Psalms 35 (BOICB)

undefined Abụ Ọma Devid. 1 O ONYENWE ANYỊ, lụso ha ọgụ bụ ndị na-alụso m ọgụ;buso ha agha bụ ndị na-ebuso m agha. 2 Yikwasị uwe agha gị, werekwa ọta gị;bilie bịa nyere m aka. 3 Sepụta ùbe gị na anyụike agha gị;bịa zute ndị na-achụ m ọsọ.Gwa mkpụrụobi m,“Abụ m nzọpụta gị.” 4 Mee ka ihere meendị niile na-agbalịsị ike igbu m.Ka ndị na-agba izuzu igbu m bụrụkwa ndị a chụghachiri azụ,na ndị ihere mere. 5 Ka ha dịka igbugbo ọka mgbe oke ifufe na-efe,ka mmụọ ozi ONYENWE ANYỊ bụrụ onye na-achụfu ha. 6 Mee ka ụzọ ha gbaa ọchịchịrị, bụrụkwa ebe na-amị amị;ka mmụọ ozi ONYENWE ANYỊ bụrụ onye na-achụ ha ọsọ. 7 Ọ bụ ezie na ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere ha,ma ha siere m ọnya, gwukwaara m olulu nʼụzọ m. 8 Ka mbibi bịakwasị ha na mberede,ka ụgbụ ha zobeere m kee ha;ka ha lakwaa nʼiyi site nʼidaba nʼolulu ahụ ha gwuru. 9 Mgbe ahụ, mkpụrụobi m ga-aṅụrị ọṅụ na ONYENWE ANYỊ,ọ ga-enwekwa obi ụtọ nʼime nzọpụta ya. 10 Ihe niile dị nʼime m ga-eti mkpu sị,“O ONYENWE ANYỊ, ọ bụ onye dịka gị?Ị na-agbapụta ndị na-adịghị ike site nʼaka ndị dị ike karịa ha,ma na-anapụta ndị ogbenye ndị chọrọ enyemaka site nʼaka ndị na-apụnara ha ihe ha nwere nʼike.” 11 Ndị akaebe, ndị kwara obi nʼazụ na-apụkwute m;ha na-ebo m ebubo ihe ndị m na-anụbeghị ihe banyere ha na mbụ. 12 Ana m emere ha ihe ọma, ma ha na-akwụghachi m ihe ọjọọ.Nke a na-ewute mmụọ m ruo nʼọnwụ. 13 Mgbe ha na-arịa ọrịa, eyiri m akwa mkpe,site na ibu ọnụ weda onwe m nʼala.Mgbe ekpere m lọghachikwutere m na-enweghị ọsịsa, 14 ejegharịrị m nʼọnọdụ iru ụjụ,dịka a ga-asị na ọ bụ nwanne m, maọbụ enyi m,jegharịakwa nʼobi ọjọọ dịka a ga-asịna ọ bụ nne m na-arịa ọrịa ahụ. 15 Ma mgbe m dahiere, ha zukọtara na-aṅụrị ọṅụ;mgbe m na-adịghị ele anya, ha biliri imegide m.Ha na-ekwulu m na-esepụghị aka. 16 Dịka ndị ajọ omume, ha na-akwa m emo nʼiwe,na-atakwara m ikikere eze ha. 17 O Onyenwe anyị, ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-ele ihe na-eme?Gbapụta ndụ m site na mbibi ha niile,site nʼaka ụmụ ọdụm ndị a, gbapụta ndụ m dị oke ọnụahịa. 18 Aga m enye gị ekele nʼihu ọha mmadụ dị ukwuu,nʼetiti ọha kachasị ibe ya dị ukwuu, ka m ga-anọ too gị. 19 Ekwekwala ka ndị ahụ bụ ndị iro m,mgbe o nweghị ihe m mere ha, chịa m ọchị;ekwekwala ka ndị ahụ kpọrọ m asị nʼihi iro,mgbe o nweghị ihe m mere ha nwee izuike. 20 Nʼihi na ọ bụghị okwu udo ka ha na-ekwu,kama ha na-echepụta ebubo ụgha dị iche ichemegide ndị ahụ na-anọrọ onwe ha jụụ nʼime ala ahụ. 21 Nʼiju anya, ha na-ele m anya na-eti mkpu na-asị,“Ewoo! Ewoo! Anya anyị abụọ ka anyị ji hụ ya.” 22 O ONYENWE ANYỊ, ị hụla nke a, agbakwala nkịtị;anọkwala m nʼebe dị anya, O Onyenwe anyị. 23 Teta, bilie bụụrụ m onye mkpepụta m.Kpechitere m ọnụ m, Chineke m na onyenwe m. 24 O ONYENWE ANYỊ Chineke m, kpepụta m nʼihi ezi omume gị;ekwekwala ka ha chịa m ọchị. 25 Ekwekwala ka ha sị, “Ahaa, ọ dị ka anyị tụrụ anya ya!”Maọbụ sị, “Anyị eloola ya!” 26 Mee ka ihere na ọgbaagharabụrụ nke ndị na-achị m ọchị nʼime mkpagbu m;were ihere na nweda nʼala yinye ha dịka uwe,bụ ndị niile na-ebuli onwe ha elu imegide m. 27 Ka ndị niile mkpepụta m dị mmawere obi ụtọ tie mkpu ọṅụ;ka ha na-asị mgbe niile, “Ka e bulie ONYENWE ANYỊ elu,onye ọdịmma nke ohu ya na-amasị.” 28 Ire m ga-ekwu banyere ezi omume gịna otuto gị niile ogologo ụbọchị niile.

