụahịa ụlọ ahụ. 15 Ọ bụrụ na onye ahụ nke na-edo ụlọ ya nsọ achọọ ịgbara ya, ọ ga-akwụ ọnụahịa ụlọ ahụ, tụkwasịkwa nʼelu ya otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ụlọ ahụ. Emesịa, ụlọ ahụ ga-abụkwa nke ya. 16 “ ‘Ọ bụrụ na mmadụ ewere mpaghara ala ubi ezinaụlọ ya nye ONYENWE ANYỊ ka ihe ido nsọ, ihe a ga-eji mata ọnụahịa ala ahụ ga-abụ ụdị ihe ubi e nwere ike ịkụ nʼime ya. Ọnụahịa ala ubi e nwere ike ịkụnye ọka balị ruru otu ihe ọtụtụ homa, ga-abụ iri mkpụrụ ego ọlaọcha shekel ise. 17 Ọ bụrụ nʼime afọ inwere onwe ka o doro ala ahụ nsọ, agaghị agbanwe ọnụahịa ya. 18 Ma ọ bụrụ na o doro ala ahụ nsọ mgbe afọ inwe onwe ahụ gafere, onye nchụaja ga-agụkọrọ ya ọnụahịa ya dịka afọ ole ọ fọdụrụ mgbe mmemme afọ inwere onwe ọzọ ga-adị. A ga-ewebilatakwa ihe ọnụahịa ya ruru. 19 Ọ bụrụ na onye doro ala ahụ nsọ achọọ ịgbara ala ya, ọ ga-akwụ ọnụahịa ahụ onye nchụaja kpebiri, tụkwasị ya ego ruru otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ala ahụ. Mgbe ahụ ala ahụ ga-abụkwa nke ya. 20 Ọ bụrụ na ọ gbapụtaghị ala ahụ, maọbụ na o resila ya onye ọzọ, a gaghị agbapụtakwa ala ahụ ọzọ. 21 Mgbe mmemme afọ inwere onwe ruru, ala ahụ ga-aghọ ala dị nsọ, ala e doro nsọ nye ONYENWE ANYỊ. Ndị nchụaja ga-ewere ya ka ọ bụrụ nke ha. 22 “ ‘Ọ bụrụ na mmadụ e doro ONYENWE ANYỊ ala ubi ọ zụrụ azụ nsọ, nke na-abụghị ala ezinaụlọ ha, 23 onye nchụaja ga-agụ afọ ole ọ fọdụrụ ruo mmemme afọ inwere onwe. Ọ ga-agwa onye ahụ ego ole ọ ga-akwụ nʼihi ya. Ego ọbụla ọ kwụrụ nʼụbọchị ahụ ga-abụ ihe dị nsọ nye ONYENWE ANYỊ. 24 Mgbe afọ inwere onwe ahụ zuru, onye nwe ala ahụ, ya bụ onye ahụ e si nʼaka ya zụọ ya, ga-ewerekwa ala ya. 25 Ọnụahịa ọbụla a ga-ekpebi ga-abụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. Iri gera abụọ ga-abụ otu shekel. 26 “ ‘A gaghị edo nwa mbụ anụmanụ mụtara nsọ maọbụ ehi maọbụ atụrụ nʼihi na ha bụ nke ONYENWE ANYỊ. 27 Ọ bụrụ otu nʼime anụ ndị ahụ rụrụ arụ, a ga-agbara ya nʼọnụ ego nke akara bụ ọṅụ ahịa ya, tụkwasịkwa nʼelu ya otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ya. Ọ bụrụkwanụ na onye nwe anụ ụlọ ahụ achọghị ịgbarakwa ya, a ga-ere ya nʼọnụ ahịa dịka o ruru. 28 “ ‘A gaghị ere, maọbụ gbara ihe ọbụla mmadụ nwere, nke o doro nsọ nye ONYENWE ANYỊ, maọbụ mmadụ, maọbụ ala ezinaụlọ, maọbụ anụ ụlọ, nʼihi na ihe ọbụla nke e wezugara iche bụ ihe dịkarịsịrị nsọ nye ONYENWE ANYỊ. 29 “ ‘Mgbapụta ọbụla adịghị nye onye ọbụla e doro nsọ nye mbibi. A ghaghị ime ka ọ nwụọ. 30 “ ‘Otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile si nʼala, maọbụ mkpụrụ ọghịgha nke ubi, maọbụ mkpụrụ nke osisi mịrị, bụ nke ONYENWE ANYỊ. Ha bụ ihe nsọ dịrị ONYENWE ANYỊ. 31 Onye ọbụla chọrọ ịgbara otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe ubi ya aghaghị ịkwụ ọnụahịa ya, tụkwasị ya otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa e kwesiri ire ya. 32 Otu ụzọ nʼụzọ iri nke igwe ehi na atụrụ niile, anụ nke iri ọbụla nke na-agabiga nʼokpuru mkpanaka onye ọzụzụ atụrụ mgbe a na-agụ ha ọnụ, ga-abụ ihe dị nsọ nye ONYENWE ANYỊ. 33 A gaghị ahọ anụ ụlọ a na-enye ONYENWE ANYỊ ahọ, ile ma ha dị mma, maọbụ na ha dị njọ. A gaghị agbanwekwa ha. Ọ bụrụ na a gbanwee ha, ndị e ji gbanwee ha na ndị a na-achọ ịgbanwe ga-aghọ ihe dị nsọ, a gaghị agbarakwa ha.’ ” 34 Ndị a bụ iwu ONYENWE ANYỊ nyere Mosis nʼugwu Saịnaị ka ọ nye ụmụ Izrel.

