2 Chronicles 14 (BOICB)

1 Abija sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Devid. Asa, nwa ya nwoke ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. Udo dịkwa afọ iri nʼụbọchị ịbụ eze ya. 2 Asa mere ihe dị mma na nke ziri ezi nʼanya ONYENWE ANYỊ bụ Chineke ya. 3 Ọ wezugakwara ebe ịchụ aja nke chi ọzọ niile dị nʼugwu, tipịa ogidi nsọ niile, gbujasịakwa ogidi Ashera. 4 O nyere Juda iwu ka ha chọọ ONYENWE ANYỊ Chineke nke nna ha, ka ha debekwa iwu ya na ụkpụrụ ya niile. 5 O wezugakwara ebe niile a na-efe arụsị nʼelu ugwu, bibiekwa ebe niile a na-esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼobodo Juda. Alaeze ahụ nwekwara udo nʼokpuru ọchịchị ya. 6 O wuru ọtụtụ obodo e ji mgbidi gbaa gburugburu nʼala Juda niile. O nweghị onye busoro ya agha, nʼihi na ONYENWE ANYỊ nyere ya udo. 7 Nʼihi nke a, ọ gwara ndị Juda sị ha, “Ugbu a ka anyị kwesiri iwu obodo ndị a. Ka anyị wuokwa mgbidi gburugburu ha, wuokwa ụlọ elu nche, tinyesịa ha niile ibo ọnụ ụzọ ama, na mkpọrọ e ji akpọchi ya, ala a bụ nke anyị, nʼihi na ONYENWE ANYỊ Chineke onye anyị ji obi anyị chọsie ike enyela anyị udo.” Ya mere, ha wuru ihe ndị a niile nwekwa ọganihu. 8 Ọnụọgụgụ ndị agha Asa ndị si Juda nʼoge ahụ bụ narị puku atọ. Ngwa agha ha ji bụ ọta ukwu na ùbe. Ndị agha ya ọzọ si Benjamin dị narị puku abụọ na iri puku mmadụ asatọ. Ndị a jikwa ọta na ụta. Ndị agha ndị a niile bụ ndị a zụziri azụzi, bụrụkwa ndị dị ike. 9 Zera, bụ onye Kush duru puku kwụrụ puku, na narị ụgbọ agha atọ, bịaruo Maresha ibuso Juda agha. 10 Asa pụrụ izute ya. Ha doro onwe ha nʼusoro ibu agha na Ndagwurugwu Zefata nke dị Maresha nso. 11 Mgbe ahụ, Asa kpọkuru ONYENWE ANYỊ Chineke ya, si, “ONYENWE ANYỊ ọ dịghị onye dịka gị nʼinyere onye na-adịghị ike aka nʼihu onye dị ike nke ukwuu. Nyere anyị aka, O ONYENWE ANYỊ Chineke anyị, nʼihi na anyị dabere na gị. Ọ bụkwa nʼaha gị ka anyị na-apụ ibuso igwe a agha. O ONYENWE ANYỊ i bụ Chineke anyị. Ekwela ka ọ bụrụ na mmadụ efu meriri gị.” 12 ONYENWE ANYỊ tigbukwara ndị Kush niile ahụ nʼihu Asa na Juda. Ndị Kush gbakwara ọsọ. 13 Asa na ndị agha ya chụrụ ha ọsọ chụruo ha obodo Gera ebe ọtụtụ ndị Kush dara, ruo na o nwekwaghị onye fọdụrụ ndụ nʼime ha. E tigburu ha nʼihu ONYENWE ANYỊ na ndị agha ya. Ndị Juda bukọọrọ ọtụtụ ihe nkwata nʼagha dị iche iche. 14 Ha bibiri obodo niile gbara Gera gburugburu, nʼihi na egwu ONYENWE ANYỊ dakwasịrị obodo ndị ahụ niile. Ndị Juda bukọọrọ ọtụtụ ihe nkwata nʼihi na ọtụtụ ihe dị nʼobodo ndị ahụ. 15 Ha busokwara ebe obibi ndị na-azụ anụ ụlọ agha, chikọrọ igwe atụrụ na ewu na ịnyịnya kamel. Emesịa ha laghachiri Jerusalem.

