Leviticus 6 (BOICB)

1 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị, 2 “Ọ bụrụ na onye ọbụla emehie bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye ONYENWE ANYỊ, site nʼiduhie onye agbataobi ya banyere ihe e tinyere ya nʼaka idebe, maọbụ izunarị mmadụ ihe, maọbụ iji aghụghọ nara mmadụ ibe ya ihe; 3 maọbụ site nʼijide ihe furu efu nke ọ chọtara ghaa ụgha banyere ya. Ma ọ bụrụ na ha a ṅụọ iyi na ha ejighị ya, maọbụ gbasara ụdị mmehie mmadụ pụrụ ime. 4 Mgbe ha mehiere nʼụzọ ọbụla nʼime ụzọ ndị a niile, ghọta na ikpe mara ha. Ha aghaghị inyeghachi onye nwe ihe ahụ ha zuru nʼohi, maọbụ ihe ha pụnara nʼike, maọbụ ihe e nyere ya idebe, ma ọ bụkwanụ ihe ahụ furu efu ọ chọtara, 5 maọbụ ihe ọbụla ọ ṅụrụ nʼiyi ụgha. Ọ ga-akwụghachi ihe ndị a niile nʼuju, tụkwasịkwa otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ihe ahụ, nyeghachi ya onye nwe ya, nʼụbọchị ahụ ọ ga-eweta aja ikpe ọmụma ya. 6 Ọ ga-ewetara onye nchụaja nʼihu ONYENWE ANYỊ, aja ikpe ọmụma ya nke bụ ebule na-enweghị ntụpọ site nʼigwe anụ, nke ọnụahịa ya ga-abụ ihe ahụ e gbubiri iji ịkwụ ụgwọ mmehie. 7 Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchikwara ya mmehie ya nʼihu ONYENWE ANYỊ, a ga-agbaghakwara ha nʼihi ihe ọbụla ha mere nke ikpe ji maa ha.” 8 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị ya, 9 “Nye Erọn na ụmụ ya ndị ikom iwu sị: ‘Ndị a bụ usoro iwu metụtara aja nsure ọkụ. Aja nsure ọkụ ga-adịgide nʼekwu ahụ dị nʼebe ịchụ aja site nʼabalị ruo nʼụtụtụ. A ga-akwanyekwa ọkụ na-adị nʼebe ịchụ aja hapụ ya ka o nwuo abalị niile. 10 Mgbe chi bọrọ, onye nchụaja ga-eyiri uwe ime ahụ ya nke akwa ọcha, nakwa uwe elu ahụ ya, gaa kpopu ntụ dị nʼekwu nke ebe ịchụ aja nsure ọkụ ahụ, wụsa ha nʼakụkụ ebe ịchụ aja ahụ. 11 Mgbe o mesịrị nke a, ọ ga-agbanwe uwe ya, kporo ntụ ahụ, buru ya pụọ nʼazụ ogige ahụ gaa wufuo ya nʼebe ahụ e mere ka ọ dị ọcha. 12 Ọkụ dị nʼebe ịchụ aja ga na-enwu mgbe niile, a gaghị ekwe ka ọ nyụọ. Nʼụtụtụ niile onye nchụaja ga-akwanye ya nkụ ọhụrụ, tụkwasịkwa aja nsure ọkụ nʼelu ya surekwaa abụba aja udo nʼelu ya. 13 Ọkụ ga-enwugide nʼebe ịchụ aja mgbe niile. A gaghị ekwe ka ọ nyụọ mgbe ọbụla.’ 