2 Chronicles 32 (BOICB)

1 Mgbe Hezekaya ji ikwesi ntụkwasị obi rụchaa ọrụ ndị a niile, Senakerib bụ eze Asịrịa, bịara nʼime Juda megide ya. Ọ nọchibidoro obodo niile nke e wusiri ike, na-eche na ọ ga-emeri ha nye onwe ya. 2 Mgbe o doro eze anya na Senakerib bịara ka o buo agha megide Jerusalem, 3 Hezekaya mere ngwangwa kpọkọta ụmụ eze niile na ndịisi agha ya. Mgbe ha zukọtara, ha kpebiri iwuchi isi iyi ahụ niile na-esi nʼazụ obodo na-asọpụta. Ha mekwara otu a. 4 Ha kpọkọtara ọtụtụ ndị ọrụ, ndị gara gbochie isi iyi niile, mee ka mmiri gharakwa ịsọpụta nʼala ahụ niile. Ha mere nke a nʼihi na ha achọghị ka eze ndị Asịrịa na ndị agha ya nweta mmiri ha ga-aṅụ mgbe ha bịaruru ibuso Jerusalem agha. 5 Hezekaya wuzikwara mgbidi obodo ahụ, wusie ha ike nʼebe niile ọ na-ada ada. O wukwara mgbidi ọzọ gburugburu mgbidi nke ochie ahụ. O wusikwara ebe siri ike nke Milo dị nʼobodo Devid ike, kpụọkwa ọtụtụ ngwa agha na ọta. 6 O tinyere ndị agha niile nọ nʼobodo ahụ nʼokpuru ndịisi agha na-achị ha, mee ka ha niile zukọta nʼọnụ ụzọ ama nke obodo. Nʼebe ahụ ka ọ nọ gwa ha okwu sị ha, 7 “Dịrịnụ ike, unu adakwala mba. Unu atụla ụjọ maọbụ daa mba nʼihi eze Asịrịa na usuu ndị agha ya, nʼihi na onye dịnyeere anyị ka ya ike. 8 Ihe nọnyere ya bụ ogwe aka nke anụ ahụ, ma nke nọnyere anyị bụ ONYENWE ANYỊ, Chineke anyị, inyere anyị aka na ibu agha anyị niile.” Okwu a, nke Hezekaya bụ eze Juda kwuru, mere ka ndị Juda nwee agbamume. 9 Mgbe e mesiri, mgbe Senakerib eze Asịrịa na ndị agha ya niile nọchibidoro Lakish, o zipụrụ ndị ọrụ ya gaa Jerusalem, ka ha jiri ozi a gaa maka Hezekaya, bụ eze Juda na ndị Juda niile ndị nọ nʼebe ahụ: 10 “Nke a bụ ihe Senakerib, bụ eze Asịrịa sịrị: Ọ bụ na gịnị ka ntụkwasị obi gị dabere, mere i ji nọgidesie ike na Jerusalem nʼọnọdụ nnọchibido a? 11 Mgbe Hezekaya na-asị, ‘ONYENWE ANYỊ bụ Chineke anyị ga-azọpụta anyị site nʼaka eze Asịrịa,’ ọ bụ aghụghọ ka ọ na-aghọ unu. Ọ na-eduhie unu, na-achọ ka unu nwụọ nʼagụụ nakwa akpịrị ịkpọ nkụ. 12 Ọ bụghị Hezekaya na onwe ya wezugara ebe ya niile dị elu na ebe ịchụ aja ya niile, na-asị Juda na Jerusalem, ‘Unu aghaghị ịkpọ isiala nʼotu ebe ịchụ aja, chụọkwa aja nʼelu ya’? 13 “Unu amaghị ihe mụ na nna m ha bụ ndị bu m ụzọ chịa mere ndị ala ọzọ? Chi niile nke mba ndị ahụ niile ha nwere ike zọpụta ala ha site nʼaka m? 14 Ọ bụ onye nʼetiti chi niile nke mba ndị a niile, bụ ndị nna nna m ha bibiri, napụtarala ndị ya site nʼaka m? Aṅaa ka chi unu ga-esi zọpụta unu site nʼaka m? 15 Unu ekwela ka Hezekaya duhie unu, rafuokwa unu otu a. Unu ekwenyekwarala ya, nʼihi na ọ dịghị chi ọbụla maọbụ nke mba ọbụla maọbụ alaeze ọbụla pụrụ ịnapụta ndị ya site nʼaka m maọbụ nʼaka nna m ha. Ka ọ bụrụzie chi unu ga-abụ nke ga-anapụta unu site nʼaka m!” 16 Nʼụzọ dị otu a ka ndị ozi Senakerib ahụ ji leda ONYENWE ANYỊ Chineke, na Hezekaya anya kwuokwa okwu mkparị megide ha. 17 Emesịa, Senakerib dekwara akwụkwọ mkparị ndị ọzọ, nke ọ nọ nʼime ya kwuluo ONYENWE ANYỊ Chineke Izrel, na-asị, “Dịka chi ndị ala ọzọ niile enweghị ike zọpụta ndị ha site nʼaka m, otu a kwa, Chineke nke Hezekaya apụghịkwa ịzọpụta ndị ya site nʼaka m.” 18 Mgbe ahụ, ha ji oke olu kpọkuo ndị Jerusalem, bụ ndị nọ na mgbidi ahụ nʼasụsụ Hibru, imenye ha egwu nakwa ime ka ụjọ tụọ ha, ka ha nwee ike were obodo ahụ. 19 Ha kwuru okwu ọjọọ dị iche iche banyere Chineke nke Jerusalem, dịka ha si kwuo megide chi niile nke ndị ọzọ dị nʼụwa, bụ ọrụ aka mmadụ. 