Nehemiah 6 (BOICB)
1 Mgbe a gwara Sanbalat, na Tobaya, na Geshem onye Arab, na ndị iro anyị ndị ọzọ na m ewuzichaala mgbidi ahụ, na ọ dịkwaghị ntipu fọdụrụ na ya, ọ bụ ezie na nʼoge ahụ, etinyebeghị m ibo nʼọnụ ụzọ ama ya niile, 2 Sanbalat na Geshem zitere m ozi a, “Bịa ka anyị zụkọta nʼotu obodo nta nke dị nʼobosara ala Ono.”Ma ha na-achọ ụzọ imerụ m ahụ. 3 Ya mere, azara m ha site nʼaka ndị ozi sị, “Ana m arụ ọrụ dị oke mkpa, agaghị enwe ike ịrịdata. Nʼihi gịnị ka ọrụ a ga-eji kwụsị mgbe m ga-ahapụ ya ịbịa nʼebe ị nọ?” 4 Ha zitere ozi ahụ ugboro anọ, ma enyere m ha otu ọsịsa ahụ ugboro anọ. 5 Na nke ugboro ise, Sanbalat ziteere m onye na-ejere ya ozi, ya na akwụkwọ ozi nke e mechighị emechi o ji bịa. 6 Nke a bụ ihe e dere nʼime ya;“Anụla ya na mba niile, Geshem kwukwara otu ihe ahụ, na gị na ndị Juu na-akwado inupu isi. Ọ bụ ya mere i ji na-ewu mgbidi ahụ. Ozi ahụ na-ekwukwa na gị onwe gị na-achọ ịbụ eze ha, 7 na ị họpụtala ndị amụma ndị ga-ekwupụta na Jerusalem na ị bụ eze ndị Juda. Ugbu a, ozi a ga-eru ntị eze, ya mere, bịa ka mụ na gị kparịtaa ụka nʼetiti onwe anyị.” 8 Ma eziri m ya ozi sị, “O nweghị eziokwu ọbụla dị nʼihe ị na-ekwu, nʼihi na ha bụ ihe i chepụtara nʼobi gị.” 9 Nzube ha bụ ime ka ụjọ tụọ anyị. Ha na-echekwa sị, “Ha ga-ada mba nʼọrụ a ma hapụkwa ịrụcha ya.”Ma akpọkuru m Chineke sị ya, “Biko gbaa aka m ume.” 10 Otu ụbọchị, a gara m nʼụlọ Shemaya, nwa Delaya, nwa Mehetabel, onye e mechibidoro ụzọ nʼụlọ ya. Ọ sịrị m, “Ka anyị zukọta nʼụlọ Chineke, nʼime ụlọnsọ, ka anyị mechiekwa ụzọ niile nke ụlọnsọ ahụ, nʼihi na ndị ikom na-abịa igbu gị, e, nʼabalị ka ha na-abịa igbu gị.” 11 Ma azara m si; “O kwesiri ka mụ onwe m bụ onyeisi ọchịchị gbaa ọsọ? O kwesiri ka mmadụ dịka m gbaa ọsọ gbaba nʼụlọnsọ Chineke ịzọpụta ndụ ya? Agaghị m aga.” 12 Mgbe ahụ ka o doro m anya na Chineke agwaghị ya okwu ọbụla, kama na ọ bụ Tobaya na Sanbalat zụrụ ya. 13 E goro ya ọrụ ka o yinye m egwu, ka m site na-ime otu a mehie, mgbe ahụ, ha ga-ahụ ihe ha ga-eji nye m aha ọjọọ, kwaa m emo. 14 “Chineke m, cheta Tobaya na Sanbalat, nʼihi ihe ndị a niile ha mere, chetakwa Noadaya, bụ onye amụma nwanyị, na ndị amụma ndị ọzọ niile fọdụrụ, bụ ndị ahụ chọrọ ime ka m tụọ egwu.” 15 E wuchara mgbidi ahụ nʼụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Elul, nʼime iri ụbọchị ise na abụọ. 16 Mgbe ndị iro anyị niile nụrụ ya, mba niile ndị nọ anyị gburugburu tụrụ ụjọ, obi jụkwara ha oyi, nʼihi na ha matara na-arụrụ ọrụ a site nʼinyeaka Chineke. 