In Other Versions

Leviticus 27 in the ANGEFD

Leviticus 27 in the ANTPNG2D

Leviticus 27 in the AS21

Leviticus 27 in the BAGH

Leviticus 27 in the BBPNG

Leviticus 27 in the BBT1E

Leviticus 27 in the BDS

Leviticus 27 in the BEV

Leviticus 27 in the BHAD

Leviticus 27 in the BIB

Leviticus 27 in the BLPT

Leviticus 27 in the BNT

Leviticus 27 in the BNTABOOT

Leviticus 27 in the BNTLV

Leviticus 27 in the BOATCB

Leviticus 27 in the BOATCB2

Leviticus 27 in the BOBCV

Leviticus 27 in the BOCNT

Leviticus 27 in the BOECS

Leviticus 27 in the BOGWICC

Leviticus 27 in the BOHCB

Leviticus 27 in the BOHCV

Leviticus 27 in the BOHLNT

Leviticus 27 in the BOHNTLTAL

Leviticus 27 in the BOILNTAP

Leviticus 27 in the BOITCV

Leviticus 27 in the BOKCV

Leviticus 27 in the BOKCV2

Leviticus 27 in the BOKHWOG

Leviticus 27 in the BOKSSV

Leviticus 27 in the BOLCB

Leviticus 27 in the BOLCB2

Leviticus 27 in the BOMCV

Leviticus 27 in the BONAV

Leviticus 27 in the BONCB

Leviticus 27 in the BONLT

Leviticus 27 in the BONUT2

Leviticus 27 in the BOPLNT

Leviticus 27 in the BOSCB

Leviticus 27 in the BOSNC

Leviticus 27 in the BOTLNT

Leviticus 27 in the BOVCB

Leviticus 27 in the BOYCB

Leviticus 27 in the BPBB

Leviticus 27 in the BPH

Leviticus 27 in the BSB

Leviticus 27 in the CCB

Leviticus 27 in the CUV

Leviticus 27 in the CUVS

Leviticus 27 in the DBT

Leviticus 27 in the DGDNT

Leviticus 27 in the DHNT

Leviticus 27 in the DNT

Leviticus 27 in the ELBE

Leviticus 27 in the EMTV

Leviticus 27 in the ESV

Leviticus 27 in the FBV

Leviticus 27 in the FEB

Leviticus 27 in the GGMNT

Leviticus 27 in the GNT

Leviticus 27 in the HARY

Leviticus 27 in the HNT

Leviticus 27 in the IRVA

Leviticus 27 in the IRVB

Leviticus 27 in the IRVG

Leviticus 27 in the IRVH

Leviticus 27 in the IRVK

Leviticus 27 in the IRVM

Leviticus 27 in the IRVM2

Leviticus 27 in the IRVO

Leviticus 27 in the IRVP

Leviticus 27 in the IRVT

Leviticus 27 in the IRVT2

Leviticus 27 in the IRVU

Leviticus 27 in the ISVN

Leviticus 27 in the JSNT

Leviticus 27 in the KAPI

Leviticus 27 in the KBT1ETNIK

Leviticus 27 in the KBV

Leviticus 27 in the KJV

