1 Kings 21 (BOICB)

1 Mgbe nwa oge nta gasịrị, Nebọt, onye Jezril, nwere ubi vaịnị dị na Jezril, nʼakụkụ ụlọeze Ehab bụ eze Sameria. 2 Ehab sịrị Nebọt, “Nye m ubi vaịnị gị ka ọ bụrụ ubi a gbara ogige, ebe m ga-akụ akwụkwọ nri, ebe ọ dị nso nʼụlọeze m. Aga m enye gị ubi vaịnị ọzọ dị mma karịa ya, ma ọ bụrụkwa na ị chọrọ, aga m akwụ gị ego ọbụla o ruru nʼọnụ ahịa ya.” 3 Ma Nebọt zara sị Ehab, “Ala a bụ ihe nketa ruuru m site nʼaka nna nna m ha. M ga-esi aṅaa nye gị ya. ONYENWE ANYỊ ekwela na m ga-ewere ihe nketa nke nna nna m ha nye gị.” 4 Ehab jiri obi ụfụ na ihu mgbarụ laa nʼụlọ ya nʼihi okwu a Nebọt, onye Jezril gwara ya, sị, “Agaghị m enye gị ihe nketa nna nna m ha.” O dinara nʼihe ndina ya, chee ihu ya nʼaja ụlọ, jụ iri ihe ọbụla. 5 Ma nwunye ya bụ Jezebel, bịakwutere ya jụọ ya sị, “Gịnị mere i ji jụ iri ihe? Gịnị mere i ji nọgide nʼobi ọjọọ na iwe?” 6 Ehab zara sị ya, “Agwara m Nebọt, nwoke onye Jezril okwu sị ya, ‘Resi m ubi vaịnị gị, ma ọ bụrụ na ị chọrọ, aga m enye gị ala ubi ọzọ mara mma nʼọnọdụ ya.’ Ma ọ jụrụ jụwaa isi inye m ubi ahụ.” 7 Mgbe ahụ, nwunye ya Jezebel jụrụ ya ajụjụ sị ya, “Ọ bụghị gị bụ eze na-achị Izrel? Bilie, rie nri, enyela obi gị nsogbu, nʼihi na aga m enyefe gị ubi vaịnị Nebọt onye Jezril nʼaka.” 8 Ya mere, Jezebel dere akwụkwọ nʼaha Ehab, were mgbaaka akara eze kaa nʼakwụkwọ ndị ahụ, zigara ha ndị okenye obodo na ndị a na-asọpụrụ bi nʼobodo ebe Nebọt bi. 9 Nʼime akwụkwọ ozi ndị a, o dere sị,“Nyenụ iwu ka mmadụ niile buo ọnụ. Kpọkọtaanụ ndị Jezril niile, ka ha zukọta. Mgbe unu zukọrọ, nyenụ Nebọt ọnọdụ nʼoche dị mkpa. 10 Họpụtanụ ndị ikom abụọ, ndị na-abaghị uru ka ha pụta nʼihu nzukọ unu guzo gbaa ama ụgha megide Nebọt sị na ha nụrụ mgbe ọ kọchara Chineke na eze. Maanụ ya ikpe ọnwụ, kpụpụ ya nʼazụ obodo, jiri nkume tugbuo ya, ka ọ nwụọ.” 11 Ndị okenye na ndị a na-asọpụrụ ndị bi nʼobodo ahụ mere dịka Jezebel nyere nʼiwu nʼakwụkwọ ahụ o degaara ha. 12 Ha nyere iwu maka ibu ọnụ, kpọọkwa nzukọ ndị obodo ahụ niile, meekwa ka Nebọt nọdụ nʼoche dị mkpa. 13 Mgbe ahụ, ndị ikom abụọ na-abaghị uru pụtakwara, nọdụ na ncherita ihu ya, ha gbara ama ụgha megide Nebọt, nʼihu ndị mmadụ, sị, “Nebọt kọchara Chineke na eze.” Nʼihi nke a, ha dọkpụụrụ ya gaa nʼazụ obodo jiri nkume tugbuo ya. 14 Emesịa, ndị okenye na ndị a maara aha ha nke obodo Jezril, ziri ozi zigara Jezebel gwa ya na Nebọt anwụọla. 