2 Corinthians 11 (BOICB)

1 Ọ ga-adị m mma ma ọ bụrụ na unu ga-anagide m ka m kwuo okwu ndị a dị ka onye nzuzu. Biko nagidenụ m. 2 Ekworo m nwere nʼebe unu nọ bụ ekworo nke Chineke. Ekwere m nkwa iwere unu nye otu di, ya bụ Kraịst, ka m nwe ike chee unu nʼihu ya dịka nwaagbọghọ dị ọcha nke na-amaghị nwoke. 3 Ma ana m atụ egwu, na dịka agwọ jiri aghụghọ ghọgbuo Iiv, ndị nrafu ga-eji aghụghọ duhie unu, mee ka unu kwụsị iji obi dị ọcha na uche ziri ezi jeere Kraịst ozi. 4 Nʼihi na unu gaara anara onye ọzọ bịakwutere unu na-ekwusa Jisọs ọzọ nke na-abụghị nke anyị kwusara, unu gaara anarakwa ike nke mmụọ ọzọ dị iche na-abụghị ike nke Mmụọ Nsọ ahụ unu natara, unu gaara ekwenyekwa na nkuzi ọzọ dị iche, na-abụghị oziọma ahụ nke unu natara. 5 Ma echeghị m na ọ dị ụzọ ọbụla ndị ozi a maara aha ha si kara m mma. 6 Ọ bụrụ na m abụghị onye ọka okwu, abụ m onye ọka mmụta. Anyị akọwarala unu nke a ọtụtụ mgbe nʼụzọ dị iche iche nʼihe niile. 7 Ọ ga-abụ na-emere m ihe ọjọọ mgbe m wedara onwe m ala ka e welie unu elu, nʼihi nʼanaghị m unu ihe ọbụla mgbe m na-ekwusara unu oziọma Chineke? 8 Ọ bụ nzukọ nọ nʼebe ọzọ nyeere m aka mgbe m na-arụ ọrụ nʼetiti unu. Ọ bụ site nʼaka ha ka m ji nata nkwado, dịka ụgwọ ọrụ m, ka m nwee ike inyere unu aka. 9 Ma mgbe m nọ nʼetiti unu abụghị m ibu arọ nye onye ọbụla nʼoge mkpa m. Nʼihi na ụmụnna si Masidonia wetaara m ihe niile na-akpa m mkpa. Ebe ọ bụ na m gbalịrị debe onwe m, ka m ghara ịbụ ibu arọ nye unu nʼụzọ ọbụla nʼoge gara aga, agaghị m abụkwa ibu arọ nye unu nʼoge dị nʼihu. 10 Ebe eziokwu nke Kraịst dị nʼime m, ịnya isi m nke a agaghị akwụsị na mpaghara Akaịa niile. 11 Nʼihi gịnị? Ọ bụ nʼihi na m ahụghị unu nʼanya? Chineke maara na m hụrụ unu nʼanya. 12 Ma aga m aga nʼihu na-arụ ọrụ m na-achọghị ka unu nyere m aka nʼụzọ ọbụla ka m si otu a mee ka ndị ahụ na-akpọ onwe ha ndị ozi ghara ịnya isi kwuokwa na ha na-arụ ọrụ dịka anyị si arụ ọrụ anyị nʼetiti unu. 13 Nʼihi na ndị dị otu a bụ ndị ozi ụgha, ndị ọrụ aghụghọ, ndị na-eme onwe ha ka ha bụ ndị ozi Kraịst. 14 Ma omume ha adịghị eju m anya, nʼihi na ekwensu gbanwere onwe ya dịrị ka mmụọ ozi na-enye ìhè. 15 Ya mere, ọ bụghị ihe iju anya ma ọ bụrụ na ndị na-ejere ya ozi emee onwe ha dịka ndị na-eje ozi ụzọ ezi omume. Ma nʼọgwụgwụ oge, ha ga-anata ụgwọ dịka ọrụ ha si dị. 16 Dịka m kwuru na mbụ, ka onye ọbụla ghara iche na m bụ onye na-enweghị uche. Ọ bụrụkwarị na unu na-eche ụdị echiche a, biko naranụ m dịka onye na-enweghị uche, ka m nwee ike ịnya isi nke nta dịka ndị ọzọ si eme. 17 Ma nʼihe m dabeere na-anya isi, adịghị m ekwu okwu dịka Onyenwe anyị