Psalms 3 (BOICB)
undefined Abụ Ọma Devid. Nke o dere mgbe o si nʼihu Absalọm gbapụ ọsọ ndụ. 1 O ONYENWE ANYỊ, ọnụọgụgụ ndị iro m dị ọtụtụ.Ọtụtụ ndị mmadụ na-ebili imegide m. 2 Ọtụtụ nʼime ha na-ekwu banyere m sị,“Chineke agaghị azọpụta ya.” Sela 3 Ma gị, ONYENWE ANYỊ bụ ọta na-ekpuchi m;I na-ebuli isi m elu na-eme ka m bụrụ onye nwere nsọpụrụ. 4 Etikuru m ONYENWE ANYỊ mkpu akwa,ọ nụkwara olu m, sitekwa nʼugwu nsọ ya za m. Sela 5 Edinara m ala, hie ụra,ma bilikwa nʼụtụtụ nʼudo, nʼihi na ONYENWE ANYỊ na-eche m nche. 6 A sịkwa na iri puku kwụrụ puku ndị iro agbaa m gburugburu,agaghị m atụ egwu ọbụla. 7 Bilie ONYENWE ANYỊ!Zọpụta m Chineke m!Tie ndị iro m niile aka nʼagba;tipụkwa ndị ajọ omume eze nʼọnụ. 8 Nʼihi na nzọpụta na-esite nʼebe ONYENWE ANYỊ nọ na-abịa.Ka ngọzị gị dịịrị ndị gị niile. Sela