1 Kings 19 (BOICB)

1 Ehab kọọrọ Jezebel ihe niile Ịlaịja mere, na otu o si jiri mma agha gbuo ndị amụma Baal niile. 2 Nʼihi nke a, Jezebel zigara onyeozi ka ọ ga zie Ịlaịja sị, “Ka chi ndị a mesoo m mmeso, nʼagbanyeghị otu mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na oge dịka oge a echi, egbughị gị dịka i si gbuo ndị amụma Baal.” 3 Ịlaịja tụrụ egwu, gbapụ ọsọ, nʼihi ichebe ndụ ya. Mgbe ọ bịaruru Bịasheba, dị na Juda, ọ hapụrụ nwokorobịa na-ejere ya ozi nʼebe ahụ. 4 Ma ya onwe ya pụkwara jee ije otu ụbọchị nʼọzara naanị ya. Nʼikpeazụ, ọ kwụsịrị nọdụ ala nʼokpuru otu osisi brum, kpee ekpere rịọọ ka a napụ ya ndụ ya. Ekpere o kpere nʼoge a bụ, “O zuorela m ONYENWE ANYỊ, biko napụ ndụ m. O nweghị ụzọ m si dị mma karịa nna nna m ha.” 5 O dinara nʼokpuru osisi brum rahụ ụra.Ma lee, otu oge ahụ, mmụọ ozi metụrụ ya aka, sị ya, “Bilie, rie nri.” 6 Ịlaịja biliri legharịa anya, hụ ogbe achịcha na ite mmiri nta nke dị nʼakụkụ ebe ọ tụkwasịrị isi ya. O riri ogbe achịcha ahụ a hụrụ nʼicheku ọkụ, ṅụọkwa mmiri ahụ. Emesịa, o dinakwara ọzọ. 7 Mmụọ ozi nke ONYENWE ANYỊ bịaghachikwara nke ugboro abụọ, sị ya, “Bilie rie ihe, nʼihi na ije dị gị nʼihu dị ukwuu.” 8 Ịlaịja biliri rie ihe, ṅụọkwa mmiri. Nri ahụ nyere ya ike ije ije iri ụbọchị anọ ọzọ, ehihie na abalị, tutu ruo mgbe ọ bịaruru nʼugwu Horeb nke bụ ugwu Chineke. 9 Nʼebe ahụ, ọ banyere nʼotu ọgba nkume rahụ ụra abalị nʼime ya.Ma okwu ONYENWE ANYỊ rutere ya sị, “Ịlaịja, gịnị ka ị na-eme nʼebe a?” 10 Ọ zaghachiri sị, “Eji m ịnụ ọkụ nʼobi na-ejere ONYENWE ANYỊ Chineke Onye pụrụ ime ihe niile ozi. Ndị Izrel ajụla ọgbụgba ndụ gị, tidasịakwa ebe ịchụ aja gị, were mma agha gbukwaa ndị amụma gị niile, ugbu a, ọ bụ naanị mụ onwe m bụ onye fọdụrụ, ma ha na-achọkwa iwepụ ndụ m.” 11 ONYENWE ANYỊ sịrị ya, “Pụọ gaa guzo nʼelu ugwu, nʼihu ONYENWE ANYỊ, nʼihi na ONYENWE ANYỊ na-aga isite nʼebe ahụ gafee.”Mgbe ahụ, oke ifufe dị ike gbawara ugwu ahụ, tipịasịa nkume ndị ahụ nʼihu ONYENWE