2 Kings 10 (BOICB)

1 Ugbu a, e nwere ụmụ Ehab ndị ikom ọnụọgụgụ ha dị iri asaa ndị nọ na Sameria, Jehu dere akwụkwọ ozi ziga Sameria, zigara ndịisi obodo Jezril, zigakwara ndị okenye na ndị na-elekọta ụmụ Ehab ndị ahụ. Ọ sịrị, 2 “Ugbu a, mgbe akwụkwọ a rutere unu aka, ebe unu na ụmụ ndị ikom nna unu ukwu nọ, ebe unu nwekwara ụgbọ agha na ịnyịnya, na obodo e wusiri ike na ngwa agha, 3 họpụtanụ onye kachasị inwe ugwu ma kwesikwa nʼime ụmụ ndị ikom nna unu ukwu, mee ka ọ nọkwasị nʼocheeze nna ya. Mgbe ahụ, buo agha chebe ụlọ nna unu ukwu.” 4 Ma ha tụrụ egwu nʼebe ọ dị ukwuu, sị, “Lee, eze abụọ enweghị ike iguzogide ya, anyị onwe anyị ga-esi aṅaa guzogide ya?” 5 Ya mere, onye ọ dị nʼaka ilekọta ezinaụlọ eze, onyeisi obodo, ndị okenye na ndị niile na-elekọta ụmụ Ehab, dere akwụkwọ a zigara Jehu, sị ya, “Jehu, anyị niile bụ ndị ohu gị. Anyị jikeere ime ihe niile i gwara anyị. Anyị agaghị ahọpụta onye ọbụla dịka eze; gị onwe gị mee ihe ọbụla ị chere na ọ bụ ya kachasị mma.” 6 Mgbe ahụ, Jehu degaara ha akwụkwọ nke ugboro abụọ sị ha, “Ọ bụrụ na unu dịnyeere m, ọ bụrụkwa na unu ga-erube isi nye m, chịrịnụ isi ụmụ ndị ikom nna unu ukwu, bịakwute m nʼotu oge a echi na Jezril.”Nʼoge ahụ, ụmụ eze iri ndị ikom asaa nọ nʼaka ndịisi obodo ahụ, ndị na-azụlite ha. 7 Mgbe akwụkwọ ozi ahụ rutere ha, ndị ikom ahụ kpọrọ ụmụ ndị ikom eze dị iri asaa nʼọnụọgụgụ gbuo ha niile, chịrị isi ha tinye na nkata zigara ya Jehu na Jezril. 8 Mgbe onyeozi bịarutere, ọ gwara Jehu sị, “Ha ebutala isi ụmụ ndị ikom eze.”Mgbe ahụ, Jehu nyere iwu sị, “Tụkọbanụ ha ọnụ nʼoke abụọ, nʼọnụ ụzọ e si abata obodo, tutu ruo ụtụtụ.” 9 Nʼụtụtụ ya, Jehu pụrụ, guzoro nʼihu ndị niile gbakọrọ nʼebe ahụ gwa ha okwu sị, “Ndị Izrel, unu bụ ndị ezi omume. Ọ bụ mụ onwe m gbara izu ọjọọ megide nna m ukwu, gbuo ya, ma onye gburu ndị a niile? 10 Matanụ nke ọma na o nweghị okwu ọbụla ONYENWE ANYỊ kwuru megide ezinaụlọ Ehab nke na-agaghị emezu. ONYENWE ANYỊ emeela ihe o kwere nkwa na ọ ga-eme site nʼọnụ ohu ya Ịlaịja.” 11 Emesịa, Jehu gburu ndị ikwu Ehab fọdụrụ nʼobodo Jezril, ha na ndịisi niile, na ndị enyi ya niile, na ndị nchụaja ya niile. Ọ dịkwaghị otu onye ikwu Ehab ọ hapụrụ ndụ. 12 Emesịakwa, Jehu hapụrụ Jezril gaa Sameria. Mgbe ọ na-aga nʼụzọ, ọ bịaruru ebe a na-akpọ Ebe Izuike Ndị ọzụzụ atụrụ. 