20 Mgbe ahụ, Hezekaya bụ eze, na Aịzaya onye amụma, nwa Emọz, kpọkuru Chineke nke eluigwe nʼekpere. 21 ONYENWE ANYỊ zipụrụ otu mmụọ ozi, onye gara tigbuo ndị agha niile bụ dike, ndị ọchịagha na ndịisi niile nọ nʼọmụma ụlọ ikwu nke eze Asịrịa. Ya mere, Senakerib ji oke ihere laghachi nʼala ya. Ma mgbe ọ gara nʼụlọ chi ya, ụfọdụ nʼime ụmụ ya ndị ikom, ndị bụ anụ ahụ na ọbara ya, were mma agha gbuo ya nʼebe ahụ. 22 Otu a ka ONYENWE ANYỊ si zọpụta Hezekaya na ndị Jerusalem, site nʼaka Senakerib eze Asịrịa, na sitekwa nʼaka ndị iro ya ndị ọzọ. Udo dịkwara nʼala ya niile. 23 Site nʼoge ahụ, Hezekaya ghọrọ eze a maara aha ya na mba niile dị Juda gburugburu. Ọtụtụ mmadụ bidokwara ibutere ONYENWE ANYỊ onyinye dị iche iche na Jerusalem. Hezekaya nʼonwe ya nwetakwara onyinye nke ya. 24 Ma nʼoge ahụ, Hezekaya rịara ọrịa, ruo na ọ gaara anwụ. Ma o kpere ekpere rịọ ONYENWE ANYỊ ka ọ gwọọ ya. Ọ zara ekpere ya, gosikwa ya ihe ịrịbama dị ebube. 25 Ma Hezekaya ejighị obi ya niile kelee Chineke ekele nʼihi na nganga batara ya nʼobi. Nke a mere ka iwe wee ONYENWE ANYỊ megide ya na ndị Jerusalem na Juda. 26 Mgbe Hezekaya na ndị Jerusalem wedara onwe ha nʼala, iwe ONYENWE ANYỊ dajụrụ nʼebe ha nọ, ọ takwaghị ha ahụhụ nʼoge niile ahụ Hezekaya dị ndụ. 27 Ya mere, Hezekaya ghọrọ eze bara ọgaranya, bụrụkwa onye a na-asọpụrụ. O wuru ụlọakụ maka ichebe ọlaọcha ya na ọlaedo, na nkume dị oke ọnụahịa, na ụda na-esi isi ụtọ, na ọta na efere ọlaedo ya. 28 O wukwara ọtụtụ ụlọ ọzọ ebe a na-echebe ọka, na mmanya vaịnị ọhụrụ, na mmanụ oliv. O wukwara ụlọ anụmanụ maka ọtụtụ igwe ewu na atụrụ ya. 29 O wukwara ọtụtụ obodo nta dị iche iche, nweekwa ọtụtụ igwe anụ ụlọ, na igwe ehi, nʼihi na Chineke mere ka ọ baa ụba. 30 Hezekaya bụkwa onye gbochiri mmiri iyi Gaihọn nʼakụkụ elu elu ya, gwuo olulu ebe mmiri ahụ si sọgharịa na-asọbata nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke obodo Devid. Ihe niile o mere gaara ya nke ọma. 31 Ma mgbe ndị ozi nke ndị na-achị Babilọn zitere ka ha jụọ ya banyere ihe ebube ahụ nke mere nʼala ahụ, Chineke hapụrụ ya i nwalee ya, ka ọ mara ihe niile dị ya nʼobi. 32 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Hezekaya, na ọrụ ebere niile nke ọ rụrụ ka edere nʼakwụkwọ ọhụ onye amụma bụ Aịzaya, nwa Emọz, dịkwa nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Juda na Izrel niile. 33 Hezekaya sooro ndị nna nna ya dinaa nʼọnwụ, e lie ya nʼugwu nʼebe ili ndị nna nna Devid dị. Ndị Juda niile na ndị niile bi na Jerusalem kwanyere ya ugwu nʼọnwụ ya. Manase nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