15 Ngwangwa Jezebel natara ozi na a tụgbola Nebọt, ọ sịrị Ehab, “Bilie, gaa nwetara onwe gị ubi vaịnị Nebọt, nwoke onye Jezril. Ubi ahụ ọ jụrụ inye gị nʼego abụrụla nke gị ugbu a nʼihi na Nebọt anwụọla. Ọ dịkwaghị ndụ ọzọ!” 16 Mgbe Ehab nụrụ na Nebọt anwụọla, o biliri pụọ, gaa ịbanye nʼubi ahụ, inwetara onwe ya ubi vaịnị Nebọt, onye Jezril. 17 Ma okwu ONYENWE ANYỊ rutere Ịlaịja, onye Tishbe, sị ya, 18 “Bilie, gaa zute Ehab, eze Izrel onye bi na Sameria. Ọ nọ ugbu a nʼime ubi vaịnị Nebọt inwetara ya onwe ya. 19 Gwa ya sị ya, ‘Ihe a ka ONYENWE ANYỊ kwuru: I gbuola ọchụ mmadụ si otu a nwetara onwe gị ihe nketa? Ebe ahụ nkịta nọ rachaa ọbara Nebọt ka ha ga-anọ rachaakwa ọbara gị. E, ọbara gị onwe gị.’ ” 20 Mgbe ahụ, Ehab jụrụ Ịlaịja ajụjụ sị ya, “Onye iro m, ị chọrọkwala m bịa?”Ịlaịja zara sị ya, “E, achọrọla m gị bịa nʼihi nnyefe i nyefere onwe gị ime ihe dị njọ nʼanya ONYENWE ANYỊ. 21 Ọ sịrị, ‘Aga m eme ka ihe ọjọọ dakwasị gị. Aga m ekpochapụ ndị agbụrụ gị, site nʼezinaụlọ Ehab bipụ nwoke ọbụla, maọbụ ohu maọbụ onyenwe onwe ya nʼIzrel. 22 Aga m eme ka ụlọ gị dịrị ka nke Jeroboam nwa Nebat, na dịka nke Baasha nwa Ahija, nʼihi na ị kpasuola m iwe, meekwa ka Izrel mehie.’ 23 “Ma banyere Jezebel, ONYENWE ANYỊ sịrị, ‘Ụmụ nkịta ga-eri anụ ahụ Jezebel nʼakụkụ mgbidi aja ụlọ dị nʼobodo Jezril.’ 24 “Nkịta ga-eri anụ onye ọbụla si nʼezinaụlọ Ehab nke nwụrụ nʼime obodo, ma anụ ufe nke eluigwe ga-eri anụ ndị ọbụla nwụrụ nʼọhịa.” 25 (Nʼezie, o nweghị onye ọbụla ọzọ dị ka Ehab, onye rere onwe ya nye ime ihe ọjọọ dị ukwuu nʼanya ONYENWE ANYỊ, onye Jezebel nwunye ya kwagidere ime ihe ọjọọ dị iche iche. 26 Ehab bụ onye mere mmehie dị oke njọ nke ịgbaso na ife arụsị dị iche iche ofufe dịka ndị Amọrait mere, bụ ndị ahụ ONYENWE ANYỊ sitere nʼala a chụpụ ime ka ndị Izrel nweta ala ha.) 27 Mgbe Ehab nụrụ okwu amụma ndị a, ọ dọwara uwe ya, yikwasị onwe ya akwa mkpe, buo ọnụ, dinaa nʼakwa mkpe ahụ, jegharịakwa nʼịdị umeala. 28 Ma okwu ONYENWE ANYỊ rutere Ịlaịja, onye Tishbe ọzọ, sị ya, 29 “Ị hụrụ otu Ehab si weda onwe ya ala nʼihu m? Nʼihi ihe a o mere, iweda onwe ya ala nʼihu m, agaghị m eme ka ihe ọjọọ ndị a m kwuru okwu banyere ha rute ya nʼoge ọ dị ndụ. Kama aga m eme ka ihe ndị a dakwasị ezinaụlọ ya mgbe nwa ya ga-achị dịka eze.”

