1 Samuel 6 (BOICB)

1 Igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ ahụ nọrọ nʼobodo ndị Filistia ọnwa asaa. 2 Emesịa, ndị Filistia kpọrọ ndị nchụaja ha na ndị na-ajụ mmụọ ase jụọ ha sị, “Gịnị ka anyị ga-eme banyere igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ? Gwa anyị otu anyị ga-esi zilaga ya nʼala ya.” 3 Ndị ahụ zara sị, “Ọ bụrụ na unu ezighachi igbe ọgbụgba ndụ chi ndị Izrel, unu ezighachila ya nʼaka efu, kama jirinụ onyinye aja ikpe ọmụma zilaga ya. Unu mee nke a, ihe otiti ndị a ga-ala. Unu ga-amatakwa ihe mere o ji na-ata unu ahụhụ ndị a.” 4 Ha jụrụ, “Olee ụdị onyinye aja ikpe ọmụma anyị ga-enye.”A gwara ha, “Dịka ọnụọgụgụ ndịisi obodo Filistia si dị ise, unu ga-eziga onyinye oyiyi etuto ise nke e jiri ọlaedo kpụọ na oyiyi oke ise nke e jikwa ọlaedo kpụọ, nʼihi na ọ bụ otu ụdị ihe otiti ahụ ka o ji tie unu na ndịisi obodo unu niile. 5 Jiri ọlaedo kpụọ oyiyi etuto na oke ndị ahụ na-emebi ala unu, si otu a nye chi ndị Izrel nsọpụrụ. Ma eleghị anya ọ ga-ewezuga aka ike ya site nʼebe unu na chi unu dị iche iche na ala unu nọ. 6 Gịnị mere unu ga-eji nyịchie obi unu dịka ndị Ijipt na Fero mere? Mgbe Chineke mesiri ha ike, ọ bụ na ha ahapụghị ndị Izrel ka ha laa? 7 “Wuonụ ụgbọala ọhụrụ, werekwanụ nne ehi abụọ na-enye ụmụ ara kegide nʼụgbọ ahụ. Ehi ndị a ga-abụ ndị a na-ejibeghị kọọ ọrụ ubi mbụ. Mgbe unu kegidere ehi ndị a, chịrịnụ ụmụ ha chụba ha nʼebe a na-edebe ehi. 8 Werenụ igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ tinye nʼụgbọala ahụ, tinyekwa ihe ọlaedo ndị ahụ unu na-enye ka ọ bụrụ aja ikpe ọmụma unu nʼime igbe nta unu ga-etinye nʼakụkụ ya. Zilaganụ ya nʼụzọ ọ ga-agbaso. 9 Ma guzonụ na-ele ya anya. Ọ bụrụ na ọ gafee oke ala anyị banye Bet-Shemesh, unu ga-amata na ọ bụ ONYENWE ANYỊ mere ka ihe ọjọọ ndị a dakwasị anyị. Ma ọ bụrụ na o meghị otu a, ọ bụrụ na ọ lọghachi, anyị ga-amata na ihe otiti a bụ naanị ihe ndaba nke dakwasịrị anyị, o sikwaghị nʼaka ONYENWE ANYỊ.” 10 Ha were dịka okwu ndị a si dị. Ha weere nne ehi abụọ na-enye ụmụ ara kegide ha nʼụgbọala ahụ, werekwa ụmụ ha kpọchie nʼọgba anụ. 11 Igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ na igbe nta ahụ e tinyere oke na oyiyi etuto ọlaedo ndị ahụ a kpụrụ akpụ ka ha dọkwasịrị nʼelu ụgbọala ahụ. 12 Ehi ndị ahụ dọkpụrụ ụgbọ ahụ gawa nʼụzọ Bet-Shemesh. Ha na-ebekwa muuu mgbe ha na-aga. Ha sogidere ụzọ ahụ na-aga. Ha echigharịghị gaa aka nri maọbụ aka ekpe. Ndị eze ndị Filistia sogidekwara ha nʼazụ tutu rute nʼoke ala Bet-Shemesh. 13 Nʼoge a, ndị Bet-Shemesh nọ nʼubi na-ewe ihe ubi nke ọka wiiti na ndagwurugwu ala ahụ. Mgbe ha lepụrụ anya hụ igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ, ọṅụ juru ha obi. 14 Mgbe ụgbọala ahụ batara nʼubi nwoke a na-akpọ Joshua na Bet-Shemesh, ọ kwụsịrị nʼakụkụ otu nkume ukwu dị nʼebe ahụ. Ngwangwa, ndị nọ nʼebe ahụ gbuwasịrị osisi e ji mee ụgbọ ahụ, gbukwaa ehi abụọ ahụ, were ha chụọrọ ONYENWE ANYỊ aja nsure ọkụ. 15 Ndị ikom Livayị nọ nʼebe ahụ buliri igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ na igbe nta ahụ dị nʼakụkụ ya nke ọlaedo niile a kpụrụ akpụ dị nʼime ya, dọkwasị ha nʼelu nkume. Ndị Bet-Shemesh chụrụ ọtụtụ aja nsure ọkụ na aja ndị ọzọ nye ONYENWE ANYỊ nʼụbọchị ahụ. 16 Mgbe ndị eze ise obodo ndị Filistia hụrụ ihe mere, ha laghachiri nʼEkrọn nʼụbọchị ahụ. 17 Onyinye etuto ọlaedo ise a kpụrụ akpụ nke ha nyere ONYENWE ANYỊ dị ka aja ikpe ọmụma nʼihi ihe mere ha bụ maka obodo ndị Filistia ndị a, Ashdọd, Gaza, Ashkelọn, Gat na Ekrọn. 18 Ha wetakwara oke ọlaedo a dịka ọnụọgụgụ obodo ndị Filistia si dị, bụ nke ndịisi ise ahụ nwere, obodo ndị e wusiri ike, na obodo nta niile ha. Nkume ukwu ahụ ebe a dọkwasịrị igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ, bụ ihe akaebe nʼubi Joshua, onye Bet-Shemesh ruo taa. 19 Ma ONYENWE ANYỊ tigburu iri ndị ikom asaa nʼetiti ndị Bet-Shemesh nʼihi na ha nyobara anya nʼime igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ ahụ. Nʼihi ya ndị Bet-Shemesh ruru ụjụ nʼihi ndị ahụ niile ONYENWE ANYỊ tigburu. 20 Ndị Bet-Shemesh jụrụ sị, “Onye pụrụ iguzo nʼihu ONYENWE ANYỊ, bụ Chineke a dị nsọ? Olee ebe anyị ga-ezigakwa igbe ọgbụgba ndụ a?” 21 Ha zipụrụ ndị ozi ka ha gaa gwa ndị Kiriat Jearim sị ha, “Ndị Filistia ezighachila igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ. Bịanụ buru ya gaa nʼobodo unu.”