In Other Versions

2 Chronicles 14 in the ANGEFD

2 Chronicles 14 in the ANTPNG2D

2 Chronicles 14 in the AS21

2 Chronicles 14 in the BAGH

2 Chronicles 14 in the BBPNG

2 Chronicles 14 in the BBT1E

2 Chronicles 14 in the BDS

2 Chronicles 14 in the BEV

2 Chronicles 14 in the BHAD

2 Chronicles 14 in the BIB

2 Chronicles 14 in the BLPT

2 Chronicles 14 in the BNT

2 Chronicles 14 in the BNTABOOT

2 Chronicles 14 in the BNTLV

2 Chronicles 14 in the BOATCB

2 Chronicles 14 in the BOATCB2

2 Chronicles 14 in the BOBCV

2 Chronicles 14 in the BOCNT

2 Chronicles 14 in the BOECS

2 Chronicles 14 in the BOGWICC

2 Chronicles 14 in the BOHCB

2 Chronicles 14 in the BOHCV

2 Chronicles 14 in the BOHLNT

2 Chronicles 14 in the BOHNTLTAL

2 Chronicles 14 in the BOILNTAP

2 Chronicles 14 in the BOITCV

2 Chronicles 14 in the BOKCV

2 Chronicles 14 in the BOKCV2

2 Chronicles 14 in the BOKHWOG

2 Chronicles 14 in the BOKSSV

2 Chronicles 14 in the BOLCB

2 Chronicles 14 in the BOLCB2

2 Chronicles 14 in the BOMCV

2 Chronicles 14 in the BONAV

2 Chronicles 14 in the BONCB

2 Chronicles 14 in the BONLT

2 Chronicles 14 in the BONUT2

2 Chronicles 14 in the BOPLNT

2 Chronicles 14 in the BOSCB

2 Chronicles 14 in the BOSNC

2 Chronicles 14 in the BOTLNT

2 Chronicles 14 in the BOVCB

2 Chronicles 14 in the BOYCB

2 Chronicles 14 in the BPBB

2 Chronicles 14 in the BPH

2 Chronicles 14 in the BSB

2 Chronicles 14 in the CCB

2 Chronicles 14 in the CUV

2 Chronicles 14 in the CUVS

2 Chronicles 14 in the DBT

2 Chronicles 14 in the DGDNT

2 Chronicles 14 in the DHNT

2 Chronicles 14 in the DNT

2 Chronicles 14 in the ELBE

2 Chronicles 14 in the EMTV

2 Chronicles 14 in the ESV

2 Chronicles 14 in the FBV

2 Chronicles 14 in the FEB

2 Chronicles 14 in the GGMNT

2 Chronicles 14 in the GNT

2 Chronicles 14 in the HARY

2 Chronicles 14 in the HNT

2 Chronicles 14 in the IRVA

2 Chronicles 14 in the IRVB

2 Chronicles 14 in the IRVG

2 Chronicles 14 in the IRVH

2 Chronicles 14 in the IRVK

2 Chronicles 14 in the IRVM

2 Chronicles 14 in the IRVM2

2 Chronicles 14 in the IRVO

2 Chronicles 14 in the IRVP

2 Chronicles 14 in the IRVT

2 Chronicles 14 in the IRVT2

2 Chronicles 14 in the IRVU

2 Chronicles 14 in the ISVN

2 Chronicles 14 in the JSNT

2 Chronicles 14 in the KAPI

2 Chronicles 14 in the KBT1ETNIK

2 Chronicles 14 in the KBV

2 Chronicles 14 in the KJV

2 Chronicles 14 in the KNFD

2 Chronicles 14 in the LBA

2 Chronicles 14 in the LBLA

2 Chronicles 14 in the LNT

2 Chronicles 14 in the LSV

2 Chronicles 14 in the MAAL

2 Chronicles 14 in the MBV

2 Chronicles 14 in the MBV2

2 Chronicles 14 in the MHNT

2 Chronicles 14 in the MKNFD

2 Chronicles 14 in the MNG

2 Chronicles 14 in the MNT

2 Chronicles 14 in the MNT2

2 Chronicles 14 in the MRS1T

2 Chronicles 14 in the NAA

2 Chronicles 14 in the NASB

2 Chronicles 14 in the NBLA

2 Chronicles 14 in the NBS

2 Chronicles 14 in the NBVTP

2 Chronicles 14 in the NET2

2 Chronicles 14 in the NIV11

2 Chronicles 14 in the NNT

2 Chronicles 14 in the NNT2

2 Chronicles 14 in the NNT3

2 Chronicles 14 in the PDDPT

2 Chronicles 14 in the PFNT

2 Chronicles 14 in the RMNT

2 Chronicles 14 in the SBIAS

2 Chronicles 14 in the SBIBS

2 Chronicles 14 in the SBIBS2

2 Chronicles 14 in the SBICS

2 Chronicles 14 in the SBIDS

2 Chronicles 14 in the SBIGS

2 Chronicles 14 in the SBIHS

2 Chronicles 14 in the SBIIS

2 Chronicles 14 in the SBIIS2

2 Chronicles 14 in the SBIIS3

2 Chronicles 14 in the SBIKS

2 Chronicles 14 in the SBIKS2

2 Chronicles 14 in the SBIMS

2 Chronicles 14 in the SBIOS

2 Chronicles 14 in the SBIPS

2 Chronicles 14 in the SBISS

2 Chronicles 14 in the SBITS

2 Chronicles 14 in the SBITS2

2 Chronicles 14 in the SBITS3

2 Chronicles 14 in the SBITS4

2 Chronicles 14 in the SBIUS

2 Chronicles 14 in the SBIVS

2 Chronicles 14 in the SBT

2 Chronicles 14 in the SBT1E

2 Chronicles 14 in the SCHL

2 Chronicles 14 in the SNT

2 Chronicles 14 in the SUSU

2 Chronicles 14 in the SUSU2

2 Chronicles 14 in the SYNO

2 Chronicles 14 in the TBIAOTANT

2 Chronicles 14 in the TBT1E

2 Chronicles 14 in the TBT1E2

2 Chronicles 14 in the TFTIP

2 Chronicles 14 in the TFTU

2 Chronicles 14 in the TGNTATF3T

2 Chronicles 14 in the THAI

2 Chronicles 14 in the TNFD

2 Chronicles 14 in the TNT

2 Chronicles 14 in the TNTIK

2 Chronicles 14 in the TNTIL

2 Chronicles 14 in the TNTIN

2 Chronicles 14 in the TNTIP

2 Chronicles 14 in the TNTIZ

2 Chronicles 14 in the TOMA

2 Chronicles 14 in the TTENT

2 Chronicles 14 in the UBG

2 Chronicles 14 in the UGV

2 Chronicles 14 in the UGV2

2 Chronicles 14 in the UGV3

2 Chronicles 14 in the VBL

2 Chronicles 14 in the VDCC

2 Chronicles 14 in the YALU

2 Chronicles 14 in the YAPE

2 Chronicles 14 in the YBVTP

2 Chronicles 14 in the ZBP