1 Samuel 30 (BOICB)

1 Mgbe Devid na ndị ikom ya rutere obodo Ziklag nʼụbọchị nke atọ, ha hụrụ na ndị Amalek abịala wakporo bi nʼakụkụ ndịda Negev na Ziklag. Ha buru agha megide Ziklag, gbaa obodo ahụ ọkụ, 2 dọtakwa ndị inyom na ndị niile bi nʼime ya nʼagha, ma okenye ma ụmụntakịrị. Ha egbughị ha egbu, kama ha buuru ha laa. 3 Mgbe Devid na ndị ikom ya ruru Ziklag, ha hụrụ na-esuola ya ọkụ, dọkpụrụ ndị inyom ha, na ụmụ ndị ikom na ndị inyom nʼagha. 4 Ya mere, Devid na ndị ikom ya kwara akwa ruo mgbe ike akwa gwụrụ ha. 5 Ndị inyom abụọ Devid, Ahinoam onye Jezril na Abigel, nwunye ochie Nebal onye Kamel, sokwa na ndị a dọtara nʼagha ahụ. 6 Ihe a wetaara Devid oke nsogbu, nʼihi na ndị ikom ya nọ na-ekwu okwu iji nkume tugbuo ya; ha niile nọ nʼobi ilu nʼihi ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom. Ma Devid chọtara ike nʼime ONYENWE ANYỊ Chineke ya. 7 Devid sịrị Abịata, bụ onye nchụaja, nwa Ahimelek, “Chịtara m efọọd ahụ.” Ya mere, Abịata chịtara ya nye ya 8 Mgbe ahụ, Devid jụrụ ONYENWE ANYỊ ase sị, “Ọ bụ m chụso ndị a na-apụnara ndị mmadụ ihe? Ọ bụrụ na m achụso ha, aga m ejide ha?” ONYENWE ANYỊ zara, “E, chụso ha ọsọ, ị ga-achụkwute ha, ma nataghachikwa ihe niile ha were.” 9 Mgbe ahụ, Devid na narị ndị agha isii ya bịarutere nʼọdọ mmiri Beso, ebe ha hapụrụ ụfọdụ ndị 10 narị ndị ikom abụọ nʼime ha enwekwaghị ike ịgafe ndagwurugwu Beso nʼihi ike ọgwụgwụ, ma Devid na narị anọ ndị ọzọ chụsoro ha. 11 Ha hụrụ otu nwokorobịa onye Ijipt nʼọhịa, duuru ya bịakwute Devid. Ha nyere ya mmiri ka ọ ṅụọ, nyekwa ya nri ka o rie. 12 Ihe ha nyere ya bụ achịcha fiig, na ụyọkọ mkpụrụ vaịnị abụọ nke a mịkpọrọ amịkpọ. Mgbe o richara ha, o nweghachiri onwe ya, nʼihi na o ribeghị nri ọbụla, maọbụ ṅụọ mmiri ọbụla ụbọchị atọ, ehihie na nʼabalị. 13 Mgbe ahụ, Devid jụrụ ya sị, “Ị bụ onye? Ebeekwa ka i si bịa?”Ọ zara Devid sị, “Abụ m onye Ijipt, bụrụkwa ohu onye Amalek. Onyenwe m hapụrụ m nʼebe a abalị atọ gara aga nʼihi na ahụ adịghị m ike. 14 Anyị si obodo ebe anyị gara lụọ agha na-alọghachi mgbe ha hapụrụ m nʼebe a. Anyị gara lụgbuo obodo ndị Keret, nke dị nʼime Negeb, na obodo dị na ndịda ala Juda na ala Kaleb. Anyị gbakwara obodo Ziklag ọkụ.” 15 Devid jụrụ ya sị, “I nwere ike duru m gaa ebe ha nọ.”Nwokorobịa ahụ zara ya sị, “Ọ bụrụ na ị ga-aṅụ iyi nʼaha Chineke na ị gaghị egbu m maọbụ were m nyeghachi onyenwe m, aga m eduru gị gaa ebe ha nọ.” 16 O duuru ha jee nʼebe ndị Amalek nọ. Mgbe ha ruru ebe ahụ, ha hụrụ ha ebe ha tụsara onwe ha nʼala na-eri na-aṅụ, na-etekwa egwu ọṅụ, nʼihi ihe dị ukwuu ha kwatara nʼagha site nʼala ndị Filistia, na nʼala Juda. 17 Devid na ndị agha ya bịakwasịrị ha na mberede gbuo ha site nʼabalị ahụ ruo anyasị echi ya. Ọ dịkwaghị otu nwoke nʼime ha fọdụrụ ndụ ma ọ bụghị narị ndị ikom anọ makwasịrị nʼelu ịnyịnya kamel ha gbalaga. 18 Devid nwetaghachiri ihe niile ndị Amalek kwatara nʼagha, tinyere ndị inyom ya abụọ. 19 O nweghị ihe furu efu, ma nke ukwu ma nke nta, ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom, ihe a kwatara nʼagha, maọbụ ihe ọbụla ọzọ ndị Amalek dọtara nʼagha. Devid nwetaghachiri ihe niile. 20 Ọzọkwa, Devid chịkọtara igwe ehi na igwe ewu na atụrụ. Ndị ikom ya chịịrị ha, tinyere anụ ụlọ ndị ọzọ, na-aga, na-asị, “Ndị a bụ ihe Devid kwatara nʼagha.” 21 Emesịa, Devid bịarutere ebe narị ndị ikom abụọ ndị ahụ nọ na Ndagwurugwu Beso. Ndị a bụ ndị ahụ na-enweghị ike iso Devid nʼihi na ike gwụrụ ha. Ha pụtara zute Devid na ndị so ya. Mgbe Devid na ndị ikom ya bịara ha nso, ọ jụrụ ha otu ha mere. 22 Ma ndị ikom ọjọọ ahụ niile, na ndị okwu na ụka nọ nʼetiti ndị na-eso Devid sịrị, “Nʼihi na ndị a esoghị anyị jee, ya mere ha agaghị eso anyị keta ihe ndị a anyị kwatara nʼagha. Nyeghachi ha naanị nwunye ha na ụmụ ha; gwakwa ha ka ha laa.” 23 Ma Devid sịrị, “Mba, ụmụnna m, unu ekwesighị isi otu a kee ihe ndị ahụ ONYENWE ANYỊ nyere anyị. O chebere anyị, nyefee nʼaka anyị ndị agha ahụ niile bịara imegide anyị. 24 Unu chere na ọ dị onye ga-ege unu ntị mgbe unu na-ekwu okwu dị otu a? Anyị niile ga-eketa oke; oke ndị jere agha na ndị chebere ihe anyị ga-abụ otu.” 25 Site nʼụbọchị ahụ, Devid mere ka nke a bụrụ iwu nye ndị Izrel niile ruo taa. 26 Mgbe ha rutere Ziklag, Devid weere ụfọdụ ihe ha kwatara nʼagha zigara ndị okenye Juda, ndị bụ ndị enyi ya, na-asị, “Lee onyinye ewetaara unu site nʼụfọdụ nʼime ihe anyị kwatara site nʼaka ndị iro ONYENWE ANYỊ.” 27 O zigara ha nye ndị bi na Betel, Ramọt Negev na Jatịa, 28 nyekwa ndị nọ Aroea, Sifmot, Eshtemoa 29 na Rakal, nyekwa ndị bi nʼobodo ndị Jerameel na nke ndị Ken, 30 nyekwa ndị bi na Homa, Bo Ashan, Atak 31 na Hebrọn na ndị nọ nʼebe niile ndị ahụ ebe Devid na ndị ya wagharịrị.

