1 Chronicles 11 (BOICB)

1 Ndị Izrel niile gbakọtara bịakwute Devid na Hebrọn sị ya, “Lee, ọkpụkpụ gị na anụ ahụ gị ka anyị bụ. 2 Nʼoge gara aga, ọ bụladị mgbe Sọl bụ eze, ọ bụ gị duuru ndị agha Izrel nʼọgụ niile, ma ọpụpụ ma mbata. ONYENWE ANYỊ bụ Chineke gị, sịrị gị, ‘Ị ga-azụ ndị m, bụ Izrel, ị ga-abụkwa onye ga-achị ha.’ ” 3 Mgbe ndị okenye Izrel niile bịakwutere eze Devid na Hebrọn, ya na ha gbara ndụ nʼihu ONYENWE ANYỊ na Hebrọn. Ha tere ya mmanụ ịbụ eze Izrel, dịka ONYENWE ANYỊ kwere na nkwa site nʼọnụ Samuel. 4 Devid na ndị Izrel zọọrọ ije garuo Jerusalem nke bụ Jebus. Ma ndị Jebus bi nʼebe ahụ, 5 gwara Devid sị, “Ị gaghị abata nʼebe a.” Nʼagbanyeghị okwu ndị a, Devid dọtara ebe ahụ e wusiri ike nke Zayọn nʼagha, ya bụ obodo Devid. 6 Devid ekwuolarị sị, “Onye ọbụla buru ụzọ buo agha megide ndị Jebus ga-abụ onyeisi ọchịagha ndị agha.” Joab nwa Zeruaya bụ onye mbụ gara, nʼihi ya, o nwetara ike ịbụ ọchịagha. 7 Devid biiri nʼebe ahụ e wusiri ike. Ọ bụ nke a mere e ji akpọ ya obodo Devid. 8 O wuru obodo gburugburu ya, site na Milo ruo na mgbidi gbara ya gburugburu. Ma Joab wuzikwara akụkụ obodo ahụ nke fọdụrụ. 9 Ma Devid gara nʼihu na-adị ukwuu karịa, nʼihi na ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, nọnyeere ya. 10 Ndị a bụ ndịisi ndị dike nʼetiti ndị agha Devid. Ha na ndị Izrel niile nyere ịchị eze Devid ezi nkwado ime ka ọchịchị ya ruo nʼakụkụ niile nke ala ahụ, dịka ONYENWE ANYỊ kwere na nkwa. 11 Nke a bụ ndekọ ọnụọgụgụ ndị dike nʼagha Devid nwere:Jashobeam, onye Hakmon, bụ onyeisi nʼetiti ndịisi ndị ọzọ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom atọ, bụ ndị o gburu nʼotu mgbe ibu agha. 12 Onye nke na-eso ya bụ Elieza nwa Dodayi, onye Ahohi, onye bụ otu nʼime ndị dike atọ ndị ahụ. 13 Ya na Devid nọ na Pas Damin mgbe ndị Filistia zukọrọ nʼebe ahụ ibu agha. Nʼotu ebe, nke e nwere otu ubi jupụtara nʼọka balị, ma ndị agha Izrel si nʼọgbọ agha gbapụ ọsọ nʼihi ndị Filistia. 14 Ma ha were ọnọdụ ha nʼetiti ubi ahụ, ha napụtara ya, tigbuo ndị Filistia niile ahụ. ONYENWE ANYỊ nyere mmeri dị ukwuu. 15 Mmadụ atọ nʼime iri ndịisi agha atọ ahụ jekwuru Devid na nkume dị nʼọgba Adulam, na mgbe otù ndị Filistia mara ụlọ ikwu ha na Ndagwurugwu Refaim. 16 Ma Devid nọ nʼebe ahụ ewusiri ike nʼoge ahụ, ma ọnọdụ ndị agha ndị Filistia dị na Betlehem. 17 Agụụ mmiri gụrụ Devid nke ukwuu, ọ sị, “Ọ ga-amasị m ma ọ bụrụ na o nwere onye ga-ekunye m mmiri ọṅụṅụ site nʼolulu mmiri dị nso nʼọnụ ụzọ ama Betlehem!” 