1 John 3 (BOICB)

1 Lee ụdị oke ịhụnanya nke Nna ahụ nwere nʼebe anyị nọ, na-aga akpọ anyị ụmụ Chineke. Nʼezie, nke a bụ ihe anyị bụ. Ihe mere na ụwa amaghị anyị bụ nʼihi na ọ maghị ya. 2 Ndị hụrụ nʼanya, ugbu a anyị abụrụla ụmụ Chineke. Ọ bụ ezie na anyị enweghị ike ịghọta ihe ọnọdụ anyị ga-abụ nʼoge dị nʼihu, ma anyị maara nke ọma na mgbe a ga-eme ka ọ pụta ìhè, a ga-emekwa ka anyị bụrụ ndị yiri ya, nʼihi na anyị ga-ahụ ya dịka ọ dị. 3 Onye ọbụla nwere olileanya dị otu a kwesiri idebe onwe ya ọcha, dị ka ya onwe ya dị ọcha. 4 Onye ọbụla na-eme mmehie na-emebi iwu. Nʼezie mmehie bụ mmebi iwu. 5 Unu maara na e mere ka ọ pụta ìhè iwepụ mmehie. Ọ dịkwaghị mmehie ọbụla dị nʼime ya. 6 Onye ọbụla na-anọgide nʼime ya adịghị ebi ndụ ime mmehie, onye ọbụla nke na-ebi ndụ mmehie ahụbeghị ya anya mgbe ọbụla, ọ matabekwaghị ya. 7 Ezigbo ụmụ m, unu ekwela ka onye ọbụla duhie unu, onye ọbụla na-eme ezi ihe bụ onye ezi omume dị ka ya onwe ya bụ onye ezi omume. 8 Onye ọbụla na-eme mmehie bụ nwa ekwensu, nʼihi na ekwensu bụ onye mmehie site na mmalite. Ihe mere Ọkpara Chineke jiri pụta ìhè bụ ka ọ laa ọrụ niile nke ekwensu nʼiyi. 9 Onye a mụrụ site na Chineke adịghị anọgide na-eme mmehie, nʼihi na mkpụrụ Chineke na-anọgide nʼime ya, ha enweghị ike ịnọgide na-eme mmehie, nʼihi na a mụrụ ha site na Chineke. 10 Otu a ka anyị si amata ndị bụ ụmụ Chineke, na ndị bụ ụmụ ekwensu: Onye ọbụla na-adịghị eme ihe ziri ezi abụghị nwa Chineke, otu a ka ọ dịkwa onye na-adịghị ahụ ụmụnna ha nʼanya. 11 Nʼihi na nke a bụ ozi ahụ unu nụrụ site na mmalite, ka anyị hụrịta onwe anyị nʼanya. 12 Ka anyị hapụ ịdị ka Ken, onye bụ nke ajọ onye ahụ, na onye gburu nwanne ya. Gịnị mere o ji gbuo ya? Ọ bụ nʼihi na ọrụ ya jọrọ njọ, ma nke nwanne ya ziri ezi. 13 Ka ọ gharakwa iju unu anya ụmụnna m, na ụwa kpọrọ unu asị. 14 Anyị matara na anyị esitela nʼọnwụ baa na ndụ nʼihi na anyị na-ahụ ụmụnna anyị nʼanya. Onye ọbụla na-adịghị ahụ ibe ya nʼanya na-anọgide nʼọnwụ. 15 Onye ọbụla na-akpọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ, unu matakwara na o nweghị onye ọbụla bụ ogbu mmadụ nwere ndụ ebighị ebi nʼime ya. 16 Ọ bụ otu a ka anyị sị mata ihe bụ ịhụnanya, na Jisọs tọgbọrọ ndụ ya nʼihi anyị. Anyị kwesikwara ịtọgbọ ndụ anyị nʼihi ụmụnna anyị. 17 Ọ bụrụ na onye ọbụla nwere akụ nke ụwa, ahụ nwanna ya ka ọ nọ na mkpa ma o nweghị obi ebere nʼebe ọ nọ, olee otu ịhụnanya Chineke si dịrị nʼime ya? 18 Ụmụntakịrị m, ka ịhụnanya anyị ghara ịbụ naanị nʼegbugbere ọnụ maọbụ nke okwu efu, kama ka ọ bụrụ nke sitere nʼeziokwu nakwa nʼomume anyị. 19 Anyị ga-esitekwa na nke a mata na anyị bụ ndị nke eziokwu ahụ ma matakwa otu anyị ga-esi mee ka obi anyị kwenye nʼihu ya. 20 Nʼihi na ọ bụrụ na obi anyị amaa anyị ikpe, Chineke dị ukwuu karịa obi anyị, ọ mazukwara ihe niile. 21 Ndị m hụrụ nʼanya, ọ bụrụ na obi anyị amaghị anyị ikpe, anyị nwere nkwuwa okwu nʼihu Chineke 22 na-anatakwa ya ihe ọbụla anyị rịọrọ nʼihi na anyị na-erube isi nʼiwu ya, na-emekwa ihe na-atọ ya ụtọ. 23 Nke a bụkwa iwu ya: ka anyị kwere nʼaha Ọkpara ya Jisọs Kraịst, ya na ịhụrịta ibe anyị nʼanya dịka o nyere anyị nʼiwu. 24 Ndị niile na-erube isi nye iwu ya na-anọgidesikwa ike nʼime ya, ya onwe ya na-anọgidesikwa ike nʼime ndị ahụ! Otu a ka anyị si mara na ọ na-anọgidesike nʼime anyị: Ọ bụ site na Mmụọ nke o nyere anyị.