13 Nʼebe ahụ, o zutere ndị ụmụnna Ahazaya, eze Juda, jụọ sị, “Olee ndị ka unu bụ?”Ha zara, “Anyị bụ ndị ikwu Ahazaya, eze Juda, anyị bịara ka anyị jụọ maka ọdịmma ndị ezinaụlọ eze na nne eze.” 14 O nyere iwu sị, “Jidenụ ha na ndụ.” Ha jidere ha na ndụ, gbukwaa ha niile nʼakụkụ olulu miri nke Bet-Eked. Ọnụọgụgụ ha dị iri anọ na abụọ. O nweghị onye ọbụla ọ hapụrụ ndụ. 15 Mgbe o si nʼebe ahụ pụọ, o zutere Jehonadab nwa Rekab, ka ọ na-abịa izute ya. Jehu kelere ya, sị, “Obi gị, o ziri ezi nwee nkwekọrịta, dịka obi m dị nʼebe ị nọ?”Jehonadab zara sị ya, “E.”Jehu sịrị, “Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, kwe m nʼaka.” Jehonadab kwere ya nʼaka. Jehu nʼonwe ya nyeere ya aka ka ọ rigota nʼụgbọ agha ya. 16 Mgbe ahụ, Jehu sịrị ya, “Ugbu a, soro m bịa lee ụdị ịnụ ọkụ nʼobi m nwere maka ọrụ ONYENWE ANYỊ.” Ha abụọ sooro nʼụgbọ agha Jehu. 17 Mgbe ha bịaruru Sameria, Jehu gburu ndị enyi na ndị ikwu Ehab niile, ndị fọdụrụ site nʼikwu Ehab, o bibiri ha dịka okwu ONYENWE ANYỊ kwuru site nʼọnụ onye amụma Ịlaịja. 18 Emesịa, Jehu kpọkọtara ndị obodo ahụ niile sị ha, “Ehab fere Baal ofufe nke nta, Jehu ga-efe ya ebe ọ dị ukwuu. 19 Ugbu a, kpọkọtaanụ ndị amụma Baal niile, ndị niile na-efe ya, na ndị nchụaja ya niile. Hụnụ na onye ọbụla nʼime ha bịara, nʼihi na a ga-eme oke mmemme ịchụ aja nye Baal. Onye ọbụla e lere anya ya nʼebe ahụ, ma a hụghị ya, agaghị adị ndụ.” Ma Jehu ji aghụghọ nʼihi ka ọ laa ndị a na-efe Baal nʼiyi. 20 Jehu sịrị, “Kpọsaanụ na a ga-enwe oke mkpọkọta dị nsọ nye Baal.” Ya mere, ha kwusara ya. 21 O zipụrụ ozi nye ndị bi nʼakụkụ Izrel niile. Ndị niile na-efe Baal bịazuru. Ọ dịghị onye fọdụrụ nke na-abịaghị. Ha jupụtara nʼụlọnsọ ukwu Baal site nʼotu isi ya ruo nʼisi nke ọzọ. 22 Jehu sịrị onye na-elekọta ụlọ ebe a na-edebe uwe ndị na-efe ofufe na-eyi, “Chịpụta uwe nye ndị niile na-efe Baal.” Ya mere, ọ chịpụtaara ha uwe. 23 Mgbe ahụ, Jehu na Jehonadab nwa Rekab, banyere nʼebe nzukọ Baal. Jehu sịrị ndị nʼefe Baal, “Chọzienụ nke ọma ka unu hụ na o