Numbers 15 (BOICB)

1 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị ya, 2 “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘mgbe unu batara ala ahụ m na-enye unu dịka ụlọ unu, 3 ọ bụrụ na unu echee nʼihu ONYENWE ANYỊ aja nsure ọkụ nke isisi ya dị ụtọ nye ONYENWE ANYỊ, maọbụ nke si nʼigwe ehi, maọbụ nke si nʼigwe ewu na atụrụ, maọbụ aja nsure ọkụ, maọbụ aja ndị ọzọ, maka imezu nkwa pụrụ iche maọbụ onyinye afọ ofufu, maọbụ aja mmemme. 4 Onye wetara onyinye a aghaghị iweta nʼihu ONYENWE ANYỊ aja mkpụrụ ọka nke bụ ezi ụtụ ọka ruru lita abụọ nke e ji mmanụ ruru otu lita gwakọtaa. 5 Ọ ga-eweta otu lita mmanya dịka onyinye ihe ọṅụṅụ maka nwa atụrụ ọbụla e ji chụọ aja nsure ọkụ maọbụ aja ụzọ. 6 “ ‘Ọ bụrụ nwa ebule ka e ji achụ aja ahụ, weta lita ezi ụtụ ọka anọ na ọkara, nke a gwakọtara ya na mmanụ jitụ ntakịrị karịa otu lita, 7 tinyekwa ya mmanya jitụ ihe nta karịa otu lita ka ọ bụrụ onyinye ihe ọṅụṅụ nye ha, dịka aja nke isisi ya dị ụtọ nye ONYENWE ANYỊ. 8 “ ‘Mgbe i ji nwa oke ehi chụọ aja nsure ọkụ, maọbụ aja imezu nkwa, maọbụ aja udo nye ONYENWE ANYỊ, 9 tinyere oke ehi ahụ, ị ghaghị iji ezi ụtụ ọka ruru lita isii na ọkara, nke a gwakọtara ya na mmanụ ruru lita abụọ. 10 Wetakwa lita mmanya abụọ nke ga-abụ onyinye ihe ọṅụṅụ. Ọ ga-abụ onyinye e sitere nʼọkụ nye, nke isisi ya dị ụtọ nye ONYENWE ANYỊ. 11 Nke a bụ usoro a ga-agbaso nʼoge ọbụla e ji nwa oke ehi, maọbụ nwa ebule, maọbụ nwa atụrụ, maọbụ nwa ewu chụọ aja. 12 Meenụ ya maka anụ ụlọ ọbụla nʼoge niile ọbụla unu na-achụ aja. 13 “ ‘Onye ọbụla bụ nwa afọ ala aghaghị ime ihe ndị a mgbe ọbụla o wetara onyinye e sitere nʼọkụ nye dịka onyinye isisi ya dị ụtọ nye ONYENWE ANYỊ. 14 Nʼọgbọ niile na-abịa, mgbe ọbụla onye ọbịa, maọbụ onye ọzọ bi nʼetiti unu wetara onyinye e sitere nʼọkụ nye, nke isisi ya dị ụtọ nye ONYENWE ANYỊ, ọ ghaghị ịgbaso ụzọ a nye onyinye ya. 15 Ọgbakọ ụmụ Izrel ga-enwe otu iwu ga-adịrị unu na ndị ọbịa bi nʼetiti unu. Nke a bụ ụkpụrụ ebighị ebi ga-adịrị ọgbọ niile na-abịa. Unu na ndị ọbịa ga-abụ otu nʼihu ONYENWE ANYỊ. 16 Otu iwu na otu ụkpụrụ bụ ihe ga-adịrị onye ọbụla, diala na ndị ọbịa bi nʼetiti unu.’ ” 17 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị ya, 18 “Gwa ndị Izrel okwu sị ha, ‘mgbe unu banyere nʼala ahụ m na-akpọbata unu nʼime ya, 19 ọ bụrụ na unu erie nri dị nʼala ahụ, wetanụ ụfọdụ nʼime nri ahụ dịka onyinye nye ONYENWE ANYỊ. 20 Wetanụ ogbe achịcha site nʼọka mbụ unu ga-akwọ, chee ya nʼihu ONYENWE ANYỊ dịka onyinye e wetara site nʼebe ịzọcha ọka. 21 Unu aghaghị inye ONYENWE ANYỊ onyinye a sitere nʼọka mbụ ọbụla unu kwọrọ, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 22 “ ‘Ọ bụrụ na unu amaghị ama