Ruth 4 (BOICB)

1 Ya mere, Boaz pụrụ gaa nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ, nọdụ ala nʼebe ahụ. Ọ dịghị anya onye mgbapụta ahụ dị nso nke Boaz kwuru okwu banyere ya si nʼebe ahụ na-agafe. Boaz kpọrọ ya sị, “Enyi m bịa nọdụ ala.” Ọ bịara nọdụ ala. 2 Boaz kpọrọ mmadụ iri, ndị bụ ndị okenye obodo ahụ, gwa ha, “Nọdụnụ ala nʼebe a.” Ha mere otu ahụ. 3 Mgbe ahụ, ọ gwara nwoke onye mgbapụta ahụ dị nso sị, “Naomi, onye si nʼala ndị Moab lọta, na-achọ ire ala nwanna anyị nwoke Elimelek. 4 Ahụrụ m na o kwesiri ka m buru ụzọ gwa gị ka ị zụọ ya nʼihu ndị a nọ ọdụ nʼebe a, na nʼihu ndị okenye obodo anyị. Ọ bụrụ na ị ga-agbara ya, gwa m, ọ bụrụkwanụ na ị gaghị agbara ya, gwa m, ka m mara ihe m ga-eme. Nʼihi na ọ bụ gị ka ọ dịrị ịgbapụta ya. Mụ onwe m na-esote gị.”Ọ zara sị, “Aga m agbapụta ya.” 5 Mgbe ahụ, Boaz sịrị, “Nʼụbọchị ị ga-azụrụ ala ahụ site nʼaka Naomi ka ị ga-enwetakwa Rut onye Moab bụ nwunye onye ahụ nwụrụ anwụ, ime ka aha onye ahụ nwụrụ anwụ na ihe nketa ya na-adịgide.” 6 Na nke a, onye nchekwa mgbapụta ahụ sịrị, “Apụghị m ịgbapụta ya nʼihi na e nwere m ike itinye ihe nketa m na nsogbu. Gị onwe gị gbapụta ya. Nke a agaghị ekwe m omume.” 7 Na mgbe ochie nʼala Izrel, ime ka mgbapụta ihe na iwefe ihe site nʼaka baa nʼaka zuo oke, otu onye ga-eyipụ akpụkpọụkwụ ya were ya nye onye nke ọzọ. Otu a ka e si ekpebi okwu gbasara orire na ọzụzụ, na-ime ka ihe ndị ọzọ guzosie ike nʼala Izrel. 8 Nʼihi ya, mgbe nwoke ahụ gwara Boaz sị ya, “Zụrụ ala ahụ nʼonwe gị,” o yipụtara akpụkpọụkwụ ya. 9 Mgbe ahụ, Boaz kwupụtara na ntị ndị okenye ndị ahụ na ndị mmadụ nọ nʼebe ahụ sị ha, “Unu bụ ndị akaebe na esitela m nʼaka Naomi zụrụ ala niile Elimelek, na Kilịọn na Mahlọn nwere. 10 Azụrụkwala m Rut onye Moab, nwunye Mahlọn ka ọ bụrụ nwunye m, ime ka aha onye nwụrụ anwụ na ihe nketa ya na-adịgide, ka aha ha hapụ ifu nʼetiti ndị ikwu ya maọbụ site nʼobodo ebe amụrụ ya. Taa unu niile bụ ndị akaebe m.” 11 Mgbe ahụ, ndị okenye na ndị niile nọ nʼọnụ ụzọ ama kwuru sị, “Anyị bụ ndị akaebe. Ka ONYENWE ANYỊ mee nwanyị a na-abata nʼezinaụlọ gị ka ọ dịrị ka Rechel na Lịa, ndị ebo Izrel niile sitere na ha pụta! Ka ị bụrụkwa ọgaranya nʼagbụrụ Efrata, ghọọkwa onye a ma ama na Betlehem. 12 Site nʼụmụ ONYENWE ANYỊ ga-enye gị site na nwanyị a, ka ezinaụlọ gị dịrị ka nke Perez onye Tama mụụrụ Juda.” 13 Boaz kpọọrọ Rut ka ọ bụrụ nwunye ya. Mgbe ya na Rut dinakọrọ, ONYENWE ANYỊ nyeere ya aka ịtụrụ ime. Ọ mụkwara nwa nwoke. 14 Mgbe ahụ, ndị inyom obodo ahụ bịakwutere Naomi sị ya, “Onye a gọziri agọzi ka ONYENWE ANYỊ bụ, onye na-agbawaghị gị aka onye agbụrụ mgbapụta dị nso. Ka aha ya bụrụ ihe ga-ada ụda nʼala Izrel niile. 15 Ya wetakwara gị ntute na ndụ gị ma bụrụkwa onye ga-azụ gị nʼisi awọ gị. Nʼihi na nwunye nwa gị, onye hụrụ gị nʼanya, onye baara gị uru karịa ndị ikom asaa, amụọrala gị nwa nwoke.” 16 Naomi kuuru nwantakịrị ahụ, jikụọ ya nʼapata ya, lekọtaa ya. 17 Ndị inyom ndị agbataobi ya sịrị, “Ugbu a, nʼikpeazụ, Naomi enwetala nwa nwoke ọzọ!” Ha gụrụ ya Obed. Ọ bụkwa onye ahụ bụ nna Jesi, onye bụ nna Devid. 18 Nke a bụ usoro ndị a mụrụ site na Perez. Perez mụrụ Hezrọn 19 Hezrọn mụrụ RamRam mụrụ Aminadab 20 Aminadab mụrụ NashọnNashọn mụrụ Salmọn 21 Salmọn mụrụ BoazBoaz mụrụ Obed 22 Obed mụrụ JesiJesi mụrụ Devid.

