1 Kings 22 (BOICB)

1 Agha ọzọ adaghị nʼetiti Aram na Izrel afọ atọ. 2 Ma nʼafọ nke atọ, Jehoshafat, eze Juda, gara ileta Ehab eze Izrel. 3 Eze Izrel sịrị ndị ozi ya, “Unu amaghị na ala Ramọt Gilead bụ nke anyị, ma lee na anyị gbara nkịtị ịga napụta ya site nʼaka eze Aram?” 4 Ya mere, ọ jụrụ Jehoshafat, “Ị ga-eso m gaa buso Ramọt Gilead agha?”Jehoshafat zaghachiri eze Izrel, sị, “Otu m dị ka gị onwe gị dị, ndị m bụkwa ndị gị, ịnyịnya m bụkwa nke gị.” 5 Ma Jehoshafat gwakwara eze Izrel, sị, “Buru ụzọ chọpụta ihe bụ ntụziaka ONYENWE ANYỊ.” 6 Ya mere, eze Izrel kpọkọtara ndị amụma, ọnụọgụgụ ha ruru narị ndị ikom anọ, jụọ ha sị, “Ọ bụ m gaa buso Ramọt Gilead agha, ka ọ bụ m hapụ ịga?”Ha zara, “Gaa, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enyefe ha nʼaka eze.” 7 Ma Jehoshafat jụrụ, “Ọ bụ na e nwekwaghị onye amụma ONYENWE ANYỊ nọ nʼebe a, onye anyị nwere ike ịjụta ase nʼaka ya?” 8 Eze Izrel zaghachiri Jehoshafat, sị, “A ka nwere otu onye amụma, onye anyị nwere ike isite nʼaka ya jụọ ONYENWE ANYỊ ase, ọ bụ Maikaya nwa Imla, ma akpọrọ m ya asị, nʼihi na o nweghị oge ọ na-ebu amụma ihe ọma nʼebe m nọ, kama ọ bụ naanị nke ọjọọ.”Jehoshafat sịrị, “Eze ekwesighị ikwu okwu dị otu a.” 9 Mgbe ahụ, eze Izrel kpọrọ otu onye na-ejere ya ozi sị ya, “Mee ọsịịsọ kpọta Maikaya nwa Imla nʼebe a.” 10 Ehab eze Izrel na Jehoshafat eze Juda, onye ọbụla yi uwe eze ya, na-anọkwasị nʼocheeze ya nʼebe ịzọcha ọka nʼọnụ ụzọ ama e si abata obodo Sameria. Ndị amụma ahụ niile nọkwa na-ebu amụma nʼihu ha. 11 Zedekaya nwa Kenaana, mere mpi igwe, ọ kwupụtara sị, “Nke a bụ ihe ONYENWE ANYỊ na-ekwu, ‘Ihe ndị a ka ị ga-eji sọgide ndị Aram, ruo mgbe a ga-ala ha nʼiyi.’ ” 12 Ndị amụma ndị ọzọ niile na-ebu otu ihe ahụ nʼamụma, na-asị, “Gaa, busoo Ramọt Gilead agha, ị ga-enwekwa mmeri, nʼihi na ONYENWE ANYỊ ga-enyefe ya nʼaka eze.” 13 Onyeozi ahụ nke gara ịkpọ Maikaya sịrị ya, “Lee, ndị amụma ndị ọzọ na-agụpụghị onye ọbụla na-ebu amụma ọganihu nye eze. Mee ka okwu gị na ha dakọta. Kwuokwa ihe ga-adị eze mma.” 14 Ma Maikaya sịrị, “Dịka ONYENWE ANYỊ na-adị ndụ, aga m agwa ya naanị ihe ONYENWE ANYỊ gwara m.” 15 Mgbe ọ bịarutere, eze jụrụ ya, “Maikaya, ọ bụ anyị gaa buso Ramọt Gilead agha, ka ọ bụ anyị hapụ?”Ọ zara, “Gaa, ma nwekwa mmeri, nʼihi na ONYENWE ANYỊ ga-enyefe ya nʼaka eze.” 16 Eze sịrị ya, “Ugboro ole ka m ga-eme ka ị ṅụọ iyi na ị gaghị agwa m ihe ọzọ, karịa naanị eziokwu nʼaha ONYENWE ANYỊ?” 17 Mgbe ahụ Mikaya zara, “Ahụrụ m Izrel niile ka ha gbasasịrị nʼelu ọtụtụ ugwu dịka atụrụ na-enweghị onye ọzụzụ atụrụ, ma ONYENWE ANYỊ sịrị, ‘Ndị a enweghị onyendu. Ka onye ọbụla laghachi nʼụlọ ya nʼudo.’ ” 18 Eze Izrel, sịrị Jehoshafat, “Ọ bụ na m agwaghị gị na ọ dịghị mgbe ọ na-ebu amụma ihe ọma banyere m, kama naanị ihe ọjọọ?” 19 Mikaya gara nʼihu, sị, “Ya mere, nụrụnụ okwu ONYENWE ANYỊ. Ahụrụ m ONYENWE ANYỊ ka ọ nọkwasịrị nʼocheeze ya, hụkwa usuu nke eluigwe ka ha na-eguzo nʼakụkụ ya, nʼaka nri ya nakwa nʼaka ekpe ya. 20 ONYENWE ANYỊ sịrị, ‘Onye ga-aga rafuo Ehab ka ọ gaa buso Ramọt Gilead agha, gaa nwụọ nʼebe ahụ?’“Otu onye tụpụtara aro nke a, ebe onye ọzọ tụpụtara nke ọzọ. 21 Nʼikpeazụ otu mmụọ pụtara, guzo nʼihu ONYENWE ANYỊ sị, ‘Mụ onwe m ga-arafu ya.’ 22 “ ‘ONYENWE ANYỊ jụrụ sị, Olee otu ị ga-esi mee nke a?’“ ‘Aga m apụ gaa bụrụ mmụọ nrafu nʼọnụ ndị amụma ya niile,’ ka ọ zara.“ONYENWE ANYỊ sịrị, ‘Ị ga-enwe ike ịrafu ya. Gaa mee otu a.’ 23 “Ma ugbu a, ONYENWE ANYỊ etinyela mmụọ okwu ụgha nʼọnụ ndị amụma gị niile ndị a. ONYENWE ANYỊ ekwubiela nʼihe ọjọọ ga-adakwasị gị.” 24 Mgbe ahụ, Zedekaya nwa Kenaana, gara nso, maa Maikaya aka na nti, jụọ ya, “Olee ụzọ ka mmụọ ahụ sitere na ONYENWE ANYỊ gara, mgbe ọ hapụrụ m bịa ịgwa gị okwu?” 25 Maikaya zaghachiri, “Ị ga-achọpụta nke a nʼụbọchị ị ga-agbaba nʼime ime ụlọ izo onwe gị.” 26 Mgbe ahụ, eze Izrel nyere iwu sị, “Jidenụ Maikaya kpụgara ya Amọn onye na-achị obodo a, na Joash nwa eze 27 ị ga-asịkwa, ‘Otu a ka eze sịrị: Tinye nwoke a nʼụlọ mkpọrọ, nye ya naanị achịcha na mmiri ọṅụṅụ tutu ruo mgbe m lọghachiri nʼudo.’ ” 28 Maikaya kwupụtara sị, “Ọ bụrụ na ị lọghachi nʼudo, ọ pụtara na ọ bụghị ONYENWE ANYỊ si nʼọnụ m kwuo okwu.” O kwukwara sị, “Unu niile hụbakwanụ okwu m ndị a niile ama!” 29 Ya mere, eze Izrel na Jehoshafat eze Juda, pụrụ gawa Ramọt Gilead. 30 Eze Izrel gwara Jehoshafat, sị, “Aga m ejikere onwe m dịka m bụ onye ọzọ banye nʼọgbọ agha, ma gị onwe gị yiri uwe eze gị.” Ya mere, eze Izrel nwogharịrị onwe ya ka onye ọzọ baa nʼọgbọ agha. 31 Ma eze Aram enyelarị ndị ọchịagha ndị na-agba ụgbọ agha, ọnụọgụgụ ha dị iri atọ na abụọ, iwu sị, “Unu ebusola onye ọbụla agha, maọbụ onye ukwu maọbụ onye nta, karịakwa naanị eze Izrel.” 32 Mgbe ndị ọchịagha, na-achị ụgbọ agha hụrụ Jehoshafat, ha chere nʼobi ha, “Nʼezie, onye a bụ eze Izrel.” Nʼihi ya ha tụgharịrị ibuso ya agha, ma Jehoshafat tiri mkpu, 33 ndị ọchịagha, na-achị ndị na-agba ụgbọ agha hụrụ na ọ bụghị eze Izrel, ma kwụsị ịchụso ya. 34 Ma otu onye dọrọ ụta ya gbapụ ya na-ebughị onye ọbụla nʼobi, gbata ya eze Izrel nʼetiti njikọ nke uwe agha ya. Eze gwara onye ọkwọ ụgbọ agha ya, sị, “Tụgharịa, si nʼebe a bupụ m, nʼihi na emerụọla m ahụ.” 35 Agha ahụ siri ike nʼụbọchị ahụ niile, e ji ihe mee ka eze kwụrụ ọtọ nʼime ụgbọ agha ya na-eche ndị Aram ihu. Ọbara si