Psalms 150 (BOICB)
1 Toonu ONYENWE ANYỊ. Toonu Chineke nʼime ụlọnsọ ya.Toonu ya, na mbara igwe nke ike ya. 2 Toonu ya, nʼihi ọrụ niile ọ rụrụ site nʼike ya.Toonu ya, nʼihi ịdị ukwuu ya nke kachasị ịdị ukwuu niile. 3 Werenụ opi ike too ya,werekwanụ ụbọ akwara na une too ya, 4 jirinụ ihe iti egwu na ite egwu too ya,jirikwanụ ụbọ akwara dị iche iche na ọja too ya, 5 werenụ ogene too ya,werekwanụ ogene na-ada oke ụda too ya. 6 Ka ihe niile na-eku ume too ONYENWE ANYỊ. Toonu ONYENWE ANYỊ.