2 Kings 24 (BOICB)

1 Nʼoge Jehoiakim na-achị, Nebukadneza eze Babilọn ji ike bata nʼala ya, mee ka Jehoiakim ghọọ ohu ya afọ atọ. Ma o mesịrị tụgharịa megide Nebukadneza, nupukwa isi nʼokpuru ya. 2 ONYENWE ANYỊ zigara ndị na-apụnara mmadụ ihe site na Kaldịa, Aram, Moab na ndị Amọn, ka ha ga bibie Juda. Ọ bụ nʼusoro okwu ONYENWE ANYỊ kpọsara site nʼọnụ ndị amụma ya. 3 Nʼezie, ihe ndị a bịakwasịrị Juda dịka ONYENWE ANYỊ si nye ya nʼiwu, ka o si otu a kpochapụ ha site nʼihu ya nʼihi mmehie niile Manase mere, na dịka ihe niile o mere si dị, 4 tinyere ọbara ndị aka ha dị ọcha nke ọ wusiri. Nʼihi na o mere ka ọbara ndị aka ha dị ọcha jupụta na Jerusalem. ONYENWE ANYỊ ekwekwaghị agbaghara ajọ omume dị otu a. 5 Akụkọ ọzọ niile gbasara ọchịchị Jehoiakim na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe e mere nʼụbọchị ndụ ndị eze Juda? 6 Jehoiakim sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ. Jehoiakin nwa ya ghọrọ eze ọhụrụ nʼọnọdụ ya. 7 Ma eze Ijipt esiteghị nʼala ya pụta ọzọ, nʼihi na eze Babilọn nọchiri oke ala ya niile, site na mmiri iyi Ijipt ruo nʼoke Osimiri Yufretis. 8 Jehoiakin gbara afọ iri na asatọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị naanị ọnwa atọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Nehushta, nwa Elnatan, onye Jerusalem. 9 O mere ihe jọrọ njọ nʼanya ONYENWE ANYỊ, dịka nna ya ha mere. 10 Nʼoge ọ bụ eze, ndịisi Nebukadneza, eze Babilọn bịara, gbaa Jerusalem gburugburu ma nọchibido obodo ahụ nʼagha. 11 Nebukadneza, eze Babilọn nʼonwe ya, bịara nʼobodo ahụ mgbe ndị agha ya gbara ya gburugburu. 12 Jehoiakin, bụ eze Juda, na nne ya na ndị ọrụ ya niile na ndịisi niile na ndịisi ozi ya niile were onwe ha nyefee Nebukadneza nʼaka.Nʼafọ asatọ nke ọchịchị eze Babilọn ka ọ kpụụrụ Jehoiakin dịka onye mkpọrọ. 13 Ọ kwakọọrọ akụ niile dị nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ, na ndị nke dị nʼụlọeze, o gbukakwara ihe ọlaedo niile Solomọn eze Izrel tinyere nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ buru ha bulaa Babilọn, ihe a niile mere dịka ONYENWE ANYỊ kwururịị. 14 O bupụkwara puku ndị ikom iri site na Jerusalem bulaa ha Babilọn dịka ndị a dọtara nʼagha. Ndị so nʼime ndị a bụ ndịisi niile na ndị agha niile. O bupụkwara ndị na-akwa ǹka niile na ndị ọkpụ ụzụ. Naanị ndị na-enweghị ike, na ndị ogbenye ka ọ hapụrụ nʼala ahụ. 15 Nebukadneza kpụụrụ Jehoiakin ka ọ ga biri na Babilọn. O sikwa na Jerusalem kpọrọ nne eze, na ndị nwunye eze, ndị ozi ya, na ndị niile a ma ama nʼala ahụ gaa Babilọn. 16 Eze Babilọn bupụkwara ndị ikom niile dị ike ma tozukwaa ibu agha, ndị ọnụọgụgụ ha dị puku asaa, tinyere otu puku ndị ọrụ aka, na ndị ọrụ ǹka, bulaa ha Babilọn. 17 O mere nwanne nna Jehoiakin, bụ Matanaya, eze nʼọnọdụ ya. Ọ gụgharịrị ya aha, kpọọ ya Zedekaya. 18 Iri afọ abụọ na otu ka Zedekaya gbara mgbe ọ malitere ịbụ eze nʼime Jerusalem. Aha nne ya bụ Hamutal, nwa Jeremaya onye Libna. Ọ chịrị dịka eze na Jerusalem afọ iri na otu. 19 Ma o mere ihe jọrọ njọ nʼanya ONYENWE ANYỊ dịka Jehoiakim mere. 20 Ọ bụ nʼihi iwe ONYENWE ANYỊ ka ihe ndị a niile ji bịakwasị Jerusalem na Juda. Nʼikpeazụ, o sitere nʼihu ya chụpụ ha.Nʼoge a, Zedekaya nupuru isi nʼokpuru eze Babilọn.

