Leviticus 8 (BOICB)

1 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị, 2 “Kpọta Erọn na ụmụ ya ndị ikom, chịtakwa uwe ha, weta mmanụ nsọ, oke ehi nke aja mmehie na ebule abụọ ahụ, na nkata achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee. 3 Kpọkọtaa ọgbakọ ụmụ Izrel niile ka ha bịa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.” 4 Mosis mere ihe ONYENWE ANYỊ gwara ya ka o mee. Ọgbakọ ụmụ Izrel zukọtara nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. 5 Mosis gwara ọgbakọ ahụ sị, “Nke a bụ ihe ONYENWE ANYỊ nyere nʼiwu ka e mee.” 6 Mgbe ahụ, Mosis kpọpụtara Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼihu, jiri mmiri saa ha ahụ. 7 O yikwasịrị Erọn uwe ime ahụ, kee ya ihe okike a na-eke nʼukwu, yikwasịkwa ya uwe mwụda na efọọd ahụ, jiri ihe okike ahụ a chọrọ mma kegidesie efọọd ahụ ike nʼahụ ya. 8 O tụkwasịrị ya ihe igbochi obi ahụ nʼahụ, tinye Urim na Tumim nʼime ihe igbochi obi ahụ. 9 Ọ tụhịkwara akwa ike nʼisi ahụ nʼisi Erọn, tinye nʼihu akwa ike nʼisi ahụ, okpu nsọ e ji ọlaedo kpụọ, nke bụ akara ido nsọ, dịka ONYENWE ANYỊ si nye Mosis nʼiwu. 10 Mgbe ahụ, Mosis weere mmanụ nsọ ahụ tee nʼụlọ nzute ahụ, na nʼihe niile dị nʼime ya, ido ha nsọ. 11 Ọ fesakwara ụfọdụ nʼime mmanụ ahụ ugboro asaa nʼebe ịchụ aja, fesakwa ya ugboro asaa nʼelu ngwongwo niile dị nʼebe ịchụ aja, na nʼefere e ji asa ihe, na ụkwụ ya, ido ha nsọ. 12 Ọ wụsara Erọn ụfọdụ mmanụ nsọ ahụ nʼisi, tee ya mmanụ, nʼihi ido ya nsọ. 13 Ọ kpọtara ụmụ ndị ikom Erọn nso, o yikwasịrị ha uwe ime ahụ, kee ha ihe okike nke ukwu, kekwasị ha ihe okike nʼisi, dịka iwu ONYENWE ANYỊ nyere Mosis si dị. 14 Ọ kpụtara oke ehi e ji achụ aja mmehie, mee ka Erọn na ụmụ ya ndị ikom bikwasị aka ha nʼelu isi ya. 15 Mosis gburu oke ehi ahụ, were ụfọdụ nʼime ọbara ahụ, jiri mkpịsịaka ya rụta ọbara tee na mpi niile dị nʼebe ịchụ aja, ido ebe ịchụ aja ahụ nsọ. Ọ wụpụrụ ọbara nke fọdụrụ nʼụkwụ ala ala nke ebe ịchụ aja ahụ. Otu a ka o si doo ya nsọ, ikpuchiri ya mmehie. 16 Mosis wekwara abụba niile dị gburugburu ihe dị nʼime afọ ehi ahụ, mba-umeju nke umeju ya, akụrụ abụọ ya na abụba dị nʼelu ha, kpọọ ya ọkụ nʼebe ịchụ aja. 17 Ma oke ehi ahụ, akpụkpọ ya, anụ ya na mgbịrị afọ ya, ka ọ kpọrọ ọkụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu ahụ dịka ONYENWE ANYỊ nyere Mosis nʼiwu. 18 O weere ebule ahụ, chee nʼihu ONYENWE ANYỊ, dịka aja nsure ọkụ. Erọn na ụmụ ya ndị ikom bikwasịrị aka ha nʼelu isi ya. 19 Mgbe ahụ, Mosis gburu ebule ahụ, fesa ọbara ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja. 20 Ọ bọwasịrị ebule ahụ ntakịrị ntakịrị, kpọọ isi ya, iberibe anụ ya na abụba ya ọkụ. 21 Ọ sachara ihe dị nʼime afọ ya na ụkwụ ya niile mmiri, kpọọ ebule ahụ niile ọkụ nʼebe ịchụ aja. Nʼihi na ọ bụ aja nsure ọkụ nke isisi ya dị ONYENWE ANYỊ ezi mma, nʼihi na ọ bụ dịka ONYENWE ANYỊ nyere Mosis nʼiwu. 