17 Ọzọ, nʼụbọchị ndị ahụ ndị Juda a na-asọpụrụ na e zigara Tobaya ọtụtụ akwụkwọ ozi, akwụkwọ ozi Tobaya na-erutekwa ha aka. 18 Nʼihi na ọtụtụ ndị Juda ṅụrụ iyi ịnọ ya nʼukwu, nʼihi na ọgọ ya nwoke nʼala Juda bụ Shekanaya nwa Ara. Ọzọkwa, Jehohanan nwa nwoke Tobaya na-alụ nwa nwanyị Meshulam, nwa Berekaya. 19 Ha niile nọgidere na-agwa m otu Tobaya si bụrụ ezigbo mmadụ. Ma ha na-apụkwa gaa kọọrọ ya ihe niile m kwuru. Nʼihi ya Tobaya zitere ọtụtụ akwụkwọ ozi ime ka ụjọ tụọ m.
In Other Versions
Nehemiah 6 in the ANGEFD
Nehemiah 6 in the ANTPNG2D
Nehemiah 6 in the AS21
Nehemiah 6 in the BAGH
Nehemiah 6 in the BBPNG
Nehemiah 6 in the BBT1E
Nehemiah 6 in the BDS
Nehemiah 6 in the BEV
Nehemiah 6 in the BHAD
Nehemiah 6 in the BIB
Nehemiah 6 in the BLPT
Nehemiah 6 in the BNT
Nehemiah 6 in the BNTABOOT
Nehemiah 6 in the BNTLV
Nehemiah 6 in the BOATCB
Nehemiah 6 in the BOATCB2
Nehemiah 6 in the BOBCV
Nehemiah 6 in the BOCNT
Nehemiah 6 in the BOECS
Nehemiah 6 in the BOGWICC
Nehemiah 6 in the BOHCB
Nehemiah 6 in the BOHCV
Nehemiah 6 in the BOHLNT
Nehemiah 6 in the BOHNTLTAL
Nehemiah 6 in the BOILNTAP
Nehemiah 6 in the BOITCV
Nehemiah 6 in the BOKCV
Nehemiah 6 in the BOKCV2
Nehemiah 6 in the BOKHWOG
Nehemiah 6 in the BOKSSV
Nehemiah 6 in the BOLCB
Nehemiah 6 in the BOLCB2
Nehemiah 6 in the BOMCV
Nehemiah 6 in the BONAV
Nehemiah 6 in the BONCB
Nehemiah 6 in the BONLT
Nehemiah 6 in the BONUT2
Nehemiah 6 in the BOPLNT
Nehemiah 6 in the BOSCB
Nehemiah 6 in the BOSNC
Nehemiah 6 in the BOTLNT
Nehemiah 6 in the BOVCB
Nehemiah 6 in the BOYCB
Nehemiah 6 in the BPBB
Nehemiah 6 in the BPH
Nehemiah 6 in the BSB
Nehemiah 6 in the CCB
Nehemiah 6 in the CUV
Nehemiah 6 in the CUVS
Nehemiah 6 in the DBT
Nehemiah 6 in the DGDNT
Nehemiah 6 in the DHNT
Nehemiah 6 in the DNT
Nehemiah 6 in the ELBE
Nehemiah 6 in the EMTV
Nehemiah 6 in the ESV
Nehemiah 6 in the FBV
Nehemiah 6 in the FEB
Nehemiah 6 in the GGMNT
Nehemiah 6 in the GNT
Nehemiah 6 in the HARY
Nehemiah 6 in the HNT
Nehemiah 6 in the IRVA
Nehemiah 6 in the IRVB
Nehemiah 6 in the IRVG
Nehemiah 6 in the IRVH