In Other Versions

2 Kings 24 in the ANGEFD

2 Kings 24 in the ANTPNG2D

2 Kings 24 in the AS21

2 Kings 24 in the BAGH

2 Kings 24 in the BBPNG

2 Kings 24 in the BBT1E

2 Kings 24 in the BDS

2 Kings 24 in the BEV

2 Kings 24 in the BHAD

2 Kings 24 in the BIB

2 Kings 24 in the BLPT

2 Kings 24 in the BNT

2 Kings 24 in the BNTABOOT

2 Kings 24 in the BNTLV

2 Kings 24 in the BOATCB

2 Kings 24 in the BOATCB2

2 Kings 24 in the BOBCV

2 Kings 24 in the BOCNT

2 Kings 24 in the BOECS

2 Kings 24 in the BOGWICC

2 Kings 24 in the BOHCB

2 Kings 24 in the BOHCV

2 Kings 24 in the BOHLNT

2 Kings 24 in the BOHNTLTAL

2 Kings 24 in the BOILNTAP

2 Kings 24 in the BOITCV

2 Kings 24 in the BOKCV

2 Kings 24 in the BOKCV2

2 Kings 24 in the BOKHWOG

2 Kings 24 in the BOKSSV

2 Kings 24 in the BOLCB

2 Kings 24 in the BOLCB2

2 Kings 24 in the BOMCV

2 Kings 24 in the BONAV

2 Kings 24 in the BONCB

2 Kings 24 in the BONLT

2 Kings 24 in the BONUT2

2 Kings 24 in the BOPLNT

2 Kings 24 in the BOSCB

2 Kings 24 in the BOSNC

2 Kings 24 in the BOTLNT

2 Kings 24 in the BOVCB

2 Kings 24 in the BOYCB

2 Kings 24 in the BPBB

2 Kings 24 in the BPH

2 Kings 24 in the BSB

2 Kings 24 in the CCB

2 Kings 24 in the CUV

2 Kings 24 in the CUVS

2 Kings 24 in the DBT

2 Kings 24 in the DGDNT

2 Kings 24 in the DHNT

2 Kings 24 in the DNT

2 Kings 24 in the ELBE

2 Kings 24 in the EMTV

2 Kings 24 in the ESV

2 Kings 24 in the FBV

2 Kings 24 in the FEB

2 Kings 24 in the GGMNT

2 Kings 24 in the GNT

2 Kings 24 in the HARY

2 Kings 24 in the HNT

2 Kings 24 in the IRVA

2 Kings 24 in the IRVB

2 Kings 24 in the IRVG

2 Kings 24 in the IRVH

2 Kings 24 in the IRVK

2 Kings 24 in the IRVM

2 Kings 24 in the IRVM2

2 Kings 24 in the IRVO

2 Kings 24 in the IRVP

2 Kings 24 in the IRVT

2 Kings 24 in the IRVT2

2 Kings 24 in the IRVU

2 Kings 24 in the ISVN

2 Kings 24 in the JSNT

2 Kings 24 in the KAPI

2 Kings 24 in the KBT1ETNIK

2 Kings 24 in the KBV

2 Kings 24 in the KJV

2 Kings 24 in the KNFD

2 Kings 24 in the LBA

2 Kings 24 in the LBLA

2 Kings 24 in the LNT

2 Kings 24 in the LSV

2 Kings 24 in the MAAL

2 Kings 24 in the MBV

2 Kings 24 in the MBV2

2 Kings 24 in the MHNT

2 Kings 24 in the MKNFD

2 Kings 24 in the MNG

2 Kings 24 in the MNT

2 Kings 24 in the MNT2

2 Kings 24 in the MRS1T

2 Kings 24 in the NAA

2 Kings 24 in the NASB

2 Kings 24 in the NBLA

2 Kings 24 in the NBS

2 Kings 24 in the NBVTP

2 Kings 24 in the NET2

2 Kings 24 in the NIV11

2 Kings 24 in the NNT

2 Kings 24 in the NNT2

2 Kings 24 in the NNT3

2 Kings 24 in the PDDPT

2 Kings 24 in the PFNT

2 Kings 24 in the RMNT

2 Kings 24 in the SBIAS

2 Kings 24 in the SBIBS

2 Kings 24 in the SBIBS2

2 Kings 24 in the SBICS

2 Kings 24 in the SBIDS

2 Kings 24 in the SBIGS

2 Kings 24 in the SBIHS

2 Kings 24 in the SBIIS

2 Kings 24 in the SBIIS2

2 Kings 24 in the SBIIS3

2 Kings 24 in the SBIKS

2 Kings 24 in the SBIKS2

2 Kings 24 in the SBIMS

2 Kings 24 in the SBIOS

2 Kings 24 in the SBIPS

2 Kings 24 in the SBISS

2 Kings 24 in the SBITS

2 Kings 24 in the SBITS2

2 Kings 24 in the SBITS3

2 Kings 24 in the SBITS4

2 Kings 24 in the SBIUS

2 Kings 24 in the SBIVS

2 Kings 24 in the SBT

2 Kings 24 in the SBT1E

2 Kings 24 in the SCHL

2 Kings 24 in the SNT

2 Kings 24 in the SUSU

2 Kings 24 in the SUSU2

2 Kings 24 in the SYNO

2 Kings 24 in the TBIAOTANT

2 Kings 24 in the TBT1E

2 Kings 24 in the TBT1E2

2 Kings 24 in the TFTIP

2 Kings 24 in the TFTU

2 Kings 24 in the TGNTATF3T

2 Kings 24 in the THAI

2 Kings 24 in the TNFD

2 Kings 24 in the TNT

2 Kings 24 in the TNTIK

2 Kings 24 in the TNTIL

2 Kings 24 in the TNTIN

2 Kings 24 in the TNTIP

2 Kings 24 in the TNTIZ

2 Kings 24 in the TOMA

2 Kings 24 in the TTENT

2 Kings 24 in the UBG

2 Kings 24 in the UGV

2 Kings 24 in the UGV2

2 Kings 24 in the UGV3

2 Kings 24 in the VBL

2 Kings 24 in the VDCC

2 Kings 24 in the YALU

2 Kings 24 in the YAPE

2 Kings 24 in the YBVTP

2 Kings 24 in the ZBP