In Other Versions

2 Chronicles 32 in the ANGEFD

2 Chronicles 32 in the ANTPNG2D

2 Chronicles 32 in the AS21

2 Chronicles 32 in the BAGH

2 Chronicles 32 in the BBPNG

2 Chronicles 32 in the BBT1E

2 Chronicles 32 in the BDS

2 Chronicles 32 in the BEV

2 Chronicles 32 in the BHAD

2 Chronicles 32 in the BIB

2 Chronicles 32 in the BLPT

2 Chronicles 32 in the BNT

2 Chronicles 32 in the BNTABOOT

2 Chronicles 32 in the BNTLV

2 Chronicles 32 in the BOATCB

2 Chronicles 32 in the BOATCB2

2 Chronicles 32 in the BOBCV

2 Chronicles 32 in the BOCNT

2 Chronicles 32 in the BOECS

2 Chronicles 32 in the BOGWICC

2 Chronicles 32 in the BOHCB

2 Chronicles 32 in the BOHCV

2 Chronicles 32 in the BOHLNT

2 Chronicles 32 in the BOHNTLTAL

2 Chronicles 32 in the BOILNTAP

2 Chronicles 32 in the BOITCV

2 Chronicles 32 in the BOKCV

2 Chronicles 32 in the BOKCV2

2 Chronicles 32 in the BOKHWOG

2 Chronicles 32 in the BOKSSV

2 Chronicles 32 in the BOLCB

2 Chronicles 32 in the BOLCB2

2 Chronicles 32 in the BOMCV

2 Chronicles 32 in the BONAV

2 Chronicles 32 in the BONCB

2 Chronicles 32 in the BONLT

2 Chronicles 32 in the BONUT2

2 Chronicles 32 in the BOPLNT

2 Chronicles 32 in the BOSCB

2 Chronicles 32 in the BOSNC

2 Chronicles 32 in the BOTLNT

2 Chronicles 32 in the BOVCB

2 Chronicles 32 in the BOYCB

2 Chronicles 32 in the BPBB

2 Chronicles 32 in the BPH

2 Chronicles 32 in the BSB

2 Chronicles 32 in the CCB

2 Chronicles 32 in the CUV

2 Chronicles 32 in the CUVS

2 Chronicles 32 in the DBT

2 Chronicles 32 in the DGDNT

2 Chronicles 32 in the DHNT

2 Chronicles 32 in the DNT

2 Chronicles 32 in the ELBE

2 Chronicles 32 in the EMTV

2 Chronicles 32 in the ESV

2 Chronicles 32 in the FBV

2 Chronicles 32 in the FEB

2 Chronicles 32 in the GGMNT

2 Chronicles 32 in the GNT

2 Chronicles 32 in the HARY

2 Chronicles 32 in the HNT

2 Chronicles 32 in the IRVA

2 Chronicles 32 in the IRVB

2 Chronicles 32 in the IRVG

2 Chronicles 32 in the IRVH

2 Chronicles 32 in the IRVK

2 Chronicles 32 in the IRVM

2 Chronicles 32 in the IRVM2

2 Chronicles 32 in the IRVO

2 Chronicles 32 in the IRVP

2 Chronicles 32 in the IRVT

2 Chronicles 32 in the IRVT2

2 Chronicles 32 in the IRVU

2 Chronicles 32 in the ISVN

2 Chronicles 32 in the JSNT

2 Chronicles 32 in the KAPI

2 Chronicles 32 in the KBT1ETNIK

2 Chronicles 32 in the KBV

2 Chronicles 32 in the KJV

