2 Chronicles 28 (BOICB)

1 Ehaz gbara iri afọ abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịkwara afọ iri na isii nʼime Jerusalem, ma o meghị ihe ziri ezi nʼanya ONYENWE ANYỊ, dịka nna ya Devid mere. 2 Ọ gbasoro ụzọ niile nke ndị eze Izrel, kpụọkwa arụsị dị iche iche maka ofufe arụsị Baal. 3 O surere ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ dị iche iche nʼime Ndagwurugwu nke Ben Hinom, surekwaa ụmụ ya nʼọkụ. Ọ gbasoro omenaala niile rụrụ arụ nke ndị mba ọzọ, ndị ahụ ONYENWE ANYỊ chụpụrụ site nʼihu ndị Izrel. 4 Ọ chụrụ aja surekwaa ihe nsure ọkụ aja na-esi isi ụtọ nʼebe niile dị elu, nʼelu ugwu niile, na nʼokpuru osisi ndụ ọbụla. 5 Nʼihi ya, ONYENWE ANYỊ Chineke ya nyefere ya nʼaka eze ndị Aram. Ndị Aram lụgburu ya, kpọrọ ọtụtụ nʼetiti ndị ya dịka ndị mkpọrọ kpọta ha nʼDamaskọs.E nyefekwara ya nʼaka eze Izrel, onye gburu ọtụtụ ndị agha ya. 6 Nʼotu ụbọchị, Peka nwa Remalaya gburu narị puku ndị agha Juda na iri puku abụọ. Ihe ndị a mere nʼihi na ha gbakụtara ONYENWE ANYỊ Chineke nna nna ha azụ. 7 Zikri onye Ifrem, onye bụ dike nʼagha, gburu Maaseia, nwa eze, na Azrikam onye na-elekọta ụlọeze. O gbukwara Elkena onye na-esota eze. 8 Ndị Izrel sitere nʼetiti ụmụnne ha ndị Juda dọta ndị inyom, na ụmụ okorobịa, na ụmụ agbọghọbịa ọnụọgụgụ ha dị narị puku abụọ nʼagha. Ha bukọkwaara ọtụtụ ihe ndị ọzọ ha kwatara nʼagha laghachi na Sameria. 9 Ma Oded, onye amụma ONYENWE ANYỊ, nọ na Sameria nʼoge a. Ọ pụrụ jekwuru ndị agha ahụ na Sameria sị ha, “ONYENWE ANYỊ Chineke nna nna unu ha mere ka unu merie ndị Juda nʼihi na ha na-efe arụsị. Ma unu ji ọnụma gbuo ha, nke mere na ụzụ tụrụ ruo nʼeluigwe. 10 Ugbu a, unu na-achọkwa ime ndị ikom na ndị inyom Juda na Jerusalem ndị ohu unu? Ma unu abụghị ndị ikpe mmehie mara nʼebe ONYENWE ANYỊ Chineke unu nọ? 11 Ugbu a, geenụ ntị nʼihe m na-ekwu. Kpọghachinụ ụmụnna unu ndị a unu dọtara nʼagha nʼụlọ ha, nʼihi na ugbu a ONYENWE ANYỊ na-ewe oke iwe megide unu.” 12 Ụfọdụ ndịisi ndị Ifrem, bụ Azaraya nwa Jehohanan, na Berekaya nwa Meshilemot, na Jehizkaya nwa Shalum, na Amasa nwa Hadlai, biliri guzogide ndị ahụ si agha na-alọta. 13 Ha sịrị, “Unu akpọbatakwala ndị a unu dọtara nʼagha nʼebe a, nʼihi na unu mee ya, anyị ga-abụ ndị ikpe maara nʼihu ONYENWE ANYỊ. Unu chọrọ ịtụkwasị ihe na mmehie na ikpe ọmụma anyị? Nʼihi na ikpe ọmụma anyị adịla ukwuu, iwe ya dị ọkụ na-adịkwasịkwa nʼahụ Izrel.” 