2 Kings 23 (BOICB)

1 Mgbe ahụ, eze zigara ozi kpọkọta ndị okenye Juda na Jerusalem. 2 Ọ gara nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ, ya na ndị ikom Juda niile, ndị niile bi na Jerusalem, na ndị nchụaja, na ndị amụma niile, na ndị mmadụ niile, site nʼonye nta ruo na onye ukwu. Ọ gụpụtara na ntị onye ọbụla okwu niile si nʼakwụkwọ ọgbụgba ndụ ahụ, bụ nke achọtara nʼime ụlọnsọ ONYENWE ANYỊ. 3 Eze guzoro nʼakụkụ ogidi, kwee nkwa nʼihu ONYENWE ANYỊ, ịgbaso ONYENWE ANYỊ, na iji obi ya niile, na mkpụrụobi ya niile, debe ihe niile o nyere nʼiwu, nʼihe ama ya niile na ụkpụrụ ya niile. O si otu a mee ka okwu niile nke ọgbụgba ndụ ahụ e dere nʼakwụkwọ guzosie ike. Mgbe ahụ, ndị mmadụ niile kwekwara nkwa idebe ọgbụgba ndụ ahụ. 4 Eze nyere Hilkaya onyeisi nchụaja na ndị nchụaja na-esote nʼọkwa, na ndị na-eche ọnụ ụzọ mbata, iwu ka ha site nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ kwapụtasịa ngwongwo niile e mere nye Baal, na Ashera, na usuu ihe niile nke mbara eluigwe. O sunyere ha niile ọkụ nʼazụ Jerusalem, nʼọhịa dị na Ndagwurugwu Kidrọn, buru ntụ ha bulaa Betel. 5 Ọ chụdara ndị nchụaja arụsị ndị ahụ niile, bụ ndị eze Juda họpụtara isure ihe na-esi isi ụtọ nʼelu ebe dị elu nke obodo Juda nakwa ebe dị ọkụ. Nʼihi na ndị nchụaja ndị a achụọla aja, surekwaa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼebe ịchụ aja dị nʼelu ugwu niile dị nʼobodo dị iche iche na Juda, nakwa ndị dị gburugburu Jerusalem. Ha bụ ndị surere ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Baal, na anyanwụ, ọnwa na kpakpando, nyekwa usuu niile nke mbara eluigwe. 6 O sikwa nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ bupụ ogidi chi Ashera, wezuga ya nʼazụ Jerusalem, na Ndagwurugwu Kidrọn. Ebe ahụ ka ọ nọ suo ya ọkụ, supịa ya ka ọ ghọọ ntụ, fesaa ya nʼebe a na-eli ndị mmadụ efu. 7 Ọ kwadakwara ụlọ obibi ụmụ ndị ikom na-agba akwụna dị nọ nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ. Nʼebe ndị inyom na-anọ na-akpara Ashera akwa. 8 O mere ka ndị nchụaja niile site nʼobodo Juda niile bịa, o merụkwara ebe ịchụ aja niile nke dị elu, site na Geba ruo Bịasheba, ebe ndị nchụaja ndị a nọrọ suree ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Ọ kwatụrụ ọnụ ụzọ ama nke dị nʼebe ọnụ ụzọ ama Joshua, onye bụ gọvanọ obodo, nke dị nʼakụkụ aka ekpe nke ọnụ ụzọ ama obodo. 