1 Corinthians 10 (BOICB)

1 Ụmụnna m, achọghị m ka unu chefuo ihe mere nna nna anyị ha mgbe ha jere ije nʼime ọzara. O ji igwe ojii duo ha. O mekwara ka ha si nʼetiti Osimiri Uhie gafee. 2 Nʼime igwe ojii ahụ, na nʼime osimiri ahụ e tinyere ha niile na baptizim, dịka ndị na-eso ụzọ Mosis. 3 Ha niile rikwara ihe oriri nke mmụọ ahụ. 4 Ha ṅụkwara mmiri mmụọ ahụ, mmiri sitere nʼoke nkume mmụọ ahụ, nke na-eso ha. Oke nkume ahụ bụ Kraịst nʼonwe ya. 5 Nʼihe ndị a niile, omume ha amasịghị Chineke. Nʼihi nke a, ọ lara ha nʼiyi nʼime ọzara. 6 Ugbu a, ihe ndị a niile bụkwa ihe ịdọ aka na ntị nye anyị, ka anyị hapụ ịbụ ndị agụụ ime ihe ọjọọ na-agụ dịka ha. 7 Unu abụla ndị na-ekpere arụsị dịka ụfọdụ ha mere. Dịka e dere ya, “Ndị a nọdụrụ ala iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, biliekwa ọtọ gwurie egwu ime onwe ha obi ụtọ.” 8 Ka anyị ghara ịkwa iko dịka ụfọdụ nʼime ha mere, iri puku mmadụ abụọ na atọ nʼime ha nwụọ nʼotu ụbọchị. 9 Ka anyị hapụ ịnwa Kraịst ọnwụnwa dịka ụfọdụ nʼime ha si nwaa Chineke. E mere ka agwọ tagbusie ha. 10 Ka anyị hapụkwa itamu ntamu dịka ụfọdụ ha mere ma bụrụ ndị Mmụọ ozi ọnwụ tigburu. 11 Ihe ndị a niile dakwasịrị ha ka ọ bụrụ ihe ilere anya nye anyị. E dekwara ha nʼakwụkwọ ka ha bụrụ anyị ihe ịdọ aka na ntị nʼihi na anyị bi nʼoge a mgbe ọgwụgwụ ihe niile dị nso. 12 Ya mere, ọ bụrụ na ị na-eche na ị guzosiri ike, lezie anya ka ị ghara ịda. 13 O nweghị ọnwụnwa ọbụla nwara unu nke abịakwutebeghị mmadụ. Chineke kwesiri ntụkwasị obi, ọ gaghị ekwe ka a nwaa unu karịa ike unu. Kama mgbe a na-anwa unu, ọ ga-enye unu ike imeri ọnwụnwa ma gosikwa unu ụzọ mgbapụ nʼime ya. 14 Ya mere, ndị enyi m hụrụ nʼanya, gbaaranụ ikpere arụsị ọsọ. 15 Ana m agwa ndị nwere uche okwu, unu onwe unu tulenụ ihe m na-ekwu. 16 Iko ngọzị ahụ nke anyị na-agọzi, ọ bụghị iketa oke site nʼọbara Kraịst? Achịcha nke anyị na-anyawa, ọ bụghị iketa oke nʼahụ Kraịst? 17 Nʼihi na otu achịcha dị, ọ bụ ezie na anyị dị ọtụtụ, anyị bụ otu ahụ, nʼihi na anyị niile na-eketa oke nʼotu ogbe achịcha ahụ. 18 Chetanụ ka ndị Izrel siri mee: ọ bụ na ndị na-eri ihe eji chụọ aja abụghị ndị nnwekọ nʼebe ịchụ aja? 19 Gịnị ka okwu ndị a m na-ekwu pụtara? Na arụsị, maọbụ ihe a chụrụ nʼaja nye arụsị bụ ihe ọbụla, maọbụ na ọ bụghị ihe? 20 Mba! Ihe m na-ekwu bụ na ndị niile na-achụrụ arụsị aja jikọtara onwe ha nʼotu obi ịchụrụ ekwensu aja ahụ. Ọ bụghị Chineke. Achọkwaghị m ka unu bụrụ ndị e jikọtara ha na ekwensu. 21 Unu apụghị ịṅụ site nʼiko Onyenwe anyị ma ṅụọkwa site nʼiko ekwensu; unu apụghịkwa inwe oke site na tebul Onyenwe anyị na tebul ekwensu. 22 Anyị na-achọ ime ka iwe wee Onyenwe anyị? Anyị dị ike karịa ya? 23 Ị na-asị, “Enwere m ike ime ihe niile m maara na m kwesiri ime,” ma ọ bụghị ihe niile ga-abara m uru. “Enwere m ike ime ihe niile m maara ziri ezi,” ma ọ bụghị ihe niile nwere ike inyere anyị aka. 24 Ka onye ọbụla hapụ ịchọ ọdịmma nke onwe ya, kama ọdịmma nke ndị ọzọ. 25 Rie ihe bụ anụ ọbụla e rere nʼahịa na-ajụghị ajụjụ ọbụla nʼihi akọnuche. 26 Nʼihi na, “Ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke Onyenwe anyị.” 27 Ọ bụrụ na onye na-ekweghị ekwe akpọọ unu oriri, unu kpebie ije, riekwanụ nri ọbụla e nyere unu na-ajụghị ajụjụ nʼihi akọnuche. 28 Ma ọ buru na e nwee onye gwara gị, “A chụrụ ihe a nʼaja.” Unu erila nri ahụ, maka onye ahụ mere ka unu mata, na nʼihi akọnuche. 29 Akọnuche nke m na-ekwu maka ya abụghị nke gị, kama ọ bụ maka nke onye ahụ. Nʼihi gịnị ka mnwere onwe m ga-eji bụrụ ihe akọnuche onye ọzọ ga-ekpe ikpe? 30 Ọ bụrụ na m nwere ike inye ekele, were nri m rie, olee otu e si ekwutọ m nʼihi ihe ahụ m nyere Chineke ekele banyere ya? 31 Ihe ọbụla ị na-eme, ma unu na-eri ihe maọbụ na-aṅụ ihe, na-emenụ ha niile maka otuto nke Chineke. 32 Unu emejọla ndị Juu maọbụ ndị Griik, ma ọ bụkwanụ nzukọ Chineke. 33 Na-agbalịsinụ ike ime dịka m si eme. Nʼihe ọbụla m na-eme, ana m ejisi ike ime ihe ga-atọ onye ọbụla ụtọ. Anaghị m achọ ọdịmma nke m naanị, kama ọ bụ ọdịmma nke mmadụ ibe m, ime ka a zọpụta ha.