nʼọnya ahụ sọjuru nʼala ụgbọ agha ahụ, ọ nwụrụ nʼuhuruchi ụbọchị ahụ. 36 Mgbe anyanwụ na-ada, e tiri mkpu nke gazuru nʼọgbọ agha ndị Izrel, sị, “Nwoke ọbụla laa nʼobodo ya, onye ọbụla laakwa nʼala nke aka ya!” 37 Ya mere, eze nwụrụ, e buta ozu ya nʼobodo Sameria, ebe a nọ lie ya. 38 Ha sachara ụgbọ agha ya nʼọdọ mmiri dị na Sameria (ebe ndị akwụna na-asa ahụ). Ụmụ nkịta rachara ọbara ya, dịka okwu ONYENWE ANYỊ kwubiri. 39 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Ehab na ihe niile o mere, ụlọeze o wuru nke o ji ọdụ chọọ mma, na obodo niile o wusiri ike, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Izrel? 40 Ehab sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ. Ahazaya nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ. 41 Jehoshafat nwa Asa ghọrọ eze Juda, nʼafọ nke anọ, nke ọchịchị Ehab eze Izrel. 42 Jehoshafat gbara iri afọ atọ na ise mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị iri afọ abụọ na ise na Jerusalem. Aha nne ya bụ Azuba, nwa Shilhi. 43 Nʼihe niile o jere ije nʼụzọ Asa bụ nna ya, o sitekwaghị nʼime ha wezuga onwe ya, o mekwara ihe ziri ezi nʼanya ONYENWE ANYỊ. Naanị na o wezugaghị ebe dị elu niile, nke mere na ndị mmadụ gara nʼihu na-achụ aja, na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼebe ahụ niile. 44 Jehoshafat mere ka udo dị nʼetiti ya na eze Izrel. 45 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Jehoshafat, ihe niile ndị ọ rụpụtara, ike ọ kpara nʼọtụtụ agha nke o buru, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda? 46 O kpochapụrụ ndị ikom akwụna ụlọ arụsị, bụ ndị nke fọdụrụ, mgbe nna ya bụ Asa chịchara ọchịchị. 47 Nʼoge a, eze adịghị nʼala Edọm, kama ọ bụ onye nnọchite anya eze bụ onye na-achị. 48 Jehoshafat wuuru ọtụtụ ụgbọ mmiri eji azụ ahịa, maka ije nʼala Ọfịa ịga bute ọlaedo ma ụgbọ mmiri ndị a agaghị ebe ọbụla, nʼihi na ha mikpuru nʼEziọn Geba. 49 Nʼoge ahụ, Ahazaya nwa Ehab sịrị Jehoshafat, “Kwere ka ndị ikom m soro ndị ọrụ gị nʼụgbọ gị,” ma Jehoshafat ekweghị. 50 Mgbe ahụ, Jehoshafat sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha nʼobodo Devid, nna ya. Jehoram nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 51 Ahazaya nwa Ehab, malitere ịbụ eze Izrel na Sameria, nʼafọ iri na asaa nke ọchịchị Jehoshafat, eze Juda. Ma ọ chịrị Izrel naanị afọ abụọ. 52 O mere ihe dị njọ nʼanya ONYENWE ANYỊ, nʼihi na o sooro ụzọ ọjọọ niile nke nna na nne ya, na ụzọ ọjọọ nke Jeroboam nwa Nebat, onye mere ka Izrel mee mmehie. 53 Ọ fekwara arụsị Baal ofufe, kpọọkwa isiala nye ya, si otu a kpasuo ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel iwe, dịka nna ya mere.

