Psalms 23 (BOICB)
undefined Abụ Ọma Devid. 1 ONYENWE ANYỊ na-azụ m dịka atụrụ, ọ dịghị ihe akọrọ m. 2 Ọ na-eme ka m dinaa ala nʼebe ahịhịa ndụ na-eto,ọ na-edugharị m nʼakụkụ mmiri dị jụụ, 3 ọ na-atụte mkpụrụobi m.Ọ na-edu m nʼụzọ niile nke ezi omumenʼihi aha ya. 4 A sịkwarị na m na-aga ije,na ndagwurugwu nke ọchịchịrị ọnwụ,agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla;nʼihi na ị nọnyeere m,mkpọrọ gị na mkpanaka gịna-akasị m obi. 5 Ị na-akwado tebul nʼihu m,nʼanya ndị iro m.I tere isi m mmanụiko m na-ejubiga oke. 6 Nʼezie, ịdị mma na ebere ga-agbaso mogologo ụbọchị niile nke ndụ m,m ga-ebikwa nʼụlọ ONYENWE ANYỊmgbe niile ebighị ebi.