Numbers 5 (BOICB)

1 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị ya, 2 “Nye ndị Izrel iwu ka ha site nʼọmụma ụlọ ikwu ha kpọpụ onye ekpenta ọbụla maọbụ onye ihe si nʼahụ na-asọpụta, na ndị merụrụ onwe ha site nʼimetụ onye nwụrụ anwụ aka. 3 Iwu a metụtara onye ọbụla, nwoke na nwanyị. Kpọpụ ha ka ha gaa nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu, ka ha ghara imerụ ogige ụlọ ikwu ha bụ ebe ahụ m binyere unu.” 4 Ndị Izrel mezuru iwu a, site nʼetiti ha kpọpụ ndị dị otu a, dịka ONYENWE ANYỊ nyere Mosis nʼiwu. 5 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị ya, 6 “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Mgbe onye ọbụla, nwoke maọbụ nwanyị, mejọrọ mmadụ ibe ya nʼụzọ ọbụla, si otu a bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye ONYENWE ANYỊ bụ onye ikpe mara. 7 Onye dị otu a aghaghị ikwupụta mmehie ya, kwụghachi onye ahụ o mejọrọ ihe iwu kwuru na ọ ga-akwụ. Ọ ga-atụkwasị nʼelu ihe ọ na-akwụghachi onye ahụ o mejọrọ ego ọzọ ruru otu ụzọ nʼụzọ ise. 8 Ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị onye ikwu ya bụ onye a ga-akwụghachi ụgwọ nʼihi mejọọ ahụ, ihe ịkwụghachi ụgwọ ahụ ga-abụ nke ONYENWE ANYỊ, aghaghị inye onye nchụaja. A ga-atụkwasịkwa ya ebule a ga-eji chụọ aja mkpuchi mmehie nʼihi onye ahụ mehiere. 9 Onyinye niile dị nsọ ndị Izrel wetaara onye nchụaja bụ nke onye nchụaja ahụ. 10 Onyinye dị nsọ niile mmadụ na-eweta bụ nke onye na-eweta ya, ma onyinye e nyere onye nchụaja bụ nke onye nchụaja.’ ” 11 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị, 12 “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, Ọ bụrụ na nwunye mmadụ ejehie ụzọ bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼebe di ya nọ 13 site nʼidinakwuru nwoke ọzọ nʼụzọ zoro ezo nʼebe di ya nọ ruo na achọpụtaghị adịghị ọcha ya (ebe a na-enweghị onye ga-agba akaebe megide ya, maọbụ na e jidere ya mgbe ọ na-akwa iko ahụ), 14 ọ bụrụ na mmụọ ekworo abịakwasị di ya, ọ bụrụkwa na di nwanyị ahụ na-enyo nwunye ya enyo, na-ele ya anya dịka onye merụrụ onwe ya, ma ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na di ya esite nʼekworo nyoo nwunye ya, ọ bụ ezie na nwanyị ahụ bụ onye na-emerụghị onwe ya, 15 nwoke a ga-akpọrọ nwunye ya bịakwute onye nchụaja. Ọ ga-eweta onyinye iji ịbịaru nso nʼihi nwunye ya, nke bụ iko ụtụ ọka balị abụọ a na-awụkwasịghị mmanụ, maọbụ ụda na-esi isi ụtọ a gwakọrọ agwakọ, nʼihi na ọ bụ onyinye mkpụrụ ọka e sitere nʼobi jupụtara nʼekworo nye, onyinye ịkpọtụ uche nʼikpe ọmụma. 