ga-ekwu, maọbụ dịka onye na-enweghị uche. 18 Ebe ọtụtụ mmadụ na-anya isi banyere ihe ha bụ nʼụzọ ụwa si eme. Mụ onwe m ga-anyakwa isi. 19 Unu were obi ụtọ na-anagide ndị na-enweghị uche, ebe unu onwe unu nwere uche. 20 Unu na-anagide ya ma ọ bụrụ na onye ọbụla eme unu ndị ohu ha, maọbụ jiri anya ike nakọrọ unu ihe unu nwere, maọbụ ghọgbuo unu, maọbụ bulie onwe ya elu dịka ha karịrị unu, maọbụ maa unu uraa nʼihu. 21 Nʼezie, ọ bụ ihere m, ịnabata na anyị bụ ndị na-adịghị ike nʼezie nye nke a.Ọ bụrụ na onye ọbụla anwaa anwaa nyaa isi nʼihe ọbụla (ana m ekwu dịka onye nʼenweghị uche), mụ onwe m ga-anyakwa isi. 22 Ha bụ ndị Hibru? Mụ onwe m bụkwa ya. Ha bụ ndị Izrel? Mụ onwe m bụkwa ya. Ha bụ ndị agbụrụ Ebraham? Mụ onwe m bụkwa. 23 Ha bụ ndị na-ejere Kraịst ozi? (Ana m ekwu dịka onye anya na-adịghị mma.) Ma mụ onwe m ejela ozi karịa. Adọgbuola m onwe m nʼọrụ karịa ha niile. Etinyela m nʼụlọ mkpọrọ ọtụtụ mgbe, tinyere ọtụtụ ihe otiti, mgbe mgbe anọọla m nʼọnụ ọnwụ. 24 Ugboro ise ka ndị Juu pịara m ọnụ ụtarị iri anọ e wepụrụ otu. 25 E jirila okporo igwe tie m ugboro atọ. Atụrụ m nkume otu ugboro. Ugboro atọ ka ụgbọ mmiri m nọ nʼime ya kpuru nʼoke osimiri. Anọọla m otu abalị na ụbọchị so ya nʼelu oke osimiri ebe mmiri na-ebugharị m. 26 Ejeela m ọtụtụ ogologo ije nke ọtụtụ ihe ize ndụ dị nʼime ya. Nʼize ndụ site nʼosimiri, ize ndụ site na ndị na-apụnarị mmadụ ihe nʼike, ize ndụ site nʼaka ndị obodo nke aka m. Ọtụtụ mgbe ka m zere ndụ site nʼaka ndị mba ọzọ, nʼime obodo ukwu, nʼọzara ma nʼoke osimiri; na nʼaka ndị kpọrọ onwe ha ụmụnna m, ma ha bụ ndị ụgha. 27 Adọgbuola m onwe m nʼọrụ, anọọla m nʼọnọdụ ịhụju anya na ịmụ anya ọtụtụ abalị. Ọtụtụ mgbe ana m anọ agụụ na-erighị ihe ọbụla, maọbụ ịṅụ ihe ọbụla. Anọọla m ọtụtụ mgbe nʼoge oyi na-ama jijiji nʼihi enweghị uwe dị mma m ji achụ oyi. 28 Ma e wezuga ihe ndị a niile, ana m anọ nʼechiche mgbe niile banyere otu ihe niile si aga nʼime nzukọ. 29 Onye bụ onye ahụ na-adịghị ike nke m na-adịghị eso ya kere oke na-adịghị ike ya? Onye ka e dubara na mmehie nke ọnọdụ ya na-adịghị emetụ m nʼobi? 30 Kama ọ bụrụ na o kwesiri ka m nyaa isi aga m anya isi banyere ihe ndị ahụ na-egosi adịghị ike m. 31 Chineke, na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs, onye e kwesiri ito aha ya ruo mgbe ebighị ebi, maara na ihe ndị a niile m na-ekwu bụ eziokwu. 32 Nʼobodo Damaskọs, onye ọchịchị ala ahụ nke eze obodo ahụ a na-akpọ Aretas họpụtara, ndị na-eche obodo Damaskọs nche ka ha jide m. 33 Ma e tinyere m nʼime nkata, site nʼoghere dị na mgbidi gbara obodo ahụ gburugburu wedata m, m gbanarị ya.