9 Ma e kweghị ka ndị nchụaja ahụ jee ozi nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ dị na Jerusalem, ma o nyere ha ike iso ndị nchụaja ndị ọzọ rie achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee. 10 Josaya merụrụ Tofet, laa ya nʼiyi. Tofet bụ ebe ịchụ aja dị na Ndagwurugwu nke Ben Hinom. O mere nke a igbochi mmadụ ọbụla iji nwa ya nwoke, maọbụ nwa ya nwanyị chụọrọ chi Molek aja nsure ọkụ. 11 O sitere nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ wepụ ịnyịnya ndị ahụ ndị eze Juda doro nsọ nye anyanwụ. Ịnyịnya ndị a dị nʼogige ụlọnsọ ONYENWE ANYỊ nʼebe dị nso nʼụlọ onyeozi aha ya bụ Netan-Melek. Josaya kpọrọ ụgbọ agha ndị a niile e doro nsọ nye anyanwụ ọkụ. 12 Josaya kwadara ebe ịchụ aja niile nke ndị eze Juda wukwasịrị nʼelu ụlọeze, nʼelu elu ụlọ Ehaz. Ọ kwadakwara ebe ịchụ aja niile nke Manase wuru nʼime ogige abụọ nke ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ, kporo ha kpofuo nʼime Ndagwurugwu Kidrọn. 13 Eze merụkwara ebe ịchụ aja niile dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ obodo Jerusalem nʼakụkụ ndịda nke Ugwu Mbibi, nke Solomọn eze Izrel wuru nye chi Ashtọret, ihe arụ ndị Saịdọn, na chi Kemosh, ihe arụ ndị Moab, na chi Molek, ihe arụ ụmụ Amọn. 14 Josaya kwadakwara ogidi nkume niile, gbutuo ihe arụsị Ashera niile, werekwa ọkpụkpụ ndị mmadụ wụsa nʼelu ala ahụ niile. 15 Josaya kwadakwara ogidi niile dị na Betel, nke Jeroboam nwa Nebat wuru mgbe o dubara ndị Izrel na mmehie. Ọ kwadara ebe ịchụ aja dị nʼebe ahụ, kụjisie nkume e doro nʼebe ahụ, gwerie ha dịka ntụ. Ọ kpọkwara arụsị Ashera ọkụ. 16 Josaya legharịkwara anya gburugburu hụ ọtụtụ ili dị nʼelu ugwu. O ziri ndị ohu ya ka ha gaa chịpụtasịa ọkpụkpụ dị nʼili ahụ niile, kpọọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja imerụ ya, dịka okwu ONYENWE ANYỊ si dị, nke onye nke Chineke kwupụtara mgbe o buru amụma banyere ihe ndị a. 17 Josaya jụrụ ndị guzo nʼebe ahụ ajụjụ sị, “Ọ bụ ili onye bụ nke a?”Ndị ikom obodo ahụ zara sị, “Ọ bụ ili onye nke Chineke ahụ si Juda bịa buo amụma megide ebe ịchụ aja Betel. O buru amụma na ihe ndị a ị na-eme ebe ịchụ aja a ga-emezu.” 18 Mgbe ahụ, Josaya zara sị ha, “Hapụnụ ya ka o guzoro onwe ya. Ka nwoke ọbụla gharakwa ịchịpụta ọkpụkpụ ya.” Ha hapụrụ ọkpụkpụ ya, hapụkwa ọkpụkpụ onye amụma ahụ si Sameria bịa. 19 Dịka o mere na Betel, otu a ka Josaya wepụrụ ma merụkwaa ebe ịchụ aja niile dị nʼebe niile dị elu nke ndị eze Izrel wuru nʼobodo niile nke Sameria, bụ ebe ịchụ aja kpasuru ONYENWE ANYỊ iwe. 20 O gburu ndị nchụaja chi ndị a niile nʼelu ebe ịchụ aja ha, suo ọkpụkpụ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja ha. Mgbe o mesịrị ihe ndị a, ọ laghachiri na Jerusalem. 