ghara idebe iwu ndị a niile ONYENWE ANYỊ nyere site nʼaka Mosis, 23 bụ iwu ndị a niile ONYENWE ANYỊ nyere unu site nʼaka Mosis, site nʼụbọchị ahụ ONYENWE ANYỊ nyere ha ruo nʼọgbọ niile nke na-abịa. 24 Ọ bụrụ na e mere ya na-amaghị ama, ọ bụrụ na ọgbakọ ụmụ Izrel amaghị ama mee ya, mgbe ahụ, ọgbakọ ụmụ Izrel ga-eji nwa oke ehi chụọ aja nsure ọkụ, aja na-esi isi ụtọ nke ONYENWE ANYỊ na-anabata. Aghaghị iwetakwa mkpụrụ ọka, na onyinye ihe ọṅụṅụ nke ya na aja ahụ so, tinyere otu mkpi maka aja mmehie. 25 Onye nchụaja ga-ekpuchitere nzukọ Izrel niile mmehie ha. A ga-agbagharakwa ha mmehie ha niile, nʼihi na ọ bụ mmehie ha mere na-amaghị ama. Ha e cheela nʼihu ONYENWE ANYỊ aja onyinye nri nʼihi amaghị ama ha ya na aja mmehie. 26 A ga-agbaghara nzukọ Izrel niile na ndị ọbịa nọ nʼetiti ha mmehie ha, nʼihi na mmadụ ndị a niile akpachaghị anya mehie. 27 “ ‘Ọ bụrụ na ọ bụ naanị otu onye mehiere na-amaghị ama, ọ ga-eweta nwa nne ewu gbara otu afọ maka aja mmehie. 28 Onye nchụaja a ga-eji ya chụọ aja ikpuchitere onye ahụ na-amaghị ama mehie mmehie ya nʼihu ONYENWE ANYỊ. Mgbe ekpuchichara mmehie ya, a ga-agbaghara onye ahụ. 29 Ọ bụ otu iwu a dịrị onye ọbụla mehiere na-amaghị ama, maọbụ nwa afọ Izrel, maọbụ onye ọbịa nke bi nʼetiti unu. 30 “ ‘Ma onye ọbụla kpachapụrụ anya mehie, maọbụ nwa afọ maọbụ onye ọbịa, nke na-ekwulu ONYENWE ANYỊ, a ga-ebipụ onye dị otu a site nʼetiti ndị Izrel. 31 Nʼihi na ha eledala okwu ONYENWE ANYỊ anya, mebie ihe o nyere nʼiwu. A ghaghị ibipụ onye dị otu a, mmehie ha ga-adịkwa ha nʼisi.’ ” 32 Mgbe ụmụ Izrel nọ nʼọzara, e jidere otu onye nʼime ha ka ọ na-akpa nkụ nʼụbọchị izuike. 33 Ndị hụrụ ya ebe ọ na-akpa nkụ duuru ya jekwuru Mosis na Erọn na ọgbakọ ụmụ Izrel. 34 Ha tinyere ya nʼụlọ mkpọrọ nʼihi na o doghị anya ihe e kwesiri ime ya. 35 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị ya, “Nwoke a ghaghị ịnwụ. Ọgbakọ Izrel niile ga-atụ ya nkume nʼazụ obodo.” 36 Ya mere, ọgbakọ ahụ kpọpụrụ ya nʼazụ obodo jiri nkume tugbuo ya, dịka ONYENWE ANYỊ nyere Mosis nʼiwu. 37 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị ya, 38 “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Nʼọgbọ niile na-abịa unu ga-adụnye eriri akwa nʼọnụ ala ala uwe unu. Unu ga-eji eriri na-acha anụnụ anụnụ dụnye ya. 39 Eriri akwa ndị a dị nʼọnụ ọnụ uwe unu ga-eme ka unu cheta iwu niile ONYENWE ANYỊ nyere unu. Ka unu rube isi na ha hapụ imerụ onwe unu site na ịgbaso ihe ọjọọ niile na-agụ obi unu na anya unu. 40 Mgbe ahụ unu ga-echeta irube isi nʼiwu m niile, bụrụ ndị e doro nsọ nye Chineke unu. 41 Abụ m ONYENWE ANYỊ Chineke unu, onye si nʼala Ijipt kpọpụta unu ịbụ Chineke unu. Abụ m ONYENWE ANYỊ Chineke unu.’ ”

