1 Samuel 8 (BOICB)

1 Mgbe Samuel ghọrọ agadi, o mere ụmụ ya ndị ikom ka ha bụrụ ndị ikpe ndị Izrel. 2 Juel, ọkpara ya, na Abija, nke na-eso ya ka ọ họpụtara. Ha nọkwa na Bịasheba na-ekpe ndị Izrel ikpe. 3 Ma ụmụ ya esoghị ụzọ ya. Ha na-agbaso naanị ihe ga-abara ha. Ha na-erikwa ngarị, na-ekpe ikpe na-ezighị ezi. 4 Nʼihi ya, ndị okenye ụmụ Izrel niile zukọtara, bịakwute Samuel na Rema sị ya, 5 “I meela agadi, ụmụ gị ndị ikom adịghịkwa eso ụzọ gị. Ugbu a họpụtara anyị onye ga-abụ eze anyị, onye ga na-edu anyị, dịka mba ndị ọzọ.” 6 Ma obi adịghị Samuel ụtọ mgbe ha rịọrọ sị, “Nye anyị eze ga-edu anyị.” Nʼihi ya, Samuel kpọkuru ONYENWE ANYỊ nʼekpere. 7 ONYENWE ANYỊ gwara ya, “Gee ntị nʼihe niile ndị a na-agwa gị; ọ bụghị gị ka ha jụrụ, kama ọ bụ mụ onwe m ka ha jụrụ ibu eze ha. 8 Site nʼụbọchị m mere ka ha si nʼIjipt pụta ruo taa, ha na-agbakụta m azụ, na-efe chi ndị ọzọ. Ọ bụkwa otu a ka ha na-eme gị ugbu a. 9 Mee dịka ha rịọrọ, ma echefula ịgwa ha ụdị omume eze ahụ ga-achị ha ga-emeso ha.” 10 Samuel gwara ndị Izrel na-arịọ ka e nye ha eze ihe ONYENWE ANYỊ kwuru. 11 Ọ zara sị ha, “Ihe ndị a bụ ụdị mmeso eze ahụ ga-achị unu ga-emeso unu: Ọ ga-eduru ụmụ unu ndị ikom mee ha ndị na-agba ọsọ nʼihu ụgbọ agha ya na ịnyịnya ya. 12 Ụfọdụ ka ọ ga-eme ọchịagha, ndị ga-elekọta ọtụtụ puku ndị agha, maọbụ iri ndị agha ise; ndị ụfọdụ ga-abụ ndị ga-akọ ubi ya, ndị ọzọ ga-ewebatakwa ihe owuwe ubi ya, ma ndị ọzọ ga-akpụrụ ya ngwa agha na ihe niile e ji anya ụgbọ agha ya. 13 Ọ ga-eduru ụmụ unu ndị inyom mee ka ha bụrụ ndị na-esiri ya mmanụ otite na-esi isi ụtọ, na ndị na-esiri ya nri, na ndị na-eghere ya ihe oghịghe. 14 Ọ ga-anarakwa unu ubi unu, na ubi vaịnị unu, na ubi oliv unu ndị kachasị mma, were ha nye ndị na-ejere ya ozi. 15 Ọ ga-ewere otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke mkpụrụ ubi unu na ubi vaịnị unu nye ndịisi ọrụ ya na ndị na-ejere ya ozi. 16 Ọ ga-akwagidekwa unu ka unu nye ya ndị ohu unu, ndị ikom nʼime ha, na ndị inyom nʼime ha, ya na anụ ụlọ unu ahụ dị ezi mma, na ịnyịnya ibu unu. 17 Ọ ga-ewerekwa otu ụzọ nʼụzọ iri nke igwe anụ ụlọ unu, meekwa ka unu onwe unu bụrụkwa ndị ohu ya. 18 Mgbe ụbọchị ndị ahụ bịara, mgbe ihe ndị a bidoro imezu, unu ga-akwa akwa, rịọọ ka e wezugara unu eze ahụ unu họpụtaara onwe unu, ma ONYENWE ANYỊ agaghị aṅa unu ntị nʼụbọchị ahụ.” 19 Ma ndị Izrel jụrụ ige Samuel ntị. Ha sịrị, “Anyị chọrọ eze ga-achị anyị. 20 Mgbe ahụ, anyị onwe anyị ga-adị ka ndị mba niile ọzọ, anyị ga-enwe eze ga na-edu anyị, na-aga nʼihu anyị na-ebukwa agha anyị.” 21 Samuel gwara ONYENWE ANYỊ ihe niile ha kwuru. 22 Ma ONYENWE ANYỊ zara ya ọzọ sị, “Mee ihe ha kwuru, nye ha eze.”Mgbe ahụ, Samuel gwara ndị ikom Izrel okwu sị ha, “Laanụ, nwoke ọbụla nʼobodo ya.”