14 “ ‘Ndị a bụ usoro iwu gbasara onyinye mkpụrụ ọka. Ụmụ Erọn ndị ikom ga-eguzo nʼihu ebe ịchụ aja iche ya nʼihu ONYENWE ANYỊ. 15 Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-ekpoju ọka ahụ a kwọrọ nke ọma, na ụfọdụ mmanụ oliv, tinyere ụda na-esi isi ụtọ nʼaka ya dịka oke ncheta. Kpọọ ya ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja ka ọ nọchie anya onyinye ahụ niile, nke isisi ya dị ONYENWE ANYỊ ezi mma. 16 Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eri nke fọdụrụnụ. Ma a ga-eri ya na-ejighị ihe na-eko achịcha, nʼime ebe nsọ, nʼogige ụlọ nzute ka a ga-anọ eri ya. 17 Agaghị etinye ya ihe na-eko achịcha ma a na-eghe ya. Enyela ya ka ọ bụrụ oke ruuru ha site nʼonyinye nsure ọkụ e chere nʼihu m. Ha bụkwa ihe dịkarịsịrị nsọ, dịka aja ikpe ọmụma na aja mmehie. 18 Nwoke ọbụla sitere nʼagbụrụ Erọn, onye nchụaja, nwere ike iri ya. Ọ bụ oke ọ ga na-eketa site nʼonyinye nsure ọkụ niile echere nʼihu ONYENWE ANYỊ ruo nʼọgbọ niile na-abịa. Ihe ọbụla metụrụ ha ahụ ga-aghọ ihe dị nsọ.’ ” 19 ONYENWE ANYỊ gwakwara Mosis sị, 20 “Nke a bụ aja Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-achụrụ ONYENWE ANYỊ nʼụbọchị a ga-ete ya mmanụ. Ọ ga-abụ ọtụtụ ruru lita abụọ nke ọka dị ezi mma dịka aja onyinye a na-achụ mgbe niile. Ha ga-enye otu ọkara ya nʼụtụtụ, nye nke ọzọ nʼuhuruchi. 21 Ha ga-etinye ya mmanụ, ghee ya nʼite. Ị ga-ebubata ya mgbe a gwọkọrọ ya nke ọma, chee ya dịka aja ọka a nyawasịrị anyawasị nke isisi ya dị ONYENWE ANYỊ ezi mma. 22 Nwa nwoke ahụ nke ga-anọchi ya dịka onye nchụaja e tere mmanụ bụ onye ga-akwado ya. Ọ bụ oke ruuru ONYENWE ANYỊ ebighị ebi, bụrụkwa nke a ga-esure ọkụ kpamkpam. 23 Onyinye mkpụrụ ọka ọbụla nke onye nchụaja nyere ka a ga-akpọ ọkụ kpamkpam. A gaghị eri ya eri.” 24 ONYENWE ANYỊ sịrị Mosis, 25 “Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom, sị, ‘Ndị a bụ usoro iwu unu ga-edebe banyere aja mmehie. A ga-egbu anụ aja mmehie nʼihu ONYENWE ANYỊ, nʼebe ahụ a na-egbu anụ aja nsure ọkụ. Ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ. 26 Onye nchụaja chụrụ ya ga-eri anụ ya, ọ bụ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ, ya bụ nʼogige ụlọ nzute ahụ ka a ga-anọ rie ya. 27 Ihe ọbụla metụrụ anụ nke ọbụla aka, ga-aghọ ihe dị nsọ. Ọ bụrụkwa na ọbara ya efesa nʼuwe ọbụla, ị ga-asụ uwe ahụ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ. 28 A ghaghị itiwa ite aja e ji sie anụ ahụ. Ọ bụrụkwanụ nʼite bronz ka e siri ya, a ga-asa ite ahụ mmiri nke ọma, saa ya ka ọ dị ezi ọcha. 29 Nwoke ọbụla a mụrụ nʼezinaụlọ ndị nchụaja nwere ike iri anụ ahụ, ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ. 30 Ma a gaghị eri anụ aja mmehie ọbụla, bụ nke e webatara ọbara ya nʼime ụlọ nzute maka ikpuchi mmehie nʼEbe nsọ ahụ. Aghaghị ịkpọ ya ọkụ.