In Other Versions

Ruth 4 in the ANGEFD

Ruth 4 in the ANTPNG2D

Ruth 4 in the AS21

Ruth 4 in the BAGH

Ruth 4 in the BBPNG

Ruth 4 in the BBT1E

Ruth 4 in the BDS

Ruth 4 in the BEV

Ruth 4 in the BHAD

Ruth 4 in the BIB

Ruth 4 in the BLPT

Ruth 4 in the BNT

Ruth 4 in the BNTABOOT

Ruth 4 in the BNTLV

Ruth 4 in the BOATCB

Ruth 4 in the BOATCB2

Ruth 4 in the BOBCV

Ruth 4 in the BOCNT

Ruth 4 in the BOECS

Ruth 4 in the BOGWICC

Ruth 4 in the BOHCB

Ruth 4 in the BOHCV

Ruth 4 in the BOHLNT

Ruth 4 in the BOHNTLTAL

Ruth 4 in the BOILNTAP

Ruth 4 in the BOITCV

Ruth 4 in the BOKCV

Ruth 4 in the BOKCV2

Ruth 4 in the BOKHWOG

Ruth 4 in the BOKSSV

Ruth 4 in the BOLCB

Ruth 4 in the BOLCB2

Ruth 4 in the BOMCV

Ruth 4 in the BONAV

Ruth 4 in the BONCB

Ruth 4 in the BONLT

Ruth 4 in the BONUT2

Ruth 4 in the BOPLNT

Ruth 4 in the BOSCB

Ruth 4 in the BOSNC

Ruth 4 in the BOTLNT

Ruth 4 in the BOVCB

Ruth 4 in the BOYCB

Ruth 4 in the BPBB

Ruth 4 in the BPH

Ruth 4 in the BSB

Ruth 4 in the CCB

Ruth 4 in the CUV

Ruth 4 in the CUVS

Ruth 4 in the DBT

Ruth 4 in the DGDNT

Ruth 4 in the DHNT

Ruth 4 in the DNT

Ruth 4 in the ELBE

Ruth 4 in the EMTV

Ruth 4 in the ESV

Ruth 4 in the FBV

Ruth 4 in the FEB

Ruth 4 in the GGMNT

Ruth 4 in the GNT

Ruth 4 in the HARY

Ruth 4 in the HNT

Ruth 4 in the IRVA

Ruth 4 in the IRVB

Ruth 4 in the IRVG

Ruth 4 in the IRVH

Ruth 4 in the IRVK

Ruth 4 in the IRVM

Ruth 4 in the IRVM2

Ruth 4 in the IRVO

Ruth 4 in the IRVP

Ruth 4 in the IRVT

Ruth 4 in the IRVT2

Ruth 4 in the IRVU

Ruth 4 in the ISVN

Ruth 4 in the JSNT

Ruth 4 in the KAPI

Ruth 4 in the KBT1ETNIK

Ruth 4 in the KBV

Ruth 4 in the KJV

