Psalms 12 (BOICB)
undefined Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro Sheminit. Abụ Ọma nke Devid. 1 ONYENWE ANYỊ, nyere anyị aka! Nʼihi na ndị ezi omume agwụla!Ndị kwesiri ntụkwasị obi anọkwaghị nʼetiti ụmụ mmadụ. 2 O nwekwaghị onye eziokwu dị nʼọnụ ya nye onye agbataobi ya.Egbugbere ọnụ onye ọbụla na-ekwukwa okwu ire ụtọ,maọbụ aghụghọ dị nʼobi ha. 3 Ka ONYENWE ANYỊ wezuga egbugbere ọnụ niile na-ekwu okwu ire ụtọna ire niile na-ekwu okwu ịnya isi. 4 Ndị na-asị,“Ọ bụ site nʼire anyị ka anyị ga-enwe mmeri;egbugbere ọnụ anyị ga-echebe anyị, ọ bụ onye na-achị anyị?” 5 “Nʼihi na a na-apụnara ndị ogbenye ihe nʼihi ndị nọ na mkpa na-asụ ude,aga m ebili ugbu a, ka ONYENWE ANYỊ kwuru.Aga m zọpụta ha pụọ nʼaka ndị ahụ ji iwe ekwulu ha.” 6 Okwu ọnụ ONYENWE ANYỊ niile zuruoke,ha dịka ọlaọcha a nụchara nʼọkụ,nke a nụchara ugboro asaa. 7 O ONYENWE ANYỊ, i ga-edebe anyị nʼudoma sitekwa nʼaka ndị dị otu a chebe anyị ruo mgbe ebighị ebi. 8 Ndị ajọ omume na-ejegharị nʼebe niilemgbe a na-eto ihe ọjọọ nʼetiti ụmụ mmadụ.