2 Corinthians 4 (BOICB)
1 Ya mere, ebe anyị natara ije ozi a site nʼebere Chineke, ike adịghị agwụ anyị nʼobi. 2 Anyị ahapụla omume nzuzo niile na-eweta ihere. Anyị ahapụla ụzọ aghụghọ niile, maọbụ iji okwu Chineke na-atụ asị. Kama site nʼikwupụta eziokwu ahụ ka ndị mmadụ were ezi akọnuche ha mata ụdị mmadụ anyị bụ nʼihu Chineke. 3 Ma a sịkwa na oziọma nke anyị na-ekwusa dịka ihe e zoro ezo, ọ bụ ihe e zoro ezo nye ndị ahụ na-ala nʼiyi. 4 Nʼebe ha nọ, chi nke ụwa a ekpuchiela uche ndị na-ekweghị ekwe iji gbochie ha ịhụ ìhè nke oziọma ahụ na-ezipụta ebube Kraịst, onye dị nʼụdị Chineke nʼonwe ya. 5 Nʼihi na ọ bụghị anyị onwe anyị ka anyị na-ekwusa, kama anyị na-ekwusa na Kraịst Jisọs bụ Onyenwe anyị. Ma anyị onwe anyị bụ ụmụodibo unu nʼihi Jisọs. 6 Nʼihi na ọ bụ Chineke ahụ sịrị, ka ìhè si nʼọchịchịrị chawapụta; bụkwa onye mere ka ìhè ya nwuwa nʼime obi anyị. Nke a ka o mere iji wetara anyị ìhè amamihe nke ebube Chineke nʼihu Kraịst. 7 Anyị onwe anyị bụ ndị natara akụ nke dị oke ọnụahịa dị nʼime ite ụrọ, iji gosi na ike kacha elu si nʼaka Chineke, ọ bụghị nʼaka anyị. 8 A na-akpagbu anyị nʼakụkụ niile, ma adịghị emeri anyị. Mgbe ụfọdụ, anyị nọ na mgbagwoju anya ma anyị adịghị ada mba. 9 A na-esogbu anyị, ma adịghị ahapụ naanị anyị; mgbe ụfọdụ, a na-akụtu anyị nʼala ma adịghị ala anyị nʼiyi. 10 Ọtụtụ mgbe, anyị na-ebugharị nʼahụ anyị ọnwụ Jisọs, ka ndụ nke Jisọs nwekwa ike pụta ìhè nʼahụ anyị. 11 Mgbe ọbụla anyị dị ndụ, anyị nọ nʼọnwụ nʼihi Jisọs, ka ndụ Jisọs nwee ike pụta ìhè nʼahụ anyị pụrụ ịnwụ anwụ. 12 Nke a pụtara na ọnwụ na-arụsị ọrụ ike nʼime anyị, ma na ndụ na-arụ ọrụ nʼime unu. 13 Ebe ọ bụ na anyị nwere otu mmụọ nke okwukwe ahụ, dịka e si dee nʼakwụkwọ nsọ, “Ekweere m, ya mere m ji kwuo.” Anyị onwe anyị kwekwara, nʼihi nke a mere anyị ji na-ekwu, 14 ma anyị maara na onye mere ka Onyenwe anyị Jisọs si nʼọnwụ bilie, ga-emekwa ka anyị soro Jisọs si nʼọnwụ bilie, ma kpọbatakwa anyị na unu nʼihu ya. 15 Ihe ndị a niile bụ maka nʼihi unu, ka ọ ga-abụ amara na-abawanye irute ọtụtụ mmadụ aka, ka o nwee ike na-abawanye inye ekele maka otuto nke Chineke. 16 Ọ bụ nke a mere ike adịghị agwụ anyị nʼobi. Ọ bụ ezie na anụ ahụ anyị na-anwụ anwụ, ma a na-agba mmụọ anyị ume kwa ụbọchị. 17 Nwantịntị ahụhụ nke anyị na-ata ugbu a, nke na-adị nwa oge, na-akwadoro anyị otuto ebighị ebi dị ukwuu. 18 Nʼihi na anyị adịghị ele ihe anya nwere ike ịhụ, kama anyị na-ele anya nʼihe ahụ anya na-adịghị ahụ. Nʼihi na ihe ahụ anya na-ahụ na-adị naanị nwa oge, ma ihe ahụ anya na-adịghị ahụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi.