18 Ya mere, ha atọ wakpuru ọmụma ụlọ ikwu ndị Filistia, seta mmiri site nʼolulu mmiri ahụ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama Betlehem, bulatara ya Devid. Ma Devid jụrụ ịṅụ ya, kama ọ wufuru ya nʼala dịka onyinye nye ONYENWE ANYỊ, kwuo sị, 19 “Chineke ekwela ka m mee nke a. M ga-aṅụ ọbara ndị ikom a, bụ ndị ji ndụ ha chụọ aja nʼihi ikute mmiri a?” Nʼihi na ha ji ndụ ha chụọ aja ịga kute ya, Devid ekweghị aṅụ ya.Nke a bụ ụdị ike dike atọ ahụ kpara. 20 Abishai, nwanne Joab bụ onyeisi ndị ikom atọ ahụ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom atọ, tigbukwaa ha niile. Nʼihi nke a, ọ ghọrọ onye a ma ama dịka mmadụ atọ ndị a. 21 Nʼetiti mmadụ atọ ahụ, a na-asọpụrụ ya karịa, ọ ghọrọ onyeisi ha. Ọ bụ ezie na-agụnyeghị ya dịka otu onye nʼime ha. 22 Benaya, nwa Jehoiada, onye si Kabzeel, bụ dike nʼagha, kpara ike dị ukwuu. O tigburu dimkpa abụọ ndị Moab, ndị bụ ọkaka nʼagha. O rịdakwukwara ọdụm nʼime olulu na-amị amị nʼụbọchị mkpụrụ mmiri na-ezo, gbuo ya. 23 O tigburu otu nwoke onye Ijipt, nke ogologo ya dị mita abụọ na ọkara. Ọ bụ ezie na onye Ijipt ahụ ji ùbe buru ezigbo ibu nʼaka, nke okporo ya dịka nke onye na-ekwe akwa ji ekwe akwa, ma Benaya ji naanị mkpọ jekwuru ya, pụnara onye Ijipt ahụ ùbe dị ya nʼaka, jiri ya magbuo ya. 24 Nke a bụ ụdị ike Benaya nwa Jehoiada kpara. Ya onwe ya nwekwara aha dịka ndị dike atọ ahụ. 25 A na-asọpụrụ ya nʼebe ọ dị ukwuu karịa onye ọbụla nʼetiti iri dike atọ ndị ahụ, ma o rughị ogugo ndị dike atọ mbụ ahụ. Devid mere ya onyeisi ndị na-eche ya nche. 26 Ndị bụ dike nʼagha bụ ndị a: Asahel nwanne Joab,Elhanan nwa Dodo onye Betlehem, 27 Shamot onye Haroa,Helez onye Pelon, 28 Ira nwa Ikesh, onye Tekoa,Abieza onye Anatot, 29 Sibekai onye Husha,Ilai onye Ahohi, 30 Maharai onye Netofa,Heled nwa Baana, onye Netofa, 31 Itai nwa Ribai, nke Gibea ụmụ Benjamin,Benaya onye Piraton, 32 Hurai onye si nʼakụkụ iyi dị na Gaash,Abiel onye Arba, 33 Azmavet onye Baharum,Eliaba onye Shaalbon, 34 Ụmụ Hashem onye Gizon,Jonatan nwa Shagee, onye Hara, 35 Ahiam nwa Saka, onye Hara,Elifal nwa Ụọ, 36 Hefa onye Mekerat,Ahija onye Pelon, 37 Hezro onye Kamel,Naarai nwa Ezbai, 38 Juel nwanne Netan,Miba nwa Hagri, 39 Zelek onye Amọn,Naharai onye Beerọt, onye na-ebu ngwa agha Joab, nwa Zeruaya, 40 Ira onye Itra,Gareb onye Itra, 41 Ụraya onye Het,Zabad nwa Alai, 42 Adina nwa Shiza, onye Ruben, onye bụ onyeisi ebo Ruben na iri mmadụ atọ ahụ na-eso ya. 43 Hanan nwa Maaka,Joshafat onye Mitna, 44 Ụzia onye Ashterat,Shama na Jeiel ụmụ Hotam, onye Aroea, 45 Jediael nwa Shimri,Joha nwanne ya, onye Tiza, 46 Eliel onye Mahavi,Jeribai na Joshavia ụmụ Elnaam,Itma onye Moab, 47 Eliel, Obed, na Jaasiel onye Mezoba.

