2 Peter 1 (BOICB)

1 Ọ bụ Saimọn Pita, odibo na onyeozi nke Jisọs Kraịst, Na-edegara ndị niile anyị na ha ketara otu ụdị okwukwe a dị oke ọnụahịa, nʼime ezi omume nke Chineke na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst akwụkwọ ozi a: 2 Ka amara na udo bara unu ụba, site na mmazu nke Chineke na nke Jisọs Onyenwe anyị. 3 O sitela nʼike o ji bụrụ Chi nye anyị ihe niile dị anyị mkpa ibi ndụ na-asọpụrụ ya, site nʼọmụma nke anyị mara ya, bụ onye ahụ kpọrọ anyị site nʼebube ya na ịdị mma ya. 4 O sitela nʼihe ndị a nye anyị nkwa dị ukwuu na nke dị oke ọnụahịa, ka anyị site na ha keta oke nʼụdịdị nsọ ya, si otu a gbanarị ịrụ arụ dị nʼụwa, nke ọchịchọ ọjọọ na-ebute. 5 Nʼihi nke a, gbalịsienụ ike ịtụkwasị ịdị mma nʼelu okwukwe unu, ma na-atụkwasịkwanụ ihe ọmụma nʼelu ịdị mma, 6 tụkwasịkwanụ imerụ ihe nʼoke nʼelu ihe ọmụma, tụkwasịkwanụ ntachiobi nʼelu imerụ ihe na oke, ma na-atụkwasịkwanụ ibi ndụ dị ka ndị Chineke nʼelu ntachiobi. 7 Tụkwasịkwanụ obiọma nye ụmụnna nʼelu ibi ndụ dị ka ndị Chineke, ma na-atụkwasịkwanụ ịhụnanya nʼelu obiọma nye ụmụnna. 8 Ọ bụrụ na unu enwe ihe ndị a nʼụzọ ha jubigakwara oke nʼime unu, mgbe ahụ ha ga-eme ka unu ndị na-adịghị amị mkpụrụ, bụrụ ndị na-amị mkpụrụ, na ndị bara uru nʼihe unu maara banyere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. 9 Ma onye ọbụla na-atụkwasịghị ihe ndị a nʼokwukwe ya nọ nʼọchịchịrị. Ọ naghị ahụ ụzọ. Ọ bụkwa onye na-echefu na a sachapụla ya mmehie ya, ndị o mere nʼoge gara aga. 10 Nʼihi ya ụmụnna m, gbalịsienụ ike iguzosike nʼọkpụkpọ na nhọpụta unu. Nke a ga-eme ka unu hapụ ịsọ ngọngọ maọbụ daa. 11 Nʼụzọ dị otu a, a ga-enye unu ohere dị ukwuu iji bata nʼalaeze ebighị ebi nke Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst. 12 Aga m na-aga nʼihu na-echetara unu ihe ndị a site nʼoge ruo nʼoge. Ọ bụ ezie na unu maara na ha na-eguzosikwa ike nʼeziokwu ahụ unu natara. 13 Ana m agụ ya nʼihe ziri ezi ịkpọte mmụọ unu na uche unu site nʼichetara unu ihe ndị a ugbu a m dị ndụ nʼanụ ahụ a. 14 Nʼihi na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst agwala m hoohaa, na m ga-eyipụ ya nʼoge na-adịghị anya. 15 Aga m agbalịsi ike ịhụ na mgbe m hapụchara ụwa nke a, unu ga na-echeta ihe ndị a mgbe niile. 16 Ihe niile anyị na-akọrọ unu abụghị akụkọ ifo mmadụ kọrọ site nʼamamihe ya. Nʼihi na anyị kọwaara unu ihe banyere ike Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ọbịbịa ọ ga-abịa ọzọ. Ọ bụ anya anyị abụọ ka anyị ji hụ ebube nke ịbụ eze ya. 17 Nʼihi na ọ natara nsọpụrụ na ebube site nʼaka Chineke bụ Nna mgbe olu ahụ si nʼebube ahụ dị ukwuu daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, onye ihe ya dị m ezi mma.” 18 Anyị onwe anyị nụrụ olu ahụ si nʼeluigwe daa mgbe anyị so ya nọdụ nʼelu ugwu nsọ ahụ. 19 Anyị nwapụtara na okwu ndị amụma ahụ bụ ihe mezuru emezu. Unu onwe unu kwesikwara ilezi anya nʼokwu ndị ahụ, dịka a ga-asị na ha bụ ìhè na-enwu nʼebe ọchịchịrị gbara nke na-adị ruo mgbe chi bọrọ, mgbe e mere ka kpakpando ọtụtụ walie nʼobi unu. 20 Nke ka nke, ghọtanụ na okwu amụma ọbụla dị nʼakwụkwọ nsọ abụghị nke e dere dịka akọnuche mmadụ si dị. 21 Nʼihi na o nweghị okwu amụma ọbụla nke e chepụtara dị ka ọchịchọ obi mmadụ si dị, kama mgbe ndị mmadụ kwuru okwu nʼaha Chineke, ọ bụ Mmụọ Nsọ duru ha.

