1 Samuel 22 (BOICB)

1 Devid hapụrụ Gat gbaba nʼọgba nkume Adulam. Mgbe ụmụnne ya ndị ikom na ndị ezinaụlọ nna ya nụrụ nke a, ha jekwuru ya nʼebe ahụ. 2 Ndị ọzọ malitekwara ịbịakwute ya nʼebe ahụ, ndị niile nọ na mkpagbu dị iche iche, ndị ji ụgwọ, na ndị ọchịchị Sọl na-adịghị mma. Ha niile jekwuru ya. Ọ dịghị anya Devid ghọọrọ onyendu ha. Ihe ruru narị mmadụ anọ so ya. 3 Devid sitere nʼebe ahụ jee Mizpa dị na Moab rịọọ eze obodo ahụ sị, “Biko, ị ga-ekwe ka nna m na nne m pụta bịa biri nʼetiti unu tutu ruo mgbe m matara ihe Chineke na-aga imere m?” 4 Ya mere, ọ hapụrụ ha ka ha nọdụ na nke eze Moab. Ha na ya nọgidere oge niile Devid bi nʼebe ahụ e wusiri ike. 5 Ma Gad onye amụma sịrị Devid, “Anọgidela nʼebe ahụ e wusiri ike, kama laghachi nʼala Juda.” Ya mere, Devid biliri gaa nʼoke ọhịa Heret. 6 Ugbu a Sọl nụrụ na achọtala ebe Devid na ndị ikom na-eso ya nọ. Sọl, onye ji ùbe ya nʼaka nọdụrụ ala nʼokpuru osisi tamarisk nke dị nʼugwu dị na Gibea. Ndị ozi ya guzokwa gburugburu ya. 7 Sọl gwara ha sị, “Geenụ ntị unu ndị ikom Benjamin! Ọ bụ unu niile ka nwa Jesi ga-enye ala ubi na ubi vaịnị? Ọ bụ unu niile ka ọ ga-eme ndị ọchịagha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ọchịagha na-achị ọtụtụ narị ndị agha? 8 Ọ bụ ya mere unu ji dịnyere ya imegide m? Ọ dịghị onye ọbụla nʼime unu gwara m na nwa m na nwa Jesi gbara ndụ. Ọ dịghị onye ọbụla nʼime unu ihe gbasara m na-emetụ nʼobi ịgwa m na nwa m nwoke akpaliela ohu m imegide m, ichebiri m nʼụzọ, dịka o mere nʼụbọchị taa.” 9 Ma Doeg onye Edọm, onye so ndị ozi Sọl guzo nʼebe ahụ kwuru sị, “Ahụrụ m mgbe nwa Jesi bịakwutere Ahimelek, nwa Ahitub na Nob. 10 Ahimelek jụtaara ya ase site nʼaka ONYENWE ANYỊ, ma nyekwa ya ihe oriri na mma agha Golaịat onye Filistia.” 11 Mgbe ahụ, eze Sọl zipụrụ ozi nye Ahimelek nwa Ahitub na ndị ezinaụlọ nna ya niile, ndị bụ ndị nchụaja na Nob. Ha niile bịara guzo nʼihu eze. 12 Sọl gwara ha okwu sị, “Gee ntị, gị nwa Ahitub.”Ahimelek zara sị, “Ana m ege ntị, onyenwe m.” 13 Sọl jụrụ ya sị, “Gịnị mere gị na nwa Jesi ji gbaa izu imegide m? Gịnị mere i ji nye ya nri na mma agha, jụkwaara ya ase site nʼaka Chineke? Gịnị mere i ji na-agba ya ume ka o nupu isi nʼebe m nọ, na ka ọ bịakwa nʼebe a imegide m taa?” 14 Ahimelek zara eze sị, “Onye nʼetiti ndị ohu gị niile bụ onye kwesiri ntụkwasị obi dịka Devid, ọgọ eze, na onyeisi ndị agha na-eche gị nche; ọ bụkwa onye a na-enye nsọpụrụ dị ukwuu nʼezinaụlọ gị? 15 Nke a ọ bụ ụbọchị mbụ m na-ajụrụ ya ase nʼaka Chineke? Ọ bụghị! Ka eze ghara ibo ohu ya na ezinaụlọ nna m ebubo, nʼihi na ohu gị amaghị ihe ọbụla banyere okwu a niile.” 16 Ma eze kwuru sị, “Ị ga-anwụ. Ahimelek gị na ezinaụlọ nna gị niile!” 17 O nyere ndị na-eso ya iwu sị ha, “Gbuonụ ndị nchụaja ndị a, nʼihi na ha na Devid agbaala izuzu; ha makwa na o si nʼihu m na-agbapụ, ma ha agwaghị m!”Ma ndị agha eze jụrụ isetipụ aka ha megide ndị nchụaja ONYENWE ANYỊ. 18 Mgbe ahụ eze nyere Doeg iwu sị ya, “Gị onwe gị, chigharịa gbuo ha.” Ya mere, Doeg onye Edọm chigharịrị tigbuo ha. Nʼụbọchị ahụ, o gburu iri ndị nchụaja asatọ na ise, ndị yi uwe akwa ọcha efọọd. 19 O ji mma agha jee Nob, obodo ndị nchụaja, gbuo ezinaụlọ ndị nchụaja niile, nwoke na nwanyị, na ụmụntakịrị, na ụmụ na-aṅụ ara. O gbukwara ehi na ịnyịnya ibu na atụrụ ha niile. 20 Otu nʼime ụmụ Ahimelek nwa Ahitub, aha ya bụ Abịata gbapụrụ, gbakwuru Devid. 21 Ọ gwara Devid na Sọl egbuola ndị nchụaja ONYENWE ANYỊ. 22 Mgbe ahụ, Devid sịrị Abịata, “Nʼụbọchị ahụ, mgbe Doeg onye Edọm nọ nʼebe ahụ, amaara m na ọ ghaghị ịgwa Sọl. Mụ onwe m kpatara ọnwụ ndị niile nke ndị ezinaụlọ nna gị. 23 Soro m nọdụ nʼebe a, atụla ụjọ, nʼihi na onye na-achọ ndụ gị na-achọkwa ndụ nke m. Mmekpa ahụ ọbụla agaghị adakwasị gị ma mụ na gị nọdụ.”

