Luke 13 (BOICB)

1 Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị nọ nʼebe ahụ gwara ya banyere ndị Galili ahụ Pailet jiri ọbara ha gwakọta nʼaja ha chụrụ. 2 Ọ zara sị ha, “Unu chere na ndị Galili a tara ụdị ahụhụ a bụ ndị mmehie karịa ndị Galili niile? 3 Mba! Asị m unu, ọ bụrụ na unu echegharịghị, unu niile ga-esi otu ahụ laa nʼiyi. 4 Ka unu chere na mmadụ iri na asatọ ahụ, ndị mgbidi aja ụlọ elu Sailọm dagburu bụ ndị ikpe mmehie mara karịa ndị niile bi na Jerusalem? 5 Mba! Asị m unu, ọ bụrụ na unu echegharịghị, unu niile ga-ala nʼiyi dị ka ha.” 6 Ya mere, ọ tụụrụ ha ilu a sị, “Otu nwoke kụrụ osisi fiig nʼubi vaịnị ya, ma mgbe ọ bịara chọọ nʼelu ya, ma ọ hụghị mkpụrụ ọbụla. 7 Ya mere, ọ gwara onye ọrụ ubi ya sị, ‘Nʼime afọ atọ ndị a ka m bịara ka m ghọrọ mkpụrụ site nʼosisi fiig a, ma ahụghị m mkpụrụ ọbụla. Gbutuo ya! Gịnị mere ọ ga-eji na-erikọ nri dị nʼala ubi a?’ 8 “Ọ zara sị ya, ‘Nna m ukwu, hapụkwa ya nʼafọ a, ka m gwuo ala gburugburu, hinye ya aja nri ala nʼukwu. 9 Ọ bụrụ na ọ mịa mkpụrụ nʼafọ ọzọ, ọ dị mma, ọ bụrụkwa na ọ mịghị, i nwere ike gbutuo ya. ’ ” 10 Nʼụbọchị izuike ndị Juu, ọ banyere nʼime otu ụlọ ekpere na-ezi ihe. 11 Otu nwanyị nọkwa nʼebe ahụ, onye mmụọ nrịa nrịa mere ka ahụ ghara ị dị ya ike afọ iri na asatọ. Ọ na-ehu ehu, o nwekwaghị ike iguzo ọtọ kwem. 12 Mgbe Jisọs hụrụ ya, ọ kpọrọ ya sị ya, “Nwanyị emeela ka i nwere onwe gị site nʼọrịa gị.” 13 Mgbe o bikwasịrị ya aka, ngwangwa, o guzooro kwem malite na-eto Chineke. 14 Ma onyendu ụlọ ekpere ahụ were iwe nke ukwuu nʼihi na Jisọs gwọrọ ọrịa nʼụbọchị izuike. Ọ gwara igwe mmadụ ahụ okwu sị, “E nwere ụbọchị isii nʼime izu ụka mgbe mmadụ kwesiri ịrụ ọrụ. Ya mere, bịanụ ka a gwọọ unu nʼụbọchị ndị a, ọ bụghị nʼụbọchị izuike.” 15 Ma Onyenwe anyị zara ya sị, “Unu ndị ihu abụọ! Ọ dị onye nʼime unu na-adịghị atọpụ oke ehi ya maọbụ ịnyịnya ibu ya, site nʼụlọ anụmanụ, kpụpụ ya ebe ọ ga-aṅụ mmiri nʼụbọchị izuike? 16 O kwesighị ka a tọpụ nwanyị a bụ ada Ebraham nʼagbụ ekwensu kere ya ogologo afọ iri na asatọ, nʼụbọchị izuike, mee ka o nwere onwe ya?” 17 Mgbe o kwuru nke a, ihere mere ndị iro ya niile, ma ndị mmadụ nọ nʼebe ahụ ṅụrịrị ọṅụ nʼihi ọrụ ebube niile ọ na-arụ. 18 Ya mere, ọ na-ekwu sị, “Gịnị ka alaeze Chineke yiri? Gịnịkwa ka m ga-eji tụnyere ya? 19 O yiri mkpụrụ mọstaadị nke mmadụ kụrụ nʼubi ya a gbara ogige. O toro ghọọ osisi, nke ụmụ nnụnụ na-ezukwa ike nʼalaka ya.” 20 Ọzọ, ọ sịrị, “Gịnị ka m ga-eji tụnyere alaeze Chineke? 21 Ọ dị ka ihe na-eko achịcha nke nwanyị gwakọtara na ọtụtụ atọ nke ụtụ ọka, tutu ruo mgbe o koro ụtụ ọka ahụ niile.” 22 O jegharịrị nʼobodo ukwu na nʼobodo nta niile na-ezi ihe, ka ọ na-aga Jerusalem. 23 Otu onye sịrị ya, “Onyenwe m, ndị a ga-azọpụta ha ga-adị ole na ole?”Ọ sịrị ha, 24 “Gbalịsienụ ike banye site nʼọnụ ụzọ dị warawara, nʼihi na ana m a gwa unu na ọtụtụ ga-achọ ịbanye ma ha agaghị enwe ike. 25 Ọ bụrụ na nna nwe ụlọ ebilie mechie ọnụ ụzọ, unu ga-eguzo na-ezi na-akụ aka nʼụzọ na-asị, ‘Onyenwe anyị meghere anyị ụzọ.’ “Na nzaghachi, ọ ga-asị, ‘Amaghị m ebe unu si bịa.’ 26 “Nʼoge ahụ, unu ga-asị, ‘Anyị na gị rikọrọ, ṅụkọkwaa, ị kuzikwara nkuzi nʼogbe anyị.’ 27 “Ma ọ ga-asị, ‘Amaghị m ebe unu siri bịa. Pụọnụ nʼihu m, unu ndị ajọ omume.’ 28 “Ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adịkwa mgbe unu ga-ahụ Ebraham, na Aịzik na Jekọb na ndị amụma niile ka ha nọ nʼalaeze Chineke; ma unu onwe unu abụrụ ndị a chụpụrụ nʼezi. 29 Ndị mmadụ ga-esite nʼọwụwa anyanwụ, nakwa ọdịda anyanwụ, na nʼugwu na ndịda nke ụwa bịa nọdụ nʼoriri nʼime alaeze Chineke. 30 Ma lee, ndị bu ụzọ ga-aghọ ndị ikpeazụ, ma ndị ikpeazụ ga-aghọ ndị bu ụzọ.” 31 Nʼoge awa ahụ, ụfọdụ ndị Farisii bịakwutere ya sị ya, “Si nʼebe a pụọ, nʼihi na Herọd na-achọ igbu gị.” 32 Ọ sịrị ha, “Gaa gwaranụ m nkịta ọhịa ahụ, lee, ana m achụpụ mmụọ ọjọọ, gwọọkwa ndị ọrịa taa na echi, ma nʼụbọchị nke atọ ka m ga-arụcha ọrụ m. 33 Ma otu ọ dị, aga m aga nʼihu nʼụzọ m taa, na echi na nwanne echi, nʼihi na nʼezie, ọ dịghị onye amụma ga-anwụ nʼebe ọzọ na-abụghị na Jerusalem. 34 “O Jerusalem! Jerusalem! Gị onye na-egbu ndị amụma ma na-ejikwa nkume atụgbu ndị e ziteere gị. Ọtụtụ mgbe ka m gbalịrị ịchịkọta ụmụ gị dị ka nne ọkụkụ sị achịkọta ụmụ ya nʼokpuru nku ya, ma unu ekweghị. 35 Lee, a hapụrụla unu ụlọ unu. Ma agwa m unu, unu agaghị ahụ m anya ọzọ ruo mgbe oge ahụ ga-abịa, mgbe unu ga-asị, ‘Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị.’ ”

