Malachi 1 (BOICB)
1 Okwu amụma: Nke a bụ okwu ONYENWE ANYỊ gwara Izrel site nʼọnụ Malakaị onye amụma. 2 “Ahụla m unu nʼanya,” ka ONYENWE ANYỊ na-ekwu.“Ma unu na-asị, ‘Olee ụzọ i si hụ anyị nʼanya?’“Ịsọ, ọ bụghị nwanne Jekọb?” ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. “Ma otu ọ dị, ahụrụ m Jekọb nʼanya, 3 ma Ịsọ ka m kpọrọ asị, mee ugwu ya niile ka ha ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu, werekwa ihe nketa ya nye nkịta ọhịa niile nke ọzara.” 4 Ndị Edọm nwere ike sị, “Ọ bụ ezie na e tikpọọla anyị, ma anyị ga-ewugharị nkpọnkpọ ebe niile.”Ma otu a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu, “Ha nwere ike wugharịa ya, ma aga m akwadakwa ha ọzọ. Nʼihi na a ga-akpọ ha Obodo ihe ọjọọ, ndị ONYENWE ANYỊ na-eweso iwe ruo mgbe ebighị ebi. 5 Anya unu ga-ahụ nke a ma unu ga-ekwukwa, ‘ONYENWE ANYỊ dị ukwuu, ọ bụladị ruo nʼofe oke ala Izrel!’ ” 6 “Nwa na-asọpụrụ nna ya, ohu na asọpụrụkwa onyenwe ya. A sị na m bụ nna, ebee ka egwu m dị. A sị na m bụ onyenwe mmadụ, ebee ka nsọpụrụ m dị?” Ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.“Ọ bụ unu ndị nchụaja na-eleda aha m anya.“Ma unu na-ajụ, ‘Olee ụzọ anyị si eleda aha gị anya?’ 7 “Unu na-eji anụ rụrụ arụ na-achụrụ m aja nʼelu ebe ịchụ aja m.“Ma unu na-ajụ, ‘Olee ụzọ anyị si merụọ ya?’“Ọ bụ mgbe unu na-asị na tebul ONYENWE ANYỊ bụ ihe e kwesiri ileda anya. 8 Mgbe unu ji anụ ndị kpuru ìsì achụrụ m aja, ọ bụghị ihe na-ezighị ezi ka unu na-eme? Mgbe unu na-ejikwa ndị dara ngwụrọ, na anụ na-arịa ọrịa, ọ bụghị ihe ọjọọ ka unu na-eme? Werenụ anụ ndị a bugara onye na-achị obodo unu dịka onyinye. Ọ ga-atọ ya ụtọ ịnabata onyinye dị otu a? Ọ ga-anabata unu?” Ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. 9 “Ma ugbu a, rịọọnụ Chineke ka o gosi anyị amara ya. Ọ bụrụ na unu ji onyinye ndị dị otu a nʼaka unu, ọ ga-egosi unu afọ ọma ya?” Ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. 10 “Ọ gaara adị m nnọọ mma ma a sị na otu onye nʼime unu ga-emechi ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu ahụ, ka unu gharakwa ịkwanye ọkụ na-enweghị isi nʼelu ebe ịchụ aja m. Ihe banyere unu adịghị atọ m ụtọ. Ọ bụ ihe ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. Agaghị m anabatakwa onyinye ọbụla si unu nʼaka. 11 Nʼihi na site nʼọwụwa anyanwụ ruo ọdịda ya, aha m ga-adị ukwuu nʼetiti mba niile. A ga-ewebatara m ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na onyinye dị ọcha nʼaha m, nʼebe niile, nʼihi na aha m ga-adị ukwuu nʼetiti mba niile.” Ọ bụ ihe ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. 12 “Ma unu na-eme ka ọ ghara ịdị nsọ mgbe unu na-asị na, Tebul Onyenwe anyị bụ ihe e merụrụ emerụ, ebe ihe oriri ya bụkwa ihe nlelị. 13 Unu na-ekwukwa, ‘Nke a bụ ihe ike ọgwụgwụ,’ si otu a na-eduli imi unu elu nʼebe m nọ nʼọnọdụ oke nlelị.” Ọ bụ ihe ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.“Mgbe unu na-ewebata ihe a natara nʼike, na nke dara ngwụrọ, na nke na-arịa ọrịa, jiri ha chụọrọ m aja, o kwesiri ka m nabata ya?” Ka ONYENWE ANYỊ na-ekwu. 14 “Onye a na-abụ ọnụ ka onye aghụghọ ahụ bụ nke nwere oke nʼigwe ewu na atụrụ ya, kwee nkwa inye ya, ma mesịa were anụ nwere ntụpọ chụọrọ Onyenwe anyị aja. Nʼihi na mụ onwe m bụ Eze ukwu ahụ,” ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “aha m bụkwa ihe a ga-atụ egwu nʼetiti mba dị iche iche.