2 Chronicles 32 in the KNFD

2 Chronicles 32 in the LBA

2 Chronicles 32 in the LBLA

2 Chronicles 32 in the LNT

2 Chronicles 32 in the LSV

2 Chronicles 32 in the MAAL

2 Chronicles 32 in the MBV

2 Chronicles 32 in the MBV2

2 Chronicles 32 in the MHNT

2 Chronicles 32 in the MKNFD

2 Chronicles 32 in the MNG

2 Chronicles 32 in the MNT

2 Chronicles 32 in the MNT2

2 Chronicles 32 in the MRS1T

2 Chronicles 32 in the NAA

2 Chronicles 32 in the NASB

2 Chronicles 32 in the NBLA

2 Chronicles 32 in the NBS

2 Chronicles 32 in the NBVTP

2 Chronicles 32 in the NET2

2 Chronicles 32 in the NIV11

2 Chronicles 32 in the NNT

2 Chronicles 32 in the NNT2

2 Chronicles 32 in the NNT3

2 Chronicles 32 in the PDDPT

2 Chronicles 32 in the PFNT

2 Chronicles 32 in the RMNT

2 Chronicles 32 in the SBIAS

2 Chronicles 32 in the SBIBS

2 Chronicles 32 in the SBIBS2

2 Chronicles 32 in the SBICS

2 Chronicles 32 in the SBIDS

2 Chronicles 32 in the SBIGS

2 Chronicles 32 in the SBIHS

2 Chronicles 32 in the SBIIS

2 Chronicles 32 in the SBIIS2

2 Chronicles 32 in the SBIIS3

2 Chronicles 32 in the SBIKS

2 Chronicles 32 in the SBIKS2

2 Chronicles 32 in the SBIMS

2 Chronicles 32 in the SBIOS

2 Chronicles 32 in the SBIPS

2 Chronicles 32 in the SBISS

2 Chronicles 32 in the SBITS

2 Chronicles 32 in the SBITS2

2 Chronicles 32 in the SBITS3

2 Chronicles 32 in the SBITS4

2 Chronicles 32 in the SBIUS

2 Chronicles 32 in the SBIVS

2 Chronicles 32 in the SBT

2 Chronicles 32 in the SBT1E

2 Chronicles 32 in the SCHL

2 Chronicles 32 in the SNT

2 Chronicles 32 in the SUSU

2 Chronicles 32 in the SUSU2

2 Chronicles 32 in the SYNO

2 Chronicles 32 in the TBIAOTANT

2 Chronicles 32 in the TBT1E

2 Chronicles 32 in the TBT1E2

2 Chronicles 32 in the TFTIP

2 Chronicles 32 in the TFTU

2 Chronicles 32 in the TGNTATF3T

2 Chronicles 32 in the THAI

2 Chronicles 32 in the TNFD

2 Chronicles 32 in the TNT

2 Chronicles 32 in the TNTIK

2 Chronicles 32 in the TNTIL

2 Chronicles 32 in the TNTIN

2 Chronicles 32 in the TNTIP

2 Chronicles 32 in the TNTIZ

2 Chronicles 32 in the TOMA

2 Chronicles 32 in the TTENT

2 Chronicles 32 in the UBG

2 Chronicles 32 in the UGV

2 Chronicles 32 in the UGV2

2 Chronicles 32 in the UGV3

2 Chronicles 32 in the VBL

2 Chronicles 32 in the VDCC

2 Chronicles 32 in the YALU

2 Chronicles 32 in the YAPE

2 Chronicles 32 in the YBVTP

2 Chronicles 32 in the ZBP