2 Kings 11 (BOICB)

1 Mgbe Atalaya nne Ahazaya hụrụ na nwa ya nwoke anwụọla, ọ gara nʼihu bido igbu ndị niile a mụrụ nʼụlọ eze. 2 Ma Jehosheba, bụ nwa nwanyị eze Jehoram, ma bụrụkwa nwanne nwanyị Ahazaya, kuuru Joash nwa Ahazaya, zopu ya site nʼetiti ụmụ ndị ikom eze, bụ ndị a chọrọ igbu egbu. O zoro ya na nwanyị na-elekọta ya anya nʼime ụlọ ndina, ka Atalaya hapụ ịhụ ya, nke a mere na-egbughị ya. 3 Ya na nwanyị na-elekọta ya anya nọgidere na nzuzo nʼime ụlọnsọ ONYENWE ANYỊ, afọ isii, oge ahụ niile Atalaya na-achị nʼala ahụ. 4 Nʼafọ nke asaa, Jehoiada, ziri ozi kpọọ ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, ndị Karị na ndị nche oku, mee ka ha bịakwute ya nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ. Ya na ha gbara ndụ, o mekwara ka ha ṅụọ iyi nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ. Mgbe ahụ, o gosiri ha nwa eze. 5 O nyere ha iwu, sị, “Nke a bụ ihe unu ga-eme, unu bụ ndị nọ nʼotu atọ ga-abịa ọrụ nʼụbọchị izuike, nke otu ụzọ nʼime unu na-eche ụlọeze nche, 6 otu ụzọ nʼime ụzọ atọ ga-anọ nʼọnụ ụzọ Sua, ebe otu ụzọ ga-anọ nʼọnụ ụzọ ama, nʼazụ ndị na-eche nche nʼụlọnsọ ukwu Chineke. 7 Ma unu bụ otu abụọ ndị kwesiri ịga ezumike site nʼọrụ unu nʼụbọchị izuike, ga-eguzo na nche nʼụlọnsọ ukwu nʼihi eze. 8 Doonụ onwe unu gburugburu eze, onye ọbụla nʼime unu jide ihe agha nʼaka ya. Onye ọbụla nke na-abịa nso ahịrị unu, ka e gbuo ya. Nọrọnụ eze nso ebe ọbụla ọ gara, mgbe ọ na-apụ nʼezi na mgbe ọ na-aba nʼime.” 9 Ndị ọchịagha ndị a na-achị narị ndị agha mere dịka Jehoiada, onye nchụaja nyere nʼiwu. Onye ọbụla kpọrọ ndị ikom ya, ma ndị na-emechi ọrụ, ma ndị na-abata ịrụ ọrụ nʼụbọchị izuike, bịakwute Jehoiada, bụ onye nchụaja. 10 O nyere ndị ọchịagha ahụ ùbe na ọta niile, ndị bụrịị nke eze Devid, ndị dị nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ. 11 Onye ọbụla na ndị nche ahụ ji ngwa agha nʼaka ya, ha guzoro onwe ha, nọdụ eze gburugburu, na nso ebe ịchụ aja na ụlọnsọ ukwu, site nʼakụkụ ndịda ruo nʼakụkụ ugwu nke ụlọnsọ ukwu ahụ. 12 Jehoiada kpọpụtara nwa eze, kpube ya okpueze nʼisi, o nyere ya otu akwụkwọ nke ihe ọgbụgba ndụ ahụ, chie ya eze. Ha tekwara ya mmanụ ịbụ eze. Ndị niile nọ nʼebe ahụ kụrụ aka, tie mkpu, sị, “Ka eze dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi!” 13 Mgbe Atalaya nụrụ mkpọtụ nke ndị nche na ndị mmadụ na-eme, ọ gakwuru ndị ahụ nọ nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ. 14 O lepụrụ anya, ma lee eze, ka o guzo nʼakụkụ ogidi, dịka omenaala mmemme ịchị eze si dị. Ndịisi na ndị na-afụ opi nọ nʼakụkụ eze. Ndị niile nke ala ahụ nọkwa na-aṅụrị ọṅụ na-afụ opi. Atalaya dọwara uwe ya, sị, “Nnupu isi megide eze! Nke a bụ nnupu isi megide ọchịchị!” 15 Jehoiada, bụ onye nchụaja nyere ndịisi ọchịagha na-achị narị ndị agha, bụ ndị na-elekọta usuu ndị agha, iwu sị ha, “Sitenụ nʼebe ahụ kpọpụta ya nʼetiti ahịrị unu, onye ọbụla nke gbasoro ya, werenụ mma agha gbuo onye ahụ.” Nʼihi na onye nchụaja sịrị, “Agaghị egbu ya nʼime ụlọnsọ ONYENWE ANYỊ.” 16 Ya mere, ha jidere ya, mgbe o rutere nʼụzọ ebe ịnyịnya si abata nʼogige ụlọeze, ebe ahụ ka ha nọ gbuo ya. 17 Jehoiada mere ka ọgbụgba ndụ dị nʼetiti ONYENWE ANYỊ na eze, na ndị mmadụ, na ha ga-abụ ndị nke ONYENWE ANYỊ. O mekwara ka ọgbụgba ndụ dịrị nʼetiti eze na ndị ahụ. 18 Ndị niile nke ala ahụ gara nʼụlọ nchụaja Baal kwatuo ya. Ha tidasịrị ebe nchụaja na arụsị niile dị nʼebe ahụ mee ka ọ darisịa, gbukwaa Matan onye nchụaja Baal nʼihu ebe ịchụ aja ahụ.Mgbe ahụ, Jehoiada onye nchụaja, debekwara ndị nche ka ha lekọta ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ. 19 Ọ kpọọrọ ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, ha na ndị Karị, na ndị nche, ha na ndị ala ahụ niile, ha niile dupụtara eze site nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ site nʼọnụ ụzọ ndị nche banye nʼụlọeze. Eze were ọnọdụ ya nʼelu ocheeze. 20 Ndị ala ahụ niile ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu, obodo ahụ dakwara jụụ, nʼihi na e ji mma agha gbuo Atalaya nʼụlọeze. 21 Joash gbara afọ asaa mgbe ọ malitere ịbụ eze.

