2 Kings 7 (BOICB)

1 Ịlaisha zara sị ya, “Nụrụ okwu ONYENWE ANYỊ. Nʼihi na otu a ka ONYENWE ANYỊ na-ekwu, Nʼoge dịka mgbe a echi, a ga-ere otu akpa nta ụtụ ọka otu shekel, rekwaa akpa nta ọka balị abụọ otu shekel nʼọnụ ụzọ ama obodo Sameria.” 2 Ọchịagha ahụ, nke eze na-adabere nʼaka ya, sịrị onye nke Chineke, “Lee, a sịkwarị na ONYENWE ANYỊ emeghee oghere idee nke eluigwe, nke a ọ pụrụ ime?”Ma Ịlaisha zara ya, “Ị ga-eji anya gị abụọ hụ ya, ma ị gaghị eri site nʼime ya.” 3 Nʼoge a, e nwere ndị ekpenta anọ nọ nʼezi mgbidi gbara Sameria gburugburu, nʼakụkụ ọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ. Ha sịrịtara onwe ha, “Gịnị ka anyị nọ nʼebe a na-eme? Ọ bụ ka anyị nọrọ nʼebe a tutu anyị anwụọ? 4 Ọ bụrụ na anyị asị, ‘Anyị ga-abanye nʼime obodo,’ ụnwụ dị nʼebe ahụ, anyị ga-anwụkwa. Ọ bụrụkwanụ na anyị anọgide nʼebe a anyị ga-anwụ. Ya mere ka anyị gafeenụ banye nʼọmụma ụlọ ikwu ndị agha Aram, were onwe anyị nyefee ha nʼaka. Ọ bụrụ na ha edebe anyị ndụ, anyị ga-adị ndụ, ọ bụrụ na ha egbuo anyị, anyị ga-anwụkwa.” 5 Nʼoge uhuruchi, ha biliri gaa nʼọmụma ụlọ ikwu ndị agha Aram. Mgbe ha bịarutere nʼọnụ ụlọ ikwu ahụ, o nwekwaghị onye nọ nʼebe ahụ, 6 nʼihi na Onyenwe anyị mere ka ndị Aram nụ ụzụ ụgbọ agha na nke ịnyịnya, na nke usuu ndị agha. Nke a mere ka onye ọbụla gwa ibe ya sị, “Lee, eze ndị Izrel egoola ndị agha ndị Het, na ndị eze Ijipt ibuso anyị agha.” 7 Ha biliri gbapụ ọsọ nʼabalị ahụ, hapụ ụlọ ikwu ha niile, na ịnyịnya ha niile, na ịnyịnya ibu ha niile, na ihe niile otu o si dịrị, ma gbapụ ọsọ ndụ. 8 Mgbe ndị ekpenta ahụ rutere ogige ndị agha ndị Siria, ha banyere nʼime otu ụlọ rie ihe, ṅụkwaa ihe ọṅụṅụ dị nʼime ya. Ha chịịrị ọlaọcha na ọlaedo na uwe ọma niile dị nʼime ya gaa zoo ha. Ọzọkwa, ha lọghachiri banye nʼụlọ ọzọ kwakọrọ ụfọdụ ihe dị nʼime ya gaa zoo. 9 Ma mgbe ahụ ha sịrịtara onwe ha, “Ihe anyị na-eme ezighị ezi. Taa bụ ụbọchị oziọma, ma lee ka anyị na-agba nkịtị. Ọ bụrụ na anyị echere ruo ìhè ụtụtụ, a ga-achọpụta ajọọ omume anyị. Ugbu a bịanụ, ka anyị gaa gwa ndị nọ nʼụlọeze, ihe anyị hụrụ.” 10 Ya mere, ha gara kpọkuo ndị nche ọnụ ụzọ obodo ahụ, gwa ha sị, “Anyị banyere nʼogige ndị agha Aram, o