22 O kpụpụtara ebule nke ọzọ, bụ ebule nke ido nsọ, Erọn na ụmụ ya ndị ikom bikwasịrị aka ha nʼelu isi ya. 23 Mgbe ahụ, Mosis gburu ya, were ụfọdụ nʼime ọbara ya tee Erọn nʼọnụ ntị aka nri, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ya. 24 Mosis kpọtara ụmụ ndị ikom Erọn nso, weere ụfọdụ ọbara ahụ tee nʼọnụ ntị aka nri ha, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ha, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ha. O fesakwara ọbara nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja ahụ. 25 O weere abụba ya, akụkụ ọdụdụ ya nwere abụba, na abụba niile nke kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya, na mba-umeju nke dị nʼumeju ya, akụrụ ya abụọ na abụba ha, na apata aka nri ya 26 O sitere na nkata achịcha ahụ a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, nke dị nʼihu ONYENWE ANYỊ, wepụta otu ogbe achịcha, na otu ogbe achịcha a gwakọtara mmanụ oliv, na otu mbadamba ogbe achịcha, tụkwasị ha nʼelu abụba ndị ahụ, na nʼelu apata aka nri ahụ. 27 O tinyere ihe ndị a niile nʼaka Erọn na ụmụ ya ndị ikom, ha fufere ha nʼihu ONYENWE ANYỊ dịka aja mfufe. 28 Mosis naara ya site nʼaka ha, kpọọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja, ya na aja nsure ọkụ, ka ọ bụrụ aja ido nsọ nke isisi ya dị ezi mma, onyinye nsure ọkụ nye ONYENWE ANYỊ. 29 Mosis werekwara obi ebule ido nsọ ahụ, fufee ya nʼihu ONYENWE ANYỊ, dịka aja mfufe, dịka ONYENWE ANYỊ nyere nʼiwu. Nke a bụ oke Mosis. 30 Mgbe ahụ, Mosis weere ụfọdụ nʼime mmanụ nsọ ahụ, na ụfọdụ nʼime ọbara ahụ dị nʼebe ịchụ aja fesa ya Erọn na uwe ya, fesakwa ya ụmụ ndị ikom Erọn nʼuwe ha. Otu a ka o si doo Erọn na uwe ya, na ụmụ ya ndị ikom na uwe ha nsọ. 31 Mgbe ahụ, Mosis gwara Erọn na ụmụ ya ndị ikom sị, “Sienụ anụ ahụ nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Nọrọkwanụ nʼebe ahụ rie ya na achịcha ahụ dị nʼime nkata onyinye ido nsọ, dịka a gwara m, sị, ‘Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eri ya.’ 32 Ihe ọbụla fọdụrụ na anụ ahụ na achịcha ahụ, ka unu ga-akpọ ọkụ.” 33 Ọ sịrị ha: “Unu esikwala nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute a pụọ ruo ụbọchị asaa, tutu ruo mgbe ụbọchị ido nsọ unu zuruoke, nʼihi na ido nsọ unu ga-anọ ụbọchị asaa. 34 Ihe niile e mere nʼụbọchị taa bụ ihe ONYENWE ANYỊ nyere nʼiwu, banyere ịchụ aja maka mkpuchi mmehie unu.” 35 Unu aghaghị ịnọgide nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ehihie na abalị ụbọchị asaa, mezuokwa ihe ONYENWE ANYỊ nyere nʼiwu, ka unu ghara ịnwụ. Nʼihi na nke a bụ iwu e nyere m. 36 Ya mere, Erọn na ụmụ ya ndị ikom mezuru ihe niile dịka ONYENWE ANYỊ si nye nʼiwu site nʼọnụ Mosis.