ANYỊ, ma ONYENWE ANYỊ anọghị nʼime ifufe ahụ. Mgbe ifufe ahụ gasịrị, e nwere oke ala ọma jijiji nʼugwu ahụ, ma ONYENWE ANYỊ anọkwaghị nʼala ọma jijiji ahụ. 12 Mgbe ala ọma jijiji ahụ gasịrị, ọkụ nwuuru, ma ONYENWE ANYỊ anọghị nʼime ọkụ ahụ. Ma mgbe ọkụ ahụ gasịrị, nwa olu nta dị nwayọọ dara. 13 Mgbe Ịlaịja nụrụ ya, o ji uwe mwụda ya kpuchie ihu ya, pụọ gaa guzo nʼọnụ ụzọ ọgba nkume ahụ.Mgbe ahụ, ọ nụrụ olu jụrụ ya sị, “Ịlaịja, gịnị ka ị na-eme nʼebe a?” 14 Ọ zaghachiri sị, “Eji m ịnụ ọkụ nʼobi na-ejere ONYENWE ANYỊ Chineke Onye pụrụ ime ihe niile ozi. Ndị Izrel ajụla ọgbụgba ndụ gị, tidasịakwa ebe ịchụ aja gị, were mma agha gbukwaa ndị amụma gị niile, ugbu a ọ bụ naanị mụ onwe m bụ onye fọdụrụ, ma ha na-achọkwa iwepụ ndụ m.” 15 ONYENWE ANYỊ sịrị ya, “Sikwa ụzọ i si bịa laghachi, gaa nʼọzara Damaskọs. Mgbe i ruru ebe ahụ, tee Hazael mmanụ ịbụ eze Aram. 16 Teekwa Jehu, nwa Nimshi mmanụ ịbụ eze Izrel. Ị ga-etekwa Ịlaisha nwa Shafat, onye Ebel-Mehola mmanụ ịbụ onye amụma nʼọnọdụ gị. 17 Onye ọbụla gbanarịrị Hazael ga-anwụ nʼaka Jehu. Otu a kwa, ndị niile gbanarịrị mma agha Jehu ka Ịlaisha ga-egbu. 18 Ma ghọta na ọ dị puku mmadụ asaa nọ nʼIzrel, ndị na-egbubeghị ikpere ha nʼala nye Baal, maọbụ sutu ya ọnụ, ife ya ofufe.” 19 Ịlaịja sitere nʼebe ahụ pụọ gaa chọta Ịlaisha nwa Shafat ebe ọ nọ na-akọ ala ubi. Iri ehi abụọ na anọ e jikọtara abụọ abụọ dị ya nʼihu, ma ya onwe ya ji ehi abụọ e jikọtara ọnụ, nke iri na abụọ ya na-akọ ala ubi. Ịlaịja jekwuru Ịlaisha wụkwasị ya uwe mwụda ya nʼubu ya. 20 Mgbe ahụ, Ịlaisha hapụrụ ehi ndị ahụ ebe ha guzoro nʼubi ahụ gbara ọsọ gbakwuru Ịlaịja sị ya, “Biko, kwere ka m gaa sutu nna m na nne m ọnụ, sị ha nọdụ nke ọma. Emesịa, aga m esokwa gị.”Ịlaịja zara sị ya, “Laghachi azụ, ọ bụ gịnị ka m mere gị?” 21 Ịlaisha laghachiri azụ, gbuo ehi abụọ ahụ e jikọtara nʼotu, kpọọ ihe ahụ e ji arụ ọrụ nʼubi ọkụ, were ha sie anụ ahụ nye ndị mmadụ, ha rie. Mgbe ahụ, o biliri ije pụọ ga soro Ịlaịja, bụrụ nwaodibo ya.