In Other Versions

1 Kings 22 in the ANGEFD

1 Kings 22 in the ANTPNG2D

1 Kings 22 in the AS21

1 Kings 22 in the BAGH

1 Kings 22 in the BBPNG

1 Kings 22 in the BBT1E

1 Kings 22 in the BDS

1 Kings 22 in the BEV

1 Kings 22 in the BHAD

1 Kings 22 in the BIB

1 Kings 22 in the BLPT

1 Kings 22 in the BNT

1 Kings 22 in the BNTABOOT

1 Kings 22 in the BNTLV

1 Kings 22 in the BOATCB

1 Kings 22 in the BOATCB2

1 Kings 22 in the BOBCV

1 Kings 22 in the BOCNT

1 Kings 22 in the BOECS

1 Kings 22 in the BOGWICC

1 Kings 22 in the BOHCB

1 Kings 22 in the BOHCV

1 Kings 22 in the BOHLNT

1 Kings 22 in the BOHNTLTAL

1 Kings 22 in the BOILNTAP

1 Kings 22 in the BOITCV

1 Kings 22 in the BOKCV

1 Kings 22 in the BOKCV2

1 Kings 22 in the BOKHWOG

1 Kings 22 in the BOKSSV

1 Kings 22 in the BOLCB

1 Kings 22 in the BOLCB2

1 Kings 22 in the BOMCV

1 Kings 22 in the BONAV

1 Kings 22 in the BONCB

1 Kings 22 in the BONLT

1 Kings 22 in the BONUT2

1 Kings 22 in the BOPLNT

1 Kings 22 in the BOSCB

1 Kings 22 in the BOSNC

1 Kings 22 in the BOTLNT

1 Kings 22 in the BOVCB

1 Kings 22 in the BOYCB

1 Kings 22 in the BPBB

1 Kings 22 in the BPH

1 Kings 22 in the BSB

1 Kings 22 in the CCB

1 Kings 22 in the CUV

1 Kings 22 in the CUVS

1 Kings 22 in the DBT

1 Kings 22 in the DGDNT

1 Kings 22 in the DHNT

1 Kings 22 in the DNT

1 Kings 22 in the ELBE

1 Kings 22 in the EMTV

1 Kings 22 in the ESV

1 Kings 22 in the FBV

1 Kings 22 in the FEB

1 Kings 22 in the GGMNT

1 Kings 22 in the GNT

1 Kings 22 in the HARY

1 Kings 22 in the HNT

1 Kings 22 in the IRVA

1 Kings 22 in the IRVB

1 Kings 22 in the IRVG

1 Kings 22 in the IRVH

1 Kings 22 in the IRVK

1 Kings 22 in the IRVM

1 Kings 22 in the IRVM2

1 Kings 22 in the IRVO

1 Kings 22 in the IRVP

1 Kings 22 in the IRVT

1 Kings 22 in the IRVT2

1 Kings 22 in the IRVU

1 Kings 22 in the ISVN

1 Kings 22 in the JSNT

1 Kings 22 in the KAPI

1 Kings 22 in the KBT1ETNIK

1 Kings 22 in the KBV

1 Kings 22 in the KJV

