2 Kings 21 (BOICB)

1 Manase gbara afọ iri na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị iri afọ ise na ise na Jerusalem. Aha nne ya bụ Hefziba. 2 O mere ihe dị njọ nʼanya ONYENWE ANYỊ, site nʼịgbaso ihe arụ niile nke ndị mba ọzọ bi nʼala ahụ na mbụ mere, bụ ndị ONYENWE ANYỊ chụpụrụ nʼihu ndị Izrel. 3 O wugharịrị ebe dị elu niile nke nna ya Hezekaya lara nʼiyi. O wukwara ebe ịchụ aja dị iche iche nye Baal, pịakwa ogidi Ashera, dịka Ehab eze Izrel mere. Ọ kpọrọ isiala nye usuu ihe niile nke dị na mbara eluigwe, feekwa ha ofufe. 4 O wuru ebe ịchụ aja dị iche iche, nʼime ụlọnsọ ONYENWE ANYỊ, nke ONYENWE ANYỊ, kwuru okwu banyere ya sị, “Ọ bụ na Jerusalem ka m ga-etinye Aha m.” 5 O wuru ebe ịchụ aja nye usuu ihe niile dị na mbara eluigwe, nʼogige abụọ nke nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ. 6 O jikwa nwa ya nwoke chụọ aja nʼime ọkụ, ọ gbara aja, chọọ ọsịsa nʼaka ndị mgbaasị, jụta ase nʼaka ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, ya na ndị dibịa afa mekọkwara ihe. O mere ihe dị njọ nʼebe ọ dị ukwuu nʼanya ONYENWE ANYỊ, si otu a kpasuo ya iwe. 7 O were chi Ashera a pịrị apị, bụ nke o mere, debe nʼime ụlọnsọ ahụ, nke ONYENWE ANYỊ gwara Devid na nwa ya Solomọn okwu, sị, “Nʼụlọnsọ a na nʼime Jerusalem, nke mụ onwe m họpụtara site nʼebo niile nke Izrel, ka m ga-akpọkwasị Aha m ruo mgbe ebighị ebi. 8 Ma agaghị emekwa ka ụkwụ ndị Izrel wagharịa ọzọ site nʼala ahụ nke m nyere ndị nna nna ha, naanị ma ọ bụrụ na ha elezie anya debe ihe niile m nyere ha nʼiwu ma debekwa iwu niile nke ohu m bụ Mosis nyere ha.” 9 Ma ha egeghị ntị, Manase duhiere ha, mee ka ha mee ihe dị njọ karịa nke ndị mba niile ndị ONYENWE ANYỊ lara nʼiyi site nʼihu ndị Izrel. 10 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ kwuru okwu site nʼọnụ ndị amụma ya, sị, 11 “Nʼihi na Manase, eze Juda emeela ihe arụ ndị a, o meela ihe dị njọ karịa nke ndị Amọrait, bụ ndị bụ ya ụzọ, o werela arụsị ya duba Juda nʼime mmehie. 12 Ya mere, nke a bụ ihe ONYENWE ANYỊ, bụ Chineke nke Izrel, sịrị: Lee, ana m aga iweta mbibi dị ukwuu nke ga-adakwasị Jerusalem na Juda, nke ntị ọbụla nụrụ ya ga-azụ wuruwuru. 13 Aga m esetipụ eriri ịtụ ọtụtụ nke m ji megide Sameria na ihe ịtụ mgbidi nke m ji megide ụlọ Ehab, nʼelu Jerusalem. Aga m ehichapụ Jerusalem dịka mmadụ si ehichapụ efere, hichaa ya ihu na azụ ma kpuo ya ihu nʼala. 14 Aga m agbakụtakwa ndị fọdụrụ nʼihe nketa m azụ, were ha nyefee nʼaka ndị iro ha. Ha ga-aghọ ihe anaara nʼike, ghọọkwa ihe nkwata nʼagha nye ndị iro ha niile, 15 nʼihi na ha emeela ihe dị njọ nʼanya m, kpasukwaa m iwe, site nʼụbọchị nna nna ha si Ijipt pụta ọbụladị ruo taa.” 16 Nke ka nke, Manase gbukwara ọtụtụ ndị aka ha dị ọcha, ruo na ọ wụsaara ọbara ha site nʼotu akụkụ Jerusalem ruo nʼakụkụ nke ọzọ ya, nke a agụnyeghị mmehie ahụ nke o dubara ndị Juda ime, nke mere ka ha mee ihe dị njọ nʼanya ONYENWE ANYỊ. 17 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Manase na ihe niile o mere, tinyere mmehie niile nke o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda? 18 Manase soro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼime ubi a gbara ogige nʼụlọeze ya, bụ ubi Ụza a gbara ogige. Amọn nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 19 Amọn gbara iri afọ abụọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị afọ abụọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Meshulemet, ada Haruz onye Jotba. 20 O mere ihe dị njọ nʼanya ONYENWE ANYỊ dịka nna ya Manase mere. 21 Ọ gbasoro ụzọ ahụ niile dị iche nke nna ya gbasoro. O fere arụsị niile nke nna ya fere, kpọọkwa isiala nye ha. 22 Ọ jụrụ iso ONYENWE ANYỊ, bụ Chineke nna nna ya ha, jụkwa ibi ndụ irube isi nye ya. 23 Ndị na-ejere Amọn ozi gbara izu megide ya, ha gburu eze nʼime ụlọeze ya. 24 Mgbe ahụ, ndị ala ahụ gburu ndị niile ahụ gbara izu megide eze Amọn. Ha mere Josaya nwa ya nwoke eze nʼọnọdụ ya. 25 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Amọn na ihe ndị o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda? 26 E liri ya nʼili nke aka ya, dị nʼogige Ụza. Josaya nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