In Other Versions

Numbers 15 in the ANGEFD

Numbers 15 in the ANTPNG2D

Numbers 15 in the AS21

Numbers 15 in the BAGH

Numbers 15 in the BBPNG

Numbers 15 in the BBT1E

Numbers 15 in the BDS

Numbers 15 in the BEV

Numbers 15 in the BHAD

Numbers 15 in the BIB

Numbers 15 in the BLPT

Numbers 15 in the BNT

Numbers 15 in the BNTABOOT

Numbers 15 in the BNTLV

Numbers 15 in the BOATCB

Numbers 15 in the BOATCB2

Numbers 15 in the BOBCV

Numbers 15 in the BOCNT

Numbers 15 in the BOECS

Numbers 15 in the BOGWICC

Numbers 15 in the BOHCB

Numbers 15 in the BOHCV

Numbers 15 in the BOHLNT

Numbers 15 in the BOHNTLTAL

Numbers 15 in the BOILNTAP

Numbers 15 in the BOITCV

Numbers 15 in the BOKCV

Numbers 15 in the BOKCV2

Numbers 15 in the BOKHWOG

Numbers 15 in the BOKSSV

Numbers 15 in the BOLCB

Numbers 15 in the BOLCB2

Numbers 15 in the BOMCV

Numbers 15 in the BONAV

Numbers 15 in the BONCB

Numbers 15 in the BONLT

Numbers 15 in the BONUT2

Numbers 15 in the BOPLNT

Numbers 15 in the BOSCB

Numbers 15 in the BOSNC

Numbers 15 in the BOTLNT

Numbers 15 in the BOVCB

Numbers 15 in the BOYCB

Numbers 15 in the BPBB

Numbers 15 in the BPH

Numbers 15 in the BSB

Numbers 15 in the CCB

Numbers 15 in the CUV

Numbers 15 in the CUVS

Numbers 15 in the DBT

Numbers 15 in the DGDNT

Numbers 15 in the DHNT

Numbers 15 in the DNT

Numbers 15 in the ELBE

Numbers 15 in the EMTV

Numbers 15 in the ESV

Numbers 15 in the FBV

Numbers 15 in the FEB

Numbers 15 in the GGMNT

Numbers 15 in the GNT

Numbers 15 in the HARY

Numbers 15 in the HNT

Numbers 15 in the IRVA

Numbers 15 in the IRVB

Numbers 15 in the IRVG

Numbers 15 in the IRVH

Numbers 15 in the IRVK

Numbers 15 in the IRVM

Numbers 15 in the IRVM2

Numbers 15 in the IRVO

Numbers 15 in the IRVP

Numbers 15 in the IRVT

Numbers 15 in the IRVT2

Numbers 15 in the IRVU

Numbers 15 in the ISVN

Numbers 15 in the JSNT

Numbers 15 in the KAPI

Numbers 15 in the KBT1ETNIK

Numbers 15 in the KBV

Numbers 15 in the KJV

Numbers 15 in the KNFD

Numbers 15 in the LBA

Numbers 15 in the LBLA

Numbers 15 in the LNT

Numbers 15 in the LSV

Numbers 15 in the MAAL

Numbers 15 in the MBV

Numbers 15 in the MBV2

Numbers 15 in the MHNT

Numbers 15 in the MKNFD

Numbers 15 in the MNG

Numbers 15 in the MNT

Numbers 15 in the MNT2

Numbers 15 in the MRS1T

Numbers 15 in the NAA

Numbers 15 in the NASB

Numbers 15 in the NBLA

Numbers 15 in the NBS

Numbers 15 in the NBVTP

Numbers 15 in the NET2

Numbers 15 in the NIV11

Numbers 15 in the NNT

Numbers 15 in the NNT2

Numbers 15 in the NNT3

Numbers 15 in the PDDPT

Numbers 15 in the PFNT

Numbers 15 in the RMNT

Numbers 15 in the SBIAS

Numbers 15 in the SBIBS

Numbers 15 in the SBIBS2

Numbers 15 in the SBICS

Numbers 15 in the SBIDS

Numbers 15 in the SBIGS

Numbers 15 in the SBIHS

Numbers 15 in the SBIIS

Numbers 15 in the SBIIS2

Numbers 15 in the SBIIS3

Numbers 15 in the SBIKS

Numbers 15 in the SBIKS2

Numbers 15 in the SBIMS

Numbers 15 in the SBIOS

Numbers 15 in the SBIPS

Numbers 15 in the SBISS

Numbers 15 in the SBITS

Numbers 15 in the SBITS2

Numbers 15 in the SBITS3

Numbers 15 in the SBITS4

Numbers 15 in the SBIUS

Numbers 15 in the SBIVS

Numbers 15 in the SBT

Numbers 15 in the SBT1E

Numbers 15 in the SCHL

Numbers 15 in the SNT

Numbers 15 in the SUSU

Numbers 15 in the SUSU2

Numbers 15 in the SYNO

Numbers 15 in the TBIAOTANT

Numbers 15 in the TBT1E

Numbers 15 in the TBT1E2

Numbers 15 in the TFTIP

Numbers 15 in the TFTU

Numbers 15 in the TGNTATF3T

Numbers 15 in the THAI

Numbers 15 in the TNFD

Numbers 15 in the TNT

Numbers 15 in the TNTIK

Numbers 15 in the TNTIL

Numbers 15 in the TNTIN

Numbers 15 in the TNTIP

Numbers 15 in the TNTIZ

Numbers 15 in the TOMA

Numbers 15 in the TTENT

Numbers 15 in the UBG

Numbers 15 in the UGV

Numbers 15 in the UGV2

Numbers 15 in the UGV3

Numbers 15 in the VBL

Numbers 15 in the VDCC

Numbers 15 in the YALU

Numbers 15 in the YAPE

Numbers 15 in the YBVTP

Numbers 15 in the ZBP