1 Peter 5 (BOICB)

1 Mụ onwe m, onye bụ okenye na onyeama banyere ahụhụ Kraịst, bụrụkwa onye ga-eso keta oke nʼebube ya nke a gaje ikpughe, a na m arịọ ndị okenye nʼetiti unu arịrịọ a, 2 na-azụnụ igwe atụrụ ahụ Chineke nyefere unu nʼaka. Ka unu na-elekọta ha, ọ bụghị nʼihi na unu agaghị ime otu a, kama ọ bụ ihe sitere nʼọchịchọ obi unu, dị ka Chineke chọrọ ka unu mee. Ọ bụkwaghị nʼihi ego unu ga-enweta, kama ọ bụ ịnụ ọkụ unu nʼije ozi. 3 Unu abụla ọkaaka nʼebe ndị e nyefere unu nʼaka nọ. Kama bụrụnụ ihe ịma atụ nye igwe atụrụ ahụ. 4 Ma mgbe Onyeisi ndị ọzụzụ atụrụ ahụ ga-abịa unu ga-anata okpueze ebube nke na-agaghị agbanwe agbanwe. 5 Nʼotu aka ahụ, unu ụmụ okorobịa, doonụ onwe unu nʼokpuru ndị bụ okenye. Unu niile werenụ obi umeala na-ejeritara onwe unu ozi, nʼihi na,“Chineke na-eguzo imegide ndị na-ebuli onwe ha elu,ma ọ na-enye ndị dị umeala nʼobi amara.” 6 Ya mere, wedanụ onwe unu nʼokpuru aka dị ike nke Chineke, ka o bulie unu elu nʼoge ya. 7 Hapụrụnụ ya nsogbu unu na nchegbu unu, nʼihi na ihe banyere unu na-emetụ ya nʼobi. 8 Nọọnụ na njikere, na-echekwanụ nche nʼihi na onye iro unu bụ ekwensu ji oke ịgbọ ụja na-awagharị dịka ọdụm, na-achọ onye ọ ga-ala nʼiyi. 9 Guzosienụ ike nʼokwukwe unu. Unu ekwela ka o merie unu, kama tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi. Chetanụ na e nwere ọtụtụ ndị kwere ekwe dị ka unu ndị nọkwa nʼụdị ahụhụ a unu na-ahụ nʼụwa niile. 10 Chineke onye nwe amara niile, onye kpọbatara unu na ebube ebighị ebi ya nʼime Kraịst, mgbe unu hụrụ ahụhụ ndị a nwa oge, ya onwe ya ga-eweghachi unu nʼọnọdụ unu, mee ka unu dị nnọọ ike, ndị guzo chịm ma kwesikwa ntụkwasị obi. 11 Ọ bụ ya nwe ike niile ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. 12 Ọ bụ site nʼinyeaka Saịlas onye m hụtara dị ka nwanna kwesiri ntụkwasị obi ka m ji deere unu mkpụrụ okwu ole na ole ndị a nke m ji agbaa unu ume na-ekwupụtakwa na nke a bụ eziokwu dị nʼamara Chineke. Guzosienụ ike nʼime ya. 13 Nwanyị ahụ nọ na Babilọn, nke a họpụtara unu na ya, na-ekele unu. Mak, ezi nwa m nwoke na-ekelekwa unu. 14 Jirinụ isurita ọnụ ịhụnanya kelerịta onwe unu. Ka udo dịnyere unu niile nọ nʼime Kraịst.