In Other Versions

1 Samuel 22 in the ANGEFD

1 Samuel 22 in the ANTPNG2D

1 Samuel 22 in the AS21

1 Samuel 22 in the BAGH

1 Samuel 22 in the BBPNG

1 Samuel 22 in the BBT1E

1 Samuel 22 in the BDS

1 Samuel 22 in the BEV

1 Samuel 22 in the BHAD

1 Samuel 22 in the BIB

1 Samuel 22 in the BLPT

1 Samuel 22 in the BNT

1 Samuel 22 in the BNTABOOT

1 Samuel 22 in the BNTLV

1 Samuel 22 in the BOATCB

1 Samuel 22 in the BOATCB2

1 Samuel 22 in the BOBCV

1 Samuel 22 in the BOCNT

1 Samuel 22 in the BOECS

1 Samuel 22 in the BOGWICC

1 Samuel 22 in the BOHCB

1 Samuel 22 in the BOHCV

1 Samuel 22 in the BOHLNT

1 Samuel 22 in the BOHNTLTAL

1 Samuel 22 in the BOILNTAP

1 Samuel 22 in the BOITCV

1 Samuel 22 in the BOKCV

1 Samuel 22 in the BOKCV2

1 Samuel 22 in the BOKHWOG

1 Samuel 22 in the BOKSSV

1 Samuel 22 in the BOLCB

1 Samuel 22 in the BOLCB2

1 Samuel 22 in the BOMCV

1 Samuel 22 in the BONAV

1 Samuel 22 in the BONCB

1 Samuel 22 in the BONLT

1 Samuel 22 in the BONUT2

1 Samuel 22 in the BOPLNT

1 Samuel 22 in the BOSCB

1 Samuel 22 in the BOSNC

1 Samuel 22 in the BOTLNT

1 Samuel 22 in the BOVCB

1 Samuel 22 in the BOYCB

1 Samuel 22 in the BPBB

1 Samuel 22 in the BPH

1 Samuel 22 in the BSB

1 Samuel 22 in the CCB

1 Samuel 22 in the CUV

1 Samuel 22 in the CUVS

1 Samuel 22 in the DBT

1 Samuel 22 in the DGDNT

1 Samuel 22 in the DHNT

1 Samuel 22 in the DNT

1 Samuel 22 in the ELBE

1 Samuel 22 in the EMTV

1 Samuel 22 in the ESV

1 Samuel 22 in the FBV

1 Samuel 22 in the FEB

1 Samuel 22 in the GGMNT

1 Samuel 22 in the GNT

1 Samuel 22 in the HARY

1 Samuel 22 in the HNT

1 Samuel 22 in the IRVA

1 Samuel 22 in the IRVB

1 Samuel 22 in the IRVG

1 Samuel 22 in the IRVH

1 Samuel 22 in the IRVK

1 Samuel 22 in the IRVM

1 Samuel 22 in the IRVM2

1 Samuel 22 in the IRVO

1 Samuel 22 in the IRVP

1 Samuel 22 in the IRVT

1 Samuel 22 in the IRVT2

1 Samuel 22 in the IRVU

1 Samuel 22 in the ISVN

1 Samuel 22 in the JSNT

1 Samuel 22 in the KAPI

1 Samuel 22 in the KBT1ETNIK

1 Samuel 22 in the KBV

1 Samuel 22 in the KJV