In Other Versions

1 Samuel 30 in the ANGEFD

1 Samuel 30 in the ANTPNG2D

1 Samuel 30 in the AS21

1 Samuel 30 in the BAGH

1 Samuel 30 in the BBPNG

1 Samuel 30 in the BBT1E

1 Samuel 30 in the BDS

1 Samuel 30 in the BEV

1 Samuel 30 in the BHAD

1 Samuel 30 in the BIB

1 Samuel 30 in the BLPT

1 Samuel 30 in the BNT

1 Samuel 30 in the BNTABOOT

1 Samuel 30 in the BNTLV

1 Samuel 30 in the BOATCB

1 Samuel 30 in the BOATCB2

1 Samuel 30 in the BOBCV

1 Samuel 30 in the BOCNT

1 Samuel 30 in the BOECS

1 Samuel 30 in the BOGWICC

1 Samuel 30 in the BOHCB

1 Samuel 30 in the BOHCV

1 Samuel 30 in the BOHLNT

1 Samuel 30 in the BOHNTLTAL

1 Samuel 30 in the BOILNTAP

1 Samuel 30 in the BOITCV

1 Samuel 30 in the BOKCV

1 Samuel 30 in the BOKCV2

1 Samuel 30 in the BOKHWOG

1 Samuel 30 in the BOKSSV

1 Samuel 30 in the BOLCB

1 Samuel 30 in the BOLCB2

1 Samuel 30 in the BOMCV

1 Samuel 30 in the BONAV

1 Samuel 30 in the BONCB

1 Samuel 30 in the BONLT

1 Samuel 30 in the BONUT2

1 Samuel 30 in the BOPLNT

1 Samuel 30 in the BOSCB

1 Samuel 30 in the BOSNC

1 Samuel 30 in the BOTLNT

1 Samuel 30 in the BOVCB

1 Samuel 30 in the BOYCB

1 Samuel 30 in the BPBB

1 Samuel 30 in the BPH

1 Samuel 30 in the BSB

1 Samuel 30 in the CCB

1 Samuel 30 in the CUV

1 Samuel 30 in the CUVS

1 Samuel 30 in the DBT

1 Samuel 30 in the DGDNT

1 Samuel 30 in the DHNT

1 Samuel 30 in the DNT

1 Samuel 30 in the ELBE

1 Samuel 30 in the EMTV

1 Samuel 30 in the ESV

1 Samuel 30 in the FBV

1 Samuel 30 in the FEB

1 Samuel 30 in the GGMNT

1 Samuel 30 in the GNT

1 Samuel 30 in the HARY

1 Samuel 30 in the HNT

1 Samuel 30 in the IRVA

1 Samuel 30 in the IRVB

1 Samuel 30 in the IRVG

1 Samuel 30 in the IRVH

1 Samuel 30 in the IRVK

1 Samuel 30 in the IRVM

1 Samuel 30 in the IRVM2

1 Samuel 30 in the IRVO

1 Samuel 30 in the IRVP

1 Samuel 30 in the IRVT

1 Samuel 30 in the IRVT2

1 Samuel 30 in the IRVU

1 Samuel 30 in the ISVN

1 Samuel 30 in the JSNT

1 Samuel 30 in the KAPI

1 Samuel 30 in the KBT1ETNIK

1 Samuel 30 in the KBV

1 Samuel 30 in the KJV

1 Samuel 30 in the KNFD

1 Samuel 30 in the LBA

1 Samuel 30 in the LBLA

1 Samuel 30 in the LNT

1 Samuel 30 in the LSV

1 Samuel 30 in the MAAL

1 Samuel 30 in the MBV

1 Samuel 30 in the MBV2

1 Samuel 30 in the MHNT

1 Samuel 30 in the MKNFD

1 Samuel 30 in the MNG

1 Samuel 30 in the MNT

1 Samuel 30 in the MNT2

1 Samuel 30 in the MRS1T

1 Samuel 30 in the NAA

1 Samuel 30 in the NASB

1 Samuel 30 in the NBLA

1 Samuel 30 in the NBS

1 Samuel 30 in the NBVTP

1 Samuel 30 in the NET2

1 Samuel 30 in the NIV11

1 Samuel 30 in the NNT

1 Samuel 30 in the NNT2

1 Samuel 30 in the NNT3

1 Samuel 30 in the PDDPT

1 Samuel 30 in the PFNT

1 Samuel 30 in the RMNT

1 Samuel 30 in the SBIAS

1 Samuel 30 in the SBIBS

1 Samuel 30 in the SBIBS2

1 Samuel 30 in the SBICS

1 Samuel 30 in the SBIDS

1 Samuel 30 in the SBIGS

1 Samuel 30 in the SBIHS

1 Samuel 30 in the SBIIS

1 Samuel 30 in the SBIIS2

1 Samuel 30 in the SBIIS3

1 Samuel 30 in the SBIKS

1 Samuel 30 in the SBIKS2

1 Samuel 30 in the SBIMS

1 Samuel 30 in the SBIOS

1 Samuel 30 in the SBIPS

1 Samuel 30 in the SBISS

1 Samuel 30 in the SBITS

1 Samuel 30 in the SBITS2

1 Samuel 30 in the SBITS3

1 Samuel 30 in the SBITS4

1 Samuel 30 in the SBIUS

1 Samuel 30 in the SBIVS

1 Samuel 30 in the SBT

1 Samuel 30 in the SBT1E

1 Samuel 30 in the SCHL

1 Samuel 30 in the SNT

1 Samuel 30 in the SUSU

1 Samuel 30 in the SUSU2

1 Samuel 30 in the SYNO

1 Samuel 30 in the TBIAOTANT

1 Samuel 30 in the TBT1E

1 Samuel 30 in the TBT1E2

1 Samuel 30 in the TFTIP

1 Samuel 30 in the TFTU

1 Samuel 30 in the TGNTATF3T

1 Samuel 30 in the THAI

1 Samuel 30 in the TNFD

1 Samuel 30 in the TNT

1 Samuel 30 in the TNTIK

1 Samuel 30 in the TNTIL

1 Samuel 30 in the TNTIN

1 Samuel 30 in the TNTIP

1 Samuel 30 in the TNTIZ

1 Samuel 30 in the TOMA

1 Samuel 30 in the TTENT

1 Samuel 30 in the UBG

1 Samuel 30 in the UGV

1 Samuel 30 in the UGV2

1 Samuel 30 in the UGV3

1 Samuel 30 in the VBL

1 Samuel 30 in the VDCC

1 Samuel 30 in the YALU

1 Samuel 30 in the YAPE

1 Samuel 30 in the YBVTP

1 Samuel 30 in the ZBP