Nehemiah 6 in the IRVK
Nehemiah 6 in the IRVM
Nehemiah 6 in the IRVM2
Nehemiah 6 in the IRVO
Nehemiah 6 in the IRVP
Nehemiah 6 in the IRVT
Nehemiah 6 in the IRVT2
Nehemiah 6 in the IRVU
Nehemiah 6 in the ISVN
Nehemiah 6 in the JSNT
Nehemiah 6 in the KAPI
Nehemiah 6 in the KBT1ETNIK
Nehemiah 6 in the KBV
Nehemiah 6 in the KJV
Nehemiah 6 in the KNFD
Nehemiah 6 in the LBA
Nehemiah 6 in the LBLA
Nehemiah 6 in the LNT
Nehemiah 6 in the LSV
Nehemiah 6 in the MAAL
Nehemiah 6 in the MBV
Nehemiah 6 in the MBV2
Nehemiah 6 in the MHNT
Nehemiah 6 in the MKNFD
Nehemiah 6 in the MNG
Nehemiah 6 in the MNT
Nehemiah 6 in the MNT2
Nehemiah 6 in the MRS1T
Nehemiah 6 in the NAA
Nehemiah 6 in the NASB
Nehemiah 6 in the NBLA
Nehemiah 6 in the NBS
Nehemiah 6 in the NBVTP
Nehemiah 6 in the NET2
Nehemiah 6 in the NIV11
Nehemiah 6 in the NNT
Nehemiah 6 in the NNT2
Nehemiah 6 in the NNT3
Nehemiah 6 in the PDDPT
Nehemiah 6 in the PFNT
Nehemiah 6 in the RMNT
Nehemiah 6 in the SBIAS
Nehemiah 6 in the SBIBS
Nehemiah 6 in the SBIBS2
Nehemiah 6 in the SBICS
Nehemiah 6 in the SBIDS
Nehemiah 6 in the SBIGS
Nehemiah 6 in the SBIHS
Nehemiah 6 in the SBIIS
Nehemiah 6 in the SBIIS2
Nehemiah 6 in the SBIIS3
Nehemiah 6 in the SBIKS
Nehemiah 6 in the SBIKS2
Nehemiah 6 in the SBIMS
Nehemiah 6 in the SBIOS
Nehemiah 6 in the SBIPS
Nehemiah 6 in the SBISS
Nehemiah 6 in the SBITS
Nehemiah 6 in the SBITS2
Nehemiah 6 in the SBITS3
Nehemiah 6 in the SBITS4
Nehemiah 6 in the SBIUS
Nehemiah 6 in the SBIVS
Nehemiah 6 in the SBT
Nehemiah 6 in the SBT1E
Nehemiah 6 in the SCHL
Nehemiah 6 in the SNT
Nehemiah 6 in the SUSU
Nehemiah 6 in the SUSU2
Nehemiah 6 in the SYNO
Nehemiah 6 in the TBIAOTANT
Nehemiah 6 in the TBT1E
Nehemiah 6 in the TBT1E2
Nehemiah 6 in the TFTIP
Nehemiah 6 in the TFTU
Nehemiah 6 in the TGNTATF3T
Nehemiah 6 in the THAI
Nehemiah 6 in the TNFD
Nehemiah 6 in the TNT
Nehemiah 6 in the TNTIK
Nehemiah 6 in the TNTIL
Nehemiah 6 in the TNTIN
Nehemiah 6 in the TNTIP
Nehemiah 6 in the TNTIZ
Nehemiah 6 in the TOMA
Nehemiah 6 in the TTENT
Nehemiah 6 in the UBG
Nehemiah 6 in the UGV
Nehemiah 6 in the UGV2
Nehemiah 6 in the UGV3
Nehemiah 6 in the VBL
Nehemiah 6 in the VDCC
Nehemiah 6 in the YALU
Nehemiah 6 in the YAPE
Nehemiah 6 in the YBVTP
Nehemiah 6 in the ZBP