Matthew 8 (BOICB)

1 Ọtụtụ mmadụ sooro Jisọs mgbe o si nʼugwu ahụ rịdata. 2 Mgbe ha na-aga nʼụzọ, otu onye ekpenta bịakwutere ya kpọọ isiala nye ya, rịọ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” 3 O setịpụrụ aka ya, metụ ya sị, “Achọrọ m ka ị dị ọcha, dịrịkwa ọcha!” Ngwangwa, ekpenta ahụ lara. 4 Jisọs nyere nwoke ahụ iwu sị ya, “Hụ na ịgwaghị onye ọbụla, kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị, chụọkwa aja onyinye dịka Mosis, nyere nʼiwu, ka ọ bụrụ ihe ama nye ya.” 5 Mgbe ọ banyere na Kapanọm, otu onye ọchịagha bịakwutere ya rịọọ ka o nyere ya aka. 6 Ọ sịrị, “Onyenwe m, onye na-ejere m ozi dina nʼụlọ nʼoke ihe mgbu, akụkụ ahụ ya kpọnwụkwara akpọnwụ.” 7 Jisọs sịrị ya, “Ọ bụ m bịa gwọọ ya?” 8 Ma onye ọchịagha ahụ zara ya sị, “Onyenwe m, ekwesighị m ka ị bata nʼokpuru ụlọ m. Naanị nọdụ nʼebe a, kwuo okwu, ahụ ga-adịkwa onye na-ejere m ozi ike. 9 Nʼihi na mụ onwe m bụkwa onye nọ nʼokpuru ikike ọchịchị, nwee ndị agha nọ nʼokpuru m. Ana m asị onye nke a, ‘gaa.’ Ọ gaa, sịkwa onye nke ọzọ, ‘bịa.’ Ọ bịa. Ana m asị ohu m, ‘mee nke a.’ Ọ na-emekwa ya.” 10 Mgbe Jisọs nụrụ okwu a, o juru ya anya nke ukwuu. Ọ gwara igwe mmadụ ahụ so ya okwu sị, “Nʼezie, ahụbeghị m okwukwe dị otu a ebe ọbụla; ọ bụladị nʼIzrel niile. 11 Nʼezie kwa, ọtụtụ ndị mmadụ ga-esite nʼọwụwa anyanwụ nakwa ọdịda anyanwụ bịa soro Ebraham na Aịzik na Jekọb nọkọọ nʼoriri nʼalaeze eluigwe. 12 Ma ụmụ alaeze ahụ, ka a ga-atụpụ nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.” 13 Jisọs gwara ọchịagha ahụ okwu sị ya, “Laa! E meerela gị dị ka okwukwe gị sịrị dị.” Ahụ dịrị onye ahụ na-ejere ya ozi mma nʼotu awa ahụ. 14 Mgbe Jisọs ruru nʼụlọ Pita, ọ chọpụtara na nne nwunye ya nwere ahụ ọkụ. 15 Ọ metụrụ ya aka, ahụ ọkụ ahụ hapụrụ ya, o biliri malite ijere ya ozi. 16 Nʼoge uhuruchi, ha kpọtaara ya ọtụtụ ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu. O ji okwu ọnụ chụpụ mmụọ ọjọọ ahụ niile, gwọọkwa ndị niile ahụ na-adịghị ike. 17 Nke a bụ imezu amụma ahụ Aịzaya buru sị,“O bupụrụ nrịa nrịa anyị niile,burukwa ọrịa anyị niile.” 