In Other Versions
Malachi 1 in the ANGEFD
Malachi 1 in the ANTPNG2D
Malachi 1 in the AS21
Malachi 1 in the BAGH
Malachi 1 in the BBPNG
Malachi 1 in the BBT1E
Malachi 1 in the BDS
Malachi 1 in the BEV
Malachi 1 in the BHAD
Malachi 1 in the BIB
Malachi 1 in the BLPT
Malachi 1 in the BNT
Malachi 1 in the BNTABOOT
Malachi 1 in the BNTLV
Malachi 1 in the BOATCB
Malachi 1 in the BOATCB2
Malachi 1 in the BOBCV
Malachi 1 in the BOCNT
Malachi 1 in the BOECS
Malachi 1 in the BOGWICC
Malachi 1 in the BOHCB
Malachi 1 in the BOHCV
Malachi 1 in the BOHLNT
Malachi 1 in the BOHNTLTAL
Malachi 1 in the BOILNTAP
Malachi 1 in the BOITCV
Malachi 1 in the BOKCV
Malachi 1 in the BOKCV2
Malachi 1 in the BOKHWOG
Malachi 1 in the BOKSSV
Malachi 1 in the BOLCB
Malachi 1 in the BOLCB2
Malachi 1 in the BOMCV
Malachi 1 in the BONAV
Malachi 1 in the BONCB
Malachi 1 in the BONLT
Malachi 1 in the BONUT2
Malachi 1 in the BOPLNT
Malachi 1 in the BOSCB
Malachi 1 in the BOSNC
Malachi 1 in the BOTLNT
Malachi 1 in the BOVCB
Malachi 1 in the BOYCB
Malachi 1 in the BPBB
Malachi 1 in the BPH
Malachi 1 in the BSB
Malachi 1 in the CCB
Malachi 1 in the CUV
Malachi 1 in the CUVS
Malachi 1 in the DBT
Malachi 1 in the DGDNT
Malachi 1 in the DHNT
Malachi 1 in the DNT
Malachi 1 in the ELBE
Malachi 1 in the EMTV
Malachi 1 in the ESV
Malachi 1 in the FBV
Malachi 1 in the FEB
Malachi 1 in the GGMNT
Malachi 1 in the GNT
Malachi 1 in the HARY
Malachi 1 in the HNT
Malachi 1 in the IRVA
Malachi 1 in the IRVB
Malachi 1 in the IRVG
Malachi 1 in the IRVH
Malachi 1 in the IRVK
Malachi 1 in the IRVM
Malachi 1 in the IRVM2
Malachi 1 in the IRVO
Malachi 1 in the IRVP
Malachi 1 in the IRVT
Malachi 1 in the IRVT2
Malachi 1 in the IRVU
Malachi 1 in the ISVN
Malachi 1 in the JSNT
Malachi 1 in the KAPI
Malachi 1 in the KBT1ETNIK
Malachi 1 in the KBV
Malachi 1 in the KJV
Malachi 1 in the KNFD
Malachi 1 in the LBA
Malachi 1 in the LBLA
Malachi 1 in the LNT
Malachi 1 in the LSV
Malachi 1 in the MAAL
Malachi 1 in the MBV
Malachi 1 in the MBV2
Malachi 1 in the MHNT
Malachi 1 in the MKNFD
Malachi 1 in the MNG
Malachi 1 in the MNT
Malachi 1 in the MNT2
Malachi 1 in the MRS1T
Malachi 1 in the NAA
Malachi 1 in the NASB
Malachi 1 in the NBLA
Malachi 1 in the NBS
Malachi 1 in the NBVTP
Malachi 1 in the NET2
Malachi 1 in the NIV11
Malachi 1 in the NNT
Malachi 1 in the NNT2
Malachi 1 in the NNT3
Malachi 1 in the PDDPT
Malachi 1 in the PFNT
Malachi 1 in the RMNT
Malachi 1 in the SBIAS
Malachi 1 in the SBIBS
Malachi 1 in the SBIBS2
Malachi 1 in the SBICS
Malachi 1 in the SBIDS
Malachi 1 in the SBIGS
Malachi 1 in the SBIHS
Malachi 1 in the SBIIS
Malachi 1 in the SBIIS2
Malachi 1 in the SBIIS3
Malachi 1 in the SBIKS
Malachi 1 in the SBIKS2
Malachi 1 in the SBIMS
Malachi 1 in the SBIOS
Malachi 1 in the SBIPS
Malachi 1 in the SBISS
Malachi 1 in the SBITS
Malachi 1 in the SBITS2
Malachi 1 in the SBITS3
Malachi 1 in the SBITS4
Malachi 1 in the SBIUS
Malachi 1 in the SBIVS
Malachi 1 in the SBT
Malachi 1 in the SBT1E
Malachi 1 in the SCHL
Malachi 1 in the SNT
Malachi 1 in the SUSU
Malachi 1 in the SUSU2
Malachi 1 in the SYNO
Malachi 1 in the TBIAOTANT
Malachi 1 in the TBT1E
Malachi 1 in the TBT1E2
Malachi 1 in the TFTIP
Malachi 1 in the TFTU
Malachi 1 in the TGNTATF3T
Malachi 1 in the THAI
Malachi 1 in the TNFD
Malachi 1 in the TNT
Malachi 1 in the TNTIK
Malachi 1 in the TNTIL
Malachi 1 in the TNTIN
Malachi 1 in the TNTIP
Malachi 1 in the TNTIZ
Malachi 1 in the TOMA
Malachi 1 in the TTENT
Malachi 1 in the UBG
Malachi 1 in the UGV
Malachi 1 in the UGV2
Malachi 1 in the UGV3
Malachi 1 in the VBL
Malachi 1 in the VDCC
Malachi 1 in the YALU
Malachi 1 in the YAPE
Malachi 1 in the YBVTP
Malachi 1 in the ZBP