nweghị mmadụ ọbụla nọ nʼebe ahụ, ọ dịghị olu mmadụ anyị nụrụ nʼebe ahụ, naanị ịnyịnya na ịnyịnya ibu elibere nʼosisi, na ụlọ ikwu ha a hapụrụ dịka ha dị.” 11 Ndị na-eche nche tiri mkpu kọọrọ ndị nọ nʼụlọeze ihe mere. 12 Eze biliri nʼabalị ahụ gwa ndịisi ọrụ ya sị, “Ka m gwa unu ihe ndị Aram mere anyị. Ha maara na anyị nọ nʼoke agụụ, nʼihi ya, ha akpacharala anya hapụ ọmụma ụlọ ikwu ha gaa zoo onwe ha nʼime ọhịa. Echiche ha bụ, ‘Ndị a ga-apụtarịrị, mgbe ahụ, anyị ga-ejide ha na ndụ, banyekwa nʼime obodo ha.’ ” 13 Ma otu onye nʼime ndịisi agha ya zara sị ya, “Ka ụfọdụ mmadụ duru ịnyịnya ise ndị ahụ fọdụrụ nʼobodo. Ọ bụrụ na ndị a alọtaghị ọnọdụ ha ga-adị ka nke ndị Izrel niile fọdụrụ nʼebe, e, ha ga-adị ka ndị Izrel niile a gụrụ dịka ndị nwụrụ anwụ. Ya mere, ka anyị zipụ ha ka ha gaa chọpụta ihe mere.” 14 Ya mere, ha họpụtara ụgbọ agha abụọ na ịnyịnya ndị na-adọkpụ ha. Eze zipụrụ ha ịchụso ndị agha Aram, O nyere ndị na-agba ha iwu sị, “Gaanụ chọpụta ihe mere.” 15 Ha sogidere ha ruo nʼosimiri Jọdan. Nʼakụkụ ụzọ niile jupụtara nʼuwe na ngwa agha ndị agha Aram tufuru mgbe ha na-eme ngwangwa. Ndị ahụ e zipụrụ lọghachiri bịa kọọrọ eze ihe ha hụrụ. 16 Ndị Izrel niile pụrụ gaa kwakọrọ ihe dị nʼọmụma ụlọ ikwu ndị Aram. Nke bụ na e rere otu akpa nta ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma otu shekel, rekwaa akpa ọka balị abụọ otu shekel dịka ONYENWE ANYỊ si kwuo. 17 Eze họpụtara ọchịagha ahụ, nke ọ na-adabere nʼaka ya, nye ya ọrụ ilekọta ọnụ ụzọ obodo ahụ. Ma ndị si nʼobodo na-enupụta nuturu ya, zọọ ya ụkwụ, zọgbuo ya mgbe ha na-agbapụta. Ọ nwụrụ dịka Ịlaisha onye nke Chineke kwuru mgbe eze bịakwutere ya ụnyaahụ, ijide ya. 18 Ihe niile mezuru dịka onye nke Chineke gwara eze okwu sị ya, “A ga-ere akpa nta ọka balị abụọ otu shekel na otu akpa nta ụtụ ọka otu shekel, nʼọnụ ụzọ ama Sameria.” 19 Nʼoge ahụ, ọchịagha ahụ na-ejere eze ozi zara sị ya, “Ihe dị otu a agaghị eme, ọ bụladị na ONYENWE ANYỊ emeghee eluigwe mee ka nri zoo, nke a ọ ga-eme?” Ma onye nke Chineke zara ya, “Ị ga-eji anya gị hụ ya, ma ị gaghị eso rie ya.” 20 Ọ bụkwa otu a ka o si mee, nʼihi na ndị mmadụ zọgburu ya nʼụkwụ nʼọnụ ụzọ ama, ebe ọ nọ nwụọ.