nweghị onye ọbụla na-efe ONYENWE ANYỊ nọ nʼebe a, karịakwa naanị ndị na-efe Baal.” 24 Mgbe ha malitere ịchụ aja na isure ihe nsure ọkụ, Jehu emeelarị ka iri ndị agha asatọ gbaa ụlọ ahụ niile gburugburu. O nyelarị iwu sị, “Ọ bụrụ na unu ekwere ka otu onye si nʼime ụlọ a gbapụ, unu ga-eji ndụ unu kwụghachi ụgwọ onye dị otu ahụ.” 25 Ngwangwa Jehu chụchasịrị aja nsure ọkụ, ọ pụrụ gwa ndị agha ya, na ndịisi ha okwu sị, “Baanụ nʼime ụlọ gbuo ndị niile nọ nʼebe ahụ. Unu ekwela ka otu onye nʼime ha gbapụ.” Ha jiri mma agha gbuo ndị ahụ nọ nʼime ụlọ Baal, tụpụta ozu ha nʼezi. Emesịa, ndị agha Jehu banyere nʼime ime ụlọ ebe ịchụ aja Baal, 26 ha bupụtara ogidi nsọ e ji efe Baal, kpọọ ha ọkụ. 27 Ha kwaturu ogidi nsọ Baal, kwatukwaa ụlọ ịchụ aja ya. Ya mere e megharịrị ya ka ọ bụrụ ebe ọha mmadụ na-aga ogwe ruo taa. 28 Jehu kpochapụrụ ofufe Baal nʼala Izrel niile. 29 Ma otu ọ dị, o siteghị na mmehie Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya. Mmehie nke Jeroboam mere ka Izrel mehie, ya bụ, mmehie nke ife arụsị ụmụ ehi e ji ọlaedo kpụọ, dị na Betel na Dan. 30 ONYENWE ANYỊ gwara Jehu sị, “Nʼihi na i mere nke ọma mezuo ihe niile ziri ezi nʼanya m, nʼebe ezinaụlọ Ehab nọ, nʼusoro ihe niile dị nʼuche m ime, ụmụ ụmụ gị ga-anọkwasị nʼocheeze Izrel, ruo nʼọgbọ nke anọ ha.” 31 Ma Jehu akpachapụghị anya iji obi ya niile debe iwu ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel. O siteghị na mmehie Jeroboam wezuga onwe ya, bụ mmehie ahụ o mere ka Izrel mee. 32 Nʼoge ahụ, ONYENWE ANYỊ malitere ime ka ndị Izrel bido ịdị nta. Hazael eze Aram, buru agha merie ọtụtụ akụkụ Izrel, 33 nke dị nʼọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, na ala niile nke Gilead (nʼoke ala ndị Gad, na nke ndị Ruben, na Manase), site nʼAroea nke dị nʼakụkụ ndagwurugwu Anọn, ruo Gilead na Bashan. 34 Akụkọ gbasara ọchịchị eze Jehu, na ihe niile o mere, na ịkpa ike ya niile, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel? 35 Jehu sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya na Sameria. Nwa ya bụ Jehoahaz nọchiri anya ya dịka eze. 36 Ma ụbọchị niile Jehu bụ eze Izrel nʼime Sameria dị iri afọ abụọ na asatọ.