Ruth 4 in the KNFD

Ruth 4 in the LBA

Ruth 4 in the LBLA

Ruth 4 in the LNT

Ruth 4 in the LSV

Ruth 4 in the MAAL

Ruth 4 in the MBV

Ruth 4 in the MBV2

Ruth 4 in the MHNT

Ruth 4 in the MKNFD

Ruth 4 in the MNG

Ruth 4 in the MNT

Ruth 4 in the MNT2

Ruth 4 in the MRS1T

Ruth 4 in the NAA

Ruth 4 in the NASB

Ruth 4 in the NBLA

Ruth 4 in the NBS

Ruth 4 in the NBVTP

Ruth 4 in the NET2

Ruth 4 in the NIV11

Ruth 4 in the NNT

Ruth 4 in the NNT2

Ruth 4 in the NNT3

Ruth 4 in the PDDPT

Ruth 4 in the PFNT

Ruth 4 in the RMNT

Ruth 4 in the SBIAS

Ruth 4 in the SBIBS

Ruth 4 in the SBIBS2

Ruth 4 in the SBICS

Ruth 4 in the SBIDS

Ruth 4 in the SBIGS

Ruth 4 in the SBIHS

Ruth 4 in the SBIIS

Ruth 4 in the SBIIS2

Ruth 4 in the SBIIS3

Ruth 4 in the SBIKS

Ruth 4 in the SBIKS2

Ruth 4 in the SBIMS

Ruth 4 in the SBIOS

Ruth 4 in the SBIPS

Ruth 4 in the SBISS

Ruth 4 in the SBITS

Ruth 4 in the SBITS2

Ruth 4 in the SBITS3

Ruth 4 in the SBITS4

Ruth 4 in the SBIUS

Ruth 4 in the SBIVS

Ruth 4 in the SBT

Ruth 4 in the SBT1E

Ruth 4 in the SCHL

Ruth 4 in the SNT

Ruth 4 in the SUSU

Ruth 4 in the SUSU2

Ruth 4 in the SYNO

Ruth 4 in the TBIAOTANT

Ruth 4 in the TBT1E

Ruth 4 in the TBT1E2

Ruth 4 in the TFTIP

Ruth 4 in the TFTU

Ruth 4 in the TGNTATF3T

Ruth 4 in the THAI

Ruth 4 in the TNFD

Ruth 4 in the TNT

Ruth 4 in the TNTIK

Ruth 4 in the TNTIL

Ruth 4 in the TNTIN

Ruth 4 in the TNTIP

Ruth 4 in the TNTIZ

Ruth 4 in the TOMA

Ruth 4 in the TTENT

Ruth 4 in the UBG

Ruth 4 in the UGV

Ruth 4 in the UGV2

Ruth 4 in the UGV3

Ruth 4 in the VBL

Ruth 4 in the VDCC

Ruth 4 in the YALU

Ruth 4 in the YAPE

Ruth 4 in the YBVTP

Ruth 4 in the ZBP