In Other Versions

1 Kings 21 in the ANGEFD

1 Kings 21 in the ANTPNG2D

1 Kings 21 in the AS21

1 Kings 21 in the BAGH

1 Kings 21 in the BBPNG

1 Kings 21 in the BBT1E

1 Kings 21 in the BDS

1 Kings 21 in the BEV

1 Kings 21 in the BHAD

1 Kings 21 in the BIB

1 Kings 21 in the BLPT

1 Kings 21 in the BNT

1 Kings 21 in the BNTABOOT

1 Kings 21 in the BNTLV

1 Kings 21 in the BOATCB

1 Kings 21 in the BOATCB2

1 Kings 21 in the BOBCV

1 Kings 21 in the BOCNT

1 Kings 21 in the BOECS

1 Kings 21 in the BOGWICC

1 Kings 21 in the BOHCB

1 Kings 21 in the BOHCV

1 Kings 21 in the BOHLNT

1 Kings 21 in the BOHNTLTAL

1 Kings 21 in the BOILNTAP

1 Kings 21 in the BOITCV

1 Kings 21 in the BOKCV

1 Kings 21 in the BOKCV2

1 Kings 21 in the BOKHWOG

1 Kings 21 in the BOKSSV

1 Kings 21 in the BOLCB

1 Kings 21 in the BOLCB2

1 Kings 21 in the BOMCV

1 Kings 21 in the BONAV

1 Kings 21 in the BONCB

1 Kings 21 in the BONLT

1 Kings 21 in the BONUT2

1 Kings 21 in the BOPLNT

1 Kings 21 in the BOSCB

1 Kings 21 in the BOSNC

1 Kings 21 in the BOTLNT

1 Kings 21 in the BOVCB

1 Kings 21 in the BOYCB

1 Kings 21 in the BPBB

1 Kings 21 in the BPH

1 Kings 21 in the BSB

1 Kings 21 in the CCB

1 Kings 21 in the CUV

1 Kings 21 in the CUVS

1 Kings 21 in the DBT

1 Kings 21 in the DGDNT

1 Kings 21 in the DHNT

1 Kings 21 in the DNT

1 Kings 21 in the ELBE

1 Kings 21 in the EMTV

1 Kings 21 in the ESV

1 Kings 21 in the FBV

1 Kings 21 in the FEB

1 Kings 21 in the GGMNT

1 Kings 21 in the GNT

1 Kings 21 in the HARY

1 Kings 21 in the HNT

1 Kings 21 in the IRVA

1 Kings 21 in the IRVB

1 Kings 21 in the IRVG

1 Kings 21 in the IRVH

1 Kings 21 in the IRVK

1 Kings 21 in the IRVM

1 Kings 21 in the IRVM2

1 Kings 21 in the IRVO

1 Kings 21 in the IRVP

1 Kings 21 in the IRVT

1 Kings 21 in the IRVT2

1 Kings 21 in the IRVU

1 Kings 21 in the ISVN

1 Kings 21 in the JSNT

1 Kings 21 in the KAPI

1 Kings 21 in the KBT1ETNIK

1 Kings 21 in the KBV

1 Kings 21 in the KJV

1 Kings 21 in the KNFD

1 Kings 21 in the LBA

1 Kings 21 in the LBLA

1 Kings 21 in the LNT

1 Kings 21 in the LSV

1 Kings 21 in the MAAL

1 Kings 21 in the MBV

1 Kings 21 in the MBV2

1 Kings 21 in the MHNT

1 Kings 21 in the MKNFD

1 Kings 21 in the MNG

1 Kings 21 in the MNT

1 Kings 21 in the MNT2

1 Kings 21 in the MRS1T

1 Kings 21 in the NAA

1 Kings 21 in the NASB

1 Kings 21 in the NBLA

1 Kings 21 in the NBS

1 Kings 21 in the NBVTP

1 Kings 21 in the NET2

1 Kings 21 in the NIV11

1 Kings 21 in the NNT

1 Kings 21 in the NNT2

1 Kings 21 in the NNT3

1 Kings 21 in the PDDPT

1 Kings 21 in the PFNT

1 Kings 21 in the RMNT

1 Kings 21 in the SBIAS

1 Kings 21 in the SBIBS

1 Kings 21 in the SBIBS2

1 Kings 21 in the SBICS

1 Kings 21 in the SBIDS

1 Kings 21 in the SBIGS

1 Kings 21 in the SBIHS

1 Kings 21 in the SBIIS

1 Kings 21 in the SBIIS2

1 Kings 21 in the SBIIS3

1 Kings 21 in the SBIKS

1 Kings 21 in the SBIKS2

1 Kings 21 in the SBIMS

1 Kings 21 in the SBIOS

1 Kings 21 in the SBIPS

1 Kings 21 in the SBISS

1 Kings 21 in the SBITS

1 Kings 21 in the SBITS2

1 Kings 21 in the SBITS3

1 Kings 21 in the SBITS4

1 Kings 21 in the SBIUS

1 Kings 21 in the SBIVS

1 Kings 21 in the SBT

1 Kings 21 in the SBT1E

1 Kings 21 in the SCHL

1 Kings 21 in the SNT

1 Kings 21 in the SUSU

1 Kings 21 in the SUSU2

1 Kings 21 in the SYNO

1 Kings 21 in the TBIAOTANT

1 Kings 21 in the TBT1E

1 Kings 21 in the TBT1E2

1 Kings 21 in the TFTIP

1 Kings 21 in the TFTU

1 Kings 21 in the TGNTATF3T

1 Kings 21 in the THAI

1 Kings 21 in the TNFD

1 Kings 21 in the TNT

1 Kings 21 in the TNTIK

1 Kings 21 in the TNTIL

1 Kings 21 in the TNTIN

1 Kings 21 in the TNTIP

1 Kings 21 in the TNTIZ

1 Kings 21 in the TOMA

1 Kings 21 in the TTENT

1 Kings 21 in the UBG

1 Kings 21 in the UGV

1 Kings 21 in the UGV2

1 Kings 21 in the UGV3

1 Kings 21 in the VBL

1 Kings 21 in the VDCC

1 Kings 21 in the YALU

1 Kings 21 in the YAPE

1 Kings 21 in the YBVTP

1 Kings 21 in the ZBP