In Other Versions

2 Kings 21 in the ANGEFD

2 Kings 21 in the ANTPNG2D

2 Kings 21 in the AS21

2 Kings 21 in the BAGH

2 Kings 21 in the BBPNG

2 Kings 21 in the BBT1E

2 Kings 21 in the BDS

2 Kings 21 in the BEV

2 Kings 21 in the BHAD

2 Kings 21 in the BIB

2 Kings 21 in the BLPT

2 Kings 21 in the BNT

2 Kings 21 in the BNTABOOT

2 Kings 21 in the BNTLV

2 Kings 21 in the BOATCB

2 Kings 21 in the BOATCB2

2 Kings 21 in the BOBCV

2 Kings 21 in the BOCNT

2 Kings 21 in the BOECS

2 Kings 21 in the BOGWICC

2 Kings 21 in the BOHCB

2 Kings 21 in the BOHCV

2 Kings 21 in the BOHLNT

2 Kings 21 in the BOHNTLTAL

2 Kings 21 in the BOILNTAP

2 Kings 21 in the BOITCV

2 Kings 21 in the BOKCV

2 Kings 21 in the BOKCV2

2 Kings 21 in the BOKHWOG

2 Kings 21 in the BOKSSV

2 Kings 21 in the BOLCB

2 Kings 21 in the BOLCB2

2 Kings 21 in the BOMCV

2 Kings 21 in the BONAV

2 Kings 21 in the BONCB

2 Kings 21 in the BONLT

2 Kings 21 in the BONUT2

2 Kings 21 in the BOPLNT

2 Kings 21 in the BOSCB

2 Kings 21 in the BOSNC

2 Kings 21 in the BOTLNT

2 Kings 21 in the BOVCB

2 Kings 21 in the BOYCB

2 Kings 21 in the BPBB

2 Kings 21 in the BPH

2 Kings 21 in the BSB

2 Kings 21 in the CCB

2 Kings 21 in the CUV

2 Kings 21 in the CUVS

2 Kings 21 in the DBT

2 Kings 21 in the DGDNT

2 Kings 21 in the DHNT

2 Kings 21 in the DNT

2 Kings 21 in the ELBE

2 Kings 21 in the EMTV

2 Kings 21 in the ESV

2 Kings 21 in the FBV

2 Kings 21 in the FEB

2 Kings 21 in the GGMNT

2 Kings 21 in the GNT

2 Kings 21 in the HARY

2 Kings 21 in the HNT

2 Kings 21 in the IRVA

2 Kings 21 in the IRVB

2 Kings 21 in the IRVG

2 Kings 21 in the IRVH

2 Kings 21 in the IRVK

2 Kings 21 in the IRVM

2 Kings 21 in the IRVM2

2 Kings 21 in the IRVO

2 Kings 21 in the IRVP

2 Kings 21 in the IRVT

2 Kings 21 in the IRVT2

2 Kings 21 in the IRVU

2 Kings 21 in the ISVN

2 Kings 21 in the JSNT

2 Kings 21 in the KAPI

2 Kings 21 in the KBT1ETNIK

2 Kings 21 in the KBV

2 Kings 21 in the KJV

