2 Samuel 1 (BOICB)

1 Mgbe Sọl nwụsịrị, Devid si ebe ọ gara tigbuo ndị Amalek lọghachi. Devid nọrọ ụbọchị abụọ na Ziklag. 2 O ruo, nʼụbọchị nke atọ, otu nwoke si nʼọmụma ụlọ ikwu Sọl bịakwutere ya. Uwe nwoke a yi nʼahụ dọwara adọwa. Isi ya dịkwa aja aja. Ọ batara daa nʼala nʼihu Devid nʼọnọdụ inye ya nsọpụrụ. 3 Devid jụrụ ya sị, “Ebee ka i si bịa?”Nwoke ahụ zara sị, “Esi m nʼọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel gbapụta.” 4 Devid jụrụ ya sị, “Gịnị mere? Biko gwa m.”Nwoke ahụ zara sị, “Ndị agha Izrel niile agbaala ọsọ. Ọtụtụ nʼime ndị agha Izrel anwụọkwala. Sọl na Jonatan nwa ya nwụkwara!” 5 Devid jụrụ ya sị, “Olee otu i si mata na Sọl na Jonatan anwụọla?” 6 Nwokorobịa ahụ sịrị ya, “Ọ dapụtara na m nọ nʼugwu Gilboa hụ Sọl mgbe ọ dabeere nʼùbe ya. Mgbe ahụ ụgbọ agha ndị iro na ndị na-agba ịnyịnya agha na-esosi ya ike. 7 Mgbe ọ hụrụ m, ọ kpọrọ m ka m bịakwute ya. Azara m ya sị, ‘Gịnị ka m nwere ike ime?’ 8 “Ọ jụrụ m sị, ‘Ị bụ onye?’“Azara m ya sị, ‘Abụ m onye Amalek.’ 9 “Ọ sị m, ‘Biko, bịa guzo nʼakụkụ m ka ị gbuo m, nʼihi na ọ bụ ezie na m dị ndụ, ma anọ m nnọọ nʼoke ihe mgbu nke ọnwụ.’ 10 “Ya mere, eguzoro m nʼakụkụ ya, gbuo ya, nʼihi na amaara m na ọ gaghị adị ndụ tee anya. Ọ bụkwa mgbe m gbusịrị ya ka m kpupụrụ ya okpueze dị ya nʼisi, gbapụtakwa ya mgbaaka dị nʼogwe aka ya, chịrị ha, ka m chịtara gị ha, onyenwe m.” 11 Mgbe Devid na ndị ikom ya nụrụ ihe ndị a. Ha dọwara uwe ha. 12 Ha ruru ụjụ. Kwaa akwa. Bukwaa ọnụ ruo oge anyasị nʼihi Sọl na Jonatan nwa ya nwoke, na nʼihi ndị agha ONYENWE ANYỊ na ụlọ Izrel. Nʼihi na ha dara site na mma agha. 13 Mgbe ahụ, Devid jụrụ nwokorobịa ahụ wetara ozi ahụ ajụjụ sị, “Olee ebe i si bịa?”Ọ zara sị ya, “Abụ m onye ọbịa, onye Amalek.” 14 Devid jụrụ ya sị, “Gịnị mere i ji setịpụ aka gị, na-atụghị ụjọ, tigbuo onye ONYENWE ANYỊ tere mmanụ?” 15 Devid kpọrọ otu nʼime ndị ikom ya sị ya, “Gbuo ya!” Nwoke ahụ weere mma agha gbuo ya. 16 Mgbe ahụ Devid sịrị ya, “Ọbara gị laa gị nʼisi, nʼihi na ị ji ọnụ gị kwupụta sị, ‘Egburu m onye ONYENWE ANYỊ tere mmanụ.’ ” 17 Emesịa, Devid depụtara abụ akwa a nʼihi Sọl na Jonatan. 18 O nyere iwu ka akụziere ndị Juda, abụ ùta a. E dere ya nʼime akwụkwọ Jesha. 19 “Ebube gị, gị Izrel, abụrụla ihe e gburu nʼebe gị niile dị elu.Lee ka ndị bụ dike si daa! 20 “Ekwutela ya na Gat.Ekwusala ya nʼokporoụzọ Ashkelọn.Ka ada ndị Filistia ghara ịṅụrị ọṅụ.Ka ụmụ inyom ndị a na-ebighị ugwu ghara iti mkpu ọṅụ. 21 “Unu ugwu Gilboa,ka igirigi maọbụ mmiri ozuzo ghara ịbịakwasị unu.Ka mmiri ozuzo gharakwa izokwasị nʼaja mbuli elu unu.Nʼihi na nʼelu unu ka a nọ merụọ ọta ndị dị ike.E, ọta Sọl, nke a na-adịghị etekwa mmanụ. 22 “Site nʼọbara ndị e gburu egbu,site nʼanụ ahụ ndị dị ike.Ụta Jonatan alọghachighị azụ.Mma agha Sọl agbaghịkwa aka lọghachi. 23 Sọl na Jonatan,na ndụ ha bụ ndị a hụrụ nʼanya. Ndị jupụtara nʼamara.Ma nʼọnwụ, nkewa ọbụla adịghị nʼetiti ha.Ha dị gara gara karịa ugo.Ha dị ike karịa ọdụm. 24 “Ụmụada Izrel,kwaaranụ Sọl akwa.Onye na-eji uwe uhie uhie chọọ unu mma.Onye ji uwe na ihe ịchọ mma ọlaedo chọọ unu mma. 25 “Lee ka ndị dị ike si daa nʼetiti ọgbọ agha.E gbuola Jonatan nʼelu ugwu; 26 ana m eruru gị ụjụ, gị Jonatan, nwanne mnʼihi na ihe dị oke ọnụahịa ka ị bụụrụ m.Ịhụnanya i nwere nʼebe m nọ dị omimikarịa ịhụnanya ndị nwanyị. 27 “Lee ka ndị dị ike si daa!Ngwa agha niile abụrụla ihe lara nʼiyi!”

