Matthew 17 (BOICB)

1 Mgbe ụbọchị isii gasịrị, Jisọs kpọọrọ Pita, na Jemis na Jọn nwanne ya, rigoro nʼugwu dị elu ebe naanị ha nọdụrụ. 2 Nʼebe ahụ a gbanwere ọdịdị ya nʼihu ha, ihu ya na-enwupụ dị ka anyanwụ, uwe ya chapụkwara dị ka ìhè. 3 Nʼotu ntabi anya ahụ, ha hụrụ Mosis na Ịlaịja ka ha na ya na-ekwurịta okwu. 4 Mgbe ahụ Pita sịrị Jisọs, “Onyenwe anyị. Ọ dị mma ka anyị niile nọdụ nʼebe a. Ọ bụrụ na ị ga-enye m ike, aga m ewu ụlọ ikwu atọ nʼebe a. Otu nʼime ụlọ ndị a ga-abụ nke gị, otu nke Mosis, nke ọzọ nke Ịlaịja.” 5 Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, igwe ojii nke na-enwu enwu kpuchiri ha, olu sitere nʼigwe ojii ahụ daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, onye ihe ya dị m ezi mma. Geenụ ya ntị.” 6 Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ olu a, ha dara nʼala nʼihi egwu. 7 Ma Jisọs jekwuuru ha metụ ha aka sị ha, “Bilienụ, unu atụla egwu.” 8 Mgbe ha lelitere anya ha, o nwekwaghị onye ọzọ ha hụrụ ma ọ bụghị naanị Jisọs. 9 Ma mgbe ha si nʼelu ugwu ahụ na-arịdata, Jisọs nyere ha iwu, sị, “Unu agwala onye ọbụla ihe unu hụrụ tutu ruo mgbe Nwa nke Mmadụ ga-esi nʼọnwụ bilie.” 10 Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị ozizi iwu ji na-ekwu na Ịlaịja aghaghị ibu ụzọ bịa?” 11 Ọ zara sị, “Ọ bụ ezie, Ịlaịja na-abịa, ọ ga-emekwa ka ihe niile dị ka ọ dị na mbụ. 12 Ma Ịlaịja abịalarị, ma ndị mmadụ amataghị ya. Kama ndị mmadụ emeela ya ihe ọjọọ dị iche iche. Otu a kwa ka mụ onwe m bụ Nwa nke Mmadụ ga-esi ahụ ahụhụ site nʼaka ha.” 13 Mgbe ahụ ndị na-eso ụzọ ya ghọtara na ọ bụ Jọn omee baptizim ka ọ na-ekwu banyere ya. 14 Mgbe ha bịarutere nʼebe igwe mmadụ ahụ nọ, otu nwoke bịakwutere ya gbuo ikpere nʼihu ya, 15 rịọọ ya sị, “Onyenwe m, biko, meere nwa m nwoke ebere, nʼihi na akwụkwụ na-adọ ya. Ọ na-ata oke ahụhụ, ọtụtụ mgbe ọ na-adaba nʼime ọkụ maọbụ nʼime mmiri. 