21 Eze nyere ndị Juda niile iwu sị ha, “Meerenụ ONYENWE ANYỊ Chineke unu Mmemme Ngabiga, dịka e dere ya nʼakwụkwọ ọgbụgba ndụ a.” 22 O nwebeghị mgbe e mere ụdị Mmemme Ngabiga dịka nke a nʼoge ọbụla, site nʼụbọchị ndị ikpe bụ ndị duru Izrel maọbụ nʼụbọchị ndị eze Izrel na eze niile chịrị Juda, ọ dịghị nke yiri Mmemme Ngabiga a. 23 Ma ọ bụ nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị eze Josaya, nʼime Jerusalem ka a nọ mee Mmemme Ngabiga a nye ONYENWE ANYỊ. 24 Ọzọkwa, Josaya gara nʼihu kpochapụ ndị niile na-ajụta mmụọ ọjọọ ase, na ndị dibịa afa, na arụsị ezinaụlọ dị iche iche, na arụsị a pịrị apị, na ihe arụ niile nke a hụrụ nʼime Juda na Jerusalem niile. O mere nke a ka e mezuo ihe niile e dere nʼime akwụkwọ ahụ Hilkaya onye nchụaja chọtara nʼụlọ ONYENWE ANYỊ. 25 Ọ dịghị eze ọzọ nʼime ndị niile buru ya ụzọ chịa nke dịka Josaya, onye chigharịkwutere ONYENWE ANYỊ. Onye ji obi ya niile, na mmụọ ya niile na ike ya niile debe iwu niile e nyere Mosis. Ọ dịkwaghị eze ọzọ dịka ya, onye biliri mgbe ọ nwụsịrị. 26 Ma ihe ndị a emeghị ka iwe ọkụ ONYENWE ANYỊ na-ewe megide Juda dajụọ, bụ iwe a kpasuru ya nʼihi ihe ọjọọ niile nke Manase mere. 27 Ya mere, ONYENWE ANYỊ sịrị, “Aga m ekpochapụ Juda niile site nʼihu m, dịka m si kpochapụ Izrel niile. Aga m ajụkwa obodo ahụ m họpụtara, bụ Jerusalem, jụkwa ụlọnsọ ukwu a nke m kwuru banyere ya sị, ‘Nʼime ya ka Aha m ga-adị.’ ” 28 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Josaya na ihe niile o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda? 29 Nʼoge Josaya bụ eze, Fero Neko, eze Ijipt, gbagoro gaa nʼakụkụ osimiri Yufretis inyere eze Asịrịa aka. Eze Josaya pụkwara izute ya nʼagha, ma Neko zutere ya nʼagha, gbuo ya na Megido. 30 Ndị na-ejere Josaya ozi sị na Megido buru ozu ya nʼime ụgbọ agha bulata ya na Jerusalem, lie ya nʼili nke aka ya. Ndị ala ahụ kpọọrọ Jehoahaz nwa nwoke Josaya, tee ya mmanụ, mee ya eze nʼọnọdụ nna ya. 31 Jehoahaz gbara iri afọ abụọ na atọ mgbe o bidoro ịchị, ma ọ chịrị na Jerusalem ọnwa atọ. Aha nne ya bụ Hamutal, nwa Jeremaya onye Libna. 32 O mere ihe dị njọ nʼanya ONYENWE ANYỊ dịka ndị eze buru ya ụzọ. 33 Ma Fero Neko keere ya agbụ na Ribla nʼala Hamat, ime ka ọ ghara ịchịkwa na Jerusalem. Neko kwagidere ndị Juda ka ha tụọrọ ya ụtụ narị talenti ọlaọcha, na otu talenti ọlaedo. 34 Fero Neko mere Eliakịm nwa nwoke Josaya, eze, nʼọnọdụ Josaya bụ nna ya. Ọ gụgharịrị aha Eliakịm ka ọ bụrụ Jehoiakim. Ma o duuru Jehoahaz gaa Ijipt, ebe ọ nọ nwụọ. 35 Jehoiakim kwụrụ Fero Neko ọlaọcha na ọlaedo ahụ ọ nara nʼaka ya. Ka o nwee ike mee nke a, o kere ụtụ nʼala ahụ, werekwa ike nara ndị ala ahụ ọlaọcha na ọlaedo, dịka mkpebi ha si dị banyere ihe onye ahụ ga-akwụ. 36 Jehoiakim gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị afọ iri na otu na Jerusalem. Aha nne ya bụ Zebida nwa Pedaya, onye Ruma. 37 O mere ihe dị njọ nʼanya ONYENWE ANYỊ, dịka ihe niile nna ya ha ndị bu ya ụzọ mere.