16 “ ‘Onye nchụaja ga-akpọbata nwanyị a mee ka o guzo nʼihu ONYENWE ANYỊ. 17 Ọ ga-ekunye mmiri nsọ nʼime ite aja, kporo aja nʼala site nʼụlọ nzute ahụ wụnye ya nʼime mmiri ahụ. 18 Dịka nwanyị ahụ guzo nʼihu ONYENWE ANYỊ, onye nchụaja ahụ ga-atọsa agịrị isi ya, tinye onyinye mkpụrụ ọka ncheta ahụ, nke bụ onyinye mkpụrụ ọka ekworo ahụ nʼọbụaka nwanyị a. Onye nchụaja nʼonwe ya ga-eguzo nʼihu nwanyị a jide ite mmiri ilu ahụ na-eweta ọbụbụ ọnụ. 19 Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-eme ka nwanyị a ṅụọ iyi, mgbe ọ na-agwa ya okwu sị, “Ọ bụrụ na o nweghị nwoke ọbụla gị na ya nwere mmekọ, ọ bụrụ na ị kpafughị ghọọ onye na-adịghị ọcha mgbe ị nọ nʼụlọ di gị, ka ihe ọjọọ ọbụla ghara izute gị site na mmiri ilu a na-eweta ọbụbụ ọnụ. 20 Ma ọ bụrụ na ị kpafuola mgbe ị ka nọ nʼụlọ di gị, ọ bụrụ na i merụọla onwe gị site na idinakwuru nwoke ọzọ na-abụghị di gị,” 21 (nʼoge a, onye nchụaja ga-eme ka nwanyị a ṅụọ iyi nke ya na ọbụbụ ọnụ a so, gwa nwanyị okwu sị ya) “ka ONYENWE ANYỊ mee ka ndị ị nọ nʼetiti ha bụọ gị ọnụ ma kọchaa gị mgbe o mere ka apata gị ree ure, mgbe o mere ka afọ gị koo eko. 22 Ka mmiri ilu a, nke na-eweta ọbụbụ ọnụ banye gị nʼahụ ime ka afọ gị koo eko, imekwa ka akpanwa gị daa ada.”“ ‘Nwanyị ahụ ga-aza sị, “Amen, ya dịrị m otu a.” 23 “ ‘Mgbe ahụ onye nchụaja ahụ ga-ede ọbụbụ ọnụ ndị a nʼakwụkwọ, sanye ha nʼime mmiri ilu ahụ. 24 Mgbe ahụ, ọ ga-enye nwanyị a mmiri ilu ahụ na-eweta ọbụbụ ọnụ ka ọ ṅụọ, mmiri a ga-abanye ya nʼime ahụ, wetara ya ịta ahụhụ dị ilu. 25 Emesịa, onye nchụaja ga-anara nwanyị ahụ onyinye mkpụrụ ọka ekworo ahụ o ji nʼọbụaka ya, fegharịa ya nʼihu ONYENWE ANYỊ, buru ya gaa nʼebe ịchụ aja. 26 Onye nchụaja ga-esite nʼonyinye mkpụrụ ahụ kporo nke ga-eju ya aka, nke na-anọchite anya ha niile, suo ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. Emesịa, ọ ga-enye nwanyị ahụ mmiri ahụ ka ọ ṅụọ. 27 Ọ bụrụ na nwanyị a emerụọla onwe ya, bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye di ya, mgbe ọ ṅụrụ mmiri na-eweta ọbụbụ ọnụ, ọ ga-abanye nʼime ya wetara ya ahụhụ dị ilu. Afọ ya ga-eko, buo ibu, akpanwa ya a gaghị anagide nwa. Ọ ga-aghọ onye a bụrụ ọnụ nʼetiti ndị ya. 28 Ma ọ bụrụ na nwanyị emerụghị onwe ya, kama ọ bụ onye dị ọcha, ọ ga-abụ onye nwere onwe ya site nʼikpe ọmụma. Ọ ga-atụrụ ime mụta ụmụ. 29 “ ‘Nke a bụ iwu metụtara ikwo ekworo mgbe nwanyị bi nʼụlọ di ya kpafuru merụọ onwe ya. 30 Maọbụ mgbe ekworo jupụtara nwoke nʼobi nʼihi na ọ gụrụ nwunye ya dịka onye na-ekwesighị ntụkwasị obi. Onye nchụaja ga-eme ka nwanyị a guzo nʼihu ONYENWE ANYỊ, mezuokwa ihe niile nʼusoro dịka e si depụta ha nʼebe a. 31 A gaghị ama di nwanyị a ikpe dịka onye mere ihe ọjọọ, kama nwanyị a ga-ebu ahụhụ ya na mmehie ya naanị ya.’ ”