18 Mgbe Jisọs hụrụ igwe mmadụ dị ukwuu ndị gbara ya gburugburu, ọ nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha gafee nʼofe nke ọzọ. 19 Nʼoge ahụ, otu onye nʼetiti ndị na-ezi iwu bịakwutere ya sị ya, “Onye nkuzi, aga m eso gị gaa ebe ọbụla ị na-aga.” 20 Jisọs zara, sị, “Nkịta ọhịa nwere ọnụ ebe ha na-edina. Ụmụ nnụnụ nke igwe nwekwara akwụ; ma Nwa nke Mmadụ enweghị ebe obibi.” 21 Otu onye ọzọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onyenwe m, aga m eso gị, kama kwere ka m buru ụzọ gaa lie nna m.” 22 Ma Jisọs zara sị ya, “Soro m ugbu a. Hapụ ndị nwụrụ anwụ ka ha lie ndị nwụrụ anwụ ibe ha.” 23 Mgbe ọ banyere nʼụgbọ, ndị na-eso ụzọ ya sooro ya. 24 Nʼotu ntabi anya, oke ifufe bidoro ife nʼọdọ mmiri ahụ, nke mere na ebili mmiri na-ekpuchi ụgbọ ahụ. Ma ọ nọ na-arahụ ụra mgbe ihe ndị a na-eme. 25 Ndị na-eso ụzọ ya jekwuuru ya, kpọtee ya, sị ya, “Onyenwe anyị, zọpụta anyị! Lee, na anyị nʼala nʼiyi.” 26 Ma ọ zaghachiri, “Unu ndị okwukwe nta, gịnị mere ụjọ ji na-atụ unu?” Mgbe ahụ o biliri baara ifufe ahụ na ebili mmiri ahụ mba. Ha niile dajụrụ, deere jii. 27 O juru ndị na-eso ụzọ ya anya, mee ka ha jụọ ajụjụ sị, “Ọ bụ ụdị mmadụ dị aṅaa ka nwoke a bụ? Ọ bụladị ifufe na ebili mmiri na-eme ihe o kwuru.” 28 Mgbe o rutere nʼofe nke ọzọ nke obodo Gadarin, mmadụ abụọ ndị mmụọ ọjọọ si nʼebe a na-eli ozu zutere ya. Ha na-akpa ike nke ukwuu, na ọ dịkwaghị onye na-esite nʼụzọ ahụ agafe nʼihi ha. 29 Ngwangwa, ha tiri mkpu bido na-ajụ ajụjụ sị, “Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ, gị Ọkpara Chineke? Ị gaghị echekwa eche ka oge ruo tupu ibido ịta anyị ahụhụ?” 30 Igwe ezi nọ nʼakụkụ ebe ahụ na-akpa nri. 31 Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ ya arịrịọ sị, “Ọ bụrụ na ị chụpụ anyị, biko, hapụ anyị ka anyị banye nʼime ezi ndị a.” 32 Ọ nyere ha iwu sị ha, “Ngwa, gaanụ!” Ha sitere nʼime mmadụ abụọ ahụ pụta banye nʼime igwe ezi ahụ. Otu mgbe ahụ kwa, ezi ndị ahụ niile gbaara ọsọ site na mkputamkpu ala ọnụ mmiri ahụ dabanyechaa nʼime mmiri ahụ. Ha nwụkwara nʼime ya. 33 Ndị na-elekọta igwe ezi ndị ahụ gbapụrụ gbaga nʼime obodo kọọrọ ha ihe niile mere; tinyere ihe mere ndị ahụ mmụọ ọjọọ na-esogbu. 34 Ya mere ndị niile nọ nʼobodo ahụ pụtara ịhụ Jisọs. Mgbe ha hụrụ ya ha rịọrọ ya sị ya pụọra ha nʼakụkụ obodo ha.