16 Ma ekuteere m ya ndị na-eso ụzọ gị ka ha gwọọ ya, ma ha enweghị ike ime ka ahụ dị ya mma.” 17 Jisọs zara sị, “Unu ọgbọ a na-enweghị okwukwe, ndị na-adịghị erubekwa isi. Ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ? Ruo ole mgbe ka m ga-anọ na-anagide ekweghị ekwe unu? Kpọtaranụ m nwata ahụ nʼebe a.” 18 Jisọs baara mmụọ ọjọọ ahụ mba, mee ka o si nʼime nwata ahụ pụta. Otu mgbe ahụ, mmụọ ọjọọ ahụ pụtara, nwata ahụ bụ onye agwọkwara nʼotu oge ahụ. 19 Mgbe e mesịrị, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya na nzuzo jụọ ya sị, “Gịnị mere o ji siere anyị ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ ahụ?” 20 Ọ sịrị ha, “Ọ bụ nʼihi na okwukwe unu nwere esighị ike. Nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na unu e nwee okwukwe nke dị nta ka mkpụrụ mọstaadị, unu nwere ike ị sị ugwu a, ‘Site nʼebe a wezuga onwe gị,’ ọ ga-apụtakwa. Ọ dịghị ihe unu na-agaghị enwe ike ime. 21 Ma mmụọ ọjọọ dị otu a agaghị apụ, ma ọ bụghị naanị site nʼikpe ekpere na ibu ọnụ.” 22 Mgbe ha gbakọrọ na Galili, Jisọs gwara ha sị, “A ga-arara Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ndị mmadụ. 23 Ha ga-egbukwa ya, ma nʼụbọchị nke atọ a ga-eme ka o si nʼọnwụ bilie.” Nke a wutere ha nke ukwuu. 24 Mgbe ha bịaruru na Kapanọm, ndị na-ana ụtụ nʼihi ụlọnsọ bịakwutere Pita jụọ ya sị, “Onye ozizi unu ọ dịghị atụ ụtụ ụlọnsọ?” 25 Pita zara ha sị, “E, ọ na-atụ ụtụ.”Mgbe ọ batara nʼụlọ, Jisọs buru ụzọ jụọ ya sị, “Gịnị ka i chere banyere nke a Saimọn? Ọ bụ nʼaka ndị ole ka ndị eze ụwa si anakọta ụtụ taks? Ọ bụ nʼaka ụmụ ha, ka ọ bụ nʼaka ndị ọbịa?” 26 Ma mgbe Pita zara ya sị, “Ọ bụ site nʼaka ndị ọbịa.”Jisọs sịrị ya, “Ọ dị mma. Iwu ejighị ndị bụ ụmụ. 27 Ma otu ọ dị, achọghị m ka anyị mee ka iwe wee ha. Gaa nʼosimiri ahụ tụnye nko azụ gị nʼime ya. Meghe ọnụ azụ mbụ ị ga-egbute. Ị ga-ahụ otu mkpụrụ ego nʼime ọnụ ya. Were ya nye ha, ka ọ bụrụ ụtụ nke mụ na gị.”