In Other Versions

1 John 3 in the ANGEFD

1 John 3 in the ANTPNG2D

1 John 3 in the AS21

1 John 3 in the BAGH

1 John 3 in the BBPNG

1 John 3 in the BBT1E

1 John 3 in the BDS

1 John 3 in the BEV

1 John 3 in the BHAD

1 John 3 in the BIB

1 John 3 in the BLPT

1 John 3 in the BNT

1 John 3 in the BNTABOOT

1 John 3 in the BNTLV

1 John 3 in the BOATCB

1 John 3 in the BOATCB2

1 John 3 in the BOBCV

1 John 3 in the BOCNT

1 John 3 in the BOECS

1 John 3 in the BOGWICC

1 John 3 in the BOHCB

1 John 3 in the BOHCV

1 John 3 in the BOHLNT

1 John 3 in the BOHNTLTAL

1 John 3 in the BOILNTAP

1 John 3 in the BOITCV

1 John 3 in the BOKCV

1 John 3 in the BOKCV2

1 John 3 in the BOKHWOG

1 John 3 in the BOKSSV

1 John 3 in the BOLCB

1 John 3 in the BOLCB2

1 John 3 in the BOMCV

1 John 3 in the BONAV

1 John 3 in the BONCB

1 John 3 in the BONLT

1 John 3 in the BONUT2

1 John 3 in the BOPLNT

1 John 3 in the BOSCB

1 John 3 in the BOSNC

1 John 3 in the BOTLNT

1 John 3 in the BOVCB

1 John 3 in the BOYCB

1 John 3 in the BPBB

1 John 3 in the BPH

1 John 3 in the BSB

1 John 3 in the CCB

1 John 3 in the CUV

1 John 3 in the CUVS

1 John 3 in the DBT

1 John 3 in the DGDNT

1 John 3 in the DHNT

1 John 3 in the DNT

1 John 3 in the ELBE

1 John 3 in the EMTV

1 John 3 in the ESV

1 John 3 in the FBV

1 John 3 in the FEB

1 John 3 in the GGMNT

1 John 3 in the GNT

1 John 3 in the HARY

1 John 3 in the HNT

1 John 3 in the IRVA

1 John 3 in the IRVB

1 John 3 in the IRVG

1 John 3 in the IRVH

1 John 3 in the IRVK

1 John 3 in the IRVM

1 John 3 in the IRVM2

1 John 3 in the IRVO

1 John 3 in the IRVP

1 John 3 in the IRVT

1 John 3 in the IRVT2

1 John 3 in the IRVU

1 John 3 in the ISVN

1 John 3 in the JSNT

1 John 3 in the KAPI

1 John 3 in the KBT1ETNIK

1 John 3 in the KBV

1 John 3 in the KJV

1 John 3 in the KNFD

1 John 3 in the LBA

1 John 3 in the LBLA

1 John 3 in the LNT

1 John 3 in the LSV

1 John 3 in the MAAL

1 John 3 in the MBV

1 John 3 in the MBV2

1 John 3 in the MHNT

1 John 3 in the MKNFD

1 John 3 in the MNG

1 John 3 in the MNT

1 John 3 in the MNT2

1 John 3 in the MRS1T

1 John 3 in the NAA

1 John 3 in the NASB

1 John 3 in the NBLA

1 John 3 in the NBS

1 John 3 in the NBVTP

1 John 3 in the NET2

1 John 3 in the NIV11

1 John 3 in the NNT

1 John 3 in the NNT2

1 John 3 in the NNT3

1 John 3 in the PDDPT

1 John 3 in the PFNT

1 John 3 in the RMNT

1 John 3 in the SBIAS

1 John 3 in the SBIBS

1 John 3 in the SBIBS2

1 John 3 in the SBICS

1 John 3 in the SBIDS

1 John 3 in the SBIGS

1 John 3 in the SBIHS

1 John 3 in the SBIIS

1 John 3 in the SBIIS2

1 John 3 in the SBIIS3

1 John 3 in the SBIKS

1 John 3 in the SBIKS2

1 John 3 in the SBIMS

1 John 3 in the SBIOS

1 John 3 in the SBIPS

1 John 3 in the SBISS

1 John 3 in the SBITS

1 John 3 in the SBITS2

1 John 3 in the SBITS3

1 John 3 in the SBITS4

1 John 3 in the SBIUS

1 John 3 in the SBIVS

1 John 3 in the SBT

1 John 3 in the SBT1E

1 John 3 in the SCHL

1 John 3 in the SNT

1 John 3 in the SUSU

1 John 3 in the SUSU2

1 John 3 in the SYNO

1 John 3 in the TBIAOTANT

1 John 3 in the TBT1E

1 John 3 in the TBT1E2

1 John 3 in the TFTIP

1 John 3 in the TFTU

1 John 3 in the TGNTATF3T

1 John 3 in the THAI

1 John 3 in the TNFD

1 John 3 in the TNT

1 John 3 in the TNTIK

1 John 3 in the TNTIL

1 John 3 in the TNTIN

1 John 3 in the TNTIP

1 John 3 in the TNTIZ

1 John 3 in the TOMA

1 John 3 in the TTENT

1 John 3 in the UBG

1 John 3 in the UGV

1 John 3 in the UGV2

1 John 3 in the UGV3

1 John 3 in the VBL

1 John 3 in the VDCC

1 John 3 in the YALU

1 John 3 in the YAPE

1 John 3 in the YBVTP

1 John 3 in the ZBP