Psalms 128 (BOICB)
undefined Abụ nrigo. 1 Ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụ egwu ONYENWE ANYỊ,ndị na-aga ije nʼirube isi nye ya. 2 Ị ga-eri mkpụrụ ọrụ aka gị;ọtụtụ ngọzị na ihe ịga nke ọma ga-abụ nke gị. 3 Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịnịna-amị mkpụrụ nʼime ụlọ gị;ụmụ gị ndị ikom ga-adịkwa ka ome osisi olivgburugburu tebul gị. 4 Otu a ka a ga-esi gọzie nwoke ahụna-atụ egwu ONYENWE ANYỊ. 5 Ka ONYENWE ANYỊ gọzie gị site na Zayọnụbọchị niile nke ndụ gị;ka i hụkwa ọdịmma Jerusalem, 6 ka ị dị ndụ hụ ụmụ ụmụ gị.Ka udo dịrị Izrel.