1 Samuel 22 in the KNFD

1 Samuel 22 in the LBA

1 Samuel 22 in the LBLA

1 Samuel 22 in the LNT

1 Samuel 22 in the LSV

1 Samuel 22 in the MAAL

1 Samuel 22 in the MBV

1 Samuel 22 in the MBV2

1 Samuel 22 in the MHNT

1 Samuel 22 in the MKNFD

1 Samuel 22 in the MNG

1 Samuel 22 in the MNT

1 Samuel 22 in the MNT2

1 Samuel 22 in the MRS1T

1 Samuel 22 in the NAA

1 Samuel 22 in the NASB

1 Samuel 22 in the NBLA

1 Samuel 22 in the NBS

1 Samuel 22 in the NBVTP

1 Samuel 22 in the NET2

1 Samuel 22 in the NIV11

1 Samuel 22 in the NNT

1 Samuel 22 in the NNT2

1 Samuel 22 in the NNT3

1 Samuel 22 in the PDDPT

1 Samuel 22 in the PFNT

1 Samuel 22 in the RMNT

1 Samuel 22 in the SBIAS

1 Samuel 22 in the SBIBS

1 Samuel 22 in the SBIBS2

1 Samuel 22 in the SBICS

1 Samuel 22 in the SBIDS

1 Samuel 22 in the SBIGS

1 Samuel 22 in the SBIHS

1 Samuel 22 in the SBIIS

1 Samuel 22 in the SBIIS2

1 Samuel 22 in the SBIIS3

1 Samuel 22 in the SBIKS

1 Samuel 22 in the SBIKS2

1 Samuel 22 in the SBIMS

1 Samuel 22 in the SBIOS

1 Samuel 22 in the SBIPS

1 Samuel 22 in the SBISS

1 Samuel 22 in the SBITS

1 Samuel 22 in the SBITS2

1 Samuel 22 in the SBITS3

1 Samuel 22 in the SBITS4

1 Samuel 22 in the SBIUS

1 Samuel 22 in the SBIVS

1 Samuel 22 in the SBT

1 Samuel 22 in the SBT1E

1 Samuel 22 in the SCHL

1 Samuel 22 in the SNT

1 Samuel 22 in the SUSU

1 Samuel 22 in the SUSU2

1 Samuel 22 in the SYNO

1 Samuel 22 in the TBIAOTANT

1 Samuel 22 in the TBT1E

1 Samuel 22 in the TBT1E2

1 Samuel 22 in the TFTIP

1 Samuel 22 in the TFTU

1 Samuel 22 in the TGNTATF3T

1 Samuel 22 in the THAI

1 Samuel 22 in the TNFD

1 Samuel 22 in the TNT

1 Samuel 22 in the TNTIK

1 Samuel 22 in the TNTIL

1 Samuel 22 in the TNTIN

1 Samuel 22 in the TNTIP

1 Samuel 22 in the TNTIZ

1 Samuel 22 in the TOMA

1 Samuel 22 in the TTENT

1 Samuel 22 in the UBG

1 Samuel 22 in the UGV

1 Samuel 22 in the UGV2

1 Samuel 22 in the UGV3

1 Samuel 22 in the VBL

1 Samuel 22 in the VDCC

1 Samuel 22 in the YALU

1 Samuel 22 in the YAPE

1 Samuel 22 in the YBVTP

1 Samuel 22 in the ZBP