2 Chronicles 1 (BOICB)

1 Solomọn nwa Devid mere onwe ya ka o guzosie ike nʼalaeze ya, nʼihi na ONYENWE ANYỊ Chineke ya nọnyeere ya, meekwa ka ọ dị ukwuu hie nne. 2 Mgbe ahụ, Solomọn gwara ndị Izrel niile okwu, ya bụ, ndịisi agha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ndịisi agha na-achị ọtụtụ narị ndị agha, na ndị ikpe, na ndị ndu niile nọ nʼIzrel, na ndịisi ezinaụlọ niile. 3 Solomọn ya na ọgbakọ ahụ niile, gara nʼebe dị elu nke Gibiọn, nʼihi nʼebe ahụ ka ụlọ nzute Chineke dị, bụ nke Mosis onyeozi ONYENWE ANYỊ wuru nʼọzara. 4 Ma Devid esitelarị na Kiriat Jearim buputa igbe ọgbụgba ndụ Chineke ahụ, bulaa ya nʼụlọ ikwu nke o wuru maka ya na Jerusalem. 5 Ebe ịchụ aja bronz ahụ Bezalel nwa Uri, nwa Hua wuru dịkwa na Gibiọn, nʼihu ụlọ nzute ONYENWE ANYỊ. Solomọn na ọgbakọ ahụ na-ajụta ya ase nʼebe bronz ahụ. 6 Solomọn jere nʼebe ịchụ aja ahụ e ji bronz kpụọ, nke dị nʼihu ONYENWE ANYỊ, nʼime ụlọ nzute, jiri anụ ụlọ ọnụọgụgụ ha dị otu puku chụọ aja nsure ọkụ nʼelu ya. 7 Nʼabalị ụbọchị ahụ na Gibiọn, ONYENWE ANYỊ mere ka Solomọn hụ ya anya, sị ya, “Rịọọ ihe ọbụla ị chọrọ ka m nye gị.” 8 Ma Solomọn zara Chineke, sị, “I gosila nna m bụ Devid obi ebere dị ukwuu. Ugbu a, i meekwala m eze nʼọnọdụ ya 9 Ugbu a, ONYENWE ANYỊ bụ Chineke, ka nkwa gị nke i kwere nna m, bụ Devid, bụrụ ihe e mezuru, nʼihi na ị meela m eze ndị a bara ụba nʼọnụọgụgụ dịka aja nke ala. 10 Biko, nye m amamihe na nghọta, nke m ga-eji edu ndị a napụ na-abata, nʼihi na onye pụrụ ịchịkọta ndị gị a dị ukwuu?” 11 Chineke zara Solomọn sị ya, “Ebe ọ bụ na ị rịọghị m ka m nye gị akụnụba, maọbụ ogologo ndụ; ebe ọ bụkwa na ị rịọghị m ka m mee ka ndị kpọrọ gị asị nwụsịa, maọbụ ka m mee ka i nwee nsọpụrụ karịa, kama mkpa na-akpa gị bụ ka m nye gị amamihe na nghọta ị ga-eji duzie ndị m, nke m mere gị eze ha. 12 Ya mere, enyela gị amamihe na nghọta dịka ị rịọrọ. Aga m enyekwa gị akụnụba na nsọpụrụ dị ukwuu, nke eze ọbụla nke buru gị ụzọ na-enwebeghị. Ọ dịkwaghị onye nke ga-eso gị ga-enwe ụdị ya.” 13 Mgbe ahụ, Solomọn sitere nʼebe dị elu nke Gibiọn, site nʼihu ụlọ nzute ahụ, lọghachi na Jerusalem. Ọ chịrị dịka eze nʼIzrel. 14 Solomọn chịkọbara ọtụtụ ụgbọ agha na ịnyịnya dị iche iche. O nwere ụgbọ agha dị otu puku na narị anọ na ịnyịnya agha dị puku iri na abụọ nʼọnụọgụgụ, ndị o debere ụfọdụ nʼime ha nʼobodo ụgbọ agha ya ma ndị ọzọ dị na Jerusalem ebe ya onwe ya nọ. 15 Eze mere ka ọlaọcha na ọlaedo baa ụba na Jerusalem, dịka nkume efu. O mekwara ka osisi sida dị ọtụtụ dịka osisi sikamọ nke dị nʼala ala ugwu dị iche iche 16 A na-esite nʼIjipt nakwa ala Kue atụbatara Solomọn ịnyịnya. Ndị ahịa eze na-azụta ha site na Kue nʼọnụ ahịa a na-ere ha nʼoge ahụ. 17 Ha sitere nʼIjipt tụbata otu ụgbọ agha nʼọnụ ahịa narị shekel ọlaọcha isii; jirikwa otu narị shekel na iri shekel ise zụta otu ịnyịnya. Ha zipụkwara ha nye ndị eze niile nke ndị Het na ndị Aram.