In Other Versions

1 Kings 19 in the ANGEFD

1 Kings 19 in the ANTPNG2D

1 Kings 19 in the AS21

1 Kings 19 in the BAGH

1 Kings 19 in the BBPNG

1 Kings 19 in the BBT1E

1 Kings 19 in the BDS

1 Kings 19 in the BEV

1 Kings 19 in the BHAD

1 Kings 19 in the BIB

1 Kings 19 in the BLPT

1 Kings 19 in the BNT

1 Kings 19 in the BNTABOOT

1 Kings 19 in the BNTLV

1 Kings 19 in the BOATCB

1 Kings 19 in the BOATCB2

1 Kings 19 in the BOBCV

1 Kings 19 in the BOCNT

1 Kings 19 in the BOECS

1 Kings 19 in the BOGWICC

1 Kings 19 in the BOHCB

1 Kings 19 in the BOHCV

1 Kings 19 in the BOHLNT

1 Kings 19 in the BOHNTLTAL

1 Kings 19 in the BOILNTAP

1 Kings 19 in the BOITCV

1 Kings 19 in the BOKCV

1 Kings 19 in the BOKCV2

1 Kings 19 in the BOKHWOG

1 Kings 19 in the BOKSSV

1 Kings 19 in the BOLCB

1 Kings 19 in the BOLCB2

1 Kings 19 in the BOMCV

1 Kings 19 in the BONAV

1 Kings 19 in the BONCB

1 Kings 19 in the BONLT

1 Kings 19 in the BONUT2

1 Kings 19 in the BOPLNT

1 Kings 19 in the BOSCB

1 Kings 19 in the BOSNC

1 Kings 19 in the BOTLNT

1 Kings 19 in the BOVCB

1 Kings 19 in the BOYCB

1 Kings 19 in the BPBB

1 Kings 19 in the BPH

1 Kings 19 in the BSB

1 Kings 19 in the CCB

1 Kings 19 in the CUV

1 Kings 19 in the CUVS

1 Kings 19 in the DBT

1 Kings 19 in the DGDNT

1 Kings 19 in the DHNT

1 Kings 19 in the DNT

1 Kings 19 in the ELBE

1 Kings 19 in the EMTV

1 Kings 19 in the ESV

1 Kings 19 in the FBV

1 Kings 19 in the FEB

1 Kings 19 in the GGMNT

1 Kings 19 in the GNT

1 Kings 19 in the HARY

1 Kings 19 in the HNT

1 Kings 19 in the IRVA

1 Kings 19 in the IRVB

1 Kings 19 in the IRVG

1 Kings 19 in the IRVH

1 Kings 19 in the IRVK

1 Kings 19 in the IRVM

1 Kings 19 in the IRVM2

1 Kings 19 in the IRVO

1 Kings 19 in the IRVP

1 Kings 19 in the IRVT

1 Kings 19 in the IRVT2

1 Kings 19 in the IRVU

1 Kings 19 in the ISVN

1 Kings 19 in the JSNT

1 Kings 19 in the KAPI

1 Kings 19 in the KBT1ETNIK

1 Kings 19 in the KBV

1 Kings 19 in the KJV

1 Kings 19 in the KNFD

1 Kings 19 in the LBA

1 Kings 19 in the LBLA

1 Kings 19 in the LNT

1 Kings 19 in the LSV

1 Kings 19 in the MAAL

1 Kings 19 in the MBV

1 Kings 19 in the MBV2

1 Kings 19 in the MHNT

1 Kings 19 in the MKNFD

1 Kings 19 in the MNG

1 Kings 19 in the MNT

1 Kings 19 in the MNT2

1 Kings 19 in the MRS1T

1 Kings 19 in the NAA

1 Kings 19 in the NASB

1 Kings 19 in the NBLA

1 Kings 19 in the NBS

1 Kings 19 in the NBVTP

1 Kings 19 in the NET2

1 Kings 19 in the NIV11

1 Kings 19 in the NNT

1 Kings 19 in the NNT2

1 Kings 19 in the NNT3

1 Kings 19 in the PDDPT

1 Kings 19 in the PFNT

1 Kings 19 in the RMNT

1 Kings 19 in the SBIAS

1 Kings 19 in the SBIBS

1 Kings 19 in the SBIBS2

1 Kings 19 in the SBICS

1 Kings 19 in the SBIDS

1 Kings 19 in the SBIGS

1 Kings 19 in the SBIHS

1 Kings 19 in the SBIIS

1 Kings 19 in the SBIIS2

1 Kings 19 in the SBIIS3

1 Kings 19 in the SBIKS

1 Kings 19 in the SBIKS2

1 Kings 19 in the SBIMS

1 Kings 19 in the SBIOS

1 Kings 19 in the SBIPS

1 Kings 19 in the SBISS

1 Kings 19 in the SBITS

1 Kings 19 in the SBITS2

1 Kings 19 in the SBITS3

1 Kings 19 in the SBITS4

1 Kings 19 in the SBIUS

1 Kings 19 in the SBIVS

1 Kings 19 in the SBT

1 Kings 19 in the SBT1E

1 Kings 19 in the SCHL

1 Kings 19 in the SNT

1 Kings 19 in the SUSU

1 Kings 19 in the SUSU2

1 Kings 19 in the SYNO

1 Kings 19 in the TBIAOTANT

1 Kings 19 in the TBT1E

1 Kings 19 in the TBT1E2

1 Kings 19 in the TFTIP

1 Kings 19 in the TFTU

1 Kings 19 in the TGNTATF3T

1 Kings 19 in the THAI

1 Kings 19 in the TNFD

1 Kings 19 in the TNT

1 Kings 19 in the TNTIK

1 Kings 19 in the TNTIL

1 Kings 19 in the TNTIN

1 Kings 19 in the TNTIP

1 Kings 19 in the TNTIZ

1 Kings 19 in the TOMA

1 Kings 19 in the TTENT

1 Kings 19 in the UBG

1 Kings 19 in the UGV

1 Kings 19 in the UGV2

1 Kings 19 in the UGV3

1 Kings 19 in the VBL

1 Kings 19 in the VDCC

1 Kings 19 in the YALU

1 Kings 19 in the YAPE

1 Kings 19 in the YBVTP

1 Kings 19 in the ZBP