In Other Versions

2 Kings 23 in the ANGEFD

2 Kings 23 in the ANTPNG2D

2 Kings 23 in the AS21

2 Kings 23 in the BAGH

2 Kings 23 in the BBPNG

2 Kings 23 in the BBT1E

2 Kings 23 in the BDS

2 Kings 23 in the BEV

2 Kings 23 in the BHAD

2 Kings 23 in the BIB

2 Kings 23 in the BLPT

2 Kings 23 in the BNT

2 Kings 23 in the BNTABOOT

2 Kings 23 in the BNTLV

2 Kings 23 in the BOATCB

2 Kings 23 in the BOATCB2

2 Kings 23 in the BOBCV

2 Kings 23 in the BOCNT

2 Kings 23 in the BOECS

2 Kings 23 in the BOGWICC

2 Kings 23 in the BOHCB

2 Kings 23 in the BOHCV

2 Kings 23 in the BOHLNT

2 Kings 23 in the BOHNTLTAL

2 Kings 23 in the BOILNTAP

2 Kings 23 in the BOITCV

2 Kings 23 in the BOKCV

2 Kings 23 in the BOKCV2

2 Kings 23 in the BOKHWOG

2 Kings 23 in the BOKSSV

2 Kings 23 in the BOLCB

2 Kings 23 in the BOLCB2

2 Kings 23 in the BOMCV

2 Kings 23 in the BONAV

2 Kings 23 in the BONCB

2 Kings 23 in the BONLT

2 Kings 23 in the BONUT2

2 Kings 23 in the BOPLNT

2 Kings 23 in the BOSCB

2 Kings 23 in the BOSNC

2 Kings 23 in the BOTLNT

2 Kings 23 in the BOVCB

2 Kings 23 in the BOYCB

2 Kings 23 in the BPBB

2 Kings 23 in the BPH

2 Kings 23 in the BSB

2 Kings 23 in the CCB

2 Kings 23 in the CUV

2 Kings 23 in the CUVS

2 Kings 23 in the DBT

2 Kings 23 in the DGDNT

2 Kings 23 in the DHNT

2 Kings 23 in the DNT

2 Kings 23 in the ELBE

2 Kings 23 in the EMTV

2 Kings 23 in the ESV

2 Kings 23 in the FBV

2 Kings 23 in the FEB

2 Kings 23 in the GGMNT

2 Kings 23 in the GNT

2 Kings 23 in the HARY

2 Kings 23 in the HNT

2 Kings 23 in the IRVA

2 Kings 23 in the IRVB

2 Kings 23 in the IRVG

2 Kings 23 in the IRVH

2 Kings 23 in the IRVK

2 Kings 23 in the IRVM

2 Kings 23 in the IRVM2

2 Kings 23 in the IRVO

2 Kings 23 in the IRVP

2 Kings 23 in the IRVT

2 Kings 23 in the IRVT2

2 Kings 23 in the IRVU

2 Kings 23 in the ISVN

2 Kings 23 in the JSNT

2 Kings 23 in the KAPI

2 Kings 23 in the KBT1ETNIK

2 Kings 23 in the KBV

2 Kings 23 in the KJV

2 Kings 23 in the KNFD

2 Kings 23 in the LBA

2 Kings 23 in the LBLA

2 Kings 23 in the LNT

2 Kings 23 in the LSV

2 Kings 23 in the MAAL

2 Kings 23 in the MBV

2 Kings 23 in the MBV2

2 Kings 23 in the MHNT

2 Kings 23 in the MKNFD

2 Kings 23 in the MNG

2 Kings 23 in the MNT

2 Kings 23 in the MNT2

2 Kings 23 in the MRS1T

2 Kings 23 in the NAA

2 Kings 23 in the NASB

2 Kings 23 in the NBLA

2 Kings 23 in the NBS

2 Kings 23 in the NBVTP

2 Kings 23 in the NET2

2 Kings 23 in the NIV11

2 Kings 23 in the NNT

2 Kings 23 in the NNT2

2 Kings 23 in the NNT3

2 Kings 23 in the PDDPT

2 Kings 23 in the PFNT

2 Kings 23 in the RMNT

2 Kings 23 in the SBIAS

2 Kings 23 in the SBIBS

2 Kings 23 in the SBIBS2

2 Kings 23 in the SBICS

2 Kings 23 in the SBIDS

2 Kings 23 in the SBIGS

2 Kings 23 in the SBIHS

2 Kings 23 in the SBIIS

2 Kings 23 in the SBIIS2

2 Kings 23 in the SBIIS3

2 Kings 23 in the SBIKS

2 Kings 23 in the SBIKS2

2 Kings 23 in the SBIMS

2 Kings 23 in the SBIOS

2 Kings 23 in the SBIPS

2 Kings 23 in the SBISS

2 Kings 23 in the SBITS

2 Kings 23 in the SBITS2

2 Kings 23 in the SBITS3

2 Kings 23 in the SBITS4

2 Kings 23 in the SBIUS

2 Kings 23 in the SBIVS

2 Kings 23 in the SBT

2 Kings 23 in the SBT1E

2 Kings 23 in the SCHL

2 Kings 23 in the SNT

2 Kings 23 in the SUSU

2 Kings 23 in the SUSU2

2 Kings 23 in the SYNO

2 Kings 23 in the TBIAOTANT

2 Kings 23 in the TBT1E

2 Kings 23 in the TBT1E2

2 Kings 23 in the TFTIP

2 Kings 23 in the TFTU

2 Kings 23 in the TGNTATF3T

2 Kings 23 in the THAI

2 Kings 23 in the TNFD

2 Kings 23 in the TNT

2 Kings 23 in the TNTIK

2 Kings 23 in the TNTIL

2 Kings 23 in the TNTIN

2 Kings 23 in the TNTIP

2 Kings 23 in the TNTIZ

2 Kings 23 in the TOMA

2 Kings 23 in the TTENT

2 Kings 23 in the UBG

2 Kings 23 in the UGV

2 Kings 23 in the UGV2

2 Kings 23 in the UGV3

2 Kings 23 in the VBL

2 Kings 23 in the VDCC

2 Kings 23 in the YALU

2 Kings 23 in the YAPE

2 Kings 23 in the YBVTP

2 Kings 23 in the ZBP