1 Chronicles 28 (BOICB)

1 Devid kpọkọtara ndịisi ozi niile nke Izrel, ka ha zukọọ na Jerusalem, bụ ndị ndu ebo Izrel niile, na ndị ọchịagha nke otu ndị agha nọ nʼọrụ eze. Ndị ọzọ bụ ndịisi agha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ndịisi agha na-achị ọtụtụ narị ndị agha, na ndịisi ozi na-elekọta ihe niile na anụ ụlọ niile nke eze na ụmụ ya ndị ikom nwere, tinyere ndị ozi niile nọ nʼụlọeze, na ndị bụ dimkpa na ndị niile bụ dike nʼagha. 2 Eze Devid biliri kwụrụ ọtọ sị, “Geenụ m ntị, unu ụmụnna m, na ndị m. Ọ bụrịị ihe dị m nʼobi iwu ụlọ nke ga-abụ ebe izuike nye igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ, nke ga-abụ ebe mgbakwasị ụkwụ nye Chineke anyị. Edokọtachaala m ihe e ji ewu ya, 3 ma Chineke sịrị m, ‘Ọ bụghị gị ga-ewu ụlọ nye Aha m, nʼihi na ị bụ onye na-ebu agha, onye wufuru ọbara site nʼigbu ọtụtụ mmadụ nʼagha.’ 4 “Ma otu ọ dị, ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel esitela nʼetiti ikwu m họpụta m, mee m eze Izrel ruo ebighị ebi. Ọ họọrọ ebo Juda dịka onyendu. Ọ bụkwa site nʼebo Juda ka o si họrọ ụlọ nna m, sitekwa nʼetiti ụmụnne m ndị ikom họrọ m. Mee m eze Izrel. 5 ONYENWE ANYỊ enyela m ọtụtụ ụmụ ndị ikom, ma site nʼime ha ọ họpụtara Solomọn nwa m ka ọ nọkwasị nʼocheeze nke alaeze ONYENWE ANYỊ dịka eze Izrel. 6 Ọ gwara m, ‘Solomọn nwa gị, bụ onye ga-ewuru m ụlọ m, na ogige m niile, nʼihi na ahọpụtala m ya ị bụrụ m nwa, aga m abụkwara ya nna. 7 Ọ bụrụkwa na o debe ihe niile m nyere nʼiwu, mezuo ha dịka o si eme nʼoge a. Aga m eme ka alaeze ya dịgide ruo ebighị ebi.’ 8 “Ya mere, ugbu a ana m enye unu iwu nʼihu ndị Izrel niile, na nʼihu ọgbakọ ndị nke ONYENWE ANYỊ, na nʼihu Chineke anyị. Kpachapụnụ anya chọpụta ma debekwa iwu niile nke ONYENWE ANYỊ Chineke unu, ka unu nwee ike nweta ezi ala nke a; ma nyefeekwa ya dịka ihe nketa nʼaka ụmụ ụmụ unu ruo ebighị ebi. 9 “Ma gị, Solomọn nwa m, mara Chineke nke nna gị, jiri obi zuruoke, na mmụọ nwere njikere mgbe niile fee ONYENWE ANYỊ ofufe, nʼihi na ONYENWE ANYỊ na-enyocha obi mmadụ niile. Ọ na-aghọtakwa ihe niile anyị bu nʼobi na echiche niile. Ọ bụrụ na ị chọsie ụzọ ya ike, ị ga-achọta ya, ma ọ bụrụ na ị jụ ya, ọ ga-ajụ gị ruo ebighị ebi. 10 Kpachapụ anya, nʼihi na ONYENWE ANYỊ ahọrọla gị iwuru ya ụlọnsọ ya. Dị ike, rụọkwa ọrụ a e tinyere gị nʼaka.” 