In Other Versions

1 Chronicles 11 in the ANGEFD

1 Chronicles 11 in the ANTPNG2D

1 Chronicles 11 in the AS21

1 Chronicles 11 in the BAGH

1 Chronicles 11 in the BBPNG

1 Chronicles 11 in the BBT1E

1 Chronicles 11 in the BDS

1 Chronicles 11 in the BEV

1 Chronicles 11 in the BHAD

1 Chronicles 11 in the BIB

1 Chronicles 11 in the BLPT

1 Chronicles 11 in the BNT

1 Chronicles 11 in the BNTABOOT

1 Chronicles 11 in the BNTLV

1 Chronicles 11 in the BOATCB

1 Chronicles 11 in the BOATCB2

1 Chronicles 11 in the BOBCV

1 Chronicles 11 in the BOCNT

1 Chronicles 11 in the BOECS

1 Chronicles 11 in the BOGWICC

1 Chronicles 11 in the BOHCB

1 Chronicles 11 in the BOHCV

1 Chronicles 11 in the BOHLNT

1 Chronicles 11 in the BOHNTLTAL

1 Chronicles 11 in the BOILNTAP

1 Chronicles 11 in the BOITCV

1 Chronicles 11 in the BOKCV

1 Chronicles 11 in the BOKCV2

1 Chronicles 11 in the BOKHWOG

1 Chronicles 11 in the BOKSSV

1 Chronicles 11 in the BOLCB

1 Chronicles 11 in the BOLCB2

1 Chronicles 11 in the BOMCV

1 Chronicles 11 in the BONAV

1 Chronicles 11 in the BONCB

1 Chronicles 11 in the BONLT

1 Chronicles 11 in the BONUT2

1 Chronicles 11 in the BOPLNT

1 Chronicles 11 in the BOSCB

1 Chronicles 11 in the BOSNC

1 Chronicles 11 in the BOTLNT

1 Chronicles 11 in the BOVCB

1 Chronicles 11 in the BOYCB

1 Chronicles 11 in the BPBB

1 Chronicles 11 in the BPH

1 Chronicles 11 in the BSB

1 Chronicles 11 in the CCB

1 Chronicles 11 in the CUV

1 Chronicles 11 in the CUVS

1 Chronicles 11 in the DBT

1 Chronicles 11 in the DGDNT

1 Chronicles 11 in the DHNT

1 Chronicles 11 in the DNT

1 Chronicles 11 in the ELBE

1 Chronicles 11 in the EMTV

1 Chronicles 11 in the ESV

1 Chronicles 11 in the FBV

1 Chronicles 11 in the FEB

1 Chronicles 11 in the GGMNT

1 Chronicles 11 in the GNT

1 Chronicles 11 in the HARY

1 Chronicles 11 in the HNT

1 Chronicles 11 in the IRVA

1 Chronicles 11 in the IRVB

1 Chronicles 11 in the IRVG

1 Chronicles 11 in the IRVH

1 Chronicles 11 in the IRVK

1 Chronicles 11 in the IRVM

1 Chronicles 11 in the IRVM2

1 Chronicles 11 in the IRVO

1 Chronicles 11 in the IRVP

1 Chronicles 11 in the IRVT

1 Chronicles 11 in the IRVT2

1 Chronicles 11 in the IRVU

1 Chronicles 11 in the ISVN

1 Chronicles 11 in the JSNT

1 Chronicles 11 in the KAPI

1 Chronicles 11 in the KBT1ETNIK

1 Chronicles 11 in the KBV

1 Chronicles 11 in the KJV