1 Kings 22 in the KNFD

1 Kings 22 in the LBA

1 Kings 22 in the LBLA

1 Kings 22 in the LNT

1 Kings 22 in the LSV

1 Kings 22 in the MAAL

1 Kings 22 in the MBV

1 Kings 22 in the MBV2

1 Kings 22 in the MHNT

1 Kings 22 in the MKNFD

1 Kings 22 in the MNG

1 Kings 22 in the MNT

1 Kings 22 in the MNT2

1 Kings 22 in the MRS1T

1 Kings 22 in the NAA

1 Kings 22 in the NASB

1 Kings 22 in the NBLA

1 Kings 22 in the NBS

1 Kings 22 in the NBVTP

1 Kings 22 in the NET2

1 Kings 22 in the NIV11

1 Kings 22 in the NNT

1 Kings 22 in the NNT2

1 Kings 22 in the NNT3

1 Kings 22 in the PDDPT

1 Kings 22 in the PFNT

1 Kings 22 in the RMNT

1 Kings 22 in the SBIAS

1 Kings 22 in the SBIBS

1 Kings 22 in the SBIBS2

1 Kings 22 in the SBICS

1 Kings 22 in the SBIDS

1 Kings 22 in the SBIGS

1 Kings 22 in the SBIHS

1 Kings 22 in the SBIIS

1 Kings 22 in the SBIIS2

1 Kings 22 in the SBIIS3

1 Kings 22 in the SBIKS

1 Kings 22 in the SBIKS2

1 Kings 22 in the SBIMS

1 Kings 22 in the SBIOS

1 Kings 22 in the SBIPS

1 Kings 22 in the SBISS

1 Kings 22 in the SBITS

1 Kings 22 in the SBITS2

1 Kings 22 in the SBITS3

1 Kings 22 in the SBITS4

1 Kings 22 in the SBIUS

1 Kings 22 in the SBIVS

1 Kings 22 in the SBT

1 Kings 22 in the SBT1E

1 Kings 22 in the SCHL

1 Kings 22 in the SNT

1 Kings 22 in the SUSU

1 Kings 22 in the SUSU2

1 Kings 22 in the SYNO

1 Kings 22 in the TBIAOTANT

1 Kings 22 in the TBT1E

1 Kings 22 in the TBT1E2

1 Kings 22 in the TFTIP

1 Kings 22 in the TFTU

1 Kings 22 in the TGNTATF3T

1 Kings 22 in the THAI

1 Kings 22 in the TNFD

1 Kings 22 in the TNT

1 Kings 22 in the TNTIK

1 Kings 22 in the TNTIL

1 Kings 22 in the TNTIN

1 Kings 22 in the TNTIP

1 Kings 22 in the TNTIZ

1 Kings 22 in the TOMA

1 Kings 22 in the TTENT

1 Kings 22 in the UBG

1 Kings 22 in the UGV

1 Kings 22 in the UGV2

1 Kings 22 in the UGV3

1 Kings 22 in the VBL

1 Kings 22 in the VDCC

1 Kings 22 in the YALU

1 Kings 22 in the YAPE

1 Kings 22 in the YBVTP

1 Kings 22 in the ZBP