1 Corinthians 11 (BOICB)

1 Unu bụrụ ndị na-eṅomi m, dịka m si eṅomi Kraịst. 2 Ana m aja unu nʼihi na unu na-echeta m nʼihi niile, nakwa nʼihi na unu na-ejisikwa ozizi ahụ enyere unu nʼaka ike, dịka m nyere ha nʼaka unu idebe. 3 Ma achọrọ m ka unu mata na dịka Kraịst bụ isi nwoke ọbụla, otu a ka nwoke ọbụla si bụrụ isi nwunye ya. Chineke bụkwa isi Kraịst. 4 Nwoke ọbụla kpuchiri isi ya mgbe ọ na-ekpe ekpere maọbụ na-ebu amụma na-emenye isi ya ihere. 5 Ma nwanyị ọbụla na-ekpe ekpere maọbụ na-ebu amụma, ma o kpuchighị isi ya, na-emenye isi ya ihe ihere, nʼihi na ọ dịka nwanyị kpụchara isi ya. 6 Ọ bụrụ na nwanyị ọbụla achọghị ikechi isi ya, ya kpụchaa ya. A sịkwa na ọ bụkwanụ ihe ihere na nwanyị kpụchara isi ya, ka nwanyị kechie isi ya. 7 Ma nwoke ekwesighị ikpuchi isi ya, nʼihi na nwoke bụ onyinyo na otuto nke Chineke, ebe nwanyị bụ otuto nke nwoke. 8 E si na nwoke kee nwanyị, ma e sighị na nwanyị kee nwoke. 9 E keghị nwoke maka nwanyị, ma e kere nwanyị maka nwoke. 10 Nʼihi nke a, nwanyị kwesiri ikpuchi isi ya igosi na ọ nọ nʼokpuru di ya, maka ndị mmụọ ozi. 11 Ma otu ihe si dị nʼime ndụ anyị na-adị nʼime Onyenwe anyị, nwoke adịghị ma e wepụ nwanyị, nwanyị adịghịkwa ma e wepụ nwoke. 12 Nʼihi na dịka nwanyị siri na nwoke pụta na mbụ, otu a ka a na-esitekwa nʼahụ nwanyị mụpụta nwoke. Ma ha niile si nʼaka Chineke pụta. 13 Achọrọ m ka unu tule ihe a nʼonwe unu, ọ dị mma ka nwanyị ghebe isi ya oghe mgbe ọ na-ekpe ekpere nye Chineke? 14 Unu matakwara nke ọma na ọ bụ ihe ihere na nwoke ga-ebu agịrị isi dị ogologo. 15 Ma ọ bụrụ na nwanyị enwee agịrị isi dị ogologo ọ bụ ihe otuto nye ya nʼihi na e nyere ya agịrị isi dị ogologo ka ọ bụrụ ihe mkpuchi. 16 Ọ bụrụ na onye ọbụla na-arụ ụka banyere omenaala nke a, anyị onwe anyị na nzukọ Chineke niile enweghị omenaala ọzọ banyere nke a. 17 Nʼime ntụziaka ndị a, enweghị m otuto nye unu nʼihi na mgbe unu zukọtara omume unu na-eweta ihe ọjọọ karịa ihe ọma. 18 Na mmalite, ihe m na-anụ bụ na mgbe niile unu zukọrọ dịka chọọchị, ịrụ ụka nke na-ebute nkewa na-adị nʼetiti unu. E kwenyekwara m na ụfọdụ ihe ndị a m nụrụ bụ eziokwu. 