In Other Versions

2 Peter 1 in the ANGEFD

2 Peter 1 in the ANTPNG2D

2 Peter 1 in the AS21

2 Peter 1 in the BAGH

2 Peter 1 in the BBPNG

2 Peter 1 in the BBT1E

2 Peter 1 in the BDS

2 Peter 1 in the BEV

2 Peter 1 in the BHAD

2 Peter 1 in the BIB

2 Peter 1 in the BLPT

2 Peter 1 in the BNT

2 Peter 1 in the BNTABOOT

2 Peter 1 in the BNTLV

2 Peter 1 in the BOATCB

2 Peter 1 in the BOATCB2

2 Peter 1 in the BOBCV

2 Peter 1 in the BOCNT

2 Peter 1 in the BOECS

2 Peter 1 in the BOGWICC

2 Peter 1 in the BOHCB

2 Peter 1 in the BOHCV

2 Peter 1 in the BOHLNT

2 Peter 1 in the BOHNTLTAL

2 Peter 1 in the BOILNTAP

2 Peter 1 in the BOITCV

2 Peter 1 in the BOKCV

2 Peter 1 in the BOKCV2

2 Peter 1 in the BOKHWOG

2 Peter 1 in the BOKSSV

2 Peter 1 in the BOLCB

2 Peter 1 in the BOLCB2

2 Peter 1 in the BOMCV

2 Peter 1 in the BONAV

2 Peter 1 in the BONCB

2 Peter 1 in the BONLT

2 Peter 1 in the BONUT2

2 Peter 1 in the BOPLNT

2 Peter 1 in the BOSCB

2 Peter 1 in the BOSNC

2 Peter 1 in the BOTLNT

2 Peter 1 in the BOVCB

2 Peter 1 in the BOYCB

2 Peter 1 in the BPBB

2 Peter 1 in the BPH

2 Peter 1 in the BSB

2 Peter 1 in the CCB

2 Peter 1 in the CUV

2 Peter 1 in the CUVS

2 Peter 1 in the DBT

2 Peter 1 in the DGDNT

2 Peter 1 in the DHNT

2 Peter 1 in the DNT

2 Peter 1 in the ELBE

2 Peter 1 in the EMTV

2 Peter 1 in the ESV

2 Peter 1 in the FBV

2 Peter 1 in the FEB

2 Peter 1 in the GGMNT

2 Peter 1 in the GNT

2 Peter 1 in the HARY

2 Peter 1 in the HNT

2 Peter 1 in the IRVA

2 Peter 1 in the IRVB

2 Peter 1 in the IRVG

2 Peter 1 in the IRVH

2 Peter 1 in the IRVK

2 Peter 1 in the IRVM

2 Peter 1 in the IRVM2

2 Peter 1 in the IRVO

2 Peter 1 in the IRVP

2 Peter 1 in the IRVT

2 Peter 1 in the IRVT2

2 Peter 1 in the IRVU

2 Peter 1 in the ISVN

2 Peter 1 in the JSNT

2 Peter 1 in the KAPI

2 Peter 1 in the KBT1ETNIK

2 Peter 1 in the KBV

2 Peter 1 in the KJV

2 Peter 1 in the KNFD

2 Peter 1 in the LBA

2 Peter 1 in the LBLA

2 Peter 1 in the LNT

2 Peter 1 in the LSV

2 Peter 1 in the MAAL

2 Peter 1 in the MBV

2 Peter 1 in the MBV2

2 Peter 1 in the MHNT

2 Peter 1 in the MKNFD

2 Peter 1 in the MNG

2 Peter 1 in the MNT

2 Peter 1 in the MNT2

2 Peter 1 in the MRS1T

2 Peter 1 in the NAA

2 Peter 1 in the NASB

2 Peter 1 in the NBLA

2 Peter 1 in the NBS

2 Peter 1 in the NBVTP

2 Peter 1 in the NET2

2 Peter 1 in the NIV11

2 Peter 1 in the NNT

2 Peter 1 in the NNT2

2 Peter 1 in the NNT3

2 Peter 1 in the PDDPT

2 Peter 1 in the PFNT

2 Peter 1 in the RMNT

2 Peter 1 in the SBIAS

2 Peter 1 in the SBIBS

2 Peter 1 in the SBIBS2

2 Peter 1 in the SBICS

2 Peter 1 in the SBIDS

2 Peter 1 in the SBIGS

2 Peter 1 in the SBIHS

2 Peter 1 in the SBIIS

2 Peter 1 in the SBIIS2

2 Peter 1 in the SBIIS3

2 Peter 1 in the SBIKS

2 Peter 1 in the SBIKS2

2 Peter 1 in the SBIMS

2 Peter 1 in the SBIOS

2 Peter 1 in the SBIPS

2 Peter 1 in the SBISS

2 Peter 1 in the SBITS

2 Peter 1 in the SBITS2

2 Peter 1 in the SBITS3

2 Peter 1 in the SBITS4

2 Peter 1 in the SBIUS

2 Peter 1 in the SBIVS

2 Peter 1 in the SBT

2 Peter 1 in the SBT1E

2 Peter 1 in the SCHL

2 Peter 1 in the SNT

2 Peter 1 in the SUSU

2 Peter 1 in the SUSU2

2 Peter 1 in the SYNO

2 Peter 1 in the TBIAOTANT

2 Peter 1 in the TBT1E

2 Peter 1 in the TBT1E2

2 Peter 1 in the TFTIP

2 Peter 1 in the TFTU

2 Peter 1 in the TGNTATF3T

2 Peter 1 in the THAI

2 Peter 1 in the TNFD

2 Peter 1 in the TNT

2 Peter 1 in the TNTIK

2 Peter 1 in the TNTIL

2 Peter 1 in the TNTIN

2 Peter 1 in the TNTIP

2 Peter 1 in the TNTIZ

2 Peter 1 in the TOMA

2 Peter 1 in the TTENT

2 Peter 1 in the UBG

2 Peter 1 in the UGV

2 Peter 1 in the UGV2

2 Peter 1 in the UGV3

2 Peter 1 in the VBL

2 Peter 1 in the VDCC

2 Peter 1 in the YALU

2 Peter 1 in the YAPE

2 Peter 1 in the YBVTP

2 Peter 1 in the ZBP