14 Ya mere, ndị agha ahụ hapụrụ ndị mkpọrọ ahụ na ihe niile ha bulatara, nʼihu ndị ozi na igwe mmadụ ahụ niile. 15 Mgbe ahụ, ndị ikom ahụ akpọrọ nʼaha nʼaha duuru ndị mkpọrọ ahụ, manye aka nʼihe ahụ niile a dọtara nʼagha wepụta uwe, na nri, na mmanya na akpụkpọụkwụ, na mmanụ, nyeghachi ha ndị ahụ niile a dọtara nʼagha. Ha bulitere ndị ọrịa nọ nʼetiti ndị ahụ a dọtara nʼagha kukwasị ha nʼelu ịnyịnya ibu. Emesịa, ha duuru mmadụ ahụ niile dughachiri ha ndị ha nọ na Jeriko, obodo nkwụ. Emesịakwa, ha laghachikwara azụ na Sameria. 16 Nʼoge ahụ, eze Ehaz zigara ndị eze Asịrịa ozi ka ọ bịa nyere ya aka. 17 Ndị Edọm bịara ọzọ buso Juda agha, ma dọrọkwa ọtụtụ nʼime ha nʼagha. 18 Ndị Filistia na-ebusokwa ụfọdụ obodo Juda dị na mgbada ugwu, na Negeb agha. Ha meriri ma bichikwaa obodo ndị a; Bet-Shemesh, na Aijalon, na Gederọt, na Soko, na Timna, na Gimzo, na obodo nta niile gbara ha gburugburu. 19 Ma ONYENWE ANYỊ wedara Juda nʼala nʼihi Ehaz, eze Izrel onye mere ka ihe ọjọọ baa ụba na Juda, na-ekwesighị ntụkwasị obi ya nye ONYENWE ANYỊ. 20 Mgbe Tiglat-Pilesa eze ndị Asịrịa bịara, o wetaara Ehaz nsogbu kama enyemaka. 21 Ehaz weere ụfọdụ ihe dị nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ, na nke dị nʼụlọeze, sitekwa na nʼụlọ ndịisi obodo, were ha nye eze Asịrịa, ma ihe ndị a enyereghị ya aka. 22 Nʼoge nsogbu ya, eze Ehaz gakwara nʼihu bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye ONYENWE ANYỊ. 23 Ọ chụrụ aja nye chi niile nke Damaskọs, bụ ndị meriri ya nʼagha. Ọ sịrị, “Nʼihi na chi nke ndị eze Aram nyeere ha aka, ha ka m ga-achụrụ aja, ka ha nwee ike nyere m aka.” Ma ha bụ ihe wetaara ya ọdịda, bụrụkwa ọdịda nye Izrel niile. 24 Ehaz chịkọtara ngwongwo niile dị nʼụlọnsọ ukwu Chineke, gbujasịa ha. O mechiri ọnụ ụzọ niile e si abanye nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ, ma wuo ọtụtụ ebe ịchụ aja na nkuku ụzọ niile nʼime Jerusalem. 25 Nʼobodo niile ọbụla na Juda, o wuru ebe dị elu maka ịchụ aja dị iche iche nye chi ndị ọzọ, si otu a kpasuo ONYENWE ANYỊ, bụ Chineke nna nna ya ha iwe. 26 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị ya, site na mmalite ruo ọgwụgwụ, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda na Izrel? 27 Ehaz soro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Jerusalem, ma ọ bụghị nʼime ili ebe a na-eli ndị eze Izrel. Hezekaya nwa ya, ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