In Other Versions

Matthew 8 in the ANGEFD

Matthew 8 in the ANTPNG2D

Matthew 8 in the AS21

Matthew 8 in the BAGH

Matthew 8 in the BBPNG

Matthew 8 in the BBT1E

Matthew 8 in the BDS

Matthew 8 in the BEV

Matthew 8 in the BHAD

Matthew 8 in the BIB

Matthew 8 in the BLPT

Matthew 8 in the BNT

Matthew 8 in the BNTABOOT

Matthew 8 in the BNTLV

Matthew 8 in the BOATCB

Matthew 8 in the BOATCB2

Matthew 8 in the BOBCV

Matthew 8 in the BOCNT

Matthew 8 in the BOECS

Matthew 8 in the BOGWICC

Matthew 8 in the BOHCB

Matthew 8 in the BOHCV

Matthew 8 in the BOHLNT

Matthew 8 in the BOHNTLTAL

Matthew 8 in the BOILNTAP

Matthew 8 in the BOITCV

Matthew 8 in the BOKCV

Matthew 8 in the BOKCV2

Matthew 8 in the BOKHWOG

Matthew 8 in the BOKSSV

Matthew 8 in the BOLCB

Matthew 8 in the BOLCB2

Matthew 8 in the BOMCV

Matthew 8 in the BONAV

Matthew 8 in the BONCB

Matthew 8 in the BONLT

Matthew 8 in the BONUT2

Matthew 8 in the BOPLNT

Matthew 8 in the BOSCB

Matthew 8 in the BOSNC

Matthew 8 in the BOTLNT

Matthew 8 in the BOVCB

Matthew 8 in the BOYCB

Matthew 8 in the BPBB

Matthew 8 in the BPH

Matthew 8 in the BSB

Matthew 8 in the CCB

Matthew 8 in the CUV

Matthew 8 in the CUVS

Matthew 8 in the DBT

Matthew 8 in the DGDNT

Matthew 8 in the DHNT

Matthew 8 in the DNT

Matthew 8 in the ELBE

Matthew 8 in the EMTV

Matthew 8 in the ESV

Matthew 8 in the FBV

Matthew 8 in the FEB

Matthew 8 in the GGMNT

Matthew 8 in the GNT

Matthew 8 in the HARY

Matthew 8 in the HNT

Matthew 8 in the IRVA

Matthew 8 in the IRVB

Matthew 8 in the IRVG

Matthew 8 in the IRVH

Matthew 8 in the IRVK

Matthew 8 in the IRVM

Matthew 8 in the IRVM2

Matthew 8 in the IRVO

Matthew 8 in the IRVP

Matthew 8 in the IRVT

Matthew 8 in the IRVT2

Matthew 8 in the IRVU

Matthew 8 in the ISVN

Matthew 8 in the JSNT

Matthew 8 in the KAPI

Matthew 8 in the KBT1ETNIK

Matthew 8 in the KBV

Matthew 8 in the KJV

Matthew 8 in the KNFD

Matthew 8 in the LBA

Matthew 8 in the LBLA

Matthew 8 in the LNT

Matthew 8 in the LSV

Matthew 8 in the MAAL

Matthew 8 in the MBV

Matthew 8 in the MBV2

Matthew 8 in the MHNT

Matthew 8 in the MKNFD

Matthew 8 in the MNG

Matthew 8 in the MNT

Matthew 8 in the MNT2

Matthew 8 in the MRS1T

Matthew 8 in the NAA

Matthew 8 in the NASB

Matthew 8 in the NBLA

Matthew 8 in the NBS

Matthew 8 in the NBVTP

Matthew 8 in the NET2

Matthew 8 in the NIV11

Matthew 8 in the NNT

Matthew 8 in the NNT2

Matthew 8 in the NNT3

Matthew 8 in the PDDPT

Matthew 8 in the PFNT

Matthew 8 in the RMNT

Matthew 8 in the SBIAS

Matthew 8 in the SBIBS

Matthew 8 in the SBIBS2

Matthew 8 in the SBICS

Matthew 8 in the SBIDS

Matthew 8 in the SBIGS

Matthew 8 in the SBIHS

Matthew 8 in the SBIIS

Matthew 8 in the SBIIS2

Matthew 8 in the SBIIS3

Matthew 8 in the SBIKS

Matthew 8 in the SBIKS2

Matthew 8 in the SBIMS

Matthew 8 in the SBIOS

Matthew 8 in the SBIPS

Matthew 8 in the SBISS

Matthew 8 in the SBITS

Matthew 8 in the SBITS2

Matthew 8 in the SBITS3

Matthew 8 in the SBITS4

Matthew 8 in the SBIUS

Matthew 8 in the SBIVS

Matthew 8 in the SBT

Matthew 8 in the SBT1E

Matthew 8 in the SCHL

Matthew 8 in the SNT

Matthew 8 in the SUSU

Matthew 8 in the SUSU2

Matthew 8 in the SYNO

Matthew 8 in the TBIAOTANT

Matthew 8 in the TBT1E

Matthew 8 in the TBT1E2

Matthew 8 in the TFTIP

Matthew 8 in the TFTU

Matthew 8 in the TGNTATF3T

Matthew 8 in the THAI

Matthew 8 in the TNFD

Matthew 8 in the TNT

Matthew 8 in the TNTIK

Matthew 8 in the TNTIL

Matthew 8 in the TNTIN

Matthew 8 in the TNTIP

Matthew 8 in the TNTIZ

Matthew 8 in the TOMA

Matthew 8 in the TTENT

Matthew 8 in the UBG

Matthew 8 in the UGV

Matthew 8 in the UGV2

Matthew 8 in the UGV3

Matthew 8 in the VBL

Matthew 8 in the VDCC

Matthew 8 in the YALU

Matthew 8 in the YAPE

Matthew 8 in the YBVTP

Matthew 8 in the ZBP