19 Nʼezie ụdị nkewa dị otu a aghaghị ịdị nʼetiti unu ka e nwee ike mara ndị Chineke nabatara. 20 Mgbe unu zukọtara, ọ bụghị nri anyasị nke Onyenwe anyị ka unu na-eri. 21 Nʼihi na mgbe unu na-eri nri, ụfọdụ nʼime unu na-eri nri anyasị nke aka ha. Nke mere, nʼotu onye na-anọ agụụ ebe onye ọzọ na-aṅụbigakwa mmanya oke. 22 A ga-akpọ nke a gịnị? Ọ bụ na unu enweghị ụlọ ebe unu ga-anọ rijuo afọ ma ṅụjuokwa afọ? Ka ọ bụ na unu na-elelị nzukọ Chineke na emenye ndị na-enweghị ihe ihere? Gịnị ka m ga-agwa unu? Aga m eto unu maka nke a? Agaghị m eto unu maka nke a. 23 Nʼihi na ihe m ziri unu bụ ihe Onyenwe anyị ziri m. Nʼabalị ụbọchị ahụ a rara ya nye, Onyenwe anyị Jisọs weere otu ogbe achịcha. 24 Mgbe o nyechara ekele, ọ nyawara ya sị, “Nke a bụ ahụ m nke a na-enye maka unu. Na-emenụ nke a iji cheta m.” 25 Nʼụzọ dị otu a kwa, o bulitere otu iko mmanya mgbe ha risiri nri sị, “Iko a bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ nʼọbara m. Oge ọbụla unu na-aṅụ ya, na-emenụ nke a iji na-echeta m.” 26 Nʼihi na mgbe ọbụla unu na-eri achịcha ahụ na-aṅụkwa iko a, unu na-ekwusa ọnwụ Onyenwe anyị ruo mgbe ọ ga-abịa ọzọ. 27 Ya mere, ọ bụrụ na onye ọbụla erie achịcha Onyenwe anyị maọbụ ṅụọ iko Onyenwe anyị nʼụzọ na-ekwesighị ekwesi, onye ahụ na-emehie megide anụ ahụ Onyenwe anyị na ọbara Onyenwe anyị. 28 Ọ bụ nke a mere o ji bụrụ ihe dị mkpa ka onye ọbụla nyochaa onwe ya nke ọma tupu o rie achịcha ahụ maọbụ ṅụọ iko ahụ. 29 Nʼihi na onye ọbụla na-eri achịcha ahụ maọbụ ṅụọ site nʼiko ahụ na-echeghị echiche, ọ na-eri, na-aṅụtakwara onwe ya ikpe ọmụma, ma ọ bụrụ na ọ tuleghị uche banyere ahụ Kraịst. 30 Ọ bụ nke a mere ọtụtụ nʼime unu ji bụrụ ndị ahụ na-esighị ike, ndị nọ nʼọrịa na ndị dara nʼụra ọnwụ. 31 Ọ bụrụ na anyị enyochaa onwe anyị nke ọma, anyị agaghị adaba nʼikpe. 32 Ma otu ọ dị, mgbe Onyenwe anyị na-ama anyị ikpe nʼụzọ dị otu a, a na-ezi anyị otu e si ebi ezi ndụ nʼihi ka a ghara ịmakọ anyị na ndị ụwa ikpe. 33 Ya mere, ụmụnna m, mgbe unu bịakọtara iri nri, cherenụ ibe unu. 34 Ọ bụrụ na agụụ agụọ onye ọbụla ya rie nri nʼụlọ ya, ka ọ hapụ iwetara unu ikpe ọmụma.Aga m enye ntụziaka banyere ihe niile ndị ọzọ mgbe m bịara.