In Other Versions

2 Corinthians 11 in the ANGEFD

2 Corinthians 11 in the ANTPNG2D

2 Corinthians 11 in the AS21

2 Corinthians 11 in the BAGH

2 Corinthians 11 in the BBPNG

2 Corinthians 11 in the BBT1E

2 Corinthians 11 in the BDS

2 Corinthians 11 in the BEV

2 Corinthians 11 in the BHAD

2 Corinthians 11 in the BIB

2 Corinthians 11 in the BLPT

2 Corinthians 11 in the BNT

2 Corinthians 11 in the BNTABOOT

2 Corinthians 11 in the BNTLV

2 Corinthians 11 in the BOATCB

2 Corinthians 11 in the BOATCB2

2 Corinthians 11 in the BOBCV

2 Corinthians 11 in the BOCNT

2 Corinthians 11 in the BOECS

2 Corinthians 11 in the BOGWICC

2 Corinthians 11 in the BOHCB

2 Corinthians 11 in the BOHCV

2 Corinthians 11 in the BOHLNT

2 Corinthians 11 in the BOHNTLTAL

2 Corinthians 11 in the BOILNTAP

2 Corinthians 11 in the BOITCV

2 Corinthians 11 in the BOKCV

2 Corinthians 11 in the BOKCV2

2 Corinthians 11 in the BOKHWOG

2 Corinthians 11 in the BOKSSV

2 Corinthians 11 in the BOLCB

2 Corinthians 11 in the BOLCB2

2 Corinthians 11 in the BOMCV

2 Corinthians 11 in the BONAV

2 Corinthians 11 in the BONCB

2 Corinthians 11 in the BONLT

2 Corinthians 11 in the BONUT2

2 Corinthians 11 in the BOPLNT

2 Corinthians 11 in the BOSCB

2 Corinthians 11 in the BOSNC

2 Corinthians 11 in the BOTLNT

2 Corinthians 11 in the BOVCB

2 Corinthians 11 in the BOYCB

2 Corinthians 11 in the BPBB

2 Corinthians 11 in the BPH

2 Corinthians 11 in the BSB

2 Corinthians 11 in the CCB

2 Corinthians 11 in the CUV

2 Corinthians 11 in the CUVS

2 Corinthians 11 in the DBT

2 Corinthians 11 in the DGDNT

2 Corinthians 11 in the DHNT

2 Corinthians 11 in the DNT

2 Corinthians 11 in the ELBE

2 Corinthians 11 in the EMTV

2 Corinthians 11 in the ESV

2 Corinthians 11 in the FBV

2 Corinthians 11 in the FEB

2 Corinthians 11 in the GGMNT

2 Corinthians 11 in the GNT

2 Corinthians 11 in the HARY

2 Corinthians 11 in the HNT

2 Corinthians 11 in the IRVA

2 Corinthians 11 in the IRVB

2 Corinthians 11 in the IRVG

2 Corinthians 11 in the IRVH

2 Corinthians 11 in the IRVK

2 Corinthians 11 in the IRVM

2 Corinthians 11 in the IRVM2

2 Corinthians 11 in the IRVO

2 Corinthians 11 in the IRVP

2 Corinthians 11 in the IRVT

2 Corinthians 11 in the IRVT2

2 Corinthians 11 in the IRVU

2 Corinthians 11 in the ISVN

2 Corinthians 11 in the JSNT

2 Corinthians 11 in the KAPI

2 Corinthians 11 in the KBT1ETNIK

2 Corinthians 11 in the KBV

2 Corinthians 11 in the KJV