In Other Versions

1 Corinthians 10 in the ANGEFD

1 Corinthians 10 in the ANTPNG2D

1 Corinthians 10 in the AS21

1 Corinthians 10 in the BAGH

1 Corinthians 10 in the BBPNG

1 Corinthians 10 in the BBT1E

1 Corinthians 10 in the BDS

1 Corinthians 10 in the BEV

1 Corinthians 10 in the BHAD

1 Corinthians 10 in the BIB

1 Corinthians 10 in the BLPT

1 Corinthians 10 in the BNT

1 Corinthians 10 in the BNTABOOT

1 Corinthians 10 in the BNTLV

1 Corinthians 10 in the BOATCB

1 Corinthians 10 in the BOATCB2

1 Corinthians 10 in the BOBCV

1 Corinthians 10 in the BOCNT

1 Corinthians 10 in the BOECS

1 Corinthians 10 in the BOGWICC

1 Corinthians 10 in the BOHCB

1 Corinthians 10 in the BOHCV

1 Corinthians 10 in the BOHLNT

1 Corinthians 10 in the BOHNTLTAL

1 Corinthians 10 in the BOILNTAP

1 Corinthians 10 in the BOITCV

1 Corinthians 10 in the BOKCV

1 Corinthians 10 in the BOKCV2

1 Corinthians 10 in the BOKHWOG

1 Corinthians 10 in the BOKSSV

1 Corinthians 10 in the BOLCB

1 Corinthians 10 in the BOLCB2

1 Corinthians 10 in the BOMCV

1 Corinthians 10 in the BONAV

1 Corinthians 10 in the BONCB

1 Corinthians 10 in the BONLT

1 Corinthians 10 in the BONUT2

1 Corinthians 10 in the BOPLNT

1 Corinthians 10 in the BOSCB

1 Corinthians 10 in the BOSNC

1 Corinthians 10 in the BOTLNT

1 Corinthians 10 in the BOVCB

1 Corinthians 10 in the BOYCB

1 Corinthians 10 in the BPBB

1 Corinthians 10 in the BPH

1 Corinthians 10 in the BSB

1 Corinthians 10 in the CCB

1 Corinthians 10 in the CUV

1 Corinthians 10 in the CUVS

1 Corinthians 10 in the DBT

1 Corinthians 10 in the DGDNT

1 Corinthians 10 in the DHNT

1 Corinthians 10 in the DNT

1 Corinthians 10 in the ELBE

1 Corinthians 10 in the EMTV

1 Corinthians 10 in the ESV

1 Corinthians 10 in the FBV

1 Corinthians 10 in the FEB

1 Corinthians 10 in the GGMNT

1 Corinthians 10 in the GNT

1 Corinthians 10 in the HARY

1 Corinthians 10 in the HNT

1 Corinthians 10 in the IRVA

1 Corinthians 10 in the IRVB

1 Corinthians 10 in the IRVG

1 Corinthians 10 in the IRVH

1 Corinthians 10 in the IRVK

1 Corinthians 10 in the IRVM

1 Corinthians 10 in the IRVM2

1 Corinthians 10 in the IRVO

1 Corinthians 10 in the IRVP

1 Corinthians 10 in the IRVT

1 Corinthians 10 in the IRVT2

1 Corinthians 10 in the IRVU

1 Corinthians 10 in the ISVN

1 Corinthians 10 in the JSNT

1 Corinthians 10 in the KAPI

1 Corinthians 10 in the KBT1ETNIK

1 Corinthians 10 in the KBV

1 Corinthians 10 in the KJV