In Other Versions

Leviticus 8 in the ANGEFD

Leviticus 8 in the ANTPNG2D

Leviticus 8 in the AS21

Leviticus 8 in the BAGH

Leviticus 8 in the BBPNG

Leviticus 8 in the BBT1E

Leviticus 8 in the BDS

Leviticus 8 in the BEV

Leviticus 8 in the BHAD

Leviticus 8 in the BIB

Leviticus 8 in the BLPT

Leviticus 8 in the BNT

Leviticus 8 in the BNTABOOT

Leviticus 8 in the BNTLV

Leviticus 8 in the BOATCB

Leviticus 8 in the BOATCB2

Leviticus 8 in the BOBCV

Leviticus 8 in the BOCNT

Leviticus 8 in the BOECS

Leviticus 8 in the BOGWICC

Leviticus 8 in the BOHCB

Leviticus 8 in the BOHCV

Leviticus 8 in the BOHLNT

Leviticus 8 in the BOHNTLTAL

Leviticus 8 in the BOILNTAP

Leviticus 8 in the BOITCV

Leviticus 8 in the BOKCV

Leviticus 8 in the BOKCV2

Leviticus 8 in the BOKHWOG

Leviticus 8 in the BOKSSV

Leviticus 8 in the BOLCB

Leviticus 8 in the BOLCB2

Leviticus 8 in the BOMCV

Leviticus 8 in the BONAV

Leviticus 8 in the BONCB

Leviticus 8 in the BONLT

Leviticus 8 in the BONUT2

Leviticus 8 in the BOPLNT

Leviticus 8 in the BOSCB

Leviticus 8 in the BOSNC

Leviticus 8 in the BOTLNT

Leviticus 8 in the BOVCB

Leviticus 8 in the BOYCB

Leviticus 8 in the BPBB

Leviticus 8 in the BPH

Leviticus 8 in the BSB

Leviticus 8 in the CCB

Leviticus 8 in the CUV

Leviticus 8 in the CUVS

Leviticus 8 in the DBT

Leviticus 8 in the DGDNT

Leviticus 8 in the DHNT

Leviticus 8 in the DNT

Leviticus 8 in the ELBE

Leviticus 8 in the EMTV

Leviticus 8 in the ESV

Leviticus 8 in the FBV

Leviticus 8 in the FEB

Leviticus 8 in the GGMNT

Leviticus 8 in the GNT

Leviticus 8 in the HARY

Leviticus 8 in the HNT

Leviticus 8 in the IRVA

Leviticus 8 in the IRVB

Leviticus 8 in the IRVG

Leviticus 8 in the IRVH

Leviticus 8 in the IRVK

Leviticus 8 in the IRVM

Leviticus 8 in the IRVM2

Leviticus 8 in the IRVO

Leviticus 8 in the IRVP

Leviticus 8 in the IRVT

Leviticus 8 in the IRVT2

Leviticus 8 in the IRVU

Leviticus 8 in the ISVN

Leviticus 8 in the JSNT

Leviticus 8 in the KAPI

Leviticus 8 in the KBT1ETNIK

Leviticus 8 in the KBV

Leviticus 8 in the KJV

Leviticus 8 in the KNFD

Leviticus 8 in the LBA

Leviticus 8 in the LBLA

Leviticus 8 in the LNT

Leviticus 8 in the LSV

Leviticus 8 in the MAAL

Leviticus 8 in the MBV

Leviticus 8 in the MBV2

Leviticus 8 in the MHNT

Leviticus 8 in the MKNFD

Leviticus 8 in the MNG

Leviticus 8 in the MNT

Leviticus 8 in the MNT2

Leviticus 8 in the MRS1T

Leviticus 8 in the NAA

Leviticus 8 in the NASB

Leviticus 8 in the NBLA

Leviticus 8 in the NBS

Leviticus 8 in the NBVTP

Leviticus 8 in the NET2

Leviticus 8 in the NIV11

Leviticus 8 in the NNT

Leviticus 8 in the NNT2

Leviticus 8 in the NNT3

Leviticus 8 in the PDDPT

Leviticus 8 in the PFNT

Leviticus 8 in the RMNT

Leviticus 8 in the SBIAS

Leviticus 8 in the SBIBS

Leviticus 8 in the SBIBS2

Leviticus 8 in the SBICS

Leviticus 8 in the SBIDS

Leviticus 8 in the SBIGS

Leviticus 8 in the SBIHS

Leviticus 8 in the SBIIS

Leviticus 8 in the SBIIS2

Leviticus 8 in the SBIIS3

Leviticus 8 in the SBIKS

Leviticus 8 in the SBIKS2

Leviticus 8 in the SBIMS

Leviticus 8 in the SBIOS

Leviticus 8 in the SBIPS

Leviticus 8 in the SBISS

Leviticus 8 in the SBITS

Leviticus 8 in the SBITS2

Leviticus 8 in the SBITS3

Leviticus 8 in the SBITS4

Leviticus 8 in the SBIUS

Leviticus 8 in the SBIVS

Leviticus 8 in the SBT

Leviticus 8 in the SBT1E

Leviticus 8 in the SCHL

Leviticus 8 in the SNT

Leviticus 8 in the SUSU

Leviticus 8 in the SUSU2

Leviticus 8 in the SYNO

Leviticus 8 in the TBIAOTANT

Leviticus 8 in the TBT1E

Leviticus 8 in the TBT1E2

Leviticus 8 in the TFTIP

Leviticus 8 in the TFTU

Leviticus 8 in the TGNTATF3T

Leviticus 8 in the THAI

Leviticus 8 in the TNFD

Leviticus 8 in the TNT

Leviticus 8 in the TNTIK

Leviticus 8 in the TNTIL

Leviticus 8 in the TNTIN

Leviticus 8 in the TNTIP

Leviticus 8 in the TNTIZ

Leviticus 8 in the TOMA

Leviticus 8 in the TTENT

Leviticus 8 in the UBG

Leviticus 8 in the UGV

Leviticus 8 in the UGV2

Leviticus 8 in the UGV3

Leviticus 8 in the VBL

Leviticus 8 in the VDCC

Leviticus 8 in the YALU

Leviticus 8 in the YAPE

Leviticus 8 in the YBVTP

Leviticus 8 in the ZBP