In Other Versions

Matthew 17 in the ANGEFD

Matthew 17 in the ANTPNG2D

Matthew 17 in the AS21

Matthew 17 in the BAGH

Matthew 17 in the BBPNG

Matthew 17 in the BBT1E

Matthew 17 in the BDS

Matthew 17 in the BEV

Matthew 17 in the BHAD

Matthew 17 in the BIB

Matthew 17 in the BLPT

Matthew 17 in the BNT

Matthew 17 in the BNTABOOT

Matthew 17 in the BNTLV

Matthew 17 in the BOATCB

Matthew 17 in the BOATCB2

Matthew 17 in the BOBCV

Matthew 17 in the BOCNT

Matthew 17 in the BOECS

Matthew 17 in the BOGWICC

Matthew 17 in the BOHCB

Matthew 17 in the BOHCV

Matthew 17 in the BOHLNT

Matthew 17 in the BOHNTLTAL

Matthew 17 in the BOILNTAP

Matthew 17 in the BOITCV

Matthew 17 in the BOKCV

Matthew 17 in the BOKCV2

Matthew 17 in the BOKHWOG

Matthew 17 in the BOKSSV

Matthew 17 in the BOLCB

Matthew 17 in the BOLCB2

Matthew 17 in the BOMCV

Matthew 17 in the BONAV

Matthew 17 in the BONCB

Matthew 17 in the BONLT

Matthew 17 in the BONUT2

Matthew 17 in the BOPLNT

Matthew 17 in the BOSCB

Matthew 17 in the BOSNC

Matthew 17 in the BOTLNT

Matthew 17 in the BOVCB

Matthew 17 in the BOYCB

Matthew 17 in the BPBB

Matthew 17 in the BPH

Matthew 17 in the BSB

Matthew 17 in the CCB

Matthew 17 in the CUV

Matthew 17 in the CUVS

Matthew 17 in the DBT

Matthew 17 in the DGDNT

Matthew 17 in the DHNT

Matthew 17 in the DNT

Matthew 17 in the ELBE

Matthew 17 in the EMTV

Matthew 17 in the ESV

Matthew 17 in the FBV

Matthew 17 in the FEB

Matthew 17 in the GGMNT

Matthew 17 in the GNT

Matthew 17 in the HARY

Matthew 17 in the HNT

Matthew 17 in the IRVA

Matthew 17 in the IRVB

Matthew 17 in the IRVG

Matthew 17 in the IRVH

Matthew 17 in the IRVK

Matthew 17 in the IRVM

Matthew 17 in the IRVM2

Matthew 17 in the IRVO

Matthew 17 in the IRVP

Matthew 17 in the IRVT

Matthew 17 in the IRVT2

Matthew 17 in the IRVU

Matthew 17 in the ISVN

Matthew 17 in the JSNT

Matthew 17 in the KAPI

Matthew 17 in the KBT1ETNIK

Matthew 17 in the KBV

Matthew 17 in the KJV

Matthew 17 in the KNFD

Matthew 17 in the LBA

Matthew 17 in the LBLA

Matthew 17 in the LNT

Matthew 17 in the LSV

Matthew 17 in the MAAL

Matthew 17 in the MBV

Matthew 17 in the MBV2

Matthew 17 in the MHNT

Matthew 17 in the MKNFD

Matthew 17 in the MNG

Matthew 17 in the MNT

Matthew 17 in the MNT2

Matthew 17 in the MRS1T

Matthew 17 in the NAA

Matthew 17 in the NASB

Matthew 17 in the NBLA

Matthew 17 in the NBS

Matthew 17 in the NBVTP

Matthew 17 in the NET2

Matthew 17 in the NIV11

Matthew 17 in the NNT

Matthew 17 in the NNT2

Matthew 17 in the NNT3

Matthew 17 in the PDDPT

Matthew 17 in the PFNT

Matthew 17 in the RMNT

Matthew 17 in the SBIAS

Matthew 17 in the SBIBS

Matthew 17 in the SBIBS2

Matthew 17 in the SBICS

Matthew 17 in the SBIDS

Matthew 17 in the SBIGS

Matthew 17 in the SBIHS

Matthew 17 in the SBIIS

Matthew 17 in the SBIIS2

Matthew 17 in the SBIIS3

Matthew 17 in the SBIKS

Matthew 17 in the SBIKS2

Matthew 17 in the SBIMS

Matthew 17 in the SBIOS

Matthew 17 in the SBIPS

Matthew 17 in the SBISS

Matthew 17 in the SBITS

Matthew 17 in the SBITS2

Matthew 17 in the SBITS3

Matthew 17 in the SBITS4

Matthew 17 in the SBIUS

Matthew 17 in the SBIVS

Matthew 17 in the SBT

Matthew 17 in the SBT1E

Matthew 17 in the SCHL

Matthew 17 in the SNT

Matthew 17 in the SUSU

Matthew 17 in the SUSU2

Matthew 17 in the SYNO

Matthew 17 in the TBIAOTANT

Matthew 17 in the TBT1E

Matthew 17 in the TBT1E2

Matthew 17 in the TFTIP

Matthew 17 in the TFTU

Matthew 17 in the TGNTATF3T

Matthew 17 in the THAI

Matthew 17 in the TNFD

Matthew 17 in the TNT

Matthew 17 in the TNTIK

Matthew 17 in the TNTIL

Matthew 17 in the TNTIN

Matthew 17 in the TNTIP

Matthew 17 in the TNTIZ

Matthew 17 in the TOMA

Matthew 17 in the TTENT

Matthew 17 in the UBG

Matthew 17 in the UGV

Matthew 17 in the UGV2

Matthew 17 in the UGV3

Matthew 17 in the VBL

Matthew 17 in the VDCC

Matthew 17 in the YALU

Matthew 17 in the YAPE

Matthew 17 in the YBVTP

Matthew 17 in the ZBP