2 Corinthians 11 in the KNFD

2 Corinthians 11 in the LBA

2 Corinthians 11 in the LBLA

2 Corinthians 11 in the LNT

2 Corinthians 11 in the LSV

2 Corinthians 11 in the MAAL

2 Corinthians 11 in the MBV

2 Corinthians 11 in the MBV2

2 Corinthians 11 in the MHNT

2 Corinthians 11 in the MKNFD

2 Corinthians 11 in the MNG

2 Corinthians 11 in the MNT

2 Corinthians 11 in the MNT2

2 Corinthians 11 in the MRS1T

2 Corinthians 11 in the NAA

2 Corinthians 11 in the NASB

2 Corinthians 11 in the NBLA

2 Corinthians 11 in the NBS

2 Corinthians 11 in the NBVTP

2 Corinthians 11 in the NET2

2 Corinthians 11 in the NIV11

2 Corinthians 11 in the NNT

2 Corinthians 11 in the NNT2

2 Corinthians 11 in the NNT3

2 Corinthians 11 in the PDDPT

2 Corinthians 11 in the PFNT

2 Corinthians 11 in the RMNT

2 Corinthians 11 in the SBIAS

2 Corinthians 11 in the SBIBS

2 Corinthians 11 in the SBIBS2

2 Corinthians 11 in the SBICS

2 Corinthians 11 in the SBIDS

2 Corinthians 11 in the SBIGS

2 Corinthians 11 in the SBIHS

2 Corinthians 11 in the SBIIS

2 Corinthians 11 in the SBIIS2

2 Corinthians 11 in the SBIIS3

2 Corinthians 11 in the SBIKS

2 Corinthians 11 in the SBIKS2

2 Corinthians 11 in the SBIMS

2 Corinthians 11 in the SBIOS

2 Corinthians 11 in the SBIPS

2 Corinthians 11 in the SBISS

2 Corinthians 11 in the SBITS

2 Corinthians 11 in the SBITS2

2 Corinthians 11 in the SBITS3

2 Corinthians 11 in the SBITS4

2 Corinthians 11 in the SBIUS

2 Corinthians 11 in the SBIVS

2 Corinthians 11 in the SBT

2 Corinthians 11 in the SBT1E

2 Corinthians 11 in the SCHL

2 Corinthians 11 in the SNT

2 Corinthians 11 in the SUSU

2 Corinthians 11 in the SUSU2

2 Corinthians 11 in the SYNO

2 Corinthians 11 in the TBIAOTANT

2 Corinthians 11 in the TBT1E

2 Corinthians 11 in the TBT1E2

2 Corinthians 11 in the TFTIP

2 Corinthians 11 in the TFTU

2 Corinthians 11 in the TGNTATF3T

2 Corinthians 11 in the THAI

2 Corinthians 11 in the TNFD

2 Corinthians 11 in the TNT

2 Corinthians 11 in the TNTIK

2 Corinthians 11 in the TNTIL

2 Corinthians 11 in the TNTIN

2 Corinthians 11 in the TNTIP

2 Corinthians 11 in the TNTIZ

2 Corinthians 11 in the TOMA

2 Corinthians 11 in the TTENT

2 Corinthians 11 in the UBG

2 Corinthians 11 in the UGV

2 Corinthians 11 in the UGV2

2 Corinthians 11 in the UGV3

2 Corinthians 11 in the VBL

2 Corinthians 11 in the VDCC

2 Corinthians 11 in the YALU

2 Corinthians 11 in the YAPE

2 Corinthians 11 in the YBVTP

2 Corinthians 11 in the ZBP