Proverbs 25 (BOICB)
1 Ndị a bụkwa ilu Solomọn, nke ndị ozi Hezekaya eze ndị Juda dekọtara nʼakwụkwọ. 2 Ọ bụ nsọpụrụ Chineke izobe okwu,ma nsọpụrụ ndị eze bụ ịchọpụta ala okwu. 3 Dịka ịdị elu nke eluigwe, dịka ịdị omimi nke ala,otu a ka obi ndị eze bụ ihe a na-apụghị ịchọpụta. 4 Wepụ ihe ahụ niile na-ekpuchi mma ọlaọcha,onye ọkpụ ụzụ ọla ga-arụpụta efere; 5 wezugakwa ndịisi nʼeme ajọ ihe nʼihu eze,ocheeze ya ga-eguzosikwa ike site nʼezi omume. 6 Egosipụtala onwe gị nʼihu eze,ewerela ọnọdụ nʼetiti ndị oke mmadụ, 7 ọ ga-aka mma ma ọ bụrụ na ọ si gị, “Rigota nʼebe a,”karịa na o wedara gị ala nʼihu ndị oke mmadụ. Ihe iji anya gị abụọ hụ 8 e mekwala ngwangwa ịga nʼụlọikpe,nʼihi na ọ bụ gịnị ka ị ga-eme nʼikpeazụma ọ bụrụ nʼonye agbataobi gị etinye gị nʼọnọdụ ihere? 9 Ọ bụrụ na gị na onye ọzọ enwee esemokwu, dozienụ ya nʼonwe unu,emekwala ka ndị ọzọ mata okwu nzuzo gị na onye ọzọ kwuru, 10 ma ọ bụghị ya, onye nụrụ ya nwere ike menye gị ihere,agwa ọjọọ gị agaghị enwekwa ọgwụgwụ. 11 Ndụmọdụ e nyere nʼoge kwesiri ekwesidị ka mkpụrụ osisi apụl ọlaedo e tinyere nʼefere ọlaọcha. 12 Dịka ọlantị ọlaedo maọbụ ihe ịchọ mma nke ọlaedo mara mmaka mba onye maara ihe bụ na ntị onye na-anụ ya. 13 Onyeozi kwesiri ntụkwasị obi na-eweta ntute na ndụ,dịka mmiri oyi si eme ka ahụ dị jụụnʼoge okpomọkụ owuwe ihe ubi. 14 Onye ahụ na-adịghị emezu nkwa o kweredịka igwe ojii nke na-adịghị ezo mmiri. 15 Nwee ndidi, nʼikpeazụ ị ga-enwe mmeri,nʼihi na ire dị nro na-agbaji ọkpụkpụ. 16 Mmanụ aṅụ ọ na-atọ gị ụtọ?Arachala ya karịa, ka ọ ghara iwetara gị ọrịa. 17 Ejela ileta onye agbataobi gị mgbe mgbe,ka ị ghara ire ugwu gị. 18 Onye na-agbagịde onye agbataobi ya ama ụgha,dịka mkpọrọ osisi maọbụ mma agha, maọbụ àkụ a pịziri apịzi. 19 Ịtụkwasị onye aghụghọ obi nʼoge nsogbu dị ka iji eze na-eme ndakapụ ata ihe,maọbụ iji ụkwụ jiri eji agba ọsọ. 20 Dịka onye e yipụrụ uwe nʼụbọchị oyi ụgụrụ,maọbụ iwere nnu tee nʼelu ọnya,otu a ka onye na-abụrụ onye iwe na-ewe abụ dị. 21 Ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, nye ya nri ka o rie,ọ bụrụkwa na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ya mmiri ka ọ ṅụọ. 22 Mgbe ị na-eme nke a, ị na-agụkwasị icheku ọkụ na-ere ere nʼisi ya, ONYENWE ANYỊ ga-akwụghachikwa gị. 23 Dịka ifufe si nʼugwu si eweta mmiri ozuzo,otu a ka ikwu mmadụ okwu azụ si eweta iwe. 24 Ọ ka mma ibi nʼotu akụkụ elu ụlọkarịa ibinyere nwanyị na-ese okwu. 25 Oziọma e sitere na mba dị anya natadị ka mmiri jụrụ oyi nye onye akpịrị na-akpọ nkụ. 26 Onye ezi omume nke kwenyere nʼihe onye na-emebi iwu kwurudị ka iyi a gwọrụrụ nʼisi ya. 27 Dịka ịracha mmanụ aṅụ hie nne si jọọ njọ,otu a ka o si bụrụ ihe na-enweghị nsọpụrụ, mmadụ ịchọpụta ihe ndị ezomiri ezomi. 28 Nwoke ọbụla na-adịghị achị mmụọ yadị ka obodo na-enweghị ndị na-eche ya nche, nke e tikpọrọ mgbidi ya etikpọ.