In Other Versions

Luke 13 in the ANGEFD

Luke 13 in the ANTPNG2D

Luke 13 in the AS21

Luke 13 in the BAGH

Luke 13 in the BBPNG

Luke 13 in the BBT1E

Luke 13 in the BDS

Luke 13 in the BEV

Luke 13 in the BHAD

Luke 13 in the BIB

Luke 13 in the BLPT

Luke 13 in the BNT

Luke 13 in the BNTABOOT

Luke 13 in the BNTLV

Luke 13 in the BOATCB

Luke 13 in the BOATCB2

Luke 13 in the BOBCV

Luke 13 in the BOCNT

Luke 13 in the BOECS

Luke 13 in the BOGWICC

Luke 13 in the BOHCB

Luke 13 in the BOHCV

Luke 13 in the BOHLNT

Luke 13 in the BOHNTLTAL

Luke 13 in the BOILNTAP

Luke 13 in the BOITCV

Luke 13 in the BOKCV

Luke 13 in the BOKCV2

Luke 13 in the BOKHWOG

Luke 13 in the BOKSSV

Luke 13 in the BOLCB

Luke 13 in the BOLCB2

Luke 13 in the BOMCV

Luke 13 in the BONAV

Luke 13 in the BONCB

Luke 13 in the BONLT

Luke 13 in the BONUT2

Luke 13 in the BOPLNT

Luke 13 in the BOSCB

Luke 13 in the BOSNC

Luke 13 in the BOTLNT

Luke 13 in the BOVCB

Luke 13 in the BOYCB

Luke 13 in the BPBB

Luke 13 in the BPH

Luke 13 in the BSB

Luke 13 in the CCB

Luke 13 in the CUV

Luke 13 in the CUVS

Luke 13 in the DBT

Luke 13 in the DGDNT

Luke 13 in the DHNT

Luke 13 in the DNT

Luke 13 in the ELBE

Luke 13 in the EMTV

Luke 13 in the ESV

Luke 13 in the FBV

Luke 13 in the FEB

Luke 13 in the GGMNT

Luke 13 in the GNT

Luke 13 in the HARY

Luke 13 in the HNT

Luke 13 in the IRVA

Luke 13 in the IRVB

Luke 13 in the IRVG

Luke 13 in the IRVH

Luke 13 in the IRVK

Luke 13 in the IRVM

Luke 13 in the IRVM2

Luke 13 in the IRVO

Luke 13 in the IRVP

Luke 13 in the IRVT

Luke 13 in the IRVT2

Luke 13 in the IRVU

Luke 13 in the ISVN

Luke 13 in the JSNT

Luke 13 in the KAPI

Luke 13 in the KBT1ETNIK

Luke 13 in the KBV

Luke 13 in the KJV

Luke 13 in the KNFD

Luke 13 in the LBA

Luke 13 in the LBLA

Luke 13 in the LNT

Luke 13 in the LSV

Luke 13 in the MAAL

Luke 13 in the MBV

Luke 13 in the MBV2

Luke 13 in the MHNT

Luke 13 in the MKNFD

Luke 13 in the MNG

Luke 13 in the MNT

Luke 13 in the MNT2

Luke 13 in the MRS1T

Luke 13 in the NAA

Luke 13 in the NASB

Luke 13 in the NBLA

Luke 13 in the NBS

Luke 13 in the NBVTP

Luke 13 in the NET2

Luke 13 in the NIV11

Luke 13 in the NNT

Luke 13 in the NNT2

Luke 13 in the NNT3

Luke 13 in the PDDPT

Luke 13 in the PFNT

Luke 13 in the RMNT

Luke 13 in the SBIAS

Luke 13 in the SBIBS

Luke 13 in the SBIBS2

Luke 13 in the SBICS

Luke 13 in the SBIDS

Luke 13 in the SBIGS

Luke 13 in the SBIHS

Luke 13 in the SBIIS

Luke 13 in the SBIIS2

Luke 13 in the SBIIS3

Luke 13 in the SBIKS

Luke 13 in the SBIKS2

Luke 13 in the SBIMS

Luke 13 in the SBIOS

Luke 13 in the SBIPS

Luke 13 in the SBISS

Luke 13 in the SBITS

Luke 13 in the SBITS2

Luke 13 in the SBITS3

Luke 13 in the SBITS4

Luke 13 in the SBIUS

Luke 13 in the SBIVS

Luke 13 in the SBT

Luke 13 in the SBT1E

Luke 13 in the SCHL

Luke 13 in the SNT

Luke 13 in the SUSU

Luke 13 in the SUSU2

Luke 13 in the SYNO

Luke 13 in the TBIAOTANT

Luke 13 in the TBT1E

Luke 13 in the TBT1E2

Luke 13 in the TFTIP

Luke 13 in the TFTU

Luke 13 in the TGNTATF3T

Luke 13 in the THAI

Luke 13 in the TNFD

Luke 13 in the TNT

Luke 13 in the TNTIK

Luke 13 in the TNTIL

Luke 13 in the TNTIN

Luke 13 in the TNTIP

Luke 13 in the TNTIZ

Luke 13 in the TOMA

Luke 13 in the TTENT

Luke 13 in the UBG

Luke 13 in the UGV

Luke 13 in the UGV2

Luke 13 in the UGV3

Luke 13 in the VBL

Luke 13 in the VDCC

Luke 13 in the YALU

Luke 13 in the YAPE

Luke 13 in the YBVTP

Luke 13 in the ZBP