2 Kings 21 in the KNFD

2 Kings 21 in the LBA

2 Kings 21 in the LBLA

2 Kings 21 in the LNT

2 Kings 21 in the LSV

2 Kings 21 in the MAAL

2 Kings 21 in the MBV

2 Kings 21 in the MBV2

2 Kings 21 in the MHNT

2 Kings 21 in the MKNFD

2 Kings 21 in the MNG

2 Kings 21 in the MNT

2 Kings 21 in the MNT2

2 Kings 21 in the MRS1T

2 Kings 21 in the NAA

2 Kings 21 in the NASB

2 Kings 21 in the NBLA

2 Kings 21 in the NBS

2 Kings 21 in the NBVTP

2 Kings 21 in the NET2

2 Kings 21 in the NIV11

2 Kings 21 in the NNT

2 Kings 21 in the NNT2

2 Kings 21 in the NNT3

2 Kings 21 in the PDDPT

2 Kings 21 in the PFNT

2 Kings 21 in the RMNT

2 Kings 21 in the SBIAS

2 Kings 21 in the SBIBS

2 Kings 21 in the SBIBS2

2 Kings 21 in the SBICS

2 Kings 21 in the SBIDS

2 Kings 21 in the SBIGS

2 Kings 21 in the SBIHS

2 Kings 21 in the SBIIS

2 Kings 21 in the SBIIS2

2 Kings 21 in the SBIIS3

2 Kings 21 in the SBIKS

2 Kings 21 in the SBIKS2

2 Kings 21 in the SBIMS

2 Kings 21 in the SBIOS

2 Kings 21 in the SBIPS

2 Kings 21 in the SBISS

2 Kings 21 in the SBITS

2 Kings 21 in the SBITS2

2 Kings 21 in the SBITS3

2 Kings 21 in the SBITS4

2 Kings 21 in the SBIUS

2 Kings 21 in the SBIVS

2 Kings 21 in the SBT

2 Kings 21 in the SBT1E

2 Kings 21 in the SCHL

2 Kings 21 in the SNT

2 Kings 21 in the SUSU

2 Kings 21 in the SUSU2

2 Kings 21 in the SYNO

2 Kings 21 in the TBIAOTANT

2 Kings 21 in the TBT1E

2 Kings 21 in the TBT1E2

2 Kings 21 in the TFTIP

2 Kings 21 in the TFTU

2 Kings 21 in the TGNTATF3T

2 Kings 21 in the THAI

2 Kings 21 in the TNFD

2 Kings 21 in the TNT

2 Kings 21 in the TNTIK

2 Kings 21 in the TNTIL

2 Kings 21 in the TNTIN

2 Kings 21 in the TNTIP

2 Kings 21 in the TNTIZ

2 Kings 21 in the TOMA

2 Kings 21 in the TTENT

2 Kings 21 in the UBG

2 Kings 21 in the UGV

2 Kings 21 in the UGV2

2 Kings 21 in the UGV3

2 Kings 21 in the VBL

2 Kings 21 in the VDCC

2 Kings 21 in the YALU

2 Kings 21 in the YAPE

2 Kings 21 in the YBVTP

2 Kings 21 in the ZBP