In Other Versions

2 Chronicles 28 in the ANGEFD

2 Chronicles 28 in the ANTPNG2D

2 Chronicles 28 in the AS21

2 Chronicles 28 in the BAGH

2 Chronicles 28 in the BBPNG

2 Chronicles 28 in the BBT1E

2 Chronicles 28 in the BDS

2 Chronicles 28 in the BEV

2 Chronicles 28 in the BHAD

2 Chronicles 28 in the BIB

2 Chronicles 28 in the BLPT

2 Chronicles 28 in the BNT

2 Chronicles 28 in the BNTABOOT

2 Chronicles 28 in the BNTLV

2 Chronicles 28 in the BOATCB

2 Chronicles 28 in the BOATCB2

2 Chronicles 28 in the BOBCV

2 Chronicles 28 in the BOCNT

2 Chronicles 28 in the BOECS

2 Chronicles 28 in the BOGWICC

2 Chronicles 28 in the BOHCB

2 Chronicles 28 in the BOHCV

2 Chronicles 28 in the BOHLNT

2 Chronicles 28 in the BOHNTLTAL

2 Chronicles 28 in the BOILNTAP

2 Chronicles 28 in the BOITCV

2 Chronicles 28 in the BOKCV

2 Chronicles 28 in the BOKCV2

2 Chronicles 28 in the BOKHWOG

2 Chronicles 28 in the BOKSSV

2 Chronicles 28 in the BOLCB

2 Chronicles 28 in the BOLCB2

2 Chronicles 28 in the BOMCV

2 Chronicles 28 in the BONAV

2 Chronicles 28 in the BONCB

2 Chronicles 28 in the BONLT

2 Chronicles 28 in the BONUT2

2 Chronicles 28 in the BOPLNT

2 Chronicles 28 in the BOSCB

2 Chronicles 28 in the BOSNC

2 Chronicles 28 in the BOTLNT

2 Chronicles 28 in the BOVCB

2 Chronicles 28 in the BOYCB

2 Chronicles 28 in the BPBB

2 Chronicles 28 in the BPH

2 Chronicles 28 in the BSB

2 Chronicles 28 in the CCB

2 Chronicles 28 in the CUV

2 Chronicles 28 in the CUVS

2 Chronicles 28 in the DBT

2 Chronicles 28 in the DGDNT

2 Chronicles 28 in the DHNT

2 Chronicles 28 in the DNT

2 Chronicles 28 in the ELBE

2 Chronicles 28 in the EMTV

2 Chronicles 28 in the ESV

2 Chronicles 28 in the FBV

2 Chronicles 28 in the FEB

2 Chronicles 28 in the GGMNT

2 Chronicles 28 in the GNT

2 Chronicles 28 in the HARY

2 Chronicles 28 in the HNT

2 Chronicles 28 in the IRVA

2 Chronicles 28 in the IRVB

2 Chronicles 28 in the IRVG

2 Chronicles 28 in the IRVH

2 Chronicles 28 in the IRVK

2 Chronicles 28 in the IRVM

2 Chronicles 28 in the IRVM2

2 Chronicles 28 in the IRVO

2 Chronicles 28 in the IRVP

2 Chronicles 28 in the IRVT

2 Chronicles 28 in the IRVT2

2 Chronicles 28 in the IRVU

2 Chronicles 28 in the ISVN

2 Chronicles 28 in the JSNT

2 Chronicles 28 in the KAPI

2 Chronicles 28 in the KBT1ETNIK

2 Chronicles 28 in the KBV

2 Chronicles 28 in the KJV

2 Chronicles 28 in the KNFD

2 Chronicles 28 in the LBA

2 Chronicles 28 in the LBLA

2 Chronicles 28 in the LNT

2 Chronicles 28 in the LSV

2 Chronicles 28 in the MAAL

2 Chronicles 28 in the MBV

2 Chronicles 28 in the MBV2

2 Chronicles 28 in the MHNT

2 Chronicles 28 in the MKNFD

2 Chronicles 28 in the MNG

2 Chronicles 28 in the MNT

2 Chronicles 28 in the MNT2

2 Chronicles 28 in the MRS1T

2 Chronicles 28 in the NAA

2 Chronicles 28 in the NASB

2 Chronicles 28 in the NBLA

2 Chronicles 28 in the NBS

2 Chronicles 28 in the NBVTP

2 Chronicles 28 in the NET2

2 Chronicles 28 in the NIV11

2 Chronicles 28 in the NNT

2 Chronicles 28 in the NNT2

2 Chronicles 28 in the NNT3

2 Chronicles 28 in the PDDPT

2 Chronicles 28 in the PFNT

2 Chronicles 28 in the RMNT

2 Chronicles 28 in the SBIAS

2 Chronicles 28 in the SBIBS

2 Chronicles 28 in the SBIBS2

2 Chronicles 28 in the SBICS

2 Chronicles 28 in the SBIDS

2 Chronicles 28 in the SBIGS

2 Chronicles 28 in the SBIHS

2 Chronicles 28 in the SBIIS

2 Chronicles 28 in the SBIIS2

2 Chronicles 28 in the SBIIS3

2 Chronicles 28 in the SBIKS

2 Chronicles 28 in the SBIKS2

2 Chronicles 28 in the SBIMS

2 Chronicles 28 in the SBIOS

2 Chronicles 28 in the SBIPS

2 Chronicles 28 in the SBISS

2 Chronicles 28 in the SBITS

2 Chronicles 28 in the SBITS2

2 Chronicles 28 in the SBITS3

2 Chronicles 28 in the SBITS4

2 Chronicles 28 in the SBIUS

2 Chronicles 28 in the SBIVS

2 Chronicles 28 in the SBT

2 Chronicles 28 in the SBT1E

2 Chronicles 28 in the SCHL

2 Chronicles 28 in the SNT

2 Chronicles 28 in the SUSU

2 Chronicles 28 in the SUSU2

2 Chronicles 28 in the SYNO

2 Chronicles 28 in the TBIAOTANT

2 Chronicles 28 in the TBT1E

2 Chronicles 28 in the TBT1E2

2 Chronicles 28 in the TFTIP

2 Chronicles 28 in the TFTU

2 Chronicles 28 in the TGNTATF3T

2 Chronicles 28 in the THAI

2 Chronicles 28 in the TNFD

2 Chronicles 28 in the TNT

2 Chronicles 28 in the TNTIK

2 Chronicles 28 in the TNTIL

2 Chronicles 28 in the TNTIN

2 Chronicles 28 in the TNTIP

2 Chronicles 28 in the TNTIZ

2 Chronicles 28 in the TOMA

2 Chronicles 28 in the TTENT

2 Chronicles 28 in the UBG

2 Chronicles 28 in the UGV

2 Chronicles 28 in the UGV2

2 Chronicles 28 in the UGV3

2 Chronicles 28 in the VBL

2 Chronicles 28 in the VDCC

2 Chronicles 28 in the YALU

2 Chronicles 28 in the YAPE

2 Chronicles 28 in the YBVTP

2 Chronicles 28 in the ZBP