In Other Versions

Numbers 5 in the ANGEFD

Numbers 5 in the ANTPNG2D

Numbers 5 in the AS21

Numbers 5 in the BAGH

Numbers 5 in the BBPNG

Numbers 5 in the BBT1E

Numbers 5 in the BDS

Numbers 5 in the BEV

Numbers 5 in the BHAD

Numbers 5 in the BIB

Numbers 5 in the BLPT

Numbers 5 in the BNT

Numbers 5 in the BNTABOOT

Numbers 5 in the BNTLV

Numbers 5 in the BOATCB

Numbers 5 in the BOATCB2

Numbers 5 in the BOBCV

Numbers 5 in the BOCNT

Numbers 5 in the BOECS

Numbers 5 in the BOGWICC

Numbers 5 in the BOHCB

Numbers 5 in the BOHCV

Numbers 5 in the BOHLNT

Numbers 5 in the BOHNTLTAL

Numbers 5 in the BOILNTAP

Numbers 5 in the BOITCV

Numbers 5 in the BOKCV

Numbers 5 in the BOKCV2

Numbers 5 in the BOKHWOG

Numbers 5 in the BOKSSV

Numbers 5 in the BOLCB

Numbers 5 in the BOLCB2

Numbers 5 in the BOMCV

Numbers 5 in the BONAV

Numbers 5 in the BONCB

Numbers 5 in the BONLT

Numbers 5 in the BONUT2

Numbers 5 in the BOPLNT

Numbers 5 in the BOSCB

Numbers 5 in the BOSNC

Numbers 5 in the BOTLNT

Numbers 5 in the BOVCB

Numbers 5 in the BOYCB

Numbers 5 in the BPBB

Numbers 5 in the BPH

Numbers 5 in the BSB

Numbers 5 in the CCB

Numbers 5 in the CUV

Numbers 5 in the CUVS

Numbers 5 in the DBT

Numbers 5 in the DGDNT

Numbers 5 in the DHNT

Numbers 5 in the DNT

Numbers 5 in the ELBE

Numbers 5 in the EMTV

Numbers 5 in the ESV

Numbers 5 in the FBV

Numbers 5 in the FEB

Numbers 5 in the GGMNT

Numbers 5 in the GNT

Numbers 5 in the HARY

Numbers 5 in the HNT

Numbers 5 in the IRVA

Numbers 5 in the IRVB

Numbers 5 in the IRVG

Numbers 5 in the IRVH

Numbers 5 in the IRVK

Numbers 5 in the IRVM

Numbers 5 in the IRVM2

Numbers 5 in the IRVO

Numbers 5 in the IRVP

Numbers 5 in the IRVT

Numbers 5 in the IRVT2

Numbers 5 in the IRVU

Numbers 5 in the ISVN

Numbers 5 in the JSNT

Numbers 5 in the KAPI

Numbers 5 in the KBT1ETNIK

Numbers 5 in the KBV

Numbers 5 in the KJV

Numbers 5 in the KNFD

Numbers 5 in the LBA

Numbers 5 in the LBLA

Numbers 5 in the LNT

Numbers 5 in the LSV

Numbers 5 in the MAAL

Numbers 5 in the MBV

Numbers 5 in the MBV2

Numbers 5 in the MHNT

Numbers 5 in the MKNFD

Numbers 5 in the MNG

Numbers 5 in the MNT

Numbers 5 in the MNT2

Numbers 5 in the MRS1T

Numbers 5 in the NAA

Numbers 5 in the NASB

Numbers 5 in the NBLA

Numbers 5 in the NBS

Numbers 5 in the NBVTP

Numbers 5 in the NET2

Numbers 5 in the NIV11

Numbers 5 in the NNT

Numbers 5 in the NNT2

Numbers 5 in the NNT3

Numbers 5 in the PDDPT

Numbers 5 in the PFNT

Numbers 5 in the RMNT

Numbers 5 in the SBIAS

Numbers 5 in the SBIBS

Numbers 5 in the SBIBS2

Numbers 5 in the SBICS

Numbers 5 in the SBIDS

Numbers 5 in the SBIGS

Numbers 5 in the SBIHS

Numbers 5 in the SBIIS

Numbers 5 in the SBIIS2

Numbers 5 in the SBIIS3

Numbers 5 in the SBIKS

Numbers 5 in the SBIKS2

Numbers 5 in the SBIMS

Numbers 5 in the SBIOS

Numbers 5 in the SBIPS

Numbers 5 in the SBISS

Numbers 5 in the SBITS

Numbers 5 in the SBITS2

Numbers 5 in the SBITS3

Numbers 5 in the SBITS4

Numbers 5 in the SBIUS

Numbers 5 in the SBIVS

Numbers 5 in the SBT

Numbers 5 in the SBT1E

Numbers 5 in the SCHL

Numbers 5 in the SNT

Numbers 5 in the SUSU

Numbers 5 in the SUSU2

Numbers 5 in the SYNO

Numbers 5 in the TBIAOTANT

Numbers 5 in the TBT1E

Numbers 5 in the TBT1E2

Numbers 5 in the TFTIP

Numbers 5 in the TFTU

Numbers 5 in the TGNTATF3T

Numbers 5 in the THAI

Numbers 5 in the TNFD

Numbers 5 in the TNT

Numbers 5 in the TNTIK

Numbers 5 in the TNTIL

Numbers 5 in the TNTIN

Numbers 5 in the TNTIP

Numbers 5 in the TNTIZ

Numbers 5 in the TOMA

Numbers 5 in the TTENT

Numbers 5 in the UBG

Numbers 5 in the UGV

Numbers 5 in the UGV2

Numbers 5 in the UGV3

Numbers 5 in the VBL

Numbers 5 in the VDCC

Numbers 5 in the YALU

Numbers 5 in the YAPE

Numbers 5 in the YBVTP

Numbers 5 in the ZBP