Matthew 28 (BOICB)
1 Mgbe ụbọchị izuike gasịrị, nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nʼime izu ụka, Meri Magdalin na Meri nke ọzọ, gara ka ha lee ili ahụ. 2 Na mberede, oke ala ọma jijiji malitere. Nʼihi na mmụọ ozi Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe rịdata, kpụgharịa nkume ahụ e ji mechie ọnụ ili ahụ, nọkwasịkwa nʼelu ya. 3 Ihu ya na-enwu dị ka amụma. Uwe ya na-achakwa ọcha dị ka akụmmiri igwe. 4 Nʼihi egwu ya, ndị nche makwara jijiji. Daa nʼala nọrọ dị ka ndị nwụrụ anwụ. 5 Ma mmụọ ozi ahụ gwara ụmụ nwanyị ahụ sị ha, “Unu atụla egwu, nʼihi na amaara m na ọ bụ Jisọs onye a kpọgburu nʼelu obe ka unu na-achọ. 6 Ọ nọkwaghị nʼebe a. O sitela nʼọnwụ bilie, dị ka o si kwuo. Bịanụ lee ebe ọ tọgbọburu. 7 Gaanụ ngwangwa gwa ndị na-eso ụzọ ya na e meela ka o si nʼọnwụ bilie. Lee, o burula unu ụzọ gawa Galili. Ebe ahụ ka unu ga-ahụ ya. Chetakwanụ ihe m gwara unu.” 8 Ha ji oke egwu na ọṅụ pụọ ọsịịsọ site nʼili ahụ, gbara ọsọ gawa ịkọrọ ndị na-eso ụzọ ya. 9 Na mberede, Jisọs zutere ha sị ha, “Ndeewonụ!” Ha bịakwutere ya, jide ụkwụ ya abụọ aka, kpọọkwa isiala nye ya. 10 Ya mere Jisọs gwara ha sị, “Unu atụla egwu. Gaanụ, gwanụ ụmụnne m ka ha gaa Galili. Ha ga-ahụ m nʼebe ahụ.” 11 Mgbe ha na-aga, ụfọdụ ndị agha chere ili ahụ nche batara nʼime obodo. Ha gara kọọrọ ndịisi nchụaja ihe niile mere. 12 Emesịa, ndị nchụaja na ndị okenye zukọtara kwekọrịtaa inye ndị agha ahụ ọkpụrụkpụ ego, 13 sị ha, “Ihe a ka unu ga-ekwu, ‘Ndị na-eso ụzọ ya bịara nʼabalị zuru ya nʼohi mgbe anyị nọ na-arahụ ụra.’ 14 Ọ bụrụ na nke a eruo gọvanọ ntị, anyị ga-emeta ya mma, ma mee ka unu pụọ na nsogbu.” 15 Ha naara ego ahụ, meekwa dị ka e ziri ha. Akụkọ a ka a gbasara nʼetiti ndị Juu ruo taa. 16 Ma ndị ikom iri na otu ahụ bụ ndị na-eso ụzọ ya gara Galili, nʼelu ugwu ebe Jisọs gwara ha gaa. 17 Mgbe ha hụrụ ya, ha kpọrọ isiala nye ya. Ma ụfọdụ nʼime ha nwere obi abụọ. 18 Jisọs bịara ha nso, gwa ha sị, “E werela ikike niile dị nʼeluigwe na nke dị nʼelu ụwa nye m. 19 Ya mere, gaanụ mee ka mba niile bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-emenụ ha baptizim nʼaha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ. 20 Ziekwanụ ha ka ha na-eme ihe niile m nyere unu nʼiwu. Ma chetanụ na m na-anọnyere unu mgbe niile, ruo ọgwụgwụ oge.”