In Other Versions

2 Kings 10 in the ANGEFD

2 Kings 10 in the ANTPNG2D

2 Kings 10 in the AS21

2 Kings 10 in the BAGH

2 Kings 10 in the BBPNG

2 Kings 10 in the BBT1E

2 Kings 10 in the BDS

2 Kings 10 in the BEV

2 Kings 10 in the BHAD

2 Kings 10 in the BIB

2 Kings 10 in the BLPT

2 Kings 10 in the BNT

2 Kings 10 in the BNTABOOT

2 Kings 10 in the BNTLV

2 Kings 10 in the BOATCB

2 Kings 10 in the BOATCB2

2 Kings 10 in the BOBCV

2 Kings 10 in the BOCNT

2 Kings 10 in the BOECS

2 Kings 10 in the BOGWICC

2 Kings 10 in the BOHCB

2 Kings 10 in the BOHCV

2 Kings 10 in the BOHLNT

2 Kings 10 in the BOHNTLTAL

2 Kings 10 in the BOILNTAP

2 Kings 10 in the BOITCV

2 Kings 10 in the BOKCV

2 Kings 10 in the BOKCV2

2 Kings 10 in the BOKHWOG

2 Kings 10 in the BOKSSV

2 Kings 10 in the BOLCB

2 Kings 10 in the BOLCB2

2 Kings 10 in the BOMCV

2 Kings 10 in the BONAV

2 Kings 10 in the BONCB

2 Kings 10 in the BONLT

2 Kings 10 in the BONUT2

2 Kings 10 in the BOPLNT

2 Kings 10 in the BOSCB

2 Kings 10 in the BOSNC

2 Kings 10 in the BOTLNT

2 Kings 10 in the BOVCB

2 Kings 10 in the BOYCB

2 Kings 10 in the BPBB

2 Kings 10 in the BPH

2 Kings 10 in the BSB

2 Kings 10 in the CCB

2 Kings 10 in the CUV

2 Kings 10 in the CUVS

2 Kings 10 in the DBT

2 Kings 10 in the DGDNT

2 Kings 10 in the DHNT

2 Kings 10 in the DNT

2 Kings 10 in the ELBE

2 Kings 10 in the EMTV

2 Kings 10 in the ESV

2 Kings 10 in the FBV

2 Kings 10 in the FEB

2 Kings 10 in the GGMNT

2 Kings 10 in the GNT

2 Kings 10 in the HARY

2 Kings 10 in the HNT

2 Kings 10 in the IRVA

2 Kings 10 in the IRVB

2 Kings 10 in the IRVG

2 Kings 10 in the IRVH

2 Kings 10 in the IRVK

2 Kings 10 in the IRVM

2 Kings 10 in the IRVM2

2 Kings 10 in the IRVO

2 Kings 10 in the IRVP

2 Kings 10 in the IRVT

2 Kings 10 in the IRVT2

2 Kings 10 in the IRVU

2 Kings 10 in the ISVN

2 Kings 10 in the JSNT

2 Kings 10 in the KAPI

2 Kings 10 in the KBT1ETNIK

2 Kings 10 in the KBV

2 Kings 10 in the KJV

2 Kings 10 in the KNFD

2 Kings 10 in the LBA

2 Kings 10 in the LBLA

2 Kings 10 in the LNT

2 Kings 10 in the LSV

2 Kings 10 in the MAAL

2 Kings 10 in the MBV

2 Kings 10 in the MBV2

2 Kings 10 in the MHNT

2 Kings 10 in the MKNFD

2 Kings 10 in the MNG

2 Kings 10 in the MNT

2 Kings 10 in the MNT2

2 Kings 10 in the MRS1T

2 Kings 10 in the NAA

2 Kings 10 in the NASB

2 Kings 10 in the NBLA

2 Kings 10 in the NBS

2 Kings 10 in the NBVTP

2 Kings 10 in the NET2

2 Kings 10 in the NIV11

2 Kings 10 in the NNT

2 Kings 10 in the NNT2

2 Kings 10 in the NNT3

2 Kings 10 in the PDDPT

2 Kings 10 in the PFNT

2 Kings 10 in the RMNT

2 Kings 10 in the SBIAS

2 Kings 10 in the SBIBS

2 Kings 10 in the SBIBS2

2 Kings 10 in the SBICS

2 Kings 10 in the SBIDS

2 Kings 10 in the SBIGS

2 Kings 10 in the SBIHS

2 Kings 10 in the SBIIS

2 Kings 10 in the SBIIS2

2 Kings 10 in the SBIIS3

2 Kings 10 in the SBIKS

2 Kings 10 in the SBIKS2

2 Kings 10 in the SBIMS

2 Kings 10 in the SBIOS

2 Kings 10 in the SBIPS

2 Kings 10 in the SBISS

2 Kings 10 in the SBITS

2 Kings 10 in the SBITS2

2 Kings 10 in the SBITS3

2 Kings 10 in the SBITS4

2 Kings 10 in the SBIUS

2 Kings 10 in the SBIVS

2 Kings 10 in the SBT

2 Kings 10 in the SBT1E

2 Kings 10 in the SCHL

2 Kings 10 in the SNT

2 Kings 10 in the SUSU

2 Kings 10 in the SUSU2

2 Kings 10 in the SYNO

2 Kings 10 in the TBIAOTANT

2 Kings 10 in the TBT1E

2 Kings 10 in the TBT1E2

2 Kings 10 in the TFTIP

2 Kings 10 in the TFTU

2 Kings 10 in the TGNTATF3T

2 Kings 10 in the THAI

2 Kings 10 in the TNFD

2 Kings 10 in the TNT

2 Kings 10 in the TNTIK

2 Kings 10 in the TNTIL

2 Kings 10 in the TNTIN

2 Kings 10 in the TNTIP

2 Kings 10 in the TNTIZ

2 Kings 10 in the TOMA

2 Kings 10 in the TTENT

2 Kings 10 in the UBG

2 Kings 10 in the UGV

2 Kings 10 in the UGV2

2 Kings 10 in the UGV3

2 Kings 10 in the VBL

2 Kings 10 in the VDCC

2 Kings 10 in the YALU

2 Kings 10 in the YAPE

2 Kings 10 in the YBVTP

2 Kings 10 in the ZBP