In Other Versions

1 Peter 5 in the ANGEFD

1 Peter 5 in the ANTPNG2D

1 Peter 5 in the AS21

1 Peter 5 in the BAGH

1 Peter 5 in the BBPNG

1 Peter 5 in the BBT1E

1 Peter 5 in the BDS

1 Peter 5 in the BEV

1 Peter 5 in the BHAD

1 Peter 5 in the BIB

1 Peter 5 in the BLPT

1 Peter 5 in the BNT

1 Peter 5 in the BNTABOOT

1 Peter 5 in the BNTLV

1 Peter 5 in the BOATCB

1 Peter 5 in the BOATCB2

1 Peter 5 in the BOBCV

1 Peter 5 in the BOCNT

1 Peter 5 in the BOECS

1 Peter 5 in the BOGWICC

1 Peter 5 in the BOHCB

1 Peter 5 in the BOHCV

1 Peter 5 in the BOHLNT

1 Peter 5 in the BOHNTLTAL

1 Peter 5 in the BOILNTAP

1 Peter 5 in the BOITCV

1 Peter 5 in the BOKCV

1 Peter 5 in the BOKCV2

1 Peter 5 in the BOKHWOG

1 Peter 5 in the BOKSSV

1 Peter 5 in the BOLCB

1 Peter 5 in the BOLCB2

1 Peter 5 in the BOMCV

1 Peter 5 in the BONAV

1 Peter 5 in the BONCB

1 Peter 5 in the BONLT

1 Peter 5 in the BONUT2

1 Peter 5 in the BOPLNT

1 Peter 5 in the BOSCB

1 Peter 5 in the BOSNC

1 Peter 5 in the BOTLNT

1 Peter 5 in the BOVCB

1 Peter 5 in the BOYCB

1 Peter 5 in the BPBB

1 Peter 5 in the BPH

1 Peter 5 in the BSB

1 Peter 5 in the CCB

1 Peter 5 in the CUV

1 Peter 5 in the CUVS

1 Peter 5 in the DBT

1 Peter 5 in the DGDNT

1 Peter 5 in the DHNT

1 Peter 5 in the DNT

1 Peter 5 in the ELBE

1 Peter 5 in the EMTV

1 Peter 5 in the ESV

1 Peter 5 in the FBV

1 Peter 5 in the FEB

1 Peter 5 in the GGMNT

1 Peter 5 in the GNT

1 Peter 5 in the HARY

1 Peter 5 in the HNT

1 Peter 5 in the IRVA

1 Peter 5 in the IRVB

1 Peter 5 in the IRVG

1 Peter 5 in the IRVH

1 Peter 5 in the IRVK

1 Peter 5 in the IRVM

1 Peter 5 in the IRVM2

1 Peter 5 in the IRVO

1 Peter 5 in the IRVP

1 Peter 5 in the IRVT

1 Peter 5 in the IRVT2

1 Peter 5 in the IRVU

1 Peter 5 in the ISVN

1 Peter 5 in the JSNT

1 Peter 5 in the KAPI

1 Peter 5 in the KBT1ETNIK

1 Peter 5 in the KBV

1 Peter 5 in the KJV

1 Peter 5 in the KNFD

1 Peter 5 in the LBA

1 Peter 5 in the LBLA

1 Peter 5 in the LNT

1 Peter 5 in the LSV

1 Peter 5 in the MAAL

1 Peter 5 in the MBV

1 Peter 5 in the MBV2

1 Peter 5 in the MHNT

1 Peter 5 in the MKNFD

1 Peter 5 in the MNG

1 Peter 5 in the MNT

1 Peter 5 in the MNT2

1 Peter 5 in the MRS1T

1 Peter 5 in the NAA

1 Peter 5 in the NASB

1 Peter 5 in the NBLA

1 Peter 5 in the NBS

1 Peter 5 in the NBVTP

1 Peter 5 in the NET2

1 Peter 5 in the NIV11

1 Peter 5 in the NNT

1 Peter 5 in the NNT2

1 Peter 5 in the NNT3

1 Peter 5 in the PDDPT

1 Peter 5 in the PFNT

1 Peter 5 in the RMNT

1 Peter 5 in the SBIAS

1 Peter 5 in the SBIBS

1 Peter 5 in the SBIBS2

1 Peter 5 in the SBICS

1 Peter 5 in the SBIDS

1 Peter 5 in the SBIGS

1 Peter 5 in the SBIHS

1 Peter 5 in the SBIIS

1 Peter 5 in the SBIIS2

1 Peter 5 in the SBIIS3

1 Peter 5 in the SBIKS

1 Peter 5 in the SBIKS2

1 Peter 5 in the SBIMS

1 Peter 5 in the SBIOS

1 Peter 5 in the SBIPS

1 Peter 5 in the SBISS

1 Peter 5 in the SBITS

1 Peter 5 in the SBITS2

1 Peter 5 in the SBITS3

1 Peter 5 in the SBITS4

1 Peter 5 in the SBIUS

1 Peter 5 in the SBIVS

1 Peter 5 in the SBT

1 Peter 5 in the SBT1E

1 Peter 5 in the SCHL

1 Peter 5 in the SNT

1 Peter 5 in the SUSU

1 Peter 5 in the SUSU2

1 Peter 5 in the SYNO

1 Peter 5 in the TBIAOTANT

1 Peter 5 in the TBT1E

1 Peter 5 in the TBT1E2

1 Peter 5 in the TFTIP

1 Peter 5 in the TFTU

1 Peter 5 in the TGNTATF3T

1 Peter 5 in the THAI

1 Peter 5 in the TNFD

1 Peter 5 in the TNT

1 Peter 5 in the TNTIK

1 Peter 5 in the TNTIL

1 Peter 5 in the TNTIN

1 Peter 5 in the TNTIP

1 Peter 5 in the TNTIZ

1 Peter 5 in the TOMA

1 Peter 5 in the TTENT

1 Peter 5 in the UBG

1 Peter 5 in the UGV

1 Peter 5 in the UGV2

1 Peter 5 in the UGV3

1 Peter 5 in the VBL

1 Peter 5 in the VDCC

1 Peter 5 in the YALU

1 Peter 5 in the YAPE

1 Peter 5 in the YBVTP

1 Peter 5 in the ZBP