1 Corinthians 10 in the KNFD

1 Corinthians 10 in the LBA

1 Corinthians 10 in the LBLA

1 Corinthians 10 in the LNT

1 Corinthians 10 in the LSV

1 Corinthians 10 in the MAAL

1 Corinthians 10 in the MBV

1 Corinthians 10 in the MBV2

1 Corinthians 10 in the MHNT

1 Corinthians 10 in the MKNFD

1 Corinthians 10 in the MNG

1 Corinthians 10 in the MNT

1 Corinthians 10 in the MNT2

1 Corinthians 10 in the MRS1T

1 Corinthians 10 in the NAA

1 Corinthians 10 in the NASB

1 Corinthians 10 in the NBLA

1 Corinthians 10 in the NBS

1 Corinthians 10 in the NBVTP

1 Corinthians 10 in the NET2

1 Corinthians 10 in the NIV11

1 Corinthians 10 in the NNT

1 Corinthians 10 in the NNT2

1 Corinthians 10 in the NNT3

1 Corinthians 10 in the PDDPT

1 Corinthians 10 in the PFNT

1 Corinthians 10 in the RMNT

1 Corinthians 10 in the SBIAS

1 Corinthians 10 in the SBIBS

1 Corinthians 10 in the SBIBS2

1 Corinthians 10 in the SBICS

1 Corinthians 10 in the SBIDS

1 Corinthians 10 in the SBIGS

1 Corinthians 10 in the SBIHS

1 Corinthians 10 in the SBIIS

1 Corinthians 10 in the SBIIS2

1 Corinthians 10 in the SBIIS3

1 Corinthians 10 in the SBIKS

1 Corinthians 10 in the SBIKS2

1 Corinthians 10 in the SBIMS

1 Corinthians 10 in the SBIOS

1 Corinthians 10 in the SBIPS

1 Corinthians 10 in the SBISS

1 Corinthians 10 in the SBITS

1 Corinthians 10 in the SBITS2

1 Corinthians 10 in the SBITS3

1 Corinthians 10 in the SBITS4

1 Corinthians 10 in the SBIUS

1 Corinthians 10 in the SBIVS

1 Corinthians 10 in the SBT

1 Corinthians 10 in the SBT1E

1 Corinthians 10 in the SCHL

1 Corinthians 10 in the SNT

1 Corinthians 10 in the SUSU

1 Corinthians 10 in the SUSU2

1 Corinthians 10 in the SYNO

1 Corinthians 10 in the TBIAOTANT

1 Corinthians 10 in the TBT1E

1 Corinthians 10 in the TBT1E2

1 Corinthians 10 in the TFTIP

1 Corinthians 10 in the TFTU

1 Corinthians 10 in the TGNTATF3T

1 Corinthians 10 in the THAI

1 Corinthians 10 in the TNFD

1 Corinthians 10 in the TNT

1 Corinthians 10 in the TNTIK

1 Corinthians 10 in the TNTIL

1 Corinthians 10 in the TNTIN

1 Corinthians 10 in the TNTIP

1 Corinthians 10 in the TNTIZ

1 Corinthians 10 in the TOMA

1 Corinthians 10 in the TTENT

1 Corinthians 10 in the UBG

1 Corinthians 10 in the UGV

1 Corinthians 10 in the UGV2

1 Corinthians 10 in the UGV3

1 Corinthians 10 in the VBL

1 Corinthians 10 in the VDCC

1 Corinthians 10 in the YALU

1 Corinthians 10 in the YAPE

1 Corinthians 10 in the YBVTP

1 Corinthians 10 in the ZBP