In Other Versions

2 Kings 11 in the ANGEFD

2 Kings 11 in the ANTPNG2D

2 Kings 11 in the AS21

2 Kings 11 in the BAGH

2 Kings 11 in the BBPNG

2 Kings 11 in the BBT1E

2 Kings 11 in the BDS

2 Kings 11 in the BEV

2 Kings 11 in the BHAD

2 Kings 11 in the BIB

2 Kings 11 in the BLPT

2 Kings 11 in the BNT

2 Kings 11 in the BNTABOOT

2 Kings 11 in the BNTLV

2 Kings 11 in the BOATCB

2 Kings 11 in the BOATCB2

2 Kings 11 in the BOBCV

2 Kings 11 in the BOCNT

2 Kings 11 in the BOECS

2 Kings 11 in the BOGWICC

2 Kings 11 in the BOHCB

2 Kings 11 in the BOHCV

2 Kings 11 in the BOHLNT

2 Kings 11 in the BOHNTLTAL

2 Kings 11 in the BOILNTAP

2 Kings 11 in the BOITCV

2 Kings 11 in the BOKCV

2 Kings 11 in the BOKCV2

2 Kings 11 in the BOKHWOG

2 Kings 11 in the BOKSSV

2 Kings 11 in the BOLCB

2 Kings 11 in the BOLCB2

2 Kings 11 in the BOMCV

2 Kings 11 in the BONAV

2 Kings 11 in the BONCB

2 Kings 11 in the BONLT

2 Kings 11 in the BONUT2

2 Kings 11 in the BOPLNT

2 Kings 11 in the BOSCB

2 Kings 11 in the BOSNC

2 Kings 11 in the BOTLNT

2 Kings 11 in the BOVCB

2 Kings 11 in the BOYCB

2 Kings 11 in the BPBB

2 Kings 11 in the BPH

2 Kings 11 in the BSB

2 Kings 11 in the CCB

2 Kings 11 in the CUV

2 Kings 11 in the CUVS

2 Kings 11 in the DBT

2 Kings 11 in the DGDNT

2 Kings 11 in the DHNT

2 Kings 11 in the DNT

2 Kings 11 in the ELBE

2 Kings 11 in the EMTV

2 Kings 11 in the ESV

2 Kings 11 in the FBV

2 Kings 11 in the FEB

2 Kings 11 in the GGMNT

2 Kings 11 in the GNT

2 Kings 11 in the HARY

2 Kings 11 in the HNT

2 Kings 11 in the IRVA

2 Kings 11 in the IRVB

2 Kings 11 in the IRVG

2 Kings 11 in the IRVH

2 Kings 11 in the IRVK

2 Kings 11 in the IRVM

2 Kings 11 in the IRVM2

2 Kings 11 in the IRVO

2 Kings 11 in the IRVP

2 Kings 11 in the IRVT

2 Kings 11 in the IRVT2

2 Kings 11 in the IRVU

2 Kings 11 in the ISVN

2 Kings 11 in the JSNT

2 Kings 11 in the KAPI

2 Kings 11 in the KBT1ETNIK

2 Kings 11 in the KBV

2 Kings 11 in the KJV