In Other Versions

2 Chronicles 1 in the ANGEFD

2 Chronicles 1 in the ANTPNG2D

2 Chronicles 1 in the AS21

2 Chronicles 1 in the BAGH

2 Chronicles 1 in the BBPNG

2 Chronicles 1 in the BBT1E

2 Chronicles 1 in the BDS

2 Chronicles 1 in the BEV

2 Chronicles 1 in the BHAD

2 Chronicles 1 in the BIB

2 Chronicles 1 in the BLPT

2 Chronicles 1 in the BNT

2 Chronicles 1 in the BNTABOOT

2 Chronicles 1 in the BNTLV

2 Chronicles 1 in the BOATCB

2 Chronicles 1 in the BOATCB2

2 Chronicles 1 in the BOBCV

2 Chronicles 1 in the BOCNT

2 Chronicles 1 in the BOECS

2 Chronicles 1 in the BOGWICC

2 Chronicles 1 in the BOHCB

2 Chronicles 1 in the BOHCV

2 Chronicles 1 in the BOHLNT

2 Chronicles 1 in the BOHNTLTAL

2 Chronicles 1 in the BOILNTAP

2 Chronicles 1 in the BOITCV

2 Chronicles 1 in the BOKCV

2 Chronicles 1 in the BOKCV2

2 Chronicles 1 in the BOKHWOG

2 Chronicles 1 in the BOKSSV

2 Chronicles 1 in the BOLCB

2 Chronicles 1 in the BOLCB2

2 Chronicles 1 in the BOMCV

2 Chronicles 1 in the BONAV

2 Chronicles 1 in the BONCB

2 Chronicles 1 in the BONLT

2 Chronicles 1 in the BONUT2

2 Chronicles 1 in the BOPLNT

2 Chronicles 1 in the BOSCB

2 Chronicles 1 in the BOSNC

2 Chronicles 1 in the BOTLNT

2 Chronicles 1 in the BOVCB

2 Chronicles 1 in the BOYCB

2 Chronicles 1 in the BPBB

2 Chronicles 1 in the BPH

2 Chronicles 1 in the BSB

2 Chronicles 1 in the CCB

2 Chronicles 1 in the CUV

2 Chronicles 1 in the CUVS

2 Chronicles 1 in the DBT

2 Chronicles 1 in the DGDNT

2 Chronicles 1 in the DHNT

2 Chronicles 1 in the DNT

2 Chronicles 1 in the ELBE

2 Chronicles 1 in the EMTV

2 Chronicles 1 in the ESV

2 Chronicles 1 in the FBV

2 Chronicles 1 in the FEB

2 Chronicles 1 in the GGMNT

2 Chronicles 1 in the GNT

2 Chronicles 1 in the HARY

2 Chronicles 1 in the HNT

2 Chronicles 1 in the IRVA

2 Chronicles 1 in the IRVB

2 Chronicles 1 in the IRVG

2 Chronicles 1 in the IRVH

2 Chronicles 1 in the IRVK

2 Chronicles 1 in the IRVM

2 Chronicles 1 in the IRVM2

2 Chronicles 1 in the IRVO

2 Chronicles 1 in the IRVP

2 Chronicles 1 in the IRVT

2 Chronicles 1 in the IRVT2

2 Chronicles 1 in the IRVU

2 Chronicles 1 in the ISVN

2 Chronicles 1 in the JSNT

2 Chronicles 1 in the KAPI

2 Chronicles 1 in the KBT1ETNIK

2 Chronicles 1 in the KBV

2 Chronicles 1 in the KJV