In Other Versions
Proverbs 25 in the ANGEFD
Proverbs 25 in the ANTPNG2D
Proverbs 25 in the AS21
Proverbs 25 in the BAGH
Proverbs 25 in the BBPNG
Proverbs 25 in the BBT1E
Proverbs 25 in the BDS
Proverbs 25 in the BEV
Proverbs 25 in the BHAD
Proverbs 25 in the BIB
Proverbs 25 in the BLPT
Proverbs 25 in the BNT
Proverbs 25 in the BNTABOOT
Proverbs 25 in the BNTLV
Proverbs 25 in the BOATCB
Proverbs 25 in the BOATCB2
Proverbs 25 in the BOBCV
Proverbs 25 in the BOCNT
Proverbs 25 in the BOECS
Proverbs 25 in the BOGWICC
Proverbs 25 in the BOHCB
Proverbs 25 in the BOHCV
Proverbs 25 in the BOHLNT
Proverbs 25 in the BOHNTLTAL
Proverbs 25 in the BOILNTAP
Proverbs 25 in the BOITCV
Proverbs 25 in the BOKCV
Proverbs 25 in the BOKCV2
Proverbs 25 in the BOKHWOG
Proverbs 25 in the BOKSSV
Proverbs 25 in the BOLCB
Proverbs 25 in the BOLCB2
Proverbs 25 in the BOMCV
Proverbs 25 in the BONAV
Proverbs 25 in the BONCB
Proverbs 25 in the BONLT
Proverbs 25 in the BONUT2
Proverbs 25 in the BOPLNT
Proverbs 25 in the BOSCB
Proverbs 25 in the BOSNC
Proverbs 25 in the BOTLNT
Proverbs 25 in the BOVCB
Proverbs 25 in the BOYCB
Proverbs 25 in the BPBB
Proverbs 25 in the BPH
Proverbs 25 in the BSB
Proverbs 25 in the CCB
Proverbs 25 in the CUV
Proverbs 25 in the CUVS
Proverbs 25 in the DBT
Proverbs 25 in the DGDNT
Proverbs 25 in the DHNT
Proverbs 25 in the DNT
Proverbs 25 in the ELBE
Proverbs 25 in the EMTV
Proverbs 25 in the ESV
Proverbs 25 in the FBV
Proverbs 25 in the FEB
Proverbs 25 in the GGMNT
Proverbs 25 in the GNT
Proverbs 25 in the HARY
Proverbs 25 in the HNT
Proverbs 25 in the IRVA
Proverbs 25 in the IRVB
Proverbs 25 in the IRVG
Proverbs 25 in the IRVH
Proverbs 25 in the IRVK
Proverbs 25 in the IRVM
Proverbs 25 in the IRVM2
Proverbs 25 in the IRVO
Proverbs 25 in the IRVP
Proverbs 25 in the IRVT
Proverbs 25 in the IRVT2
Proverbs 25 in the IRVU
Proverbs 25 in the ISVN
Proverbs 25 in the JSNT
Proverbs 25 in the KAPI
Proverbs 25 in the KBT1ETNIK
Proverbs 25 in the KBV
Proverbs 25 in the KJV
Proverbs 25 in the KNFD
Proverbs 25 in the LBA
Proverbs 25 in the LBLA
Proverbs 25 in the LNT
Proverbs 25 in the LSV
Proverbs 25 in the MAAL
Proverbs 25 in the MBV
Proverbs 25 in the MBV2
Proverbs 25 in the MHNT
Proverbs 25 in the MKNFD
Proverbs 25 in the MNG
Proverbs 25 in the MNT
Proverbs 25 in the MNT2
Proverbs 25 in the MRS1T
Proverbs 25 in the NAA
Proverbs 25 in the NASB
Proverbs 25 in the NBLA
Proverbs 25 in the NBS
Proverbs 25 in the NBVTP
Proverbs 25 in the NET2
Proverbs 25 in the NIV11
Proverbs 25 in the NNT
Proverbs 25 in the NNT2
Proverbs 25 in the NNT3
Proverbs 25 in the PDDPT
Proverbs 25 in the PFNT
Proverbs 25 in the RMNT
Proverbs 25 in the SBIAS
Proverbs 25 in the SBIBS
Proverbs 25 in the SBIBS2
Proverbs 25 in the SBICS
Proverbs 25 in the SBIDS
Proverbs 25 in the SBIGS
Proverbs 25 in the SBIHS
Proverbs 25 in the SBIIS
Proverbs 25 in the SBIIS2
Proverbs 25 in the SBIIS3
Proverbs 25 in the SBIKS
Proverbs 25 in the SBIKS2
Proverbs 25 in the SBIMS
Proverbs 25 in the SBIOS
Proverbs 25 in the SBIPS
Proverbs 25 in the SBISS
Proverbs 25 in the SBITS
Proverbs 25 in the SBITS2
Proverbs 25 in the SBITS3
Proverbs 25 in the SBITS4
Proverbs 25 in the SBIUS
Proverbs 25 in the SBIVS
Proverbs 25 in the SBT
Proverbs 25 in the SBT1E
Proverbs 25 in the SCHL
Proverbs 25 in the SNT
Proverbs 25 in the SUSU
Proverbs 25 in the SUSU2
Proverbs 25 in the SYNO
Proverbs 25 in the TBIAOTANT
Proverbs 25 in the TBT1E
Proverbs 25 in the TBT1E2
Proverbs 25 in the TFTIP
Proverbs 25 in the TFTU
Proverbs 25 in the TGNTATF3T
Proverbs 25 in the THAI
Proverbs 25 in the TNFD
Proverbs 25 in the TNT
Proverbs 25 in the TNTIK
Proverbs 25 in the TNTIL
Proverbs 25 in the TNTIN
Proverbs 25 in the TNTIP
Proverbs 25 in the TNTIZ
Proverbs 25 in the TOMA
Proverbs 25 in the TTENT
Proverbs 25 in the UBG
Proverbs 25 in the UGV
Proverbs 25 in the UGV2
Proverbs 25 in the UGV3
Proverbs 25 in the VBL
Proverbs 25 in the VDCC
Proverbs 25 in the YALU
Proverbs 25 in the YAPE
Proverbs 25 in the YBVTP
Proverbs 25 in the ZBP