In Other Versions

2 Samuel 1 in the ANGEFD

2 Samuel 1 in the ANTPNG2D

2 Samuel 1 in the AS21

2 Samuel 1 in the BAGH

2 Samuel 1 in the BBPNG

2 Samuel 1 in the BBT1E

2 Samuel 1 in the BDS

2 Samuel 1 in the BEV

2 Samuel 1 in the BHAD

2 Samuel 1 in the BIB

2 Samuel 1 in the BLPT

2 Samuel 1 in the BNT

2 Samuel 1 in the BNTABOOT

2 Samuel 1 in the BNTLV

2 Samuel 1 in the BOATCB

2 Samuel 1 in the BOATCB2

2 Samuel 1 in the BOBCV

2 Samuel 1 in the BOCNT

2 Samuel 1 in the BOECS

2 Samuel 1 in the BOGWICC

2 Samuel 1 in the BOHCB

2 Samuel 1 in the BOHCV

2 Samuel 1 in the BOHLNT

2 Samuel 1 in the BOHNTLTAL

2 Samuel 1 in the BOILNTAP

2 Samuel 1 in the BOITCV

2 Samuel 1 in the BOKCV

2 Samuel 1 in the BOKCV2

2 Samuel 1 in the BOKHWOG

2 Samuel 1 in the BOKSSV

2 Samuel 1 in the BOLCB

2 Samuel 1 in the BOLCB2

2 Samuel 1 in the BOMCV

2 Samuel 1 in the BONAV

2 Samuel 1 in the BONCB

2 Samuel 1 in the BONLT

2 Samuel 1 in the BONUT2

2 Samuel 1 in the BOPLNT

2 Samuel 1 in the BOSCB

2 Samuel 1 in the BOSNC

2 Samuel 1 in the BOTLNT

2 Samuel 1 in the BOVCB

2 Samuel 1 in the BOYCB

2 Samuel 1 in the BPBB

2 Samuel 1 in the BPH

2 Samuel 1 in the BSB

2 Samuel 1 in the CCB

2 Samuel 1 in the CUV

2 Samuel 1 in the CUVS

2 Samuel 1 in the DBT

2 Samuel 1 in the DGDNT

2 Samuel 1 in the DHNT

2 Samuel 1 in the DNT

2 Samuel 1 in the ELBE

2 Samuel 1 in the EMTV

2 Samuel 1 in the ESV

2 Samuel 1 in the FBV

2 Samuel 1 in the FEB

2 Samuel 1 in the GGMNT

2 Samuel 1 in the GNT

2 Samuel 1 in the HARY

2 Samuel 1 in the HNT

2 Samuel 1 in the IRVA

2 Samuel 1 in the IRVB

2 Samuel 1 in the IRVG

2 Samuel 1 in the IRVH

2 Samuel 1 in the IRVK

2 Samuel 1 in the IRVM

2 Samuel 1 in the IRVM2

2 Samuel 1 in the IRVO

2 Samuel 1 in the IRVP

2 Samuel 1 in the IRVT

2 Samuel 1 in the IRVT2

2 Samuel 1 in the IRVU

2 Samuel 1 in the ISVN

2 Samuel 1 in the JSNT

2 Samuel 1 in the KAPI

2 Samuel 1 in the KBT1ETNIK

2 Samuel 1 in the KBV

2 Samuel 1 in the KJV