In Other Versions

1 Samuel 6 in the ANGEFD

1 Samuel 6 in the ANTPNG2D

1 Samuel 6 in the AS21

1 Samuel 6 in the BAGH

1 Samuel 6 in the BBPNG

1 Samuel 6 in the BBT1E

1 Samuel 6 in the BDS

1 Samuel 6 in the BEV

1 Samuel 6 in the BHAD

1 Samuel 6 in the BIB

1 Samuel 6 in the BLPT

1 Samuel 6 in the BNT

1 Samuel 6 in the BNTABOOT

1 Samuel 6 in the BNTLV

1 Samuel 6 in the BOATCB

1 Samuel 6 in the BOATCB2

1 Samuel 6 in the BOBCV

1 Samuel 6 in the BOCNT

1 Samuel 6 in the BOECS

1 Samuel 6 in the BOGWICC

1 Samuel 6 in the BOHCB

1 Samuel 6 in the BOHCV

1 Samuel 6 in the BOHLNT

1 Samuel 6 in the BOHNTLTAL

1 Samuel 6 in the BOILNTAP

1 Samuel 6 in the BOITCV

1 Samuel 6 in the BOKCV

1 Samuel 6 in the BOKCV2

1 Samuel 6 in the BOKHWOG

1 Samuel 6 in the BOKSSV

1 Samuel 6 in the BOLCB

1 Samuel 6 in the BOLCB2

1 Samuel 6 in the BOMCV

1 Samuel 6 in the BONAV

1 Samuel 6 in the BONCB

1 Samuel 6 in the BONLT

1 Samuel 6 in the BONUT2

1 Samuel 6 in the BOPLNT

1 Samuel 6 in the BOSCB

1 Samuel 6 in the BOSNC

1 Samuel 6 in the BOTLNT

1 Samuel 6 in the BOVCB

1 Samuel 6 in the BOYCB

1 Samuel 6 in the BPBB

1 Samuel 6 in the BPH

1 Samuel 6 in the BSB

1 Samuel 6 in the CCB

1 Samuel 6 in the CUV

1 Samuel 6 in the CUVS

1 Samuel 6 in the DBT

1 Samuel 6 in the DGDNT

1 Samuel 6 in the DHNT

1 Samuel 6 in the DNT

1 Samuel 6 in the ELBE

1 Samuel 6 in the EMTV

1 Samuel 6 in the ESV

1 Samuel 6 in the FBV

1 Samuel 6 in the FEB

1 Samuel 6 in the GGMNT

1 Samuel 6 in the GNT

1 Samuel 6 in the HARY

1 Samuel 6 in the HNT

1 Samuel 6 in the IRVA

1 Samuel 6 in the IRVB

1 Samuel 6 in the IRVG

1 Samuel 6 in the IRVH

1 Samuel 6 in the IRVK

1 Samuel 6 in the IRVM

1 Samuel 6 in the IRVM2

1 Samuel 6 in the IRVO

1 Samuel 6 in the IRVP

1 Samuel 6 in the IRVT

1 Samuel 6 in the IRVT2

1 Samuel 6 in the IRVU

1 Samuel 6 in the ISVN

1 Samuel 6 in the JSNT

1 Samuel 6 in the KAPI

1 Samuel 6 in the KBT1ETNIK

1 Samuel 6 in the KBV

1 Samuel 6 in the KJV

1 Samuel 6 in the KNFD

1 Samuel 6 in the LBA

1 Samuel 6 in the LBLA

1 Samuel 6 in the LNT

1 Samuel 6 in the LSV

1 Samuel 6 in the MAAL

1 Samuel 6 in the MBV

1 Samuel 6 in the MBV2

1 Samuel 6 in the MHNT

1 Samuel 6 in the MKNFD

1 Samuel 6 in the MNG

1 Samuel 6 in the MNT

1 Samuel 6 in the MNT2

1 Samuel 6 in the MRS1T

1 Samuel 6 in the NAA

1 Samuel 6 in the NASB

1 Samuel 6 in the NBLA

1 Samuel 6 in the NBS

1 Samuel 6 in the NBVTP

1 Samuel 6 in the NET2

1 Samuel 6 in the NIV11

1 Samuel 6 in the NNT

1 Samuel 6 in the NNT2

1 Samuel 6 in the NNT3

1 Samuel 6 in the PDDPT

1 Samuel 6 in the PFNT

1 Samuel 6 in the RMNT

1 Samuel 6 in the SBIAS

1 Samuel 6 in the SBIBS

1 Samuel 6 in the SBIBS2

1 Samuel 6 in the SBICS

1 Samuel 6 in the SBIDS

1 Samuel 6 in the SBIGS

1 Samuel 6 in the SBIHS

1 Samuel 6 in the SBIIS

1 Samuel 6 in the SBIIS2

1 Samuel 6 in the SBIIS3

1 Samuel 6 in the SBIKS

1 Samuel 6 in the SBIKS2

1 Samuel 6 in the SBIMS

1 Samuel 6 in the SBIOS

1 Samuel 6 in the SBIPS

1 Samuel 6 in the SBISS

1 Samuel 6 in the SBITS

1 Samuel 6 in the SBITS2

1 Samuel 6 in the SBITS3

1 Samuel 6 in the SBITS4

1 Samuel 6 in the SBIUS

1 Samuel 6 in the SBIVS

1 Samuel 6 in the SBT

1 Samuel 6 in the SBT1E

1 Samuel 6 in the SCHL

1 Samuel 6 in the SNT

1 Samuel 6 in the SUSU

1 Samuel 6 in the SUSU2

1 Samuel 6 in the SYNO

1 Samuel 6 in the TBIAOTANT

1 Samuel 6 in the TBT1E

1 Samuel 6 in the TBT1E2

1 Samuel 6 in the TFTIP

1 Samuel 6 in the TFTU

1 Samuel 6 in the TGNTATF3T

1 Samuel 6 in the THAI

1 Samuel 6 in the TNFD

1 Samuel 6 in the TNT

1 Samuel 6 in the TNTIK

1 Samuel 6 in the TNTIL

1 Samuel 6 in the TNTIN

1 Samuel 6 in the TNTIP

1 Samuel 6 in the TNTIZ

1 Samuel 6 in the TOMA

1 Samuel 6 in the TTENT

1 Samuel 6 in the UBG

1 Samuel 6 in the UGV

1 Samuel 6 in the UGV2

1 Samuel 6 in the UGV3

1 Samuel 6 in the VBL

1 Samuel 6 in the VDCC

1 Samuel 6 in the YALU

1 Samuel 6 in the YAPE

1 Samuel 6 in the YBVTP

1 Samuel 6 in the ZBP