Leviticus 27 in the KNFD

Leviticus 27 in the LBA

Leviticus 27 in the LBLA

Leviticus 27 in the LNT

Leviticus 27 in the LSV

Leviticus 27 in the MAAL

Leviticus 27 in the MBV

Leviticus 27 in the MBV2

Leviticus 27 in the MHNT

Leviticus 27 in the MKNFD

Leviticus 27 in the MNG

Leviticus 27 in the MNT

Leviticus 27 in the MNT2

Leviticus 27 in the MRS1T

Leviticus 27 in the NAA

Leviticus 27 in the NASB

Leviticus 27 in the NBLA

Leviticus 27 in the NBS

Leviticus 27 in the NBVTP

Leviticus 27 in the NET2

Leviticus 27 in the NIV11

Leviticus 27 in the NNT

Leviticus 27 in the NNT2

Leviticus 27 in the NNT3

Leviticus 27 in the PDDPT

Leviticus 27 in the PFNT

Leviticus 27 in the RMNT

Leviticus 27 in the SBIAS

Leviticus 27 in the SBIBS

Leviticus 27 in the SBIBS2

Leviticus 27 in the SBICS

Leviticus 27 in the SBIDS

Leviticus 27 in the SBIGS

Leviticus 27 in the SBIHS

Leviticus 27 in the SBIIS

Leviticus 27 in the SBIIS2

Leviticus 27 in the SBIIS3

Leviticus 27 in the SBIKS

Leviticus 27 in the SBIKS2

Leviticus 27 in the SBIMS

Leviticus 27 in the SBIOS

Leviticus 27 in the SBIPS

Leviticus 27 in the SBISS

Leviticus 27 in the SBITS

Leviticus 27 in the SBITS2

Leviticus 27 in the SBITS3

Leviticus 27 in the SBITS4

Leviticus 27 in the SBIUS

Leviticus 27 in the SBIVS

Leviticus 27 in the SBT

Leviticus 27 in the SBT1E

Leviticus 27 in the SCHL

Leviticus 27 in the SNT

Leviticus 27 in the SUSU

Leviticus 27 in the SUSU2

Leviticus 27 in the SYNO

Leviticus 27 in the TBIAOTANT

Leviticus 27 in the TBT1E

Leviticus 27 in the TBT1E2

Leviticus 27 in the TFTIP

Leviticus 27 in the TFTU

Leviticus 27 in the TGNTATF3T

Leviticus 27 in the THAI

Leviticus 27 in the TNFD

Leviticus 27 in the TNT

Leviticus 27 in the TNTIK

Leviticus 27 in the TNTIL

Leviticus 27 in the TNTIN

Leviticus 27 in the TNTIP

Leviticus 27 in the TNTIZ

Leviticus 27 in the TOMA

Leviticus 27 in the TTENT

Leviticus 27 in the UBG

Leviticus 27 in the UGV

Leviticus 27 in the UGV2

Leviticus 27 in the UGV3

Leviticus 27 in the VBL

Leviticus 27 in the VDCC

Leviticus 27 in the YALU

Leviticus 27 in the YAPE

Leviticus 27 in the YBVTP

Leviticus 27 in the ZBP