In Other Versions

1 Samuel 8 in the ANGEFD

1 Samuel 8 in the ANTPNG2D

1 Samuel 8 in the AS21

1 Samuel 8 in the BAGH

1 Samuel 8 in the BBPNG

1 Samuel 8 in the BBT1E

1 Samuel 8 in the BDS

1 Samuel 8 in the BEV

1 Samuel 8 in the BHAD

1 Samuel 8 in the BIB

1 Samuel 8 in the BLPT

1 Samuel 8 in the BNT

1 Samuel 8 in the BNTABOOT

1 Samuel 8 in the BNTLV

1 Samuel 8 in the BOATCB

1 Samuel 8 in the BOATCB2

1 Samuel 8 in the BOBCV

1 Samuel 8 in the BOCNT

1 Samuel 8 in the BOECS

1 Samuel 8 in the BOGWICC

1 Samuel 8 in the BOHCB

1 Samuel 8 in the BOHCV

1 Samuel 8 in the BOHLNT

1 Samuel 8 in the BOHNTLTAL

1 Samuel 8 in the BOILNTAP

1 Samuel 8 in the BOITCV

1 Samuel 8 in the BOKCV

1 Samuel 8 in the BOKCV2

1 Samuel 8 in the BOKHWOG

1 Samuel 8 in the BOKSSV

1 Samuel 8 in the BOLCB

1 Samuel 8 in the BOLCB2

1 Samuel 8 in the BOMCV

1 Samuel 8 in the BONAV

1 Samuel 8 in the BONCB

1 Samuel 8 in the BONLT

1 Samuel 8 in the BONUT2

1 Samuel 8 in the BOPLNT

1 Samuel 8 in the BOSCB

1 Samuel 8 in the BOSNC

1 Samuel 8 in the BOTLNT

1 Samuel 8 in the BOVCB

1 Samuel 8 in the BOYCB

1 Samuel 8 in the BPBB

1 Samuel 8 in the BPH

1 Samuel 8 in the BSB

1 Samuel 8 in the CCB

1 Samuel 8 in the CUV

1 Samuel 8 in the CUVS

1 Samuel 8 in the DBT

1 Samuel 8 in the DGDNT

1 Samuel 8 in the DHNT

1 Samuel 8 in the DNT

1 Samuel 8 in the ELBE

1 Samuel 8 in the EMTV

1 Samuel 8 in the ESV

1 Samuel 8 in the FBV

1 Samuel 8 in the FEB

1 Samuel 8 in the GGMNT

1 Samuel 8 in the GNT

1 Samuel 8 in the HARY

1 Samuel 8 in the HNT

1 Samuel 8 in the IRVA

1 Samuel 8 in the IRVB

1 Samuel 8 in the IRVG

1 Samuel 8 in the IRVH

1 Samuel 8 in the IRVK

1 Samuel 8 in the IRVM

1 Samuel 8 in the IRVM2

1 Samuel 8 in the IRVO

1 Samuel 8 in the IRVP

1 Samuel 8 in the IRVT

1 Samuel 8 in the IRVT2

1 Samuel 8 in the IRVU

1 Samuel 8 in the ISVN

1 Samuel 8 in the JSNT

1 Samuel 8 in the KAPI

1 Samuel 8 in the KBT1ETNIK

1 Samuel 8 in the KBV

1 Samuel 8 in the KJV

1 Samuel 8 in the KNFD

1 Samuel 8 in the LBA

1 Samuel 8 in the LBLA

1 Samuel 8 in the LNT

1 Samuel 8 in the LSV

1 Samuel 8 in the MAAL

1 Samuel 8 in the MBV

1 Samuel 8 in the MBV2

1 Samuel 8 in the MHNT

1 Samuel 8 in the MKNFD

1 Samuel 8 in the MNG

1 Samuel 8 in the MNT

1 Samuel 8 in the MNT2

1 Samuel 8 in the MRS1T

1 Samuel 8 in the NAA

1 Samuel 8 in the NASB

1 Samuel 8 in the NBLA

1 Samuel 8 in the NBS

1 Samuel 8 in the NBVTP

1 Samuel 8 in the NET2

1 Samuel 8 in the NIV11

1 Samuel 8 in the NNT

1 Samuel 8 in the NNT2

1 Samuel 8 in the NNT3

1 Samuel 8 in the PDDPT

1 Samuel 8 in the PFNT

1 Samuel 8 in the RMNT

1 Samuel 8 in the SBIAS

1 Samuel 8 in the SBIBS

1 Samuel 8 in the SBIBS2

1 Samuel 8 in the SBICS

1 Samuel 8 in the SBIDS

1 Samuel 8 in the SBIGS

1 Samuel 8 in the SBIHS

1 Samuel 8 in the SBIIS

1 Samuel 8 in the SBIIS2

1 Samuel 8 in the SBIIS3

1 Samuel 8 in the SBIKS

1 Samuel 8 in the SBIKS2

1 Samuel 8 in the SBIMS

1 Samuel 8 in the SBIOS

1 Samuel 8 in the SBIPS

1 Samuel 8 in the SBISS

1 Samuel 8 in the SBITS

1 Samuel 8 in the SBITS2

1 Samuel 8 in the SBITS3

1 Samuel 8 in the SBITS4

1 Samuel 8 in the SBIUS

1 Samuel 8 in the SBIVS

1 Samuel 8 in the SBT

1 Samuel 8 in the SBT1E

1 Samuel 8 in the SCHL

1 Samuel 8 in the SNT

1 Samuel 8 in the SUSU

1 Samuel 8 in the SUSU2

1 Samuel 8 in the SYNO

1 Samuel 8 in the TBIAOTANT

1 Samuel 8 in the TBT1E

1 Samuel 8 in the TBT1E2

1 Samuel 8 in the TFTIP

1 Samuel 8 in the TFTU

1 Samuel 8 in the TGNTATF3T

1 Samuel 8 in the THAI

1 Samuel 8 in the TNFD

1 Samuel 8 in the TNT

1 Samuel 8 in the TNTIK

1 Samuel 8 in the TNTIL

1 Samuel 8 in the TNTIN

1 Samuel 8 in the TNTIP

1 Samuel 8 in the TNTIZ

1 Samuel 8 in the TOMA

1 Samuel 8 in the TTENT

1 Samuel 8 in the UBG

1 Samuel 8 in the UGV

1 Samuel 8 in the UGV2

1 Samuel 8 in the UGV3

1 Samuel 8 in the VBL

1 Samuel 8 in the VDCC

1 Samuel 8 in the YALU

1 Samuel 8 in the YAPE

1 Samuel 8 in the YBVTP

1 Samuel 8 in the ZBP