In Other Versions
2 Corinthians 4 in the ANGEFD
2 Corinthians 4 in the ANTPNG2D
2 Corinthians 4 in the AS21
2 Corinthians 4 in the BAGH
2 Corinthians 4 in the BBPNG
2 Corinthians 4 in the BBT1E
2 Corinthians 4 in the BDS
2 Corinthians 4 in the BEV
2 Corinthians 4 in the BHAD
2 Corinthians 4 in the BIB
2 Corinthians 4 in the BLPT
2 Corinthians 4 in the BNT
2 Corinthians 4 in the BNTABOOT
2 Corinthians 4 in the BNTLV
2 Corinthians 4 in the BOATCB
2 Corinthians 4 in the BOATCB2
2 Corinthians 4 in the BOBCV
2 Corinthians 4 in the BOCNT
2 Corinthians 4 in the BOECS
2 Corinthians 4 in the BOGWICC
2 Corinthians 4 in the BOHCB
2 Corinthians 4 in the BOHCV
2 Corinthians 4 in the BOHLNT
2 Corinthians 4 in the BOHNTLTAL
2 Corinthians 4 in the BOILNTAP
2 Corinthians 4 in the BOITCV
2 Corinthians 4 in the BOKCV
2 Corinthians 4 in the BOKCV2
2 Corinthians 4 in the BOKHWOG
2 Corinthians 4 in the BOKSSV
2 Corinthians 4 in the BOLCB
2 Corinthians 4 in the BOLCB2
2 Corinthians 4 in the BOMCV
2 Corinthians 4 in the BONAV
2 Corinthians 4 in the BONCB
2 Corinthians 4 in the BONLT
2 Corinthians 4 in the BONUT2
2 Corinthians 4 in the BOPLNT
2 Corinthians 4 in the BOSCB
2 Corinthians 4 in the BOSNC
2 Corinthians 4 in the BOTLNT
2 Corinthians 4 in the BOVCB
2 Corinthians 4 in the BOYCB
2 Corinthians 4 in the BPBB
2 Corinthians 4 in the BPH
2 Corinthians 4 in the BSB
2 Corinthians 4 in the CCB
2 Corinthians 4 in the CUV
2 Corinthians 4 in the CUVS
2 Corinthians 4 in the DBT
2 Corinthians 4 in the DGDNT
2 Corinthians 4 in the DHNT
2 Corinthians 4 in the DNT
2 Corinthians 4 in the ELBE
2 Corinthians 4 in the EMTV
2 Corinthians 4 in the ESV
2 Corinthians 4 in the FBV
2 Corinthians 4 in the FEB
2 Corinthians 4 in the GGMNT
2 Corinthians 4 in the GNT
2 Corinthians 4 in the HARY
2 Corinthians 4 in the HNT
2 Corinthians 4 in the IRVA
2 Corinthians 4 in the IRVB
2 Corinthians 4 in the IRVG
2 Corinthians 4 in the IRVH
2 Corinthians 4 in the IRVK
2 Corinthians 4 in the IRVM
2 Corinthians 4 in the IRVM2
2 Corinthians 4 in the IRVO
2 Corinthians 4 in the IRVP
2 Corinthians 4 in the IRVT
2 Corinthians 4 in the IRVT2
2 Corinthians 4 in the IRVU
2 Corinthians 4 in the ISVN
2 Corinthians 4 in the JSNT
2 Corinthians 4 in the KAPI
2 Corinthians 4 in the KBT1ETNIK
2 Corinthians 4 in the KBV
2 Corinthians 4 in the KJV
2 Corinthians 4 in the KNFD
2 Corinthians 4 in the LBA
2 Corinthians 4 in the LBLA
2 Corinthians 4 in the LNT
2 Corinthians 4 in the LSV
2 Corinthians 4 in the MAAL
2 Corinthians 4 in the MBV
2 Corinthians 4 in the MBV2
2 Corinthians 4 in the MHNT
2 Corinthians 4 in the MKNFD
2 Corinthians 4 in the MNG
2 Corinthians 4 in the MNT
2 Corinthians 4 in the MNT2
2 Corinthians 4 in the MRS1T
2 Corinthians 4 in the NAA
2 Corinthians 4 in the NASB
2 Corinthians 4 in the NBLA
2 Corinthians 4 in the NBS
2 Corinthians 4 in the NBVTP
2 Corinthians 4 in the NET2
2 Corinthians 4 in the NIV11
2 Corinthians 4 in the NNT
2 Corinthians 4 in the NNT2
2 Corinthians 4 in the NNT3
2 Corinthians 4 in the PDDPT
2 Corinthians 4 in the PFNT
2 Corinthians 4 in the RMNT
2 Corinthians 4 in the SBIAS
2 Corinthians 4 in the SBIBS
2 Corinthians 4 in the SBIBS2
2 Corinthians 4 in the SBICS
2 Corinthians 4 in the SBIDS
2 Corinthians 4 in the SBIGS
2 Corinthians 4 in the SBIHS
2 Corinthians 4 in the SBIIS
2 Corinthians 4 in the SBIIS2
2 Corinthians 4 in the SBIIS3
2 Corinthians 4 in the SBIKS
2 Corinthians 4 in the SBIKS2
2 Corinthians 4 in the SBIMS
2 Corinthians 4 in the SBIOS
2 Corinthians 4 in the SBIPS
2 Corinthians 4 in the SBISS
2 Corinthians 4 in the SBITS
2 Corinthians 4 in the SBITS2
2 Corinthians 4 in the SBITS3
2 Corinthians 4 in the SBITS4
2 Corinthians 4 in the SBIUS
2 Corinthians 4 in the SBIVS
2 Corinthians 4 in the SBT
2 Corinthians 4 in the SBT1E
2 Corinthians 4 in the SCHL
2 Corinthians 4 in the SNT
2 Corinthians 4 in the SUSU
2 Corinthians 4 in the SUSU2
2 Corinthians 4 in the SYNO
2 Corinthians 4 in the TBIAOTANT
2 Corinthians 4 in the TBT1E
2 Corinthians 4 in the TBT1E2
2 Corinthians 4 in the TFTIP
2 Corinthians 4 in the TFTU
2 Corinthians 4 in the TGNTATF3T
2 Corinthians 4 in the THAI
2 Corinthians 4 in the TNFD
2 Corinthians 4 in the TNT
2 Corinthians 4 in the TNTIK
2 Corinthians 4 in the TNTIL
2 Corinthians 4 in the TNTIN
2 Corinthians 4 in the TNTIP
2 Corinthians 4 in the TNTIZ
2 Corinthians 4 in the TOMA
2 Corinthians 4 in the TTENT
2 Corinthians 4 in the UBG
2 Corinthians 4 in the UGV
2 Corinthians 4 in the UGV2
2 Corinthians 4 in the UGV3
2 Corinthians 4 in the VBL
2 Corinthians 4 in the VDCC
2 Corinthians 4 in the YALU
2 Corinthians 4 in the YAPE
2 Corinthians 4 in the YBVTP
2 Corinthians 4 in the ZBP