In Other Versions
Matthew 28 in the ANGEFD
Matthew 28 in the ANTPNG2D
Matthew 28 in the AS21
Matthew 28 in the BAGH
Matthew 28 in the BBPNG
Matthew 28 in the BBT1E
Matthew 28 in the BDS
Matthew 28 in the BEV
Matthew 28 in the BHAD
Matthew 28 in the BIB
Matthew 28 in the BLPT
Matthew 28 in the BNT
Matthew 28 in the BNTABOOT
Matthew 28 in the BNTLV
Matthew 28 in the BOATCB
Matthew 28 in the BOATCB2
Matthew 28 in the BOBCV
Matthew 28 in the BOCNT
Matthew 28 in the BOECS
Matthew 28 in the BOGWICC
Matthew 28 in the BOHCB
Matthew 28 in the BOHCV
Matthew 28 in the BOHLNT
Matthew 28 in the BOHNTLTAL
Matthew 28 in the BOILNTAP
Matthew 28 in the BOITCV
Matthew 28 in the BOKCV
Matthew 28 in the BOKCV2
Matthew 28 in the BOKHWOG
Matthew 28 in the BOKSSV
Matthew 28 in the BOLCB
Matthew 28 in the BOLCB2
Matthew 28 in the BOMCV
Matthew 28 in the BONAV
Matthew 28 in the BONCB
Matthew 28 in the BONLT
Matthew 28 in the BONUT2
Matthew 28 in the BOPLNT
Matthew 28 in the BOSCB
Matthew 28 in the BOSNC
Matthew 28 in the BOTLNT
Matthew 28 in the BOVCB
Matthew 28 in the BOYCB
Matthew 28 in the BPBB
Matthew 28 in the BPH
Matthew 28 in the BSB
Matthew 28 in the CCB
Matthew 28 in the CUV
Matthew 28 in the CUVS
Matthew 28 in the DBT
Matthew 28 in the DGDNT
Matthew 28 in the DHNT
Matthew 28 in the DNT
Matthew 28 in the ELBE
Matthew 28 in the EMTV
Matthew 28 in the ESV
Matthew 28 in the FBV
Matthew 28 in the FEB
Matthew 28 in the GGMNT
Matthew 28 in the GNT
Matthew 28 in the HARY
Matthew 28 in the HNT
Matthew 28 in the IRVA
Matthew 28 in the IRVB
Matthew 28 in the IRVG
Matthew 28 in the IRVH
Matthew 28 in the IRVK
Matthew 28 in the IRVM
Matthew 28 in the IRVM2
Matthew 28 in the IRVO
Matthew 28 in the IRVP
Matthew 28 in the IRVT
Matthew 28 in the IRVT2
Matthew 28 in the IRVU
Matthew 28 in the ISVN
Matthew 28 in the JSNT
Matthew 28 in the KAPI
Matthew 28 in the KBT1ETNIK
Matthew 28 in the KBV
Matthew 28 in the KJV
Matthew 28 in the KNFD
Matthew 28 in the LBA
Matthew 28 in the LBLA
Matthew 28 in the LNT
Matthew 28 in the LSV
Matthew 28 in the MAAL
Matthew 28 in the MBV
Matthew 28 in the MBV2
Matthew 28 in the MHNT
Matthew 28 in the MKNFD
Matthew 28 in the MNG
Matthew 28 in the MNT
Matthew 28 in the MNT2
Matthew 28 in the MRS1T
Matthew 28 in the NAA
Matthew 28 in the NASB
Matthew 28 in the NBLA
Matthew 28 in the NBS
Matthew 28 in the NBVTP
Matthew 28 in the NET2
Matthew 28 in the NIV11
Matthew 28 in the NNT
Matthew 28 in the NNT2
Matthew 28 in the NNT3
Matthew 28 in the PDDPT
Matthew 28 in the PFNT
Matthew 28 in the RMNT
Matthew 28 in the SBIAS
Matthew 28 in the SBIBS
Matthew 28 in the SBIBS2
Matthew 28 in the SBICS
Matthew 28 in the SBIDS
Matthew 28 in the SBIGS
Matthew 28 in the SBIHS
Matthew 28 in the SBIIS
Matthew 28 in the SBIIS2
Matthew 28 in the SBIIS3
Matthew 28 in the SBIKS
Matthew 28 in the SBIKS2
Matthew 28 in the SBIMS
Matthew 28 in the SBIOS
Matthew 28 in the SBIPS
Matthew 28 in the SBISS
Matthew 28 in the SBITS
Matthew 28 in the SBITS2
Matthew 28 in the SBITS3
Matthew 28 in the SBITS4
Matthew 28 in the SBIUS
Matthew 28 in the SBIVS
Matthew 28 in the SBT
Matthew 28 in the SBT1E
Matthew 28 in the SCHL
Matthew 28 in the SNT
Matthew 28 in the SUSU
Matthew 28 in the SUSU2
Matthew 28 in the SYNO
Matthew 28 in the TBIAOTANT
Matthew 28 in the TBT1E
Matthew 28 in the TBT1E2
Matthew 28 in the TFTIP
Matthew 28 in the TFTU
Matthew 28 in the TGNTATF3T
Matthew 28 in the THAI
Matthew 28 in the TNFD
Matthew 28 in the TNT
Matthew 28 in the TNTIK
Matthew 28 in the TNTIL
Matthew 28 in the TNTIN
Matthew 28 in the TNTIP
Matthew 28 in the TNTIZ
Matthew 28 in the TOMA
Matthew 28 in the TTENT
Matthew 28 in the UBG
Matthew 28 in the UGV
Matthew 28 in the UGV2
Matthew 28 in the UGV3
Matthew 28 in the VBL
Matthew 28 in the VDCC
Matthew 28 in the YALU
Matthew 28 in the YAPE
Matthew 28 in the YBVTP
Matthew 28 in the ZBP