2 Chronicles 1 in the KNFD

2 Chronicles 1 in the LBA

2 Chronicles 1 in the LBLA

2 Chronicles 1 in the LNT

2 Chronicles 1 in the LSV

2 Chronicles 1 in the MAAL

2 Chronicles 1 in the MBV

2 Chronicles 1 in the MBV2

2 Chronicles 1 in the MHNT

2 Chronicles 1 in the MKNFD

2 Chronicles 1 in the MNG

2 Chronicles 1 in the MNT

2 Chronicles 1 in the MNT2

2 Chronicles 1 in the MRS1T

2 Chronicles 1 in the NAA

2 Chronicles 1 in the NASB

2 Chronicles 1 in the NBLA

2 Chronicles 1 in the NBS

2 Chronicles 1 in the NBVTP

2 Chronicles 1 in the NET2

2 Chronicles 1 in the NIV11

2 Chronicles 1 in the NNT

2 Chronicles 1 in the NNT2

2 Chronicles 1 in the NNT3

2 Chronicles 1 in the PDDPT

2 Chronicles 1 in the PFNT

2 Chronicles 1 in the RMNT

2 Chronicles 1 in the SBIAS

2 Chronicles 1 in the SBIBS

2 Chronicles 1 in the SBIBS2

2 Chronicles 1 in the SBICS

2 Chronicles 1 in the SBIDS

2 Chronicles 1 in the SBIGS

2 Chronicles 1 in the SBIHS

2 Chronicles 1 in the SBIIS

2 Chronicles 1 in the SBIIS2

2 Chronicles 1 in the SBIIS3

2 Chronicles 1 in the SBIKS

2 Chronicles 1 in the SBIKS2

2 Chronicles 1 in the SBIMS

2 Chronicles 1 in the SBIOS

2 Chronicles 1 in the SBIPS

2 Chronicles 1 in the SBISS

2 Chronicles 1 in the SBITS

2 Chronicles 1 in the SBITS2

2 Chronicles 1 in the SBITS3

2 Chronicles 1 in the SBITS4

2 Chronicles 1 in the SBIUS

2 Chronicles 1 in the SBIVS

2 Chronicles 1 in the SBT

2 Chronicles 1 in the SBT1E

2 Chronicles 1 in the SCHL

2 Chronicles 1 in the SNT

2 Chronicles 1 in the SUSU

2 Chronicles 1 in the SUSU2

2 Chronicles 1 in the SYNO

2 Chronicles 1 in the TBIAOTANT

2 Chronicles 1 in the TBT1E

2 Chronicles 1 in the TBT1E2

2 Chronicles 1 in the TFTIP

2 Chronicles 1 in the TFTU

2 Chronicles 1 in the TGNTATF3T

2 Chronicles 1 in the THAI

2 Chronicles 1 in the TNFD

2 Chronicles 1 in the TNT

2 Chronicles 1 in the TNTIK

2 Chronicles 1 in the TNTIL

2 Chronicles 1 in the TNTIN

2 Chronicles 1 in the TNTIP

2 Chronicles 1 in the TNTIZ

2 Chronicles 1 in the TOMA

2 Chronicles 1 in the TTENT

2 Chronicles 1 in the UBG

2 Chronicles 1 in the UGV

2 Chronicles 1 in the UGV2

2 Chronicles 1 in the UGV3

2 Chronicles 1 in the VBL

2 Chronicles 1 in the VDCC

2 Chronicles 1 in the YALU

2 Chronicles 1 in the YAPE

2 Chronicles 1 in the YBVTP

2 Chronicles 1 in the ZBP