In Other Versions

Psalms 35 in the ANGEFD

Psalms 35 in the ANTPNG2D

Psalms 35 in the AS21

Psalms 35 in the BAGH

Psalms 35 in the BBPNG

Psalms 35 in the BBT1E

Psalms 35 in the BDS

Psalms 35 in the BEV

Psalms 35 in the BHAD

Psalms 35 in the BIB

Psalms 35 in the BLPT

Psalms 35 in the BNT

Psalms 35 in the BNTABOOT

Psalms 35 in the BNTLV

Psalms 35 in the BOATCB

Psalms 35 in the BOATCB2

Psalms 35 in the BOBCV

Psalms 35 in the BOCNT

Psalms 35 in the BOECS

Psalms 35 in the BOGWICC

Psalms 35 in the BOHCB

Psalms 35 in the BOHCV

Psalms 35 in the BOHLNT

Psalms 35 in the BOHNTLTAL

Psalms 35 in the BOILNTAP

Psalms 35 in the BOITCV

Psalms 35 in the BOKCV

Psalms 35 in the BOKCV2

Psalms 35 in the BOKHWOG

Psalms 35 in the BOKSSV

Psalms 35 in the BOLCB

Psalms 35 in the BOLCB2

Psalms 35 in the BOMCV

Psalms 35 in the BONAV

Psalms 35 in the BONCB

Psalms 35 in the BONLT

Psalms 35 in the BONUT2

Psalms 35 in the BOPLNT

Psalms 35 in the BOSCB

Psalms 35 in the BOSNC

Psalms 35 in the BOTLNT

Psalms 35 in the BOVCB

Psalms 35 in the BOYCB

Psalms 35 in the BPBB

Psalms 35 in the BPH

Psalms 35 in the BSB

Psalms 35 in the CCB

Psalms 35 in the CUV

Psalms 35 in the CUVS

Psalms 35 in the DBT

Psalms 35 in the DGDNT

Psalms 35 in the DHNT

Psalms 35 in the DNT

Psalms 35 in the ELBE

Psalms 35 in the EMTV

Psalms 35 in the ESV

Psalms 35 in the FBV

Psalms 35 in the FEB

Psalms 35 in the GGMNT

Psalms 35 in the GNT

Psalms 35 in the HARY

Psalms 35 in the HNT

Psalms 35 in the IRVA

Psalms 35 in the IRVB

Psalms 35 in the IRVG

Psalms 35 in the IRVH

Psalms 35 in the IRVK

Psalms 35 in the IRVM

Psalms 35 in the IRVM2

Psalms 35 in the IRVO

Psalms 35 in the IRVP

Psalms 35 in the IRVT

Psalms 35 in the IRVT2

Psalms 35 in the IRVU

Psalms 35 in the ISVN

Psalms 35 in the JSNT

Psalms 35 in the KAPI

Psalms 35 in the KBT1ETNIK

Psalms 35 in the KBV

Psalms 35 in the KJV

Psalms 35 in the KNFD

Psalms 35 in the LBA

Psalms 35 in the LBLA

Psalms 35 in the LNT

Psalms 35 in the LSV

Psalms 35 in the MAAL

Psalms 35 in the MBV

Psalms 35 in the MBV2

Psalms 35 in the MHNT

Psalms 35 in the MKNFD

Psalms 35 in the MNG

Psalms 35 in the MNT

Psalms 35 in the MNT2

Psalms 35 in the MRS1T

Psalms 35 in the NAA

Psalms 35 in the NASB

Psalms 35 in the NBLA

Psalms 35 in the NBS

Psalms 35 in the NBVTP

Psalms 35 in the NET2

Psalms 35 in the NIV11

Psalms 35 in the NNT

Psalms 35 in the NNT2

Psalms 35 in the NNT3

Psalms 35 in the PDDPT

Psalms 35 in the PFNT

Psalms 35 in the RMNT

Psalms 35 in the SBIAS

Psalms 35 in the SBIBS

Psalms 35 in the SBIBS2

Psalms 35 in the SBICS

Psalms 35 in the SBIDS

Psalms 35 in the SBIGS

Psalms 35 in the SBIHS

Psalms 35 in the SBIIS

Psalms 35 in the SBIIS2

Psalms 35 in the SBIIS3

Psalms 35 in the SBIKS

Psalms 35 in the SBIKS2

Psalms 35 in the SBIMS

Psalms 35 in the SBIOS

Psalms 35 in the SBIPS

Psalms 35 in the SBISS

Psalms 35 in the SBITS

Psalms 35 in the SBITS2

Psalms 35 in the SBITS3

Psalms 35 in the SBITS4

Psalms 35 in the SBIUS

Psalms 35 in the SBIVS

Psalms 35 in the SBT

Psalms 35 in the SBT1E

Psalms 35 in the SCHL

Psalms 35 in the SNT

Psalms 35 in the SUSU

Psalms 35 in the SUSU2

Psalms 35 in the SYNO

Psalms 35 in the TBIAOTANT

Psalms 35 in the TBT1E

Psalms 35 in the TBT1E2

Psalms 35 in the TFTIP

Psalms 35 in the TFTU

Psalms 35 in the TGNTATF3T

Psalms 35 in the THAI

Psalms 35 in the TNFD

Psalms 35 in the TNT

Psalms 35 in the TNTIK

Psalms 35 in the TNTIL

Psalms 35 in the TNTIN

Psalms 35 in the TNTIP

Psalms 35 in the TNTIZ

Psalms 35 in the TOMA

Psalms 35 in the TTENT

Psalms 35 in the UBG

Psalms 35 in the UGV

Psalms 35 in the UGV2

Psalms 35 in the UGV3

Psalms 35 in the VBL

Psalms 35 in the VDCC

Psalms 35 in the YALU

Psalms 35 in the YAPE

Psalms 35 in the YBVTP

Psalms 35 in the ZBP