2 Samuel 1 in the KNFD

2 Samuel 1 in the LBA

2 Samuel 1 in the LBLA

2 Samuel 1 in the LNT

2 Samuel 1 in the LSV

2 Samuel 1 in the MAAL

2 Samuel 1 in the MBV

2 Samuel 1 in the MBV2

2 Samuel 1 in the MHNT

2 Samuel 1 in the MKNFD

2 Samuel 1 in the MNG

2 Samuel 1 in the MNT

2 Samuel 1 in the MNT2

2 Samuel 1 in the MRS1T

2 Samuel 1 in the NAA

2 Samuel 1 in the NASB

2 Samuel 1 in the NBLA

2 Samuel 1 in the NBS

2 Samuel 1 in the NBVTP

2 Samuel 1 in the NET2

2 Samuel 1 in the NIV11

2 Samuel 1 in the NNT

2 Samuel 1 in the NNT2

2 Samuel 1 in the NNT3

2 Samuel 1 in the PDDPT

2 Samuel 1 in the PFNT

2 Samuel 1 in the RMNT

2 Samuel 1 in the SBIAS

2 Samuel 1 in the SBIBS

2 Samuel 1 in the SBIBS2

2 Samuel 1 in the SBICS

2 Samuel 1 in the SBIDS

2 Samuel 1 in the SBIGS

2 Samuel 1 in the SBIHS

2 Samuel 1 in the SBIIS

2 Samuel 1 in the SBIIS2

2 Samuel 1 in the SBIIS3

2 Samuel 1 in the SBIKS

2 Samuel 1 in the SBIKS2

2 Samuel 1 in the SBIMS

2 Samuel 1 in the SBIOS

2 Samuel 1 in the SBIPS

2 Samuel 1 in the SBISS

2 Samuel 1 in the SBITS

2 Samuel 1 in the SBITS2

2 Samuel 1 in the SBITS3

2 Samuel 1 in the SBITS4

2 Samuel 1 in the SBIUS

2 Samuel 1 in the SBIVS

2 Samuel 1 in the SBT

2 Samuel 1 in the SBT1E

2 Samuel 1 in the SCHL

2 Samuel 1 in the SNT

2 Samuel 1 in the SUSU

2 Samuel 1 in the SUSU2

2 Samuel 1 in the SYNO

2 Samuel 1 in the TBIAOTANT

2 Samuel 1 in the TBT1E

2 Samuel 1 in the TBT1E2

2 Samuel 1 in the TFTIP

2 Samuel 1 in the TFTU

2 Samuel 1 in the TGNTATF3T

2 Samuel 1 in the THAI

2 Samuel 1 in the TNFD

2 Samuel 1 in the TNT

2 Samuel 1 in the TNTIK

2 Samuel 1 in the TNTIL

2 Samuel 1 in the TNTIN

2 Samuel 1 in the TNTIP

2 Samuel 1 in the TNTIZ

2 Samuel 1 in the TOMA

2 Samuel 1 in the TTENT

2 Samuel 1 in the UBG

2 Samuel 1 in the UGV

2 Samuel 1 in the UGV2

2 Samuel 1 in the UGV3

2 Samuel 1 in the VBL

2 Samuel 1 in the VDCC

2 Samuel 1 in the YALU

2 Samuel 1 in the YAPE

2 Samuel 1 in the YBVTP

2 Samuel 1 in the ZBP