2 Kings 11 in the KNFD

2 Kings 11 in the LBA

2 Kings 11 in the LBLA

2 Kings 11 in the LNT

2 Kings 11 in the LSV

2 Kings 11 in the MAAL

2 Kings 11 in the MBV

2 Kings 11 in the MBV2

2 Kings 11 in the MHNT

2 Kings 11 in the MKNFD

2 Kings 11 in the MNG

2 Kings 11 in the MNT

2 Kings 11 in the MNT2

2 Kings 11 in the MRS1T

2 Kings 11 in the NAA

2 Kings 11 in the NASB

2 Kings 11 in the NBLA

2 Kings 11 in the NBS

2 Kings 11 in the NBVTP

2 Kings 11 in the NET2

2 Kings 11 in the NIV11

2 Kings 11 in the NNT

2 Kings 11 in the NNT2

2 Kings 11 in the NNT3

2 Kings 11 in the PDDPT

2 Kings 11 in the PFNT

2 Kings 11 in the RMNT

2 Kings 11 in the SBIAS

2 Kings 11 in the SBIBS

2 Kings 11 in the SBIBS2

2 Kings 11 in the SBICS

2 Kings 11 in the SBIDS

2 Kings 11 in the SBIGS

2 Kings 11 in the SBIHS

2 Kings 11 in the SBIIS

2 Kings 11 in the SBIIS2

2 Kings 11 in the SBIIS3

2 Kings 11 in the SBIKS

2 Kings 11 in the SBIKS2

2 Kings 11 in the SBIMS

2 Kings 11 in the SBIOS

2 Kings 11 in the SBIPS

2 Kings 11 in the SBISS

2 Kings 11 in the SBITS

2 Kings 11 in the SBITS2

2 Kings 11 in the SBITS3

2 Kings 11 in the SBITS4

2 Kings 11 in the SBIUS

2 Kings 11 in the SBIVS

2 Kings 11 in the SBT

2 Kings 11 in the SBT1E

2 Kings 11 in the SCHL

2 Kings 11 in the SNT

2 Kings 11 in the SUSU

2 Kings 11 in the SUSU2

2 Kings 11 in the SYNO

2 Kings 11 in the TBIAOTANT

2 Kings 11 in the TBT1E

2 Kings 11 in the TBT1E2

2 Kings 11 in the TFTIP

2 Kings 11 in the TFTU

2 Kings 11 in the TGNTATF3T

2 Kings 11 in the THAI

2 Kings 11 in the TNFD

2 Kings 11 in the TNT

2 Kings 11 in the TNTIK

2 Kings 11 in the TNTIL

2 Kings 11 in the TNTIN

2 Kings 11 in the TNTIP

2 Kings 11 in the TNTIZ

2 Kings 11 in the TOMA

2 Kings 11 in the TTENT

2 Kings 11 in the UBG

2 Kings 11 in the UGV

2 Kings 11 in the UGV2

2 Kings 11 in the UGV3

2 Kings 11 in the VBL

2 Kings 11 in the VDCC

2 Kings 11 in the YALU

2 Kings 11 in the YAPE

2 Kings 11 in the YBVTP

2 Kings 11 in the ZBP