1 Chronicles 11 in the KNFD

1 Chronicles 11 in the LBA

1 Chronicles 11 in the LBLA

1 Chronicles 11 in the LNT

1 Chronicles 11 in the LSV

1 Chronicles 11 in the MAAL

1 Chronicles 11 in the MBV

1 Chronicles 11 in the MBV2

1 Chronicles 11 in the MHNT

1 Chronicles 11 in the MKNFD

1 Chronicles 11 in the MNG

1 Chronicles 11 in the MNT

1 Chronicles 11 in the MNT2

1 Chronicles 11 in the MRS1T

1 Chronicles 11 in the NAA

1 Chronicles 11 in the NASB

1 Chronicles 11 in the NBLA

1 Chronicles 11 in the NBS

1 Chronicles 11 in the NBVTP

1 Chronicles 11 in the NET2

1 Chronicles 11 in the NIV11

1 Chronicles 11 in the NNT

1 Chronicles 11 in the NNT2

1 Chronicles 11 in the NNT3

1 Chronicles 11 in the PDDPT

1 Chronicles 11 in the PFNT

1 Chronicles 11 in the RMNT

1 Chronicles 11 in the SBIAS

1 Chronicles 11 in the SBIBS

1 Chronicles 11 in the SBIBS2

1 Chronicles 11 in the SBICS

1 Chronicles 11 in the SBIDS

1 Chronicles 11 in the SBIGS

1 Chronicles 11 in the SBIHS

1 Chronicles 11 in the SBIIS

1 Chronicles 11 in the SBIIS2

1 Chronicles 11 in the SBIIS3

1 Chronicles 11 in the SBIKS

1 Chronicles 11 in the SBIKS2

1 Chronicles 11 in the SBIMS

1 Chronicles 11 in the SBIOS

1 Chronicles 11 in the SBIPS

1 Chronicles 11 in the SBISS

1 Chronicles 11 in the SBITS

1 Chronicles 11 in the SBITS2

1 Chronicles 11 in the SBITS3

1 Chronicles 11 in the SBITS4

1 Chronicles 11 in the SBIUS

1 Chronicles 11 in the SBIVS

1 Chronicles 11 in the SBT

1 Chronicles 11 in the SBT1E

1 Chronicles 11 in the SCHL

1 Chronicles 11 in the SNT

1 Chronicles 11 in the SUSU

1 Chronicles 11 in the SUSU2

1 Chronicles 11 in the SYNO

1 Chronicles 11 in the TBIAOTANT

1 Chronicles 11 in the TBT1E

1 Chronicles 11 in the TBT1E2

1 Chronicles 11 in the TFTIP

1 Chronicles 11 in the TFTU

1 Chronicles 11 in the TGNTATF3T

1 Chronicles 11 in the THAI

1 Chronicles 11 in the TNFD

1 Chronicles 11 in the TNT

1 Chronicles 11 in the TNTIK

1 Chronicles 11 in the TNTIL

1 Chronicles 11 in the TNTIN

1 Chronicles 11 in the TNTIP

1 Chronicles 11 in the TNTIZ

1 Chronicles 11 in the TOMA

1 Chronicles 11 in the TTENT

1 Chronicles 11 in the UBG

1 Chronicles 11 in the UGV

1 Chronicles 11 in the UGV2

1 Chronicles 11 in the UGV3

1 Chronicles 11 in the VBL

1 Chronicles 11 in the VDCC

1 Chronicles 11 in the YALU

1 Chronicles 11 in the YAPE

1 Chronicles 11 in the YBVTP

1 Chronicles 11 in the ZBP