1 Chronicles 21 (BOICB)

1 Ekwensu biliri megide Izrel, mgbe ọ kpaliri Devid ka ọ gụọ Izrel ọnụ. 2 Ya mere, Devid gwara Joab na ndịisi agha okwu sị, “Gaa gụọ ụmụ Izrel niile ọnụ, site na Bịasheba ruo Dan. Emesịa, bịa gwa m ihe ị gụtara ka m mata ole ọnụọgụgụ ha dị.” 3 Ma Joab zaghachiri, “Ka ONYENWE ANYỊ mee ka ndị agha ya mụbaa, otu onye narị ụzọ karịa. Ma onyenwe m eze, ọ bụ na ndị a niile abụghị ndị nọ nʼokpuru ọchịchị onyenwe m? Nʼihi gịnị ka onyenwe m ji na-achọ ime ihe a? Nʼihi gịnị ka ọ ga-eji wetara Izrel ikpe ọmụma?” 4 Ma okwu eze dị ike karịa nke Joab. Ya mere, Joab pụrụ gagharịa nʼIzrel niile, mechaa lọghachikwa na Jerusalem. 5 Joab nyere Devid ngụkọta ọnụọgụgụ nke ndị agha Izrel niile. NʼIzrel niile, ha dị otu nde, na narị puku ndị ikom ndị tozuru iji mma agha buo agha, tinyekwara narị puku ndị ikom anọ na iri asaa nʼala Juda ndị na-amịpụta mma agha. 6 Ma Joab agụnyeghị ndị Livayị, na ndị Benjamin nʼọnụọgụgụ ahụ, nʼihi na iwu eze amasịghị ya nʼobi nʼụzọ ọbụla. 7 Iwu banyere ọnụọgụgụ a adịghịkwa Chineke mma nʼanya. Ya mere, ọ tara ndị Izrel ahụhụ nʼihi ya. 8 Mgbe ahụ, Devid sịrị Chineke, “Emehiela m nke ukwuu site nʼihe a m mere. Ma ugbu a, biko, arịọ m gị, wezuga ikpe ọmụma dịịrị ohu gị; nʼihi na emeela m ihe nzuzu dị ukwuu.” 9 ONYENWE ANYỊ gwara Gad, onye ọhụ ụzọ Devid, sị, 10 “Gaa gwa Devid, ‘Otu a ka ONYENWE ANYỊ na-ekwu: Ụzọ ihe atọ ka m na-eche gị nʼihu. Họrọ otu nʼime ha nke m ga-eme ka ọ bịakwasị gị.’ ” 11 Ya mere Gad jekwuuru Devid sị ya, “Ihe a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, Họrọ nke dị gị mma. 12 Oke ụnwụ nke ga-adị afọ atọ, ka ọ bụ ọnwa atọ nke mkpochapụ nʼihu ndị iro unu, site na mma agha ha ga-eru unu ahụ, ka ọ bụ ụbọchị atọ nke mma agha ONYENWE ANYỊ, bụ ajọ ọrịa na-efe efe ịda nʼala a, nke mmụọ ozi ONYENWE ANYỊ ga-eme ka ọ bịakwasị ala Izrel niile. Ugbu a, chee echiche, kpebie ọsịsa ị chọrọ ka m weghachiri onye ahụ zitere m.” 13 Devid sịrị Gad, “Anọ m nʼoke nsogbu. Ọ ka mma ka m daba nʼaka ONYENWE ANYỊ karịa ịdaba nʼaka mmadụ. Nʼihi na obi ebere ya bara ụba nke ukwuu.” 14 Nʼihi ya, ONYENWE ANYỊ zitere ajọ ọrịa na-efe efe nʼala Izrel, iri puku ndị ikom asaa dara nwụọ. 15 Chineke zipụrụ mmụọ ozi ị ga bibie Jerusalem, ma dịka mmụọ ozi ahụ na-eme nke a, ONYENWE ANYỊ hụrụ ya, o wutere ya nʼihi mbibi ahụ. Ọ sịrị mmụọ ozi ahụ nke na-ebibi ndị mmadụ, “O zuola! Seghachi aka gị.” Mgbe ahụ, mmụọ ozi ONYENWE ANYỊ na-eguzo nʼebe ịzọcha ọka Arauna onye Jebus. 16 Mgbe Devid leliri anya elu hụ mmụọ ozi ONYENWE ANYỊ ka o guzo nʼetiti mbara eluigwe na ụwa, hụkwa mma agha o ji, nke o chere ihu ya na Jerusalem, ya na ndị okenye Izrel yi akwa mkpe, dara nʼala kpuo ihu nʼala. 17 Devid sịrị Chineke, “Ọ bụghị m nyere iwu ka a gụọ ndị tozuru ibu agha ọnụ? Ọ bụ mụ onwe m, mụ bụ onye ọzụzụ atụrụ, mehiere mee ajọ omume. Ma ndị a bụ naanị ụmụ atụrụ, gịnị kwanụ ka ha mere? ONYENWE ANYỊ Chineke m, biko ekwela ka ọrịa a na-efe efe nọgide nʼahụ ndị gị, ka aka gị dịgide naanị nʼahụ m, dịgidekwa nʼahụ ndị ụlọ m.” 18 Mgbe ahụ, mmụọ ozi ONYENWE ANYỊ nyere Gad iwu ka ọ gwa Devid, ka ọ gaa wuore ONYENWE ANYỊ ebe ịchụ aja nʼebe ịzọcha ọka Arauna, onye Jebus. 19 Ya mere, Devid rubere isi gaa dịka okwu ahụ Gad kwuru nʼaha ONYENWE ANYỊ. 20 Mgbe Arauna nọ nʼebe ịzọcha ọka, ọ tụgharịrị hụ mmụọ ozi ahụ, ụmụ ya ndị ikom anọ ndị so ya guzo nʼebe ahụ zoro onwe ha. 21 Mgbe Devid bịakwutere Arauna, Arauna weliri anya hụ ya, ọ hapụrụ ebe ịzọcha ọka ahụ, bịa kpọọ isiala nye Devid, kpudokwa ihu ya nʼala. 22 Devid sịrị ya, “Nye m ebe a, bụ ala ebe ịzọcha ọka gị, ka m nwee ike wuore ONYENWE ANYỊ ebe ịchụ aja, ka akwụsị ọrịa a na-efe efe dakwasịrị ndị mmadụ. Resi m ya nʼọnụ ahịa o ruru.” 23 Ma Arauna zara sị Devid, “Were ya ka onyenwe m eze mee ihe ọbụla dị ya nʼobi. Aga m enye ehi maka iji chụọ aja nsure ọkụ, ihe nzọcha ọka niile ka ha bụrụ nkụ na ọka wiiti maka ịchụ aja mkpụrụ ọka. Aga m enye ha niile.” 24 Ma eze Devid zaghachiri Arauna, “ee, aghaghị m ịkwụzu gị ọnụahịa ya. Nʼihi na agaghị m ewere ihe bụ nke gị nye ya ONYENWE ANYỊ, maọbụ chụọ aja nsure ọkụ nke na-agaghị efu m ihe ọbụla.” 25 Ya mere, Devid kwụrụ Arauna narị shekel ọlaedo isii iji zụrụ ebe ahụ. 26 Devid wuru ebe ịchụrụ ONYENWE ANYỊ aja nʼebe ahụ, chụọkwa aja nsure ọkụ na aja udo. Ọ kpọkuru ONYENWE ANYỊ, ONYENWE ANYỊ zakwara ya, site nʼọkụ nke si nʼeluigwe daa nʼelu ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ. 27 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ nyere mmụọ ozi ahụ iwu ka o tinyekwa mma agha ya nʼọbọ ya. 28 Mgbe Devid hụrụ na ONYENWE ANYỊ azala ekpere ya nʼebe ịzọcha ọka nke Arauna onye Jebus, ọ chụkwara aja ọzọ nye ONYENWE ANYỊ. 29 Ụlọ ikwu ONYENWE ANYỊ na ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ Mosis wuru nʼọzara dị nʼebe dị elu Gibiọn, nʼoge ahụ. 30 Ma Devid ejerughị ebe ahụ ịjụta Chineke ase, nʼihi na ụjọ tụrụ ya mgbe ọ hụrụ mma agha ahụ dị nʼaka mmụọ ozi ONYENWE ANYỊ.

In Other Versions

1 Chronicles 21 in the ANGEFD

1 Chronicles 21 in the ANTPNG2D

1 Chronicles 21 in the AS21

1 Chronicles 21 in the BAGH

1 Chronicles 21 in the BBPNG

1 Chronicles 21 in the BBT1E

1 Chronicles 21 in the BDS

1 Chronicles 21 in the BEV

1 Chronicles 21 in the BHAD

1 Chronicles 21 in the BIB

1 Chronicles 21 in the BLPT

1 Chronicles 21 in the BNT

1 Chronicles 21 in the BNTABOOT

1 Chronicles 21 in the BNTLV

1 Chronicles 21 in the BOATCB

1 Chronicles 21 in the BOATCB2

1 Chronicles 21 in the BOBCV

1 Chronicles 21 in the BOCNT

1 Chronicles 21 in the BOECS

1 Chronicles 21 in the BOGWICC

1 Chronicles 21 in the BOHCB

1 Chronicles 21 in the BOHCV

1 Chronicles 21 in the BOHLNT

1 Chronicles 21 in the BOHNTLTAL

1 Chronicles 21 in the BOILNTAP

1 Chronicles 21 in the BOITCV

1 Chronicles 21 in the BOKCV

1 Chronicles 21 in the BOKCV2

1 Chronicles 21 in the BOKHWOG

1 Chronicles 21 in the BOKSSV

1 Chronicles 21 in the BOLCB

1 Chronicles 21 in the BOLCB2

1 Chronicles 21 in the BOMCV

1 Chronicles 21 in the BONAV

1 Chronicles 21 in the BONCB

1 Chronicles 21 in the BONLT

1 Chronicles 21 in the BONUT2

1 Chronicles 21 in the BOPLNT

1 Chronicles 21 in the BOSCB

1 Chronicles 21 in the BOSNC

1 Chronicles 21 in the BOTLNT

1 Chronicles 21 in the BOVCB

1 Chronicles 21 in the BOYCB

1 Chronicles 21 in the BPBB

1 Chronicles 21 in the BPH

1 Chronicles 21 in the BSB

1 Chronicles 21 in the CCB

1 Chronicles 21 in the CUV

1 Chronicles 21 in the CUVS

1 Chronicles 21 in the DBT

1 Chronicles 21 in the DGDNT

1 Chronicles 21 in the DHNT

1 Chronicles 21 in the DNT

1 Chronicles 21 in the ELBE

1 Chronicles 21 in the EMTV

1 Chronicles 21 in the ESV

1 Chronicles 21 in the FBV

1 Chronicles 21 in the FEB

1 Chronicles 21 in the GGMNT

1 Chronicles 21 in the GNT

1 Chronicles 21 in the HARY

1 Chronicles 21 in the HNT

1 Chronicles 21 in the IRVA

1 Chronicles 21 in the IRVB

1 Chronicles 21 in the IRVG

1 Chronicles 21 in the IRVH

1 Chronicles 21 in the IRVK

1 Chronicles 21 in the IRVM

1 Chronicles 21 in the IRVM2

1 Chronicles 21 in the IRVO

1 Chronicles 21 in the IRVP

1 Chronicles 21 in the IRVT

1 Chronicles 21 in the IRVT2

1 Chronicles 21 in the IRVU

1 Chronicles 21 in the ISVN

1 Chronicles 21 in the JSNT

1 Chronicles 21 in the KAPI

1 Chronicles 21 in the KBT1ETNIK

1 Chronicles 21 in the KBV

1 Chronicles 21 in the KJV

1 Chronicles 21 in the KNFD

1 Chronicles 21 in the LBA

1 Chronicles 21 in the LBLA

1 Chronicles 21 in the LNT

1 Chronicles 21 in the LSV

1 Chronicles 21 in the MAAL

1 Chronicles 21 in the MBV

1 Chronicles 21 in the MBV2

1 Chronicles 21 in the MHNT

1 Chronicles 21 in the MKNFD

1 Chronicles 21 in the MNG

1 Chronicles 21 in the MNT

1 Chronicles 21 in the MNT2

1 Chronicles 21 in the MRS1T

1 Chronicles 21 in the NAA

1 Chronicles 21 in the NASB

1 Chronicles 21 in the NBLA

1 Chronicles 21 in the NBS

1 Chronicles 21 in the NBVTP

1 Chronicles 21 in the NET2

1 Chronicles 21 in the NIV11

1 Chronicles 21 in the NNT

1 Chronicles 21 in the NNT2

1 Chronicles 21 in the NNT3

1 Chronicles 21 in the PDDPT

1 Chronicles 21 in the PFNT

1 Chronicles 21 in the RMNT

1 Chronicles 21 in the SBIAS

1 Chronicles 21 in the SBIBS

1 Chronicles 21 in the SBIBS2

1 Chronicles 21 in the SBICS

1 Chronicles 21 in the SBIDS

1 Chronicles 21 in the SBIGS

1 Chronicles 21 in the SBIHS

1 Chronicles 21 in the SBIIS

1 Chronicles 21 in the SBIIS2

1 Chronicles 21 in the SBIIS3

1 Chronicles 21 in the SBIKS

1 Chronicles 21 in the SBIKS2

1 Chronicles 21 in the SBIMS

1 Chronicles 21 in the SBIOS

1 Chronicles 21 in the SBIPS

1 Chronicles 21 in the SBISS

1 Chronicles 21 in the SBITS

1 Chronicles 21 in the SBITS2

1 Chronicles 21 in the SBITS3

1 Chronicles 21 in the SBITS4

1 Chronicles 21 in the SBIUS

1 Chronicles 21 in the SBIVS

1 Chronicles 21 in the SBT

1 Chronicles 21 in the SBT1E

1 Chronicles 21 in the SCHL

1 Chronicles 21 in the SNT

1 Chronicles 21 in the SUSU

1 Chronicles 21 in the SUSU2

1 Chronicles 21 in the SYNO

1 Chronicles 21 in the TBIAOTANT

1 Chronicles 21 in the TBT1E

1 Chronicles 21 in the TBT1E2

1 Chronicles 21 in the TFTIP

1 Chronicles 21 in the TFTU

1 Chronicles 21 in the TGNTATF3T

1 Chronicles 21 in the THAI

1 Chronicles 21 in the TNFD

1 Chronicles 21 in the TNT

1 Chronicles 21 in the TNTIK

1 Chronicles 21 in the TNTIL

1 Chronicles 21 in the TNTIN

1 Chronicles 21 in the TNTIP

1 Chronicles 21 in the TNTIZ

1 Chronicles 21 in the TOMA

1 Chronicles 21 in the TTENT

1 Chronicles 21 in the UBG

1 Chronicles 21 in the UGV

1 Chronicles 21 in the UGV2

1 Chronicles 21 in the UGV3

1 Chronicles 21 in the VBL

1 Chronicles 21 in the VDCC

1 Chronicles 21 in the YALU

1 Chronicles 21 in the YAPE

1 Chronicles 21 in the YBVTP

1 Chronicles 21 in the ZBP