In Other Versions

1 Corinthians 11 in the ANGEFD

1 Corinthians 11 in the ANTPNG2D

1 Corinthians 11 in the AS21

1 Corinthians 11 in the BAGH

1 Corinthians 11 in the BBPNG

1 Corinthians 11 in the BBT1E

1 Corinthians 11 in the BDS

1 Corinthians 11 in the BEV

1 Corinthians 11 in the BHAD

1 Corinthians 11 in the BIB

1 Corinthians 11 in the BLPT

1 Corinthians 11 in the BNT

1 Corinthians 11 in the BNTABOOT

1 Corinthians 11 in the BNTLV

1 Corinthians 11 in the BOATCB

1 Corinthians 11 in the BOATCB2

1 Corinthians 11 in the BOBCV

1 Corinthians 11 in the BOCNT

1 Corinthians 11 in the BOECS

1 Corinthians 11 in the BOGWICC

1 Corinthians 11 in the BOHCB

1 Corinthians 11 in the BOHCV

1 Corinthians 11 in the BOHLNT

1 Corinthians 11 in the BOHNTLTAL

1 Corinthians 11 in the BOILNTAP

1 Corinthians 11 in the BOITCV

1 Corinthians 11 in the BOKCV

1 Corinthians 11 in the BOKCV2

1 Corinthians 11 in the BOKHWOG

1 Corinthians 11 in the BOKSSV

1 Corinthians 11 in the BOLCB

1 Corinthians 11 in the BOLCB2

1 Corinthians 11 in the BOMCV

1 Corinthians 11 in the BONAV

1 Corinthians 11 in the BONCB

1 Corinthians 11 in the BONLT

1 Corinthians 11 in the BONUT2

1 Corinthians 11 in the BOPLNT

1 Corinthians 11 in the BOSCB

1 Corinthians 11 in the BOSNC

1 Corinthians 11 in the BOTLNT

1 Corinthians 11 in the BOVCB

1 Corinthians 11 in the BOYCB

1 Corinthians 11 in the BPBB

1 Corinthians 11 in the BPH

1 Corinthians 11 in the BSB

1 Corinthians 11 in the CCB

1 Corinthians 11 in the CUV

1 Corinthians 11 in the CUVS

1 Corinthians 11 in the DBT

1 Corinthians 11 in the DGDNT

1 Corinthians 11 in the DHNT

1 Corinthians 11 in the DNT

1 Corinthians 11 in the ELBE

1 Corinthians 11 in the EMTV

1 Corinthians 11 in the ESV

1 Corinthians 11 in the FBV

1 Corinthians 11 in the FEB

1 Corinthians 11 in the GGMNT

1 Corinthians 11 in the GNT

1 Corinthians 11 in the HARY

1 Corinthians 11 in the HNT

1 Corinthians 11 in the IRVA

1 Corinthians 11 in the IRVB

1 Corinthians 11 in the IRVG

1 Corinthians 11 in the IRVH

1 Corinthians 11 in the IRVK

1 Corinthians 11 in the IRVM

1 Corinthians 11 in the IRVM2

1 Corinthians 11 in the IRVO

1 Corinthians 11 in the IRVP

1 Corinthians 11 in the IRVT

1 Corinthians 11 in the IRVT2

1 Corinthians 11 in the IRVU

1 Corinthians 11 in the ISVN

1 Corinthians 11 in the JSNT

1 Corinthians 11 in the KAPI

1 Corinthians 11 in the KBT1ETNIK

1 Corinthians 11 in the KBV

1 Corinthians 11 in the KJV

1 Corinthians 11 in the KNFD

1 Corinthians 11 in the LBA

1 Corinthians 11 in the LBLA

1 Corinthians 11 in the LNT

1 Corinthians 11 in the LSV

1 Corinthians 11 in the MAAL

1 Corinthians 11 in the MBV

1 Corinthians 11 in the MBV2

1 Corinthians 11 in the MHNT

1 Corinthians 11 in the MKNFD

1 Corinthians 11 in the MNG

1 Corinthians 11 in the MNT

1 Corinthians 11 in the MNT2

1 Corinthians 11 in the MRS1T

1 Corinthians 11 in the NAA

1 Corinthians 11 in the NASB

1 Corinthians 11 in the NBLA

1 Corinthians 11 in the NBS

1 Corinthians 11 in the NBVTP

1 Corinthians 11 in the NET2

1 Corinthians 11 in the NIV11

1 Corinthians 11 in the NNT

1 Corinthians 11 in the NNT2

1 Corinthians 11 in the NNT3

1 Corinthians 11 in the PDDPT

1 Corinthians 11 in the PFNT

1 Corinthians 11 in the RMNT

1 Corinthians 11 in the SBIAS

1 Corinthians 11 in the SBIBS

1 Corinthians 11 in the SBIBS2

1 Corinthians 11 in the SBICS

1 Corinthians 11 in the SBIDS

1 Corinthians 11 in the SBIGS

1 Corinthians 11 in the SBIHS

1 Corinthians 11 in the SBIIS

1 Corinthians 11 in the SBIIS2

1 Corinthians 11 in the SBIIS3

1 Corinthians 11 in the SBIKS

1 Corinthians 11 in the SBIKS2

1 Corinthians 11 in the SBIMS

1 Corinthians 11 in the SBIOS

1 Corinthians 11 in the SBIPS

1 Corinthians 11 in the SBISS

1 Corinthians 11 in the SBITS

1 Corinthians 11 in the SBITS2

1 Corinthians 11 in the SBITS3

1 Corinthians 11 in the SBITS4

1 Corinthians 11 in the SBIUS

1 Corinthians 11 in the SBIVS

1 Corinthians 11 in the SBT

1 Corinthians 11 in the SBT1E

1 Corinthians 11 in the SCHL

1 Corinthians 11 in the SNT

1 Corinthians 11 in the SUSU

1 Corinthians 11 in the SUSU2

1 Corinthians 11 in the SYNO

1 Corinthians 11 in the TBIAOTANT

1 Corinthians 11 in the TBT1E

1 Corinthians 11 in the TBT1E2

1 Corinthians 11 in the TFTIP

1 Corinthians 11 in the TFTU

1 Corinthians 11 in the TGNTATF3T

1 Corinthians 11 in the THAI

1 Corinthians 11 in the TNFD

1 Corinthians 11 in the TNT

1 Corinthians 11 in the TNTIK

1 Corinthians 11 in the TNTIL

1 Corinthians 11 in the TNTIN

1 Corinthians 11 in the TNTIP

1 Corinthians 11 in the TNTIZ

1 Corinthians 11 in the TOMA

1 Corinthians 11 in the TTENT

1 Corinthians 11 in the UBG

1 Corinthians 11 in the UGV

1 Corinthians 11 in the UGV2

1 Corinthians 11 in the UGV3

1 Corinthians 11 in the VBL

1 Corinthians 11 in the VDCC

1 Corinthians 11 in the YALU

1 Corinthians 11 in the YAPE

1 Corinthians 11 in the YBVTP

1 Corinthians 11 in the ZBP