In Other Versions

Leviticus 6 in the ANGEFD

Leviticus 6 in the ANTPNG2D

Leviticus 6 in the AS21

Leviticus 6 in the BAGH

Leviticus 6 in the BBPNG

Leviticus 6 in the BBT1E

Leviticus 6 in the BDS

Leviticus 6 in the BEV

Leviticus 6 in the BHAD

Leviticus 6 in the BIB

Leviticus 6 in the BLPT

Leviticus 6 in the BNT

Leviticus 6 in the BNTABOOT

Leviticus 6 in the BNTLV

Leviticus 6 in the BOATCB

Leviticus 6 in the BOATCB2

Leviticus 6 in the BOBCV

Leviticus 6 in the BOCNT

Leviticus 6 in the BOECS

Leviticus 6 in the BOGWICC

Leviticus 6 in the BOHCB

Leviticus 6 in the BOHCV

Leviticus 6 in the BOHLNT

Leviticus 6 in the BOHNTLTAL

Leviticus 6 in the BOILNTAP

Leviticus 6 in the BOITCV

Leviticus 6 in the BOKCV

Leviticus 6 in the BOKCV2

Leviticus 6 in the BOKHWOG

Leviticus 6 in the BOKSSV

Leviticus 6 in the BOLCB

Leviticus 6 in the BOLCB2

Leviticus 6 in the BOMCV

Leviticus 6 in the BONAV

Leviticus 6 in the BONCB

Leviticus 6 in the BONLT

Leviticus 6 in the BONUT2

Leviticus 6 in the BOPLNT

Leviticus 6 in the BOSCB

Leviticus 6 in the BOSNC

Leviticus 6 in the BOTLNT

Leviticus 6 in the BOVCB

Leviticus 6 in the BOYCB

Leviticus 6 in the BPBB

Leviticus 6 in the BPH

Leviticus 6 in the BSB

Leviticus 6 in the CCB

Leviticus 6 in the CUV

Leviticus 6 in the CUVS

Leviticus 6 in the DBT

Leviticus 6 in the DGDNT

Leviticus 6 in the DHNT

Leviticus 6 in the DNT

Leviticus 6 in the ELBE

Leviticus 6 in the EMTV

Leviticus 6 in the ESV

Leviticus 6 in the FBV

Leviticus 6 in the FEB

Leviticus 6 in the GGMNT

Leviticus 6 in the GNT

Leviticus 6 in the HARY

Leviticus 6 in the HNT

Leviticus 6 in the IRVA

Leviticus 6 in the IRVB

Leviticus 6 in the IRVG

Leviticus 6 in the IRVH

Leviticus 6 in the IRVK

Leviticus 6 in the IRVM

Leviticus 6 in the IRVM2

Leviticus 6 in the IRVO

Leviticus 6 in the IRVP

Leviticus 6 in the IRVT

Leviticus 6 in the IRVT2

Leviticus 6 in the IRVU

Leviticus 6 in the ISVN

Leviticus 6 in the JSNT

Leviticus 6 in the KAPI

Leviticus 6 in the KBT1ETNIK

Leviticus 6 in the KBV

Leviticus 6 in the KJV

Leviticus 6 in the KNFD

Leviticus 6 in the LBA

Leviticus 6 in the LBLA

Leviticus 6 in the LNT

Leviticus 6 in the LSV

Leviticus 6 in the MAAL

Leviticus 6 in the MBV

Leviticus 6 in the MBV2

Leviticus 6 in the MHNT

Leviticus 6 in the MKNFD

Leviticus 6 in the MNG

Leviticus 6 in the MNT

Leviticus 6 in the MNT2

Leviticus 6 in the MRS1T

Leviticus 6 in the NAA

Leviticus 6 in the NASB

Leviticus 6 in the NBLA

Leviticus 6 in the NBS

Leviticus 6 in the NBVTP

Leviticus 6 in the NET2

Leviticus 6 in the NIV11

Leviticus 6 in the NNT

Leviticus 6 in the NNT2

Leviticus 6 in the NNT3

Leviticus 6 in the PDDPT

Leviticus 6 in the PFNT

Leviticus 6 in the RMNT

Leviticus 6 in the SBIAS

Leviticus 6 in the SBIBS

Leviticus 6 in the SBIBS2

Leviticus 6 in the SBICS

Leviticus 6 in the SBIDS

Leviticus 6 in the SBIGS

Leviticus 6 in the SBIHS

Leviticus 6 in the SBIIS

Leviticus 6 in the SBIIS2

Leviticus 6 in the SBIIS3

Leviticus 6 in the SBIKS

Leviticus 6 in the SBIKS2

Leviticus 6 in the SBIMS

Leviticus 6 in the SBIOS

Leviticus 6 in the SBIPS

Leviticus 6 in the SBISS

Leviticus 6 in the SBITS

Leviticus 6 in the SBITS2

Leviticus 6 in the SBITS3

Leviticus 6 in the SBITS4

Leviticus 6 in the SBIUS

Leviticus 6 in the SBIVS

Leviticus 6 in the SBT

Leviticus 6 in the SBT1E

Leviticus 6 in the SCHL

Leviticus 6 in the SNT

Leviticus 6 in the SUSU

Leviticus 6 in the SUSU2

Leviticus 6 in the SYNO

Leviticus 6 in the TBIAOTANT

Leviticus 6 in the TBT1E

Leviticus 6 in the TBT1E2

Leviticus 6 in the TFTIP

Leviticus 6 in the TFTU

Leviticus 6 in the TGNTATF3T

Leviticus 6 in the THAI

Leviticus 6 in the TNFD

Leviticus 6 in the TNT

Leviticus 6 in the TNTIK

Leviticus 6 in the TNTIL

Leviticus 6 in the TNTIN

Leviticus 6 in the TNTIP

Leviticus 6 in the TNTIZ

Leviticus 6 in the TOMA

Leviticus 6 in the TTENT

Leviticus 6 in the UBG

Leviticus 6 in the UGV

Leviticus 6 in the UGV2

Leviticus 6 in the UGV3

Leviticus 6 in the VBL

Leviticus 6 in the VDCC

Leviticus 6 in the YALU

Leviticus 6 in the YAPE

Leviticus 6 in the YBVTP

Leviticus 6 in the ZBP