In Other Versions

2 Kings 7 in the ANGEFD

2 Kings 7 in the ANTPNG2D

2 Kings 7 in the AS21

2 Kings 7 in the BAGH

2 Kings 7 in the BBPNG

2 Kings 7 in the BBT1E

2 Kings 7 in the BDS

2 Kings 7 in the BEV

2 Kings 7 in the BHAD

2 Kings 7 in the BIB

2 Kings 7 in the BLPT

2 Kings 7 in the BNT

2 Kings 7 in the BNTABOOT

2 Kings 7 in the BNTLV

2 Kings 7 in the BOATCB

2 Kings 7 in the BOATCB2

2 Kings 7 in the BOBCV

2 Kings 7 in the BOCNT

2 Kings 7 in the BOECS

2 Kings 7 in the BOGWICC

2 Kings 7 in the BOHCB

2 Kings 7 in the BOHCV

2 Kings 7 in the BOHLNT

2 Kings 7 in the BOHNTLTAL

2 Kings 7 in the BOILNTAP

2 Kings 7 in the BOITCV

2 Kings 7 in the BOKCV

2 Kings 7 in the BOKCV2

2 Kings 7 in the BOKHWOG

2 Kings 7 in the BOKSSV

2 Kings 7 in the BOLCB

2 Kings 7 in the BOLCB2

2 Kings 7 in the BOMCV

2 Kings 7 in the BONAV

2 Kings 7 in the BONCB

2 Kings 7 in the BONLT

2 Kings 7 in the BONUT2

2 Kings 7 in the BOPLNT

2 Kings 7 in the BOSCB

2 Kings 7 in the BOSNC

2 Kings 7 in the BOTLNT

2 Kings 7 in the BOVCB

2 Kings 7 in the BOYCB

2 Kings 7 in the BPBB

2 Kings 7 in the BPH

2 Kings 7 in the BSB

2 Kings 7 in the CCB

2 Kings 7 in the CUV

2 Kings 7 in the CUVS

2 Kings 7 in the DBT

2 Kings 7 in the DGDNT

2 Kings 7 in the DHNT

2 Kings 7 in the DNT

2 Kings 7 in the ELBE

2 Kings 7 in the EMTV

2 Kings 7 in the ESV

2 Kings 7 in the FBV

2 Kings 7 in the FEB

2 Kings 7 in the GGMNT

2 Kings 7 in the GNT

2 Kings 7 in the HARY

2 Kings 7 in the HNT

2 Kings 7 in the IRVA

2 Kings 7 in the IRVB

2 Kings 7 in the IRVG

2 Kings 7 in the IRVH

2 Kings 7 in the IRVK

2 Kings 7 in the IRVM

2 Kings 7 in the IRVM2

2 Kings 7 in the IRVO

2 Kings 7 in the IRVP

2 Kings 7 in the IRVT

2 Kings 7 in the IRVT2

2 Kings 7 in the IRVU

2 Kings 7 in the ISVN

2 Kings 7 in the JSNT

2 Kings 7 in the KAPI

2 Kings 7 in the KBT1ETNIK

2 Kings 7 in the KBV

2 Kings 7 in the KJV

2 Kings 7 in the KNFD

2 Kings 7 in the LBA

2 Kings 7 in the LBLA

2 Kings 7 in the LNT

2 Kings 7 in the LSV

2 Kings 7 in the MAAL

2 Kings 7 in the MBV

2 Kings 7 in the MBV2

2 Kings 7 in the MHNT

2 Kings 7 in the MKNFD

2 Kings 7 in the MNG

2 Kings 7 in the MNT

2 Kings 7 in the MNT2

2 Kings 7 in the MRS1T

2 Kings 7 in the NAA

2 Kings 7 in the NASB

2 Kings 7 in the NBLA

2 Kings 7 in the NBS

2 Kings 7 in the NBVTP

2 Kings 7 in the NET2

2 Kings 7 in the NIV11

2 Kings 7 in the NNT

2 Kings 7 in the NNT2

2 Kings 7 in the NNT3

2 Kings 7 in the PDDPT

2 Kings 7 in the PFNT

2 Kings 7 in the RMNT

2 Kings 7 in the SBIAS

2 Kings 7 in the SBIBS

2 Kings 7 in the SBIBS2

2 Kings 7 in the SBICS

2 Kings 7 in the SBIDS

2 Kings 7 in the SBIGS

2 Kings 7 in the SBIHS

2 Kings 7 in the SBIIS

2 Kings 7 in the SBIIS2

2 Kings 7 in the SBIIS3

2 Kings 7 in the SBIKS

2 Kings 7 in the SBIKS2

2 Kings 7 in the SBIMS

2 Kings 7 in the SBIOS

2 Kings 7 in the SBIPS

2 Kings 7 in the SBISS

2 Kings 7 in the SBITS

2 Kings 7 in the SBITS2

2 Kings 7 in the SBITS3

2 Kings 7 in the SBITS4

2 Kings 7 in the SBIUS

2 Kings 7 in the SBIVS

2 Kings 7 in the SBT

2 Kings 7 in the SBT1E

2 Kings 7 in the SCHL

2 Kings 7 in the SNT

2 Kings 7 in the SUSU

2 Kings 7 in the SUSU2

2 Kings 7 in the SYNO

2 Kings 7 in the TBIAOTANT

2 Kings 7 in the TBT1E

2 Kings 7 in the TBT1E2

2 Kings 7 in the TFTIP

2 Kings 7 in the TFTU

2 Kings 7 in the TGNTATF3T

2 Kings 7 in the THAI

2 Kings 7 in the TNFD

2 Kings 7 in the TNT

2 Kings 7 in the TNTIK

2 Kings 7 in the TNTIL

2 Kings 7 in the TNTIN

2 Kings 7 in the TNTIP

2 Kings 7 in the TNTIZ

2 Kings 7 in the TOMA

2 Kings 7 in the TTENT

2 Kings 7 in the UBG

2 Kings 7 in the UGV

2 Kings 7 in the UGV2

2 Kings 7 in the UGV3

2 Kings 7 in the VBL

2 Kings 7 in the VDCC

2 Kings 7 in the YALU

2 Kings 7 in the YAPE

2 Kings 7 in the YBVTP

2 Kings 7 in the ZBP