11 Mgbe ahụ, Devid nyere Solomọn nwa ya ihe e sere gbasara otu ọ ga-esi wuo ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ ahụ, na nke ụlọ ndị ọzọ niile ga-adị nʼime ya, na nʼakụkụ ya; ụlọakụ ya niile, na ime ụlọ elu ya, na ime ụlọ ya, na ụlọ ebe ikpuchi mmehie. 12 O nyekwara ya ihe osise gosiri ihe niile nke Mmụọ Nsọ tinyere ya nʼuche banyere ogige ụlọnsọ ukwuu ONYENWE ANYỊ ahụ, na ọnụụlọ niile dị ya gburugburu, maka ụlọ nchịkọta akụ nke ụlọnsọ Chineke nakwa akụ niile nke e doro nsọ. 13 Devid nyekwara Solomọn iwu otu ọ ga-esi kewaa ndị nchụaja na ndị Livayị, na iwu metụtara ọrụ ije ozi niile nke ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ, na iwu metụtara ngwongwo niile e ji eje ozi. 14 Ọ wepụtara ọlaedo dị ukwuu maka iji ya kpụọ ngwongwo ọlaedo a ga-eji jee ozi dị iche iche. Ọ wepụtakwara ọlaọcha dị ukwu maka iji ya kpụọ ngwongwo ọlaọcha a ga-eji jee ozi dị iche iche. 15 Ọ wepụtara ọlaedo nke e ji akpụ iheọkụ na ihe ịdọba iheọkụ. Wepụtakwa ọlaọcha ga-ezu ịkpụ oriọna ọlaọcha, na ihe ịdọba ha. 16 Ọ wepụtara ọlaedo e ji akpụ tebul achịcha nsọ, na ọlaedo e ji akpụ tebul ndị ọzọ, na ọlaọcha e ji akpụ tebul ọlaọcha. 17 Ọ wepụtara ọlaedo a nụchara anụcha a ga-eji kpụọ ndụdụ e ji adụrụ anụ e ji chụọ aja, efere ịkwọsa mmiri na ite mmiri; ọlaedo zuru nke e ji akpụta efere ọlaedo ọbụla, na ọlaọcha zuru nke e ji akpụta efere ọlaọcha ọbụla, wepụtakwa ọlaọcha na ọlaedo. 18 Nʼikpeazụ, o wepụtara ọlaedo a nụchara anụcha a ga-eji kpụọ ebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. O nyere ya ihe osise gosiri otu a ga-esi wuo ụgbọ agha, ya bụ, mmụọ ozi cherubim ndị ahụ e ji ọlaedo kpụọ, ndị gbasapụrụ nku ha nʼelu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ. 19 Devid kwuru sị, “E deela ihe niile gbasara osise ụlọnsọ ukwu a nʼakwụkwọ nke m sitere na ntụziaka ONYENWE ANYỊ nweta. ONYENWE ANYỊ nyekwara m nghọta banyere ihe niile metụtara osise ụlọnsọ ukwu a.” 20 Devid gwakwara nwa ya Solomọn okwu sị, “Dị ike, nwee obi ike, rụọ ọrụ a. Atụla ụjọ, adakwala mba, nʼihi na ONYENWE ANYỊ Chineke, bụ Chineke m, nọnyeere gị. Ọ gaghị ahapụ gị, maọbụ gbakụta gị azụ. Ọ ga-ahụ na ihe niile gaara gị nke ọma, tutu ruo mgbe ọrụ iwu ụlọnsọ ONYENWE ANYỊ gwụsịrị. 21 Ndị nchụaja ndị a niile, na ndị Livayị jikeere ịrụ ọrụ niile metụtara ụlọnsọ ukwu Chineke ahụ. Ndị ọzọ bụ ndị ọka ọrụ dị iche iche ndị o metụrụ nʼobi ga-abịakwa inyere gị aka, ma ndị ozi, ma ndị Izrel niile; ha ga-emezu iwu ọbụla i nyere ha.”

In Other Versions

1 Chronicles 28 in the ANGEFD

1 Chronicles 28 in the ANTPNG2D

1 Chronicles 28 in the AS21

1 Chronicles 28 in the BAGH

1 Chronicles 28 in the BBPNG

1 Chronicles 28 in the BBT1E

1 Chronicles 28 in the BDS

1 Chronicles 28 in the BEV

1 Chronicles 28 in the BHAD

1 Chronicles 28 in the BIB

1 Chronicles 28 in the BLPT

1 Chronicles 28 in the BNT

1 Chronicles 28 in the BNTABOOT

1 Chronicles 28 in the BNTLV

1 Chronicles 28 in the BOATCB

1 Chronicles 28 in the BOATCB2

1 Chronicles 28 in the BOBCV

1 Chronicles 28 in the BOCNT

1 Chronicles 28 in the BOECS

1 Chronicles 28 in the BOGWICC

1 Chronicles 28 in the BOHCB

1 Chronicles 28 in the BOHCV

1 Chronicles 28 in the BOHLNT

1 Chronicles 28 in the BOHNTLTAL

1 Chronicles 28 in the BOILNTAP

1 Chronicles 28 in the BOITCV

1 Chronicles 28 in the BOKCV

1 Chronicles 28 in the BOKCV2

1 Chronicles 28 in the BOKHWOG

1 Chronicles 28 in the BOKSSV

1 Chronicles 28 in the BOLCB

1 Chronicles 28 in the BOLCB2

1 Chronicles 28 in the BOMCV

1 Chronicles 28 in the BONAV

1 Chronicles 28 in the BONCB

1 Chronicles 28 in the BONLT

1 Chronicles 28 in the BONUT2

1 Chronicles 28 in the BOPLNT

1 Chronicles 28 in the BOSCB

1 Chronicles 28 in the BOSNC

1 Chronicles 28 in the BOTLNT

1 Chronicles 28 in the BOVCB

1 Chronicles 28 in the BOYCB

1 Chronicles 28 in the BPBB

1 Chronicles 28 in the BPH

1 Chronicles 28 in the BSB

1 Chronicles 28 in the CCB

1 Chronicles 28 in the CUV

1 Chronicles 28 in the CUVS

1 Chronicles 28 in the DBT

1 Chronicles 28 in the DGDNT

1 Chronicles 28 in the DHNT

1 Chronicles 28 in the DNT

1 Chronicles 28 in the ELBE

1 Chronicles 28 in the EMTV

1 Chronicles 28 in the ESV

1 Chronicles 28 in the FBV

1 Chronicles 28 in the FEB

1 Chronicles 28 in the GGMNT

1 Chronicles 28 in the GNT

1 Chronicles 28 in the HARY

1 Chronicles 28 in the HNT

1 Chronicles 28 in the IRVA

1 Chronicles 28 in the IRVB

1 Chronicles 28 in the IRVG

1 Chronicles 28 in the IRVH

1 Chronicles 28 in the IRVK

1 Chronicles 28 in the IRVM

1 Chronicles 28 in the IRVM2

1 Chronicles 28 in the IRVO

1 Chronicles 28 in the IRVP

1 Chronicles 28 in the IRVT

1 Chronicles 28 in the IRVT2

1 Chronicles 28 in the IRVU

1 Chronicles 28 in the ISVN

1 Chronicles 28 in the JSNT

1 Chronicles 28 in the KAPI

1 Chronicles 28 in the KBT1ETNIK

1 Chronicles 28 in the KBV

1 Chronicles 28 in the KJV

1 Chronicles 28 in the KNFD

1 Chronicles 28 in the LBA

1 Chronicles 28 in the LBLA

1 Chronicles 28 in the LNT

1 Chronicles 28 in the LSV

1 Chronicles 28 in the MAAL

1 Chronicles 28 in the MBV

1 Chronicles 28 in the MBV2

1 Chronicles 28 in the MHNT

1 Chronicles 28 in the MKNFD

1 Chronicles 28 in the MNG

1 Chronicles 28 in the MNT

1 Chronicles 28 in the MNT2

1 Chronicles 28 in the MRS1T

1 Chronicles 28 in the NAA

1 Chronicles 28 in the NASB

1 Chronicles 28 in the NBLA

1 Chronicles 28 in the NBS

1 Chronicles 28 in the NBVTP

1 Chronicles 28 in the NET2

1 Chronicles 28 in the NIV11

1 Chronicles 28 in the NNT

1 Chronicles 28 in the NNT2

1 Chronicles 28 in the NNT3

1 Chronicles 28 in the PDDPT

1 Chronicles 28 in the PFNT

1 Chronicles 28 in the RMNT

1 Chronicles 28 in the SBIAS

1 Chronicles 28 in the SBIBS

1 Chronicles 28 in the SBIBS2

1 Chronicles 28 in the SBICS

1 Chronicles 28 in the SBIDS

1 Chronicles 28 in the SBIGS

1 Chronicles 28 in the SBIHS

1 Chronicles 28 in the SBIIS

1 Chronicles 28 in the SBIIS2

1 Chronicles 28 in the SBIIS3

1 Chronicles 28 in the SBIKS

1 Chronicles 28 in the SBIKS2

1 Chronicles 28 in the SBIMS

1 Chronicles 28 in the SBIOS

1 Chronicles 28 in the SBIPS

1 Chronicles 28 in the SBISS

1 Chronicles 28 in the SBITS

1 Chronicles 28 in the SBITS2

1 Chronicles 28 in the SBITS3

1 Chronicles 28 in the SBITS4

1 Chronicles 28 in the SBIUS

1 Chronicles 28 in the SBIVS

1 Chronicles 28 in the SBT

1 Chronicles 28 in the SBT1E

1 Chronicles 28 in the SCHL

1 Chronicles 28 in the SNT

1 Chronicles 28 in the SUSU

1 Chronicles 28 in the SUSU2

1 Chronicles 28 in the SYNO

1 Chronicles 28 in the TBIAOTANT

1 Chronicles 28 in the TBT1E

1 Chronicles 28 in the TBT1E2

1 Chronicles 28 in the TFTIP

1 Chronicles 28 in the TFTU

1 Chronicles 28 in the TGNTATF3T

1 Chronicles 28 in the THAI

1 Chronicles 28 in the TNFD

1 Chronicles 28 in the TNT

1 Chronicles 28 in the TNTIK

1 Chronicles 28 in the TNTIL

1 Chronicles 28 in the TNTIN

1 Chronicles 28 in the TNTIP

1 Chronicles 28 in the TNTIZ

1 Chronicles 28 in the TOMA

1 Chronicles 28 in the TTENT

1 Chronicles 28 in the UBG

1 Chronicles 28 in the UGV

1 Chronicles 28 in the UGV2

1 Chronicles 28 in the UGV3

1 Chronicles 28 in the VBL

1 Chronicles 28 in the VDCC

1 Chronicles 28 in the YALU

1 Chronicles 28 